Imo state: Ọ bụ "ezi asị" na AA chọrọ ịsepụ aka n'ikpe ntuliaka

Ebe foto si, Facebook/Nwosu
Mgbe e biputara ya
Uche Nwosu, bụ onye nọchitere anya pati Action Allaince na ndọrọndọ ọchịchị ọkwa gọvanọ Imo steeti, ekwuola na onweghị mgbe pati ya jiri chọọ ịgbahapụ ya n'ụlọikpe maka ikpe ahụ.
Nwosu sị na "o nweghi ihe di otu ahụ".
Ọ mekwara ka BBC Igbo mata na "ọ bụ mmadụ abụọ gbara ya bụ akwụkwọ n'ụlọikpe, Uche Nwosu na Pati"
Dịka o si kwuo, "ọ bụrụgodu na Pati esepula aka, Uche Nwosu ga-akwụsị ike na ya bụ okwu".
Mana o kwesiri ike na ọ bụ ndị ajọ mmadụ na-ekwu na pati ya esepụla aka, maka na eziokwu atọgbọghị na ya bụ okwu.
Nwosu sịkwa na ọ bụghị eziokwu na ndị okaikpe ya chọro isepụ isi na ya bụ okwu.



























