Onyeisi Ohaneze Ndị
Igbo n’Ondo steeti bụ Innocent Chukwudum Ezechiefo, agwala BBC na ọ bụghị ọgụ n’etiti ndị
Igbo na ndị Yoroba bụ ihe dapụtara n’Akure kemgbe ụbọchị ụka bụ 6 nke Disemba.
Ọ kọwara na ọ bụ
nghọtaghie n’etiti nwata Kalaba na nwata Yoroba nke ha na-agba mbọ ikpezi
ugbua, butere ya bụ nsogbu.
Ezechiefo kwuru na ya bụ nsogbu selitere isi mgbe otu onye Yoroba na-ese anwụrụ (onye agboro) bịara malite ikposasị ahịa ndị Igbo, ka o kwuru na e nwere ebe a lụrụ ọgụ.
Mana dịka e si chọpụta, ebe a lụrụ ọgụ dị iche n'ebe ndị Igbo na-akpọsa ahịa ha, bụ ebe a bịara kposasịa.
Ha chọpụtakwara na onye lụrụ ọgụ a a na-ekwu okwu ya bụ otu nwa Kalaba a na-akpọ Asuquo, bụ onye na-eche nche n'ebe a na-akpọ Obaile Housing Estate.
Asuquo gara ebe ọ gara ịhụ enyi ya nwaanyị wee zute ndị na-anakọ ndị ọgbatumtum ego ụtụ nọchichara ụzọ. Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, a mara nwa Kalaba ahụ karama mere ka ọ jụọ ha ihe o mere ha ji wee mee ya ụdịrị ihe a.
Ndị uweojii kwuru na nghọtaghie ahụ abịala na njedebe ma kọwaa na ọ bụ aghọtaghị iwu ala bu ihe butere ya bụ okwu.
N'agbanyeghi na ụfọdụ ndị kwuru na mmadụ atọ nwụrụ, ndị uweojii steeti ahụ gwara BBC na e nweghi onye nwụrụ.
O kwuru sị "mmadụ abụọ merụrụ ahụ na ya bụ nsogbu mana ihe niile adịla mma ugbua".
Nsogbu a emeela ka gọọmentị Ondo steeti tinye mmachi ngagharị ruru awa iri abụọ na anọ (24) na mpaghara Ode na Isingbo dị na steeti ahụ.
Donald Ojogo bụ kọmishọna Mgbasaozi na steeti ahụ, kwuru na ha agwala ndị nchekwa ka ha gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ rubere iwu e tinyere isi ma nọrọ n'ụlọ.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Oluwarotimi Akeredolu enyekwuola iwu ka a chọta ma nwụchie ndị mere mkpamkpa a.