Emume mgba Rumuodomanya dị na Rivas Steeti

Mgbe e biputara ya

Ihe onyoonyo a gosiri ka ndị obodo Rumuodomanya dị na Rivas Steeti jiri gosipụta mmemme ngwụcha afọ ha site n'emume ịgbamgba.

Ha buruụzọ gosi ka ha si akwado ma jali ndị na-agba mgba n'obodo ahụ.

Onye okenye Rumuodiya kwukwara uru mgba a nwere n'obodo ha.

Ọ sị, "Anyị na ha na-eji mgba a ekele Chukwu maka na ha hụrụ ngwụcha afọ nke na-agwụ agwụ."

Gịnị bụ ịgbamgba na olee uru ọ bara n'ala Igbo?

N'ala Igbo, ịgba mgba so n'ime ejiji e nwere ndị okoroọbịa ji egosipụta akpamike ha.

Ụfọdụ obodo ji ịgba mgba egosi aṅụrị ha maka oge ọkọchị na oge udurummiri.

N'oge gboo eze obodo ụfọdụ ndị Igbo ji esi n'ịgbamgba ahọpụịta onye isi agha obodo ahụ.

Kwa mba Afrịka niile, ndị obodo na-ejikarị mgba eme ihe aṅụrị n'oge mmemme.

Ndị okoroọbịa na-ejikwa ịgba mgba ịchụ nwaanyị, maọbụ igosipụta onwe ha dịka onye tozuru ịlụta ezigbo nwaanyị n'obodo.

Lee etu ha sị eme emume mgba n'ala ha nke ha merụbara na nsonso a.

Kirie ya bụ ihe onyoonyo a ka ị hụ ya bụ mmemme n'uju.: