New Zealand: Praim minista Jacinda Ardern akagbuola agbamakwụkwọ ya

Ebe foto si, Getty Images
Jacinda Ardern bụ Praim minista mba New Zealand akagbuola agbamakwụkwọ ya ka ọkpọpụtachara iwu ọhụrụ maka igbochi ọrịa covid-19.
Mba New Zealand ga-enwe iwu ọhụrụ gbasara covid-19 maka etu Omicron si kpaa mkpamkpa na mba ahụ.
Iwu ndị a gụnyere ikwe ka naanị mmadụ otu narị gbagoro ọgwụ mgbochi nọrọ n'emume nakwa ikpuchi imi ma mmadụ nọrọ n'ụlọ ahịa nakwa n'ime ụgbọ njem.
New Zealand edekọla ọnụọgụ ihe ruru mmadụ puku iri na ise, otu narị na anọ (15,104) buterela ọrịa covid nakwa mmadụ iri ise na abụọ (52) nwụrụlanụ maka ọrịa a.
Arden gwara ndị ntaakụkọ na agbamakwụkwọ ya na okwuokwu n'onyonyo bụ Clarke Gayford agaghị aga n'ihu.
N'okwu ya, " Adịghị m iche, m ga-ekwu na puku kwuru puku ndị New Zealand enwela ihe ọrịa covid nabichiri ha ime, nke kacha nke bụ na ọtụtụ n'ime ha enweghi ike ịhụ onye nke ha na-arịa ahụ."
Iwu ọhụrụ a ga-amalite n'abali taa bụ Sunday, January 23, 2022.
Ọ na-abịa dịka achọpụtachara na mmadị itoolu ebutela Omicron na mba ahụ.
Ihe mba a merela na mbụ maka igbochị mfesa ọrịa covid
New Zealand nweburu iwu mmachị gbasara mgbochi mfesa ọrịa covid kamgbe ọrịa ahụ malitere.
Mba ahụ so na ndị mbụ mechiri okeala ha ma merie nfesa nje covid ndị pụtara na mbụ site n'imachị ngagharị mmadụ.
Kamgbe agba Delta variant malitere , Arden bidoro gbawa mbọ ka ọ hụ na ndị mmadụ gbazuru ọgwụ mgbochi.
A na-eche na mmadụ ruru pasenti iri itoolu na anọ (94%) nke mba ahụ , gaferala afọ iri na abụọ (12) agbazuola ọgwụ mgbochi covid, ebe 56 pasenti n'ime ha agbaala 'booster.'
N'afọ 2021, New Zealand kwuputere maka mepegharị okeala ha dịka nwalee.
Ndị mbiarambiara ga-abụ ndị ikpeazụ a ga-ekwe ka ha bata mba hụ bidọ n'April 30, 2022.
Ndị agha Naịjịrịa mere ndị otu Boko Haram ịwa na Gwashi

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa ekpochapụla ndị ọlụọ ọlaa Boko Haram n'ọhịa Gwashi dị na Okpuruọchịchị Bukkuyum na Zamfara steeti.
Foto anyị hụrụ na-egosi ndị obodo ahụ na-enwe aṅụrị na-ekele ndị agha Naịjirịa maka ịnapụtara ha obodo ha n'aka ndị Boko Haram.
Akwụkwọ akụkọ na-ekwu na ndị agha Naịjirịa busoro ha agha n'ogige ha dị n'ọzara Gando memilaa ọtụtụ n'ime ha.
Ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ a na-ana ndị obodo ahụ na ndị gbara ha gburugburu ụtụisi ma yie ha egwu na ndị ọbụna akwụghị ya ga-eji isi keele ala.
Ndị obodo ha depụgoro akwụkwọ dị otu a bụ Wawan Icce Salihu, Wawan Icce Ibrahim, Gangara, Gande, Tungar Gebe, Galle, Nan Narki, Ruwan Kura, and Yar Galma dị n'Okpuruọchịc Bukkuyum nke Zamfara steeti.
Na mbido ọnwa Jenụwarị a ka ndị ekperima a wakporo Anka dị n'okpuruọchịchị Bukkuyum gbuo mmadụ iri ise (50).
Onyeisiala Muhammadu Buharị sịkwa na ya ga-ahụ na ya meminachara ndị ajọ mmadụ ahụ.




























