Ngalaba EFCC ekwuputala na ha na-achọ aka chịburu Kogi steeti bụ Yahaya Bello ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo ịzupu ego ruru N80.2bn.
EFCC wepụtara nke a n'akara soshal midia ha niile ma kpọọ oku ka ndị mmadụ nwere okwu maka ebe ọ nọ bịa nyere ha aka kpesa ya.
"Onye ọbụla ma ihe ọbụla maka ebe ọ nọ bịa kọọrọ anyị maọbụ gaa kpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso".
Cheta na EFCC gara n'ụlọ Yahaya Bello nke dị na Wuse Abuja, gbaa ya okirikiri n'ụbọchị Wenzde.
Akukọ kwuru na aka na-achị Kogi steeti ugbua kpọrọ ndị nke ya bịa na be Bello tinye ya n'ime ụgbọala ya ma kpọrọ ya pụọ mana BBC achọpụtabeghị ma o nwere eziokwu so akụkọ a.
Gọmentị Enugwu emeela nwatakịrị emegburu obi ụtọ
Ọṅụ juputara n’obi ndị ezinaụlọ Happiness Nwafor bụ onye nne ya ukwu ji mma, mmiri ọkụ nakwa osisi meruo nnukwu ahụ n’Onitsha.
Mkpa mkpa hụ kpara na ọnwa febuwarị oge okaiwu Ada Chukwu meruru nwatakịrị ahụ gbara afọ 11 nnukwu ahụ nke mere ndị bi na ogige 33 Onitsha jiri mee ngaghariiwe.
Ngwa ngwa ka gọvanọ Chukwuma Soludo jiri nye iwu ka nwaanyị ahụ kpara ike ọjọọ a nyefee onwe ya n’aka ndị uwe ojii.
O teghi aka gọmenti Enugwu nakwa otu akpọrọ Ụmụ ada Awgu, bụ ebe nwatakiri ahụ bụ Happiness si gara n’ụlọ ọgwụ n’Onicha nyere aka n’eleta ya bụ nwa.
Taata zi ka ndị Anambra nyefere nwata ahụ n’aka kọmishọna n’ahụ maka ụmụnwaanyị na ụmụaka nke Enugwu bụ Ngozi Eni.
Ọriakụ Ngozi Eni kpọzịịrị nwata ahụ nyefee n’aka ndị akpọrọ Scholarship kọmitee ka ha malite zụwa ya bụ nwatakịrị rue mahadum dịka gọvanọ Peter Mbah siri nye ntuziaka.
Nne nwatakịrị ahụ kelere gọmenti nke Enugwu na Anambra ka ha siri zọpụta nwa ya n’aka onye chọrọ igbu ya.
Cheta n’ọkaiwu ahụ bụ Ada Chukwu bụ onye na-azara ọnụ ya ugbua n’aka ndị uweojii, oge o nyefere onwe ya n’aka ndị uwe ojii n’Ọka, Anambra steeti.
Kọmishọna nke ụmụ nwaanyị na ụmụaka na Anambra bụ Ify Obinabo ma ogbo ya nke Enugwu bụ Ngozi Eni yọrọ ọha na eze ka ha kwuo okwu ma ha hụ ihe ọbụla dị njọ.
EFCC awụchiela n'ụlọ Yahaya Bello ịji nwụchi ya
Ngalaba na alụsọ ọgụ megide mpụ na Naịjirịọ́ bụ EFCC n'ịchafụ agbazuola ụlọ Yahaya Bello okirikiri iji nwụchi ya.
Akụkọ kwuru na ha tụrụ ụkwụ na mpụta ụlọ ya dị n'Abuja kemgbe elekere 9 nke ụtụtụ.
Ụfọdụ ndị na-akwado Bello pụtakwara n'igwe nke ha iji gosi ya nkwado maka ihe na-eme.
Cheta na EFCC tụrụ aka chiburu Kogi steeti aka n'ebubo izupu ego ruru otu nari ijeri naira tupu ọ banye ọkwa dịka Gọvanọ n'afọ 2015.
Ndị ọzọ a tụkwara aka na ya bụ ebubo nzupu gụnyere Alli Bellow nakwa Daudu Suleiman bụ ndị e kwuru na ha atọ kpara nkata ịme mpụ a.
