Anyị amaghị maka akụkọ kwuru na nwaanyị gburu nne ya n’obodo Ezema Nru nke Nsukka – Ndị uweojii
Ndị uweoji ekwuola na ha amaghị maka akụkọ kwuru na otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị gburu nne ha n’obodo Umunkporogidi Ezema Nru nke dị n’okpuru ọchịchị Nsụka Enugwu Steeti n’ụbọchị Tuzde abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị 2026.
Na nzaghachi ajụjụ ụlọmgbasa ozi BBC News Igbo jụrụ ya n’ekwentị, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na ndị uweojii anataghị ozi ọbụla banyere akụkọ ahụ.
Mana mgbe onye ntaakụkọ BBC News Igbo gara n’obodo Umunkporogidi Ezema Nru ka anyị chọpụtara na onweghị onye ọbụla nọ n’ezinaụlọ ahụ ihe ahụ mere dịka a gbachiri ụlọ ha agbachi.
Mana Onyeisi ndị ntoroọbịa aha ya bụ Casmire Ezeugwu kọwara BBC News na ya na onyeisi obodo ahụ ji ọsọ gbaaga n’ebe ahụ ihe mere mgbe ha nọrọ akụkọ ahụ.
Ezeugwu bụ onye gwara BBC News Igbo na akụkọ ahụ mere eme, kwuru na ndị uweojii kpọọrọ nwaanyị ya na nwa ya nwaanyị gburu nne ha gawa n’ụlọọrụ ndị uweojii dịka e tinyere ozu nwaanyị nwụrụ anwụ n’oba ozu.
Onyeisi ndị ntoroọbịa gwara BBC na ya amaghị ebe nwaanyị ya na nwa ya gburu nne ha nọọ ugbua.
Mana otu onye agbataobi na achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na a kpọrọla ụmụnwaanyị abụọ ahụ gawa ebe a na-elekọta ndị nwere ọnọdụ ahụike nke ụbụrụ n’Enugwu.
Cheta na akụkọ malitere na-efegharị na otu nwaanyị na nwa ya nwanyị gburu otu nwaanyị dị afọ iri asaa, nke a maara dịka "Mama Oliver," n'ihe mberede ezinụlọ dịka ụlọmgbasa ozi mpaghara siri kọọ.
Ndị hụrụ ihe merenụ kwuru na nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ si Umabor-Ehalumona gaa ka ya na ada ya nwaanyị bụ Loretta Asadu biri, iji lekọta ada ya na nwa ya nwaanyị, ha abụọ bụ ndị e kwuru na ha nwere nsogbu ahụike ụbụrụ.
Onye ahụ kọrọ na Loretta Asadu bụ nwunye Ignatius Asadu nke Umunkporogidi nwụrụ anwụ, ma kwuo na ọnọdụ ahụike ụbụrụ ya malitere ịka njọ n'oge na-adịbeghị anya.
E kwuru na ọdachi ahụ mere mgbe agadi nwaanyị ahụ mere mkpesa maka agụụ. Otu nwoke n'ezinụlọ ahụ aha ya bụ Abumchukwu, onye a sịrị na ọ bụ nwa Loretta, gara ịzụtara nne nne ya nri mgbe ihe ahụ mere.
"Tupu ya apụọ, Abumchukwu kechiri aka nne ya n'ihi na ọ na-eme ihe ike," ka onye agbata obi ya kwuru. "Mgbe ọ nọghị, Chikamso tọpụrụ nne ya. A kọrọ na ha abụọ wakporo agadi nwaanyị ahụ, dọkpụo ya n'azụ ụlọ ma gbuo ya,” ka ụlọmgbasa ozi mpaghara kọrọ.
Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: