CJay Chijioke Nwokafor : Ihe ndị ị kwesịrị ị ma maka onye ihe ejije Nollywood a lara mmụọ

CJay yi akwa ọcha na trauza dị ojii ma kpuru okpu dị ojii
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye ejije Nollywood a ma ama bụ Chijioke Nwokafor a ma dịka 'CJay' alala mmụọ ka ọ gbachara afọ 46.

Ogbo ya bụ Nkechi Blessing Sunday, onye gbara ama a n' ozi o wepụtara n'akara ya n'ọbaozi Instagram ụbọchị Wenezde, kwuru na CJay nwụrụ n'ụlọọgwụ a kpóghí aha ya dị na Badore, Lagos, ụbọchị Wenezde.

Mana o kwughị ihe na-arịa CJay tupu ọ laa mmụọ.

Sunday ji anyammiri kwuo sị, " Ugbua anọ m n'ụlọọgwụ dị na Badore(Lagos). CJay efunahụla m. CJay anwụọla."

Ọ gara n'ihu kwuo na ya agaghị ewepụtakwa ihe onyonyo ọ kwadoburu iwepụta na mgbede Wenezde n'ihi ọnwụ CJay.

Sunday hiweburu emume mwepụtara n' ọha ihe nkiri a kpọrọ "Egwusi na Ọgbono" nke CJAy so na ndị ejije mere ya na mgbede Wenezde,abalị 30 nke ọnwa Septemba,afọ 2026.

N'otu n'ime ozi O wepụtara n'ikpeazụ na akara Instagram ya, CJay kwuru sị, "Ndụ dị nkenke nke ọ dịghị imefu na enweghị aṅụrị. Bie nkeji ọbụla ka ọ bụ ya bụ nke ikpeazụ gị."

Ndị Nollywood na-atụ arịrị ọnwụ ya

Ọtụtụ ndị ogbo Cjay na Nollywood nọ n'iru ụjụ.

Otu onye na-emepụta ihe ejije a ma ama bụ Ruth Kadiri bụ onye ya na Cjay rụkọrọla ọrụ kwuru sị, " Ọ bụrụ na a gbara m afa na ụbọchị m ga-ebi n'ụlọọgwụ, agahi m ekwe. Laa n'udo, CJay."

Onye ejije ọzọ a ma ama bụ Faithia Williams kpere ekpere ka mkpụrụ obi ya zuru ike na ndokwa.

Emeka Nwagbaraọcha kwuru na ya "Ekwetaghị m na CJ anwụọla. Mụ na ya ziritara ozi n'ekwentị abalị ole na ole gara aga."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Onye bụdị CJay?

CJay
  • Cjay bụ onye ejije Nollywood na-arịlite elu ma bụrụkwa onye e ji ihu ya ere ahịa.
  • Onye Awka ,Anambra steeti, a mụrụ ya n'afọ 1980.
  • Ihe nkiri o sonyerela gụnyere;"Godly Escort", "Larry Cold", 'The Private Tutor', "Coconut Head', "Housekeeper" "Bamikale", "Fond of You"wdgz..