Ụlọikpe akwadoola ọchụchụ a chụrụ Ganduje dịka Onyeisioche APC
Ebe foto si, Aminu Dahiru Ahmad/Facebook
Uloikpe ukwu
dị na Kano Steeti enyeela iwu kwadoro ọchụchụ a chụrụ onye bụbu Gọvanọ steeti bụ
Abdullahi Ganduje dịka Onyeisioche pati All
Progressive Congress (APC).
Ọkaikpe
Usman Na’abba nyere iwu ahụ mgbe Laminu Sani na Haladu Gwanjo gbara Ganduje akwụkwọ
n’ụlọikpe.
N’akwụkwọ
ahụ ha gbara, ha kwuru na Ganduje dara iwu na-achị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha.
N’iwu ụlọikpe
ahụ nyere, ọ gwara Ganduje ka ọ kwụsị ịrụ ọrụ dịka onyeisioche ndị APC ma kwusi
ihe niile gbasara ya na ndị ọchịchị pati ahụ.
Ọkaikpe
Usman Na’abba dọọrọ ndị niile nọ n’okwu ahụ aka na ntị ka ha mee ihe a iwu
kwuru ruo n’ụbọchị 30 ọnwa Eprel, 2023 mgbe a ga-eleba anya n’akwụkwọ a gbara megide
Ganduje.
N’okwu ya Ọkaịkpe
Usman Na’abba “iwu nke a metụtara ndị niile nọ n’okwu a ka ha mee ihe a iwu kwuru.
Ganduje ga-akwụsị ịhụ onwe ya ka onyeisioche APC maọbụ ịnọ n’isioche n’ọchịchị otu
ha”.
Ọ bụ mmadụ
abụọ na ndị nọ n’isiọchịchị patic APC n’obodo ha gbara akwụkwọ n’ụlọikpe iji chụọ
Ganduje n’ọkwa.
A na-arụtụ
aka na ebubo ndị ahụ e boro Ganduje sitere na esemuokwu ya na Gọvanọ na-achị
Kano steeti ugbua.
Ndịagha Russia e gburula n’agha ha na Ukraine agafeela puku 50 - BBC
Ka agha
Russia na Ukraine banyere afọ nke abụọ, anyị chọpụtara na ọnụọgugu ndịagha
Russia nwụrụ anwụ karịrị 25% ma ọ bụrụ na e jiri ndịagha ole nwụrụ n’afọ nke mbụ
tunyere ya.
Ndị BBC na Russia
na ụlọọrụ mgbasaozi a kpọrọ Mediazona na ndị ọzọ bidoro na-agụkọ ozu ndị nwụrụ
n’agha kamgbe afọ 2022.
Ili ọhụrụ
n'ebe a na-eli ozu na Russia nyere aka ịdepụta aha ọtụtụ ndịagha e gburu.
Ndị otu anyị
jịkọrọ aka ọnụ nweta ozi sitere na gọọmentị nakwa nke e dere na sosal midia nakwa
n’akwụkwọ ntaakụkọ.
Ndịagha
Russia karịrị mmadu 27,300 nwụrụ n’afọ nke abụọ n’Ukraine.
Ndị
Russia ekweghi etinye ọnụ n’okwu a
Nyocha anyị
anaghị agụnye ọnwụ nke ndịagha na Donetsk na Luhansk nke Russia - n'ebe Ọwụwa Anyanwụ
Ukraine. Ọ bụrụ na agbakwụnyere ha, ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'akụkụ Russia ga-aka
nke ukwuu.
Ukraine, ka
ọ dị ugbua, anaghị ekwu maka ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọgbọ agha ya. Mana n'ọnwa Febụwarị,
Onyeisiala ha bụ Volodymyr Zelensky kwuru na e gburu ndịagha Ukraine 31,000 -
mana ndị Amerịka na-ekwu na o nwereike ịgafe ọnụọgụgụ ahụ.
Ụsọrọ agha
ndị Russia kpọrọ “meat Grinder Tactics”
Ndepụta BBC
na Mediazona gosiri otutu ndị nwụrụ maka ụsọrọ ndị Russia jị alụ agha.
Ndịagha
Russia nwụrụ na Jenuwarị 2023 karịrị akarị ka ha bidoro ịwakpo Donetsk dị na
mpaghara Ukraine.
ịhe so bụrụ
nsogbu ebe ndị Russsia bụ etu gburugburu Donetsk dị, enweghi ikee ịwakpo ndị
Ukraine n’ike.
