Akụkọ Kachasị n'ụtụtụ a: G7 ewepụtala $3b ị kwalite ụmụnwaanyị

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a

Minista mmanụ agbidi Ibe Kachikwu

Minista na-ahụ maka ihe gbasara mmanụ agbidi bụ Ibe Kachikwu ekwuola na Gọmentị etiti ga-emezu nkwa ha kwere ndị Naịja Delta n'ihe gbasara nchekwa obodo ha

Nke a bịara ebe ndị ntorobia ahụ na-ebo ndịagha Naịjirịa kwesiri ị chekwa ha ebubo ohi mmanụ agbidi.

Ọzọ na Naịjiria

Gọvanọ na-achị Lagos state

Lagos steeti na steeti ndị ọzọ dị na ọdịda anyanwụ Naịjirịa etinyela ụbọchị iri n'abụọ nke ọnwa Juun dịka ụbọchị ezumike.

Akwukwo e depụtara gbasara iwu a, nke gọvanọ Ambode binyere aka na-ekwu na ọ bụ iji kwanyere ụbọchị onyekwuoucheya ugwu o kwesiri.

Ijeri dọla atọ maka ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị

Ndị isi ala mba G7 dị icheiche

Lee ebe Malala Yousafzai gosiri nkwado ya maka okwu a na soshal midia.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Mba Canada na mba ndị ọzọ nọ n'otu G7 ekwela nkwa ị wepụta ijeri dọlla atọ ị ji hụ na ụmụnwaanyị nwereike gụọ akwụkwọ dị ka ibe ha.

Ego a ga-akwalite ngalaba ọgụgụ akwụkwọ na mba dị ịccheiche n'ụwa niile kachasi ebe ndị e nwere ọgbaghara .

N'Egwuregwu,

Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị mba Kamerun

Otu bọọlụ mba Kamerun akpọrọ Lioness ejila ọkpụ iri asataghị otu merie otu bọọlụ mba Congo n'asọmpị ha gbara.

Nke a mere na Lioness etozuola ị sonye n'asọmpị nke iko mba Africa ụmụnwaanyị.

Gee nkeji nke ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile