Benedict XVI's funeral: Ihe atọ dị mere akwamozu Benedict XVI ji bụrụ ọpụrụiche n’ụka Katọlịk nke ụwa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Alejandro Millán Valencia
- Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
- Mgbe e biputara ya
Akwamozu onye bụbu poopu bụ Benedict XVI bụ ihe na-emetụbeghị n'ogologo oge n'ụka Katọlịk nke ụwa bụ na nke a ga-abụ oge mbụ otu Poopu ga-akwaozu Poopu ọzọ.
Akwamozu a nke na-aga n'ihu taa bụ Tọọzde n'ụka Saint Peter Basilica nke Rome. Nke a bụ ụka a na-ahụta dịka otu n'ime ndị kacha dị nsọ n'ụka Katọlịk nakwa otu n'ime ebe ndị njem na-aga ala nsọ na-akacha aga.
Poopụ Francis bụ onye na-achị ụka Katọlịk ugbua ga-anọ n'isi emume akwamozu onye bụbu Poopu bụ Benedict XVI, nke nwụrụ na ngwụcha afọ gara aga n'afọ 95.
A mụrụ Joseph Ratzinger na mba Germany dịka a họpụtara ya n'ọnwa Mee 2005 dịka Poopu ga-anọchite John Paul nke abụọ onye n'ọkwa ya nwụọ.
Cheta na n'ọnwa Febụwarị 2013 na Benedict XVI gbara arụkwaghịm n'ọkwa ya ihe na-emebeghị n'ọchịchị ụka Katọlịk kemgbe ihe ruru afọ 600.
E nwebeghị Poopu ọzọ rituru n'ọkwa kemgbe Gregory XII mere nke a n'afọ 1415. Benedict na-eso Celestine V onye mbụ mekwara otu ihe dị etu a n'afọ 1294.
Nrịtu n'ọkwa Ratzinger bụ maka okwu ahụike ya nakwa ịka nka nke mere akamozu ya ji bụrụ ihe pụrụiche.
Ọnụ na-ekwuru Vatican bụ Matteo Bruni kọwara na "Dịka Benedict XVI si chọọ, akwamozu ya ga-adị jụụ ma bụrụ nke obi ume ala."
N'ime ihe ndị niile, ile ihe atọ mere akwamozu onye bụbu Poopu a jiri bụrụ ihe pụrụ ezigbo iche.

Ebe foto si, Getty Images
Poopu n'ọkwa ga-akwa ozu ya
N'akwamaozu Poopụ ọbụla nwụrụ, ọ na-abụkarị onye nọ n'ọkwa a kpọrọ 'Camerlengo' bụ onye na-anọ n'isi ya bụ emume.
Onye ahụ ji ọkwa Camerlengo ga-agakwa n'ihu chịa ụka Katọlịk nke ụwa ruo mgbe a họpụtara Poopụ ọzọ.
Mana n'okwu Benedict XVI onye gbara arụkwaghịm ihe ji obere afọ afọ 10 gara aga, ọ bụ onye nọchitereanya ya bụ onye na-akwa ozu ya nke bụ Poopu Francis nke mbụ.
Francis ga-abụ poopụ bụ kemgbe ụwa n'ụka katọlịk ga-akwaozu poopụ ọbụla

Ebe foto si, Vatican press office
Kemgbe ụwa na Vatican, naanị otu Poopụ jirila aka ya rituo n'ọkwa oche sentị Peter maka otu ihe a mere Bemedict XVI jiri rituo.
Nke a mere n'oge Senchụrị nke 13 mgbe a họpụtara Pietro Angeleri di Murrone dịka onye ga-achị. Ụkọchukwu a onye biri ndụ ya n'ime ụlọ ma na-anmaghị apụta ezi nọrọ ọkwa ahụ dịka ọ bụghị onye Kadịnal.
Ọ họọrọ aha Celestine V dịka aha Poopụ ya mana ọ mechara chọpụta na ibu ya bụ okwa chọrọ inyịgbu ya nke mere o jiri gbaa arụkwaghị ma kwakpuo n'ime ụlọ ebe ọ nọpụrụ onwe ya iche.
Agbanyeghi nke a, ọnwụ ya mere n'ụzọ dị ezigbo iche na nke okwu ọnwụ Benedict XVI. Onye nọchịtere anya bụ Boniface VIII malitere ịche echeche n'ọha ga-amalite ịhụta Celestine dịka onye sentị. Nke a mere ụjọ nakwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'okwu ọchịchị ụka ahụ mere o jiri hụ na a nwụchiri ya.

Ebe foto si, Getty Images
Celestine V nwụrụ n'elu ụlọ ebe a kpọchiri ya ruo ọnwa 10 dịka emeghiri ya akwamozu pụrụiche ọbụla.
Ndị ọzọ pụrụla n'ọkwa oche apụghị n'ike aka ha, ha pụrụ site n'okwu ọgụ nakwa ndọrọndọrọ n'ụka ahụ.
Nke ikpeazụ mere bụ n'afọ 1415 mgbe Gregory XII ritụru n'ọkwa n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị dapụtara n'ime ọchịchị ụka ahụ. A họpụtaghị onye nọchitere anya ya ruo afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ.