EFCC ga-akpụpụ Cubana Chiefpriest ụlọikpe maka imetọ naira
Ebe foto si, Cubana Chiefpriest/Instagram
Ngalaba na-alụsọ ọgụ megide mpụ na Naịjirịa bụ EFCC ekwuola na ha ga-akpụpụ Pascal Okechukwu a ma dịka Cubana Chief Priest ụlọikpe maka ịmetọ ego naira.
Okechukwu ga-apụta ụlọikpe ịzara ọnụ ya n'elu ebubo ndị e boro ya.
EFCC gwara BBC n'ekwentị na a ga-akpụpụ ya ụlọikpe n'ezie n'ụbọchị Wenzde na Legọs.
Ọnụ na-ekwuru ngalaba ahụ bụ Dele Oyewale bụ onye gbara ama a mgbe akpọtụrụ ya.
Kedụ ebubo ndị e boro ya?
Ebe ebubo e boro Cubana Chief Priest gbadoro ụkwụ bụ iwu e tinyere n'afọ 2007 a kpọrọ Central Bank Act of 2007 megidere ịja mmadụ ego nakwa mmetọ naira.
EFCC kwuru na Cubana Chief Priest metọrọ ego mgbe ọ gara otu mmemme n'Eko Hotel n'ụbọchị 13 nke ọnwa Febụwarị mgbe ọ na-agab egwu n'elekere abụọ.
Ọzọ bụkwa mgbe ọ na-agba eguw n'otu mmemme n'afọ 2020 na Legos.
Nke ikpeazụ bụ na mmemme ọzọ mere n'ọnwa Jenụwarị afọ a ebe ọ na-agba egwu n'elekere abụọ.
Omume a niile bụ nke EFCC kwuru na o megidere iwu CBN nke afọ 2007.
Cheta na EFCC ji iwu a tụ onye a ma ama bụ Bobrisky nga ọnwa isii n'abalị ole na ole gara aga.
Ụlọọrụ
na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Kano Steeti ekwuola na ya agbaala akwụkwọ
ọhụrụ megide aka chiburu Steeti ahụ bụ Abdullahi Ganduje n’ihi nrụrụakaego na ọchịchị
ọjọọ.
Onyeisioche
ụlọọrụ ahụ bụ Muhuyi Magaji kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 16 Eprel 2024 n’ihe
omume ụlọọrụ mgbasaozi Channels.
Dịka o siri
kwuo “Ihe a na-eme ugbua ka bụ mmalite ya. Dịka m na-ekwu okwu ugbua, anyị
na-enyocha ebubo metụtara ego ọchịchị ime obodo dị ijeri Naịra 51.3 bụ nke ewepụrụ
n’akpaego gọọmenti ma kwụbanye n’akpaego mmadụ nkịtị.”
Magaji boro
gọọmenti Ganduje ebubo ịwepụ otu ijeri Naịra n’akpaego gọọmenti Kano Steeti dịka
ọ fọdụrụ naanị otu ọnwa ka ọ pụọ n’ọkwa ọchịchị na Mee 2023 mana ego ahụ bụ nke
ezigara n’aka ndị mgbanwerịta ego ‘Bureau de Change’ na-abụghị maka ọrụ okporoụzọ
eji mawapụta ya.
Ọ gara n’ihu
sị “anyị nwere okwu banyere ijeri Naịra 4 e sitere n’akpaego Kano Steeti zigaa
n’ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ubi. Okwu ndị a niile nọcha n’ihu ụlọikpe.”
Magaji
kwuru na ọ bụ eziokwu na Ganduje họpụtara ya dịka onyeisioche ụlọọrụ ahụ, na ya
agaghị ala azụ iwepụ okwu ọbụla metụtara ime nrụrụaka nke gọọmentị ahụ pụrụ apụ
n’ụlọikpe.
Ọkụ agbaala ọdụ mgbanwe ngwaahịa na Copenhagen, Denmark
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Ọkụ agbaala ọdụ mgbanwe ngwaahịa na Copenhagen, Denmark
Borson na-agba
ọkụ ugbua bụ otu n’me ụlọ kachasị dị ochie na Copenhagen, Denmark ma bụrụkwa ụlọ
ebe ndị mgbanwe ego jiri mere ọnọdu.
Onye ọbụla
nọ n’ime ụlọ ahụ gbapụrụ ọsọ mana ndị mmadụ na agba mbọ ka ha nwee ike iwepụta ihe
dị mkpa dị n’ime ya.
Minista
na-ahụ maka omenala bụ Jakob Engel-Schmidt kwuru na ụlọ ahụ agbaala afọ 400 ma
kwuo na otu ihe nketa ọdịnaala Danish agbaala ọkụ.
