Insecurity in South East: Ndị ọrụ nchekwa egbuola ndị omekome anọ dịka ha kwara mgbọ na Njaba

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe e biputara ya
Mmadụ anọ anwụọla dịka ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na ndị agha na ndị ojiegbeezu kwara mgbọ n'Ụmuaka dị n'Okpuru ọchịchị Njaba, Imo steeti n'ụbọchị Tuzde.
Onye nọ ebe ihe mere gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ekperima ahụ gara ịwakpo ndị na-eji 'POS' enye ndị mmadụ ego, mana ozi rutere ndị ọrụ nchekwa nọ nso ntị ha wee zaa oku ngwa ngwa.
Ozigbo ndị ekperima ahụ hụrụ ndị uweojii, ha gbawara ha egbe, nke ndị ọrụ nchekwa sara ha.
Ha kwarịtara mgbọ ọtụtụ awa, nke mere ka mmadụ atọ n'ime ha dọrọ n'ozu ebe ahụ dịka ndị bi na mpaghara ahụ gbara ọsọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Michael Abattam kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie.
O kwuru na ndị ekperima atọ nwụrụ ebe ahụ ozigbo, ebe onye nke anọ nwụrụ n'ụlọọgwụ.
