Ebe foto si, Getty Images
Nhọpụta onye ọchịchị ọzọ agaghị eso akwamozu a
Otu n'ime ihe na-esokarị ọnwụ Poopụ na-abụ nhọpụta onye ga-anọchite ya nke a na-emekarị ngwa ngwa ma a kwacha ozu Poopụ ọbụla.
N'ebe mmalite okpukperechi ụka Kraịst, a na-ahọpụta ndị isi ọchịchị n'ụka n'ime otu ndị Apọstụlụ nakwa ndị hibere ukpụrụ okpukperechi ahụ n'akụkụ ụka n'ụwa dị iche iche dịka ya bụ okpukperechi malitere ifesa.
Mana usoro nhọpụta a nke a na-akpọzị "conclave" bịara bụrụ usoro eji ahọpụta dịka ụfọdụ ndị Kadịnal kpọchiri onwe ha n'ime otu ụlọ ma gbaa izu họpụta otu onye ọchịchị.
Usoro Conclave a gbanwere n'ụzọ dị iche iche ka oge gachara.
Mana usoro a nabatara ugbua bụ na ndị Kadịnal ga-akpọchi onwe ha n'ime ụka a ma ama na Kadịnal bụ Sistine Chapel ma mee ntuliaka họpụta aha otu nwoke ga-achị ụka Katọlịk n'ụwa.
Ha mechaa mkpebi nke a, a mụnye otu ihe ọkụ nke ga-eme awụrụ ọcha e si n'elu ụlọ pụta - nke a bụ ihe ịgba ama nye ụwa na a họpụtala Poopụ ọhụrụ.
N'oge a, agaghị eme nzukọ Conclave dịka ụwa agaghị ahụ anwụrụ ọcha ọbụla dịka emeela nhọpụta onye ọchịchị mgbe Benedict XVI gbachara arụkwaghịm n'afọ 2013 nke mere e ji họpụta Jorge Bergoglio nke aha Poopụ ya bụ Francis nke mbụ.
Nke ọkaibe n'okwu ọchịchị ụka ekwuola na arụkwaghịm a onye bụbu poopụ gbara egosila ndị ọzọ ụzọ na ha nwereike ịgba arụkwaghịm n'ọdịnihu.
Francis na onwe ekwupụtala na o binyelaka n'otu akwụkwọ ịgba arụkwaghịm ma ọ bụrụ na ndatu ahụike ya kawanye njọ nke bụ na ọ gaghịzi enweike rụọ ọrụ ya n'uju.
Mbibi ọlaaka "Ring of the fisherman'

Ebe foto si, Getty Images
A họpụtacha onye poopụ ọbụla a na-enye ya akwa njirimara ọchịchị pụrụi che nakwa akara ndị ọzọ iji gosi ụwa na onye ahụ bụ onyeisi ụka Katọlịk n'ụwa nakwa mpaghara 'Vatican City' Steeti.
Ihe ndị a na-enyinye poopụ ọbụla gụnyere uwe ọcha 'Cassock' nke na-enwe uwe mgbakwunye 'pellegrina' na-azụ ya. Mkpọrọ pụrụiche na-enwe akpụrụakpụ Krọsụ n'elu ya nakwa ọlaaka pụrụiche bụ 'Ring of the Fisherman'.
Ọlaaka bụ nke e ji ọlaedo kpụọ dịka e tinyere ihụ gosiri Onye sentị Peter ebe ọ nọ n'ime ụgbọ mmiri ma na-atụnye neetị ya maka mmụdo ụmụ azụ.
Poopụ niile chịrịla enyiela ya bụ uwe 'cassock' ebe mkpọrọ ọchịchị ahụ bụ ihe ụfọdụ na-agbanwe. Iji maa atụ, mgbe ụfọdụ Poopụ Francis na-eji mkpọrọ nke onye nọbụ n'ọkwa bụ Paul Vi nakwa John Paul II jiri n'oge nke ha.
Mana ọlaaka 'Ring of the fisherman' a na-abụ nke a na-akpụrụ onye Poopụ ọbụla a họpụrụ n'iche iche.
A kwacha ozu onye Poopụ ọbụla lara mmụọ otu n'ime usoro emume akwamozu ya ma e mechee ihe ndị ọz ọ bụ mmibi ọlaaka ahụ pụrụiche a kpụrụ ya.
A na-eji odo 'Hammer' kurie ya.
Mana n'oge a, agaghị eme mbibi ọlaaka Benedict XVI dịka ọlaaka 'Ring of the fisherman' a kpụrụ n'afọ 2005 a bụrụla ihe na-adịghịzị ire dịka ọ gbachara arụkwaghịm n'afo 2013.
Dịka otu ọnụ na-eklwuru Vatican bụ Federico Lombardi siri kwuo, agaghị ebibi ya mana akara ya akara Krọsụ pụrụiche n'elu ya.
E nyerekwara Benedict XVI ohere pụrụiche ịga n'ihu na-enye uwe Cassock ọcha agbanyeghị na nke ya dị iche na nke Poopụ Francis na-enyi.
Nke a bụ iji rụba ya ama dịka onye bụbu Poopụ, nke bụ ọnọdụ ọ nọgidere ma bụrụ uwe o yigidere tupu ọ nwụọ.





























