A na-achọ ịmalite ntuliaka n'Agulu
A na-akwado ịmalite usoro nnyocha ndị ga-atụ vootu n’ogige ntuliaka PU 023 dị na Model Primary Health Care Center Agulu.
Ndị ọrụ INEC na-egosipụta ngwa ntuliaka ma na-akụziri ndị mmadụ etu ha ga-esi tụọ vootu ha.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe niile i kwesiri ịma banyere ntuliaka ọkwa Gọvan Anambra Steeti 2025
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
A na-akwado ịmalite usoro nnyocha ndị ga-atụ vootu n’ogige ntuliaka PU 023 dị na Model Primary Health Care Center Agulu.
Ndị ọrụ INEC na-egosipụta ngwa ntuliaka ma na-akụziri ndị mmadụ etu ha ga-esi tụọ vootu ha.
Ndị mmadụ na-azụ ma na-erekwa ahịa na mpaghara dị iche iche n'Anambra steeti.
Nke a bụ n'agbanyeghị iwu e nyere ka a ghara ime ngagharị gburugburu steeti ahụ n'ihi ntuliaka.
E bupụla ngwa ntuliaka n’isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Dunukọfịa ma buru ha gawa na wọọdụ dị iche iche kemgbe ụnyaahụ.
A ga-esite na wọọdụ ndị ahụ kesaa ha n’ogige ntuliaka dị iche iche n’ụtụtụ a.
Ndị ọrụ enyemaka INEC erutela n’ogige ntuliaka PU 019 Ụmụdimakasi dị n’Amatutu Agụlụ n’okpuru ọchịchị Anaọcha n’Anambra steeti.
Ọ bụ n’ogige ntuliaka a ka a tụrụ anya na Maazị Peter Obi ga-atụ vootu nke ya.
Ndị ọrụ enyemaka INEC agaruola n’ogige ntuliaka PU 015 dị n’ụlọezumezu Amatutu, tinyekwara PU 023 dị na Model Primary Health Care Center Amatutu Agulu dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha n’Anambra steeti.
N’Ukpo Ward 1 dị n’okpuru ọchịchị Dunukọfịa, e butela ngwa ntuliaka dịka ndị ọrụ INEC na ndị chọrọ ịtụ vootu nọkwa ebe ahụ.
Ndị ọrụ INEC kwuru na ntuliaka ga-amalite mgbe ọ ga-eji ọkara gaa elekere asatọ nke ụtụtụ.
Ndị chọrọ ịtụ vootu abịaruola n'ogige ntuliaka PU 019 Ụmụdimakasi, Amatutu dị n'Agulu.
Ha na-echezi ka ndị ọrụ INEC malite ntuliaka.
Osote Onyeisi ndị uweojii bụ Benjamin Okolo ekwuola na ya nọ n’Anambra steeti ịnọchite anya Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun.
Maazị Okolo kwupụtara nke a oge ndị ntaakụkọ BBC Igbo na-agba ya ajụjụ n’ụbọchị Fraịde 7 Nọvemba 2025, dịka a na-akwado maka ntuliaka ọkwa gọvanọ ga-adị n’ụbọchị Satọde 8 Nọvemba 2025.
O kwuru na ndị uweojii enweela mkparịtaụka, ha na ndị niile na-azọ ọkwa gọvanọ, ndị nnọchiteanya pati dị iche nakwa ndị niile ọnụ na-eru n’okwu.
Okolo kọwara na ihe niile na-aga n’ụzọ kwesịrị ekwesị na steeti ahụ ugbua.
Ọ gara n’ihu rịọ ndị Anambra steeti ka ha wezuga onwe ha n’ihe ọbụla pụrụ ibute nsogbu na ọgbaaghara n’oge ntuliaka iji zere ntaramaahụhụ ndị ga-esochi ya.
BBC Igbo gagharịrị iji chọpụta ọnọdụ ahịa dị iche iche n'Anambra Steeti dịka a na-akwado ime ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025.
Ozi si n'ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) ewepụtala ọnụọgụgụ wọọdụ nakwa ogige atụmvootu( polling unit) ole e nwere n'okpuru ọchịchị 21 dị n'Anambara Steeti.
Lee ka ọnụọgụgụ a si kwụrụ:
Okpuru Ọchịchị Aguata nwere wọọdụ 20 ebe ogige ịtụ vootu 'polling unit' dị 342, Anyamelum nwere wọọdụ 15 na ogige 'polling unit' 191, Anambra East dị wọọdụ 15 na ogige 'polling unit' 241, Anambra West wọọdụ 10 na ogige 'polling unit' 164, Anaocha nwere wọọdụ 19 na ogige 'polling unit' 320, Awka Nọt wọọdụ 14 na ogige 'polling unit' 150, Awka Saụt wọọdụ 20 na ogige 'polling unit' 390, Dunkofia dị wọọdụ 14 na ogige 'polling unit' 165 ebe Ekwusigo nwere wọọdụ 12 na ogige 'polling unit' 193.
Idemili Nọt nwere wọọdụ 12 na ogige 'polling unit' 467, Idemili Saụt nwere wọọdụ 12 na ogige 'polling unit' 243, Ihiala bụ wọọdụ 20 na ogige 'polling unit' 323 dị n'ime ya, Njikoka nwere wọọdụ 18 na ogige 'polling unit' 231, Nnewi Saụt wọọdụ 20 na ogige 'polling unit' 297 ebe Nnewi Nọt nwere wọọdụ 10 na ogige 'polling unit' 318.
Ogbaru wọọdụ 16 na ogige 'polling unit' 383, Onitsha Nọt wọọdụ 15 na ogige 'polling unit' 313, Onitsha Saụt wọọdụ 17 na ogige 'polling unit' 321, Orumba Nọt wọọdụ 18 na ogige 'polling unit' 253, Orumba Saụt nwere wọọdụ 18 na ogige 'polling unit' 208 ebe Oyi nwere wọọdụ 15 na ogige 'polling unit' 207
Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) kwuru na mmadụ 2,802,790 debanyere aha ya maka ịtụ vootu na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti a ga-eme n'ụbọchị Satọde Nọvemba 8, 2025.
A na-atụ anya na ihe ruru pasentị 30 n'ime ndị a debanyere aha ha ga-apụta ma tụọ vootu ha n'ụbọchị Satọde.
A ga-eme ntuliaka n'ogige ntuliaka 5,720 dị na wọọdụ 326 n'okpuru ọchịchị 21 dị n'Anambra steeti.
Mmadụ ole na-azọ ọkwa na ntuliaka a?
Ọ bụ mmadụ 16 na-azọ ọkwa Gọvanọ na ntuliaka a.
Ha gụnyere Gọvanọ Charles Soludo nke pati APGA, Nicholas Ukachukwu nke pati APC, George Moghalu ji Labour Pati, Onyeeze Chidi Charles nke Accord pati, Nweke Japhet nke Action Alliance pati, Nwosu Chioma John pati African Democratic Congress, Jude Ezenwafor nke pati PDP, Okeke Chika Jerry nke Boot Party nakwa Onyejegbu Geoffrey pati New Nigeria People's Party.
Ndị ọzọ gụnyere Ndidi Christy Olieh nke pati National Rescue Mission, Chukwurah Vincent nke Social Democratic Party, Chukwuma Paul Chukwuka nke Young Progressive Party, Ifemeludika Chioma nke pati African Action Congress, Otti Cyprian Echezona nke pati Allied Peoples Movement, Nweke Christopher nke pati Action Peoples Party, na Ugwoji Uchenna Martin nke Zenith Labour Party.
Gọọmenti Anambra steeti akpọọla oku ka ọhanaeze pụta n’igwe ma binye aka na ntuliaka ọkwa gọvanọ n’ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025.
Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n’Anambra steeti bụ Law Mefor kwuputara nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchị Fraịde ma kwuo na ọ dị mkpa ka onye ọbụla nwere akwụkwọ vootu PVC bịa sonye na ntuliaka ahụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na nke a dị mkpa iji hụ na ihe mere na ntuliaka afọ 2021 emeghị ọzọ.
Cheta na n’ime mmadụ nde abụọ nap uku narị asaa debanyere aha ya ịtụ vootu na ntuliaka ọkwa gọvanọ n’afọ 2021, ọ bụ naanị mmadụ puku narị abụọ n’ime ha binyere aka na ntuliaka ahụ.
Law Mefor kọwakwara mkpa ọ dị ka ọhanaeze sonye na ntuliaka a iji mee ka Anambra Steeti bụrụ steeti e ji ama atụ n’ihe gbasara ntuliaka.
Ọ gwara ọhanaeze ka ha rube isi nye iwu niile banyere ntuliaka ahụ ma ghara ibute ọgbaaghara ọbụla.
Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra Steeti ekwuputala na ụbọchị Fraịde 7 Nọvemba, 2025 bụ ụbọchị ezumike nye ndị ọrụ niile na steeti ahụ.
Akwụkwọ ozi onyeisi ndị ọrụ Anambra steeti bụ Theodorah Igwebe wepụtara mere ka o doo anya na ụbọchị ezumike a bụ iji nyere ndị ọrụ aka kwadoo maka ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-eme n’ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025.
Ọtụtụ ndị uweojii awụchiela n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Amawbia n’Anambra steeti.
Nke a bụ dịka a na-akwadobe maka ntuliaka gọvanọ Anambra steeti n’ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025.
Ndị ntaakụkọ BBC Igbo gbara mbọ ka ha na ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nwee mkparịtaụka, mana nke ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla.
Otu onye uweojii na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị ọrụ ha nọ n’Anambra steeti iji hụ na e nwere udo na ime ihe n’ezi usoro n’oge ntuliaka nakwa mgbe e mechara ntuliaka.
Ụlọọrụ INEC ka na-ekesa akụrụngwa a ga-eji mee ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'Anambra Steeti n'ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025.
Lee ụfọdụ akụrụngwa anyị hụrụ anya.
Ụlọọrụ Independent Nationala Electoral Commision (Inec) amalitela ikesa akụrụngwa a ga-eji mee ntuliaka ọkwa Gọvanọ n’Anambra Steeti n’ụbọchị Satọde Nọvemba 8 2025.
BBC Igbo gara n’ụlọakụ etiti dị n’Awka isiobodo steeti ahụ ebe Inec si ikesa akụrụngwa ndị ahụ.
Akụrụngwa ndị a bụ nke a ga-ekesa n’okpuruọchị 21 dị na steeti ahụ.
Onyeisi ụlọọrụ Inec n'Anambra State Queen Agwu, binyereaka n'akwụkwọ ntuliaka Form EC 8A na form B tupu a malite ikesa ya
Ọtụtụ ndị ntuliaka doro anya, ndị ntaakụkọ nakwa ndị otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị nọ ma na-ahụ etu Inec si ekesa akụrụngwa ndị ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa kwụkwara chịm iji gbochie ọgbaaghara ọbụla n'ogige ahụ.
Dịka ụbọchị ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti na-akpụdobe nso, ndị na-azọ ọkwa na ntuliaka ahụ gụnyere Gọvanọ Charles Soludo nke pati APGA, Nicholas Ukachukwu nke pati APC na ndị ọzọ nọrọ n'ụbọchị Mọnde 3 Nọvemba