Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Onye bụ ga-bụ eze n'ime Liverpool na Real Madrid
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
APC Adịla nkwadebe ime ọgbakọ Naịjirịa niile.

Ebe foto si, Getty Images
Ha kwuru na ha ga-eme ọgbakọ ha nke Naịjirịa niile n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Juune.
Akwụkwọ onye mgbasaozi ha bụ Bolaji Abdullahi dere kwuru na ha ga-anabatakwa ndị isi ọhụrụ n'abalị iri abụọ na ise n'otu ọnwa Juunu ahụ.
Naịjirịa
Bọjetị ọ ga-abazikwa onyeisiala aka taa?

Ebe foto si, Getty Images
Ma enweghi mgbanwe mberede mere n'ikpeazụ, ị mara na ndị ụlọomeiwu ga-enye onyeisiala Muhammadu Buhari bọjetị afọ a taa.
Onyeisi ụlọ omeiwu sineti bụ Bukola Saraki kwuru nke a oge o mechiri ebum ọnụ ya ụnyaa.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Ụmụnwaanyị omeiwu anaghị achịkwa o

Ebe foto si, @Aso Rock / Twitter
Ha gara na nke onyeisiala Buhari taa wee kwuo na ha chọrọ oche osote onyeisiala n'afọ 2019.
Akụkọ mba ofesi
Agwọ na-egbu ọtụt ndị n'Afịrịka kwa afọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ WHO kwuru na ihe ruru puku narị mmadụ na-anwụ site na agwọ tara ha kwa afọ.
N'egwuregwu,
Onye ga-emeri agba ikpeazụ Champions Lig?

Ebe foto si, @Champions League /Twitter
Abalị iri abụọ ka ọ fọrọ tupu e bido asọmpi iko mbaụwa ebe asọmpi Champions Lig ga-akwụsị ụbọchị ụka.
Arụmụka na-aga ebe niile maka Champions Lig bụ ma Liverpool maọbụ Real Madrid ga-emeri.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:






























