Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ronaldo ọgbakeela?
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ebe foto si, Getty Images
A ka na-achọ ndị mụnyere isi ụlọọrụ ndị otu pati APC dị n'Imo steeti ọkụ ụnyaahụ.
Hilary Eke bụ onye isioche APC n'Imo na-ekwu na ọ bụ ndị omekome busoro ndị otu ha agha n'izu gara aga, kpara mkpamkpa a.
Nlọta Buhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na nlọta ya otu ụbọchị tupu oge o kwuru na ọ ga-alọta abụghị maka ihe ọbụla, na ahụ siri ya ike.
Cheta na Buhari kwesịburu ịlọta taa ka ọ gara UK ime nyocha maka ahụike ya.
N'akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, AFP
Amachiela onye bụbu Praịm minista ndị Malaysia bụ Najib Razak na nwunye ya ịpụ obodo ha.
Ọ kwesịrị ịzara ọnụ ya maka ebubo eboro ya gbasara imefu nde dọla narị asaa oge ọ nọ n'ọchịchị n'afọ 2015.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye egwu ndị Real Madrid bụ Cristiano Ronaldo alọghachịla ma bido ọzụzụ egwuregwu ọzọ.
Cheta na Ronaldo rọjiri ụkwụ ka ha na ndị Barcelona zukọrọ n'ụbọchị ụka mere ka ụfọdụ na-atụ egwu ma ọ ga-agbake tupu ha na Liverpool ezukọọ na ngwụcha Champions League n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa a.
Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a:





