E kwuru na
arụrụ ụlọ ahụ ihe dịka afọ 1625. Ọ dị nso n'ụlọomeiwu Denmark dị na Folketing
na obieze Christianborg.
A na-arụzigharị
ọdụ mgbanwe ngwaahịa ochie ahụ. E ji mkpuchi plastik were kpuchie ya. Ndị ụlọọrụ
azụmaahịa Danish kwabanyere n’ime ya ọhụrụ.
Onye omenka
n’obodo ahụ bụ Henrik Grage gwara Danish TV na ọ bụ ụbọchị dị mwute. "Nke
a bụ Notre Dame anyị," ka o kwuru, jiri ya tụnyere ọkụ nke repịara elu ụlọ
nke katidral dị n'etiti Paris n’afọ 2019.
Ndị
na-agafe agafe sonyeere ndị ọrụ gbatagbata tinyere onyeisi ụlọọrụ azụmaahịa
Brian Mikkelsen n’ime ka ọkụ ghara ịgbacha ihe niile dị na Borson.
Eze Denmark
bụ Christian IV meghere ụlọ mgbanwe ngwaahịa ahụ ka o nye aka tụgharịa
Copenhagen ka ọ bụrụ nnukwu ogbe azụmaahịa.
Ndị asụrụ mma n’ụlọụka Sydney bụ mwakpo ndị na-eyi ndụ egwu – ndị uweojii
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ndị ọchịchị ajụla ugboro ugboro ịkpọ aha okpukperechi onye mwakpo ahụ
Ndị uweojii
mba Sydney ekwupụtala ndị ejiri mma sụgbuo n’ụlọụka dị na Sydney n’ụbọchị Mọnde
dịka agwa iyi ndụ egwu ndị okpukperechi kwadoro.
A nwụchiri
nwata nwoke gbara afọ 16 n’oge awakpochara onye bishọpụ, ụkọchukwu na ndị na-aka
ụka n’oge a na-ahazi ofufe nron’ụlọụka ‘Assyrian
Christ The Good Shepherd Church’.
Ndị uweojii
kwuru na opekata mpe, mmadụ anọ nwetara ihe mmerụahụ ‘na-agaghị egbu ha egbu’.
Onye mere mwakpo ahụ nwetakwara ihe mmerụahụ.
Njinji ahụ
bụ nke esetere n’ihe onyonyoo na-egosi ka ofufe nro si aga dịka nke ahụ kpaliri
ọgbaaghara n’obodo ndị e nwere na Wakeley.
Nnyocha ka
na-aga n’ihu mana ndị uweojii kwuru na afọ juru ha n’ihi na okwu a bụ nke
gbasara imefe ihe oke n’ihi okpukperechi.
Ndị ọchịchị
ajụla ugboro ugboro ịkpọ aha okpukperechi onye mwakpo ahụ.
Ihe
onyonyoo mwakpo ahụ nakwa ihe ndị ọzọ mere n’oge emechara ya fesara ọkụ ọkụ n’ọbaozi
‘social media’ n’abalị Mọnde bụ nke mere ka igwe mmadụ iwe juru obi jupụta n’ụlọụka
Assyrian Orthodox Church.
Ndị uweojii
abụọ merụrụ ahụ dịka otu n’ime ha sụwara agba n’oge mgbaaja na-ada ada tụtara
ya, ebe ụgbọala ndị uweojii 10 bibikwara.
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Praịm Minista bụ Anthony Albanese akpọọla nzukọ ndị ọrụ nchekwa na Sydney
Ọnọdụ ahụ
tinyekwara ụjọ n’ime ndị nlekọta ahụike dịka ha tụrụ egwu banyere nchekwa ha n’ime
ụlọụka ahụ.
Praịm
Minista bụ Anthony Albanese akpọọla nzukọ ndị ọrụ nchekwa na Sydney dịka ọ kọwara
mwakpo ahụ dịka nke “na-amapụ obi.”
O kwuru sị “Anyị
bụ mba hụrụ udo n’anya... Anyị enweghị ohere maka ọnọdụ tigbuo zogbuo.” Dịka ọ
na-agba mbọ ịkwụsị ọnọdụ ahụ ịga n’ihu, ọ gbara ndị obodo ya ume ka ha ghara “itinye
iwu n’ọbọaka nke onwe ha.”
N’oge ọ
na-agwa ndị ọrụ mgbasaozi okwu n’ụtụtụ Tuzde 16 Eprel 2024, kọmịshọna ndị
uweojii na New South Wales bụ Karen Webb sịrị na bishọpụ na onye ụkọchukwu ahu na-agabiga
ọwụwa ahụ dịka ha nwere “chi ọma ị dị ndụ.”
Ya bụ ụlọụka
ekwupụtala aha ụkọchukwu ahụ dịka Father Isaac Royel ebe nke bishọpụ bụ Mar
Mari Emmanuel. Bishọpụ Emmanuel bụ onye e tere mmanụ n’afọ 2011. A na-ahụta ya
dịka otu n’ime ndị a ma ama ebe ekiriela okwuchukwu ya karịa ugboro otu nde n’ọbaozi
‘social media’.
Ndịisi agha Isreal aṅụọla iyi ịwakpo mba Iran na nzaghachị ogbunigwe ọ tụrụ ha
‘Inflation’ agbagoola pasenti 33.2 n’ọnwa Maachị
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ihe a bụ nke kachasị elu Naịjirịa na-ahụta kemgbe ihe ruru afọ iri atọ
Ulọọrụ ‘National
Bureau of Statistics’ (NBS) ekwuola na Ịrị elu nke ọnụ ngwaahịa Naịjirịa n’afọ
2024 agbagoola pasenti 33.2 n’ime ọnwa Maachị, dịka nke a gosiri na ngwaahịa
jiiri pasenti 1.5 rịa elu ọ bụrụ ma eji ya tụnyere nke ọnwa Febụwarị.
Ihe a bụ nke
kachasị elu Naịjirịa na-ahụta kemgbe ihe ruru afọ iri atọ.
Ịrị elu n’ọnụahịa
ihe oriri dịka achịcha, mmiri ara ehi, nri ndị gbara na mkpụrụ, akwa, anụ, akwụkwọ nri na nri ogbe bụ ya na-akpalite iri elu n’ọnụ ngwaahịa.
Ụgwọ ọkụ latrik na-arị elu sokwa akpalite ịrị elu nke ọnụ ngwaahịa dịka ọtụtụ mmadụ
na-emefu ọtụtụ ego iji kwalite usoro mmepụta ngwaahịa ha tinyere ịgbaara ngwaahịa
ha ụgbọ gburugburu Naịjirịa.
N’agbanyeghị
na akwụkwọ ego Naịra enwetatụla ume, ikike ya anaghị egosi n’ọnụ ngwaahịa.
Naịra
enwetala ume n’ebe Dọla nọ dịka o ruchara Naịra 1,825 maka otu Dọla n’ihe karịrị
otu ọnwa gara aga, bụ nke mere ka ogogo ịkụ afọ n’ala ya ruo ihe dịka pasenti
70.
Ọzọkwa, ụlọakụ
etiti Naịjirịa bụ ‘Central Bank of Nigeria’ (CBN) buliri ego mgbazinye ugboro
abụọ n’ime ọnwa abụọ gara aga iji belata ohere mmadụ nwere inweta ego ma belata
ọnụ ngwaahịa na-arị elu, mana enwebeghị uru ọbụla ahụtara n’ime ha.
Akụnaụba
kachasị baa ụbara na mba Afrịka na-agabiga ọnọdụ akụnaụba kachasị njọ na ndụ ya
bụ nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ogbenye, mee ka ntọrọmmadụ kawanye njọ n’akụkụ
mba ahụ dị iche iche.
Na mbọ ya ịwepụ
ego eji ebelata ụgwọ ọkụ latrik ma kwalite nchekwa ego, gọọmenti nọọrọ n’izuụka
abụọ gara aga jiri ihe karịrị pasenti 300 bulie ụgwọ ọkụ latrik maka ụfọdụ ndị ji
ya eme ihe, dịka nke ahụ metụtara mkpataego ụmụ mmadụ.
Ọtụtụ ụmụafọ
Naịjirịa bụ ndị na-enweghịkwa ike ịzụtanwụ ihe mana gọọmenti kwenyere na atụmatụ
ndị a ga-enye aka mee ka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa kwụrụ n’ụkwụ ya ọzọ.
Ka ọ dị
ugbua, a na-agbanwerịta Naịra 1,140 maka otu Dọla.
'E letaghi ya anya ruo mgbe ọ nwụrụ' - Ụlọikpe ekpebiela na ikpe amaghị Dowen college n'ọnwụ Sylvester Oromoni
Ebe foto si, Dowen College
Ọkaikpe na-eleba anya n'ọnwụ Sylvester Oromoni bụ nwata nwoke dị afọ 12 nwụụ n'afọ 2021 ekwuola ihe gburu nwata ahụ.
Ọkaikpe Mikhail Kadiri kwuru ụbọchị Mọnde na ọnwụ Oromoni bụ ihe a gaara ịgbalarị ma ọ bụrụ na nne ya na nna ya haziri onwe ha nke ọma.
Akụkọ pụtara n'ọnwa Novemba afọ 2021 na Sylvester Oromoni bụ nwatakwụkwọ Dowen College dị na Legọs nwụrụ n'ụlọakwụkwọ ahụ n[ebubo na ndị tọrọ ya n'ụlọakwụkwọ mekpara ya ahụ dị egwu nakwa na ha nwara ịrabanye ya n'otu nzuzo.
Ọkaiwu Kadiri kwuru na Sylvester anataghị ezigbo nleta oge ihe ahụ mere bụ nke butere ọnwụ ya.
O kwukwara na ndị ụlọọgwụ agbalịghịkwa maka na nleghara anya ha leghara ya sokwa bute ọnwụ nwata nwoke ahụ.
"Ha ebughi ya ga ụlọọgwụ ruo ụbọchị nwatakịrị ahụ nwụrụ bụn'abalị 30 ọnwa Nọvemba afọ 2021. Ha gbaghara nwatantakịrị ahụ tuo ihe ruru elekere 32 ọ nọ n'arịrị", ka ọkaiwu ahụ kwuru.
Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye pati 'APC' na ‘Ward’ ya
Ebe foto si, ABDULLAHI GANDUJE
Nkọwa foto, Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye otu APC na ‘Ward’ ya
Akwụsịtụla
onyeisioche ‘All Progressives Congress’ (APC) bụ Abdullahi Ganduje ị bụ
onye pati ahụ na wọọdụ ya dị n’okpuruọchịchị Dawakin Tofa na Kano Steeti.
Ndị isi ọchịchị
wọọdụ Ganduje nke onyeisioche ya bụ Haruna Gwanjo kpuhere nke a n’oge ọ na-agwa
ndị ọrụ mgbasaozi okwu na Kano n’ụbọchị Mọnde 15 Eprel 2024.
Gwanjo sịrị
na Ganduje, onye bụụrụ aka na-achị Kano Steeti kwesịrị ịgọpụ onwe ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya banyere akwụkwọ ego Dọla.
Cheta na ụlọikpe ukwu dị
na Kano nọọrọ n’abalị 9 Eprel 2024 tinye abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a
ga-ekpe Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi
ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.
Idemmiri egbuola ihe ruru mmadụ 60 n’ime izuụka abụọ
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Ọnọdụ ahụ kachasị metụta ndị bi n’akụkụ osimiri na mba ahụ
Ndị ọchịchị mba Tanzania ekwuola na ihe ruru mmadụ iri isii anwụọla kemgbe oke mmiri ozuzo malitere n’ọnwa
Eprel tinyere oke idemmiri a hụtara n’ọtụtụ akụkụ mba ahụ.
Ọnụ
na-ekwuru gọọmenti Tanzania bụ Mobhare Matinyi kwuru n’otu ozi o zipụrụ n’ụbọchị
Sọnde na ọnọdụ ahụ kachasị metụta ndị bi n’akụkụ osimiri na mba ahụ dịka oke
idemmiri bibiri ọtụtụ ubi n’ebe ahụ.
“A hụrụ oke idemmiri na mpaghara osimiri bụ ebe mmadụ iri na otu nwụrụla ka ọ dị ugbua,” ka Matinyi gbakwunyere.
Dịka o siri
kwuo, enwetala ozi banyere ọnwụ mmadụ iri ise na asatọ na mba ahụ ka ọ dị ugbua
n’ihi oke idemmiri.
N’ụbọchị
Fraịde gara aga, ụmụakwụkwọ asatọ nwụrụ oge ụgbọala ha danyere n’olulu
idemmiri dị na mpaghara ugwu mba ahụ.
Ọ bụ n’ọnwa
Eprel ka udummiri na-aka njọ na mba Tanzania dịka ahụtaraala nnukwu mmiri ozuzo
kachasị njọ n’afọ a.
Otu mbaụwa ‘UN’
kwuru na ọnọdụ ọjọọ ahụ butere opekata mpe ọnwụ mmadụ 13 dịka ihe ruru mmadụ
15,000 gbapụrụ n’ụlọ ha na mba Kenya.
Gọọmentị Naịjirịa arịọla ka udo chịa n'etiti Iran na Isreal
Ebe foto si, Bola Tinubu/X
Gọọmenti
etiti Naijiria akpọla oku banyere nsogbu were ike ị puta na ogu Iran na Israel
dika mkparita ụka udo na-aga n’iru n’ogige ahu.
Okwu
sitere na ministri na-ahu maka mmeko mba na mba ubochi ụka kpọkuru mba niile ka
ha nyere aka nweta udo and nchekwa n’uwa niile.
Oku ahụ
ha kpọrọ bụ maka mwakpo mba Iran wakporo Israel n’abali satọde mgbe ha turu
ogbunigwe mmegwara maka ogbugbu ndịisi agha obodo ha n’ụlọ nnọchiteanya ha dị
na Syria n'ubochi mbu n’onwa Eprel.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị agha amalitela nyocha banyere ndị otu ha a sị kugburu mmadụ n'Abia
Ebe foto si, HQ Nigerian Army/Facebook
Onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Taoreed Lagbaja enyela iwu `ka enyochaa ọnwụ otu onye nlekọta ụlọoriri dị n'Abia steeti.
Akụkọ kwuru na nwoke ahụ aha ya bụ Achimugwu James Etubi nwụrụ n'aka ndị agha kpụpụrụ ya n'ogige ha dị n'Umahia maka onye otu ha bụ Emmanuel Onyemereche nke mmiri riri n'ụlọ oriri ahụ.
"Echiche na-eche anyị maka etu ụfọdụ ndị otu anyị si akpa agwa metụtara ọnwụ otu onye nlekọta ụlọ oriri n'Abia" bụ ihe ha kwuru n'ozi ahụ.
O kwekwara ụmụ Naịjirịa nkwa na ha ga-eme ihe niile ịhụ na ikpe mkwụmọtọ ga-esi n'okwu a pụta ma kwukwaa na ha ga-eziputa ozi gbasara mpụtara nyocha a ha na-eme.
Otu onye gwara BBC na Onyemereche gara igwu mmiri n'ọdọ mmiri dị n'ụlọoriri ahụ n'agwaghị onye ọbụla ma kwukwaa na ọ bụ n'abalị ka ọ gara ebe ahụ.
Kepu kepu na-ekwu na ndị uweojii nke imeụlọ ndị agha anwụchiela ndị aka ha dị n'ọnwụ nwoke ahụ bụ Achimugwu mana o nwebeghi ihe ndị agha kwuru maka ya.
Otu nwoke ji mma sụgbuo mmadụ anọ na onwe ya n'obodo Sydney
Ebe foto si, Supplied
Ndị uweojii n'Australia ekwupụtala na nwoke ahụ ji mma gbuo mmadụ isii
ma gbuo onwe ya n'ọdụ ahịa na isi obodo Sydney bụ Joel Cauchi.
N'ubọchị Satọdee, Joel Cauchi ji mma gbuo umunwanyị ise na otu nwoke ebe
otu nwatakịrị na ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Ndị uweojii kwuru na ọ dịka Joel bụ onye na-arịa ọrịa metụtara echiche nke a kpọrọ 'mental health'.
Kọmishọna ndị uweojii na mpaghara Saụt Wales bụ Karen Webb gwara ndị
ntaakụkọ na agwa Joel bụ ihe ha na-enyocha ka e wee chọpụta ihe kpatara ya.
Joel Cauchi bụ onye ndị uweojii maara mana ha anwuchibeghi ya na mbu.
Ndị ezinaụlọ ya kọwara na Joel na-arịa ọrịa metụtara echiche kamgbe ọ bụ nwata ma kwuo na agwa ahụ ọ kpara bụ ihe ịtụnanya nye ha.
Pope Francis adọọla aka na ntị maka ọgbaghara dịka Iran tụrụ Isreal ogbunigwe
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Francis kwupụtara nwute ya
na mwakpo ahụ Iran wakporo Israel nke ọ kwuru na o nwere ike igbute ọgbaghara
na mpaghara ahụ.
“Ana m arịọ ka a kwụsị ihe ọbụla nwereike ibute ka ọgbaghara kawanye njọ
na mpaghara Middle East” ka Pope na mgbasaozi ya n’ụbọchị Sọnde na St. Peter’s
Square dị na Vatican.
Pope Francis kpọkuru ndịisi mbaụwa ka ha bụrụ ndị chọrọ ma na-akwado udo
na ezi ọganihu.
Ọ rịọrọ arịrịọ ka obodo niile kwado mba Israel n'oge ihe isi ike agha a,
ma rịọkwa ka e zite enyemaka nye na-ata ahụhụ na Gaza n’ihi nsogbu ha na mba
Isreal na-enwe.
Ị ga-enweta akwụkwọ njirimara gị site na ụlọakụ gị - Gọọmentị Etiti
Ebe foto si, NIMC
Ụlọọrụ 'National Identity Management Commission' (NIMC) ekwuola na a ga-enye ndị na-achọ akwụkwọ njirimara onye nke Bekee kpọrọ "National Identity card" site n'ụlọakụ ha.
NIMC kwuru na ha na ndị ụlọọrụ Nigerian Interbank Settlement System (NIBSS) na-arụkọ ọrụ ịhụ na ndị mmadu nwetara akwụkwọ njirimara ahụ.
Ozị ha wepụtara n’akara ọbaozi X ụbọchi Fraide, kwuru na inye akwụkwọ njirimara a ga-esoro usoro dị n’ịwu e ji enye kaadị ATM.
Ha mere ka amata na ndị chọrọ akwụkwọ njirimara ahụ bụ atụmatụ AFRIGO weputara nke NIBSS kwadoro, ga eji NIN ha nwete ya sitee na potalụ ụlọ ọrụ NIMC, ma ọ bụ n’ụlọ akụ ha."
Lee ihe ịkwesiri ịma banyere akwụkwọ njirimara ọhụrụ a:
1. akwụkwọ njirimara ọhụrụ ‘National ID Card’ bụ epekele kaadị na-eme ọtụtụ ihe a kpọrọ ‘General Multipurpose Card’ (GMPC), ga-ewepụ nsogbu ịjị ọtụtụ kaadị.
2. Ị ga ejị GMPC kaadị a mee otutu nke gunyere inwere ma-ọbụ tinye ego, inwete enyemaka gọọmentị na ịme njem.
3. Ọlụ ọrụ National Identity Management Commission, ụlọ akụ etiti naijiria ‘Central Bank of Nigeria’ na ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmekọ ụlọ akụ bụ ‘Nigerian Interbank Settlement System na-arụkọ ọrụ iji mee ka nka a pụta ihe.
4. Ọ bụ ụlọ ọrụ AFRIGO weputara atụmatụ a nke ulọ ọrọ NIBSS kwadoro.
5. Ndị chọrọ inwete kaadị ahụ ga-eje n’potalu ụlọ ọrụ NIN n'ịntanetị, ụlọ ọrụ NIMC ma ọ bụ ụlọ akụ ha dị iche iche.
6. A ga-enyefe akwụkwọ njirimara ahụ site n'ụlọ akụ dị iche iche nke ndị nke ga-esoro usoro dị n’ịwu eji enye Debiti na kredit kaadị ụlọ akụ.
Naịjirịa abụrụla mba mbụ alitere ịgab ọgwụ mgbochi Meningitis ọhụrụ – WHO
Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa abụrụla mba mbụ na mbaụwa ga-amalite ịgba ọgwụ mgbcohi Meningistis a kpọrọ Men5CV.
Otu na-ahụ maka ahụike na mbaụwa bụ WHO kwuru na nke a bụ ihe gbawara ndekọ n'ụwa.
WHO kwuru na nke a dị mkpa karịa maka na o nwere ụdị meningitis dị icheiche dị.
A na-agba ọgwụ ahụ etu e si agbakwa ọgwụ mgbochi meningitis A (MenAfriVac®) bụ ihe e jiri chụọ ọrịa meningococcal A ọsọ na Naịjirịa.
Ọgwụ mgbochi ahụ na nkesa ya bụ ndị ụlọọrụ Gavi, otu na-enye aka ikesa ọgwụ mgbochi dị icheiche maka meningitis nye mba ndị akụnaụba ha na-esichaghị ike na mbaụwa.
WHO kwuru na ọgwụ mgbochi ahụ ga-enye nchekwa nye nje meningococcal (A, C, W, Y na X) n'otu ọgbụgba. Ụdịrị nje ise ndị a na-ebute meningitis na nsị n'ọbara.
Ha kwuru na nke a na-enye nchekwa gbasara agbasa karịa ọgwụ mgbochi nke a na-agba n'Afrịka ugbua na-egbochi naanị ụdịrị A.
Naịjirịa so na mba 26 kacha enwe meningitis n'Afrịka.