Nyanya Bombing: O meela afọ isii ogbunigwe ndị Boko Haram kpara mkpamkpa na Nyanya, Abuja

Ebe foto si, Reuters
N'ụbọchị Tuzde, ụbọchị 14 nke ọnwa Eprel afọ 2020, ka o mere afọ isii ndị Boko Haram tụrụ ogbunigwe n'ọdọụgbọala dị na Nyanya, Abuja.
Gọọmentị kwuru na ndị nwụrụ na ihe ọdachi ahụ bụ mmadụ 88, mana ọtụtụ kwuru na ohe karịrị mmadụ 100 tufuru ndụ ha ụbọchị ahụ.
Ya bụ ihe mere n'ụtụtụ, oge ndị mmadụ na-aga ịba ụgbọala iji gawa mkpa ha dị icheiche.
Ọtụtụ ndị nwụrụ na ya bụ ọdachị bụ ndị na-agara onwe ha ahịa maọbụ ọrụ nakwa ndị na-ere ihe n'ọdọụgbọala ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Nzuzo Naịjirịa bụ 'Department of State Security' (DSS) mechara nwuchie onye ha sị na ọ bụ ya kpara arụ ahụ.
Aha ya bụ Aminu Sadiq Ogwuche bụ onye ndị uweojii mba ụwa bụ 'Interpol' jidere na mba Sudan ebe ọ gbagara ma kpụghachite ya na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Chetakwa na ọ bụkwa n'isi ụtụtụ ụbọchị 14 nke ọnwa Eprel n'afọ 2014 ka ndị Boko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyị dị na Chibok, Borno Steeti, wee tọrọ ụmụakwụkwọ karịrị 200.
Ihe karịrị mmadụ 100 n'ime ha enwerela onwe ha ugbua mana ndị ọzọ ka nọ n'aka ndị Boko Haram.
N'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na gọọmentị echefubeghi maka ụmụakwụkwọ ndị ahụ, kama na ha na-agba mbọ ịhụ na a tọhapụrụ ha.
Aka akparala nwoke a sị na-edina nwa ya nwaanyị n'Imo Steeti

Ebe foto si, Imo state police command
Ndị Uweojii Imo Steeti anwụchiela otu nwoke gbara afọ iri anọ na anọ bụ onye ha sị na-edina nwa ya nwaanyị dị afọ iri na ise.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo bụ Godson Orlando Ikeokwu wepụtara nke a n'akwụkwọ ozi bụ ebe ọ sị na nwoke a ji ọnụ ya kwupụta na ọ bụ ihe o mere.
Ọ si nke a abụghị mbụ nwoke a na-akpa ụdị agwa a na ọ na-akpọta ndị enyi ya nwoke ka ha dinaa nwa ya nwaanyị a.
Ikeokwu sị na ọ nọ na nkata ndị uweojii ugbua ebe ha amalitela nyocha banyere ya.
Ndị agha atụọla ogbunigwe ebe ndị nkịtị nọ na Borno

Ebe foto si, AFP
Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha na-enyocha etu ụgbọelu ha sị tụọ ogbunigwe ebe ndị nkịtị nọ na Borno steeti.
N'akwụkwọ ozi ha wepụtara na mgbede Tuzde, ọnụ na-ekwuru ndịagha kwuru na ha nwetara ozi na ndị Boko Haram na-ezo ebe ahụ.
Mana nnyocha gosiri na ndị nkịtị nọ ebe ahụ oge ha tụrụ ogbunigwe ahụ.
Amabeghi mmadụ ole nwụrụ na ya bụ ọdachi mana akụkọ ụfọdụ kwuru na ihe ruru mmadụ asatọ nwụrụ.




























