Etu 'unknown gunmen' si gbuo ndị be onyeisioche Ebonyi Council mmadụ anọ, n'Ebonyi steeti

Nwanne Steve Orogwu

Ebe foto si, Ezinaúló

Mgbe e biputara ya

Akụkọ na-eru BBC ntị bụ na ndị ojiemgbe amaghị ndị ha bụ gara na be Onyeisioche okpuruọchịchị Ebonyi Council gbuo mmadụ anọ ebe ahụ ma gbaa ụlọ ya na ngwongwo ndị ọzọ ọkụ.

Ndị ekperima ahụ gara na be Steve Orogwu bụ onyeisioche a n'abalị Tuzde mana ha ahụghị ya.

Orogwu bụ onye kwuputara nke a ụbọchị Wenezde sị "Ha gara na be m n'Ikwo n'abalị ga-gbuo nwanne m nwoke nke tọrọ m na ụmụ ya abụọ na onye nche anyị".

Nwanne Steve Orogwu

Ebe foto si, Ezinaúló

O kwukwara na ndị ahụ gbakwara ụlọ ya ọkụ na ọtụtụ ngwogwo dara puku kwuru puku ego.

Ndị ahụ e gburu nọ na ọbaozu dị n'Abakaliki ugbua.

Ndị uweojii n'Ebonyi steeti agbara ama akụkọ a ma kwuo na ha ka na enyocha akụkọ a ịma ihe mere kpọm kwem ma chọpụta etu ya bụ ihe siri mee.

Cheta na na mbido ọnwa Mee a, ndị ojiegbe wakporo ndị mmadụ n'okpuruụzọ Ebebe Junction, dị n'obodo Amike-aba ma gbaa ụgbọala ọkụ.

Cheta na Ebonyi steeti dịka steeti ndị ọzọ n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nọ n'ọnọdụ enweghị nchekwa kemgbe afọ 2021 dịka ọtụtụ mwakpo nakwa ogbugbu ndị mmadụ na-esizi akụkụ ebe a ndị a adapụta.

Gọọmentị Naịjriịa nakwa ndị ọrụ nchekwa ekwuola na ha na-agba mbọ idaju ihe ndị a mana ya bụ ọnọdụ ka na-aga n'ihu.

Akụkọ a ka na-abịa

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Ebonyi steeti: Ihe mere na Ngbo, Ebonyi Steeti