Oscars 2018: Ihe ndị nkiri yi pụta n'ọgbọ

Danai Gurira
Nkọwa foto, Danai Gurira mere ihe nkiri Black Panther na Walking Dead gosiri ihe esere n'akụkụ isi ya
Mgbe e biputara ya

Ihe nrite Academy Awards nke ama ama dịka Oscars nke ugboro 90 mere n'abalị ebe ndị mmadụ gosiri ekike ha.

Lekwa ihe ndị na-eme ihe nkiri yi bịa emume a.

Daniel Kaluuya
Nkọwa foto, Daniel Kaluuya bụ onye Britain so mee ihe nkiri Get Out so na ndị akpọrọ aha inweta ihe nrite Oscar
Lupita Nyong'o
Nkọwa foto, Lupita Nyong'o nwetara Oscar n'afọ 2012 maka ihe nkiri o mere nke akpọrọ 12 Years a Slave
Jennifer Lawrence
Nkọwa foto, Uwe Jennifer Lawrence bụ onye mere ihe nkiri Hunger Games yiri akpụrụakpụ Oscar n'acha ọlaọcha
Andra Day
Nkọwa foto, Andra Day bụ onye Amerịka na-agụ ma dee egwu, dina ala na red carpet, sị ndị mmadụ bịa lere uwe ya
Tom Holland
Nkọwa foto, Tom Holland mere ihe nkiri Spider Man yi ezigbote uwe bịa kpọpụta aha onye nwetara ihe nrite n'emume a
Chadwick Boseman
Nkọwa foto, Chadwick Boseman bụ eze T'challa nke obodo Wakanda n'ihe nkiri Black Panther yi uwe Givenchy kwara bịa Oscars
Ashley Judd
Nkọwa foto, Ashley Judd nke tinyere ọnụ n'ime okwu Time's Up yi uwe na-acha odoodo pụta na red carpet
Adam Rippon
Nkọwa foto, Adam Rippon n'eme egwuregwu olimpiks bekee kpọrọ figure skating mere ka ndị mmadụ kpụrụ ya n'ọnụ ka o yi uwe nwere ihe eji eke ajị mere ka ọ dị ka o si n'ime ihe nkiri Fifty Shades Of Grey rịpụta
Salma Hayek
Nkọwa foto, Salma Hayek yi uwe na-acha odoodo pụta
Darrell Britt-Gibson
Nkọwa foto, Ndị ose foto serela na-aga ka Darrell Britt-Gibson mere ihe nkiri Three Billboards maliri elu na red carpet
Whoopi Goldberg
Nkọwa foto, Uwe Whoopi Goldberg yi n'ahụ dị ka dragon esere n'ahụ ya
Patrick Stewart
Nkọwa foto, Sir Patrick Stewart mere ihe nkiri X-Men yi ntụtụ edere Time's Up n'uwe ya ka onyere ndị ose foto nsusu
Sally Hawkins
Nkọwa foto, Sally Hawkins, onye Britain so na ndị akpọrọ aha inweta ihe nrite maka ihe nkiri The Shape of Water o mere chịsaara ndị ose foto ọchị
Saoirse Ronan
Nkọwa foto, Saoirse Ronan mere ihe nkiri Lady Bird yi uwe pink pụta na red carpet Oscars ka afọ 10 gachara oge mpụta mbụ ya n'afọ 2008 oge ọ ka bụ nwata dị afọ 13
Meryl Streep
Nkọwa foto, Akpọọla Meryl Streep aha maka inweta ihe nrite Oscars ugboro 21 kamgbe o bidoro ime ihe nkiri
Margot Robbie
Nkọwa foto, Margot Robbie mere ihe nkiri I, Tonya mara mma n'ihe o yi pụta na red carpet
Tiffany Haddish
Nkọwa foto, Tiffany Haddish kere ezigbote ekike ndị Afrịka nke eji mara ụmụnwaanyị Eritrea na Ethiopia

Foto niile a nwere ihe bekee na-akpọ copyright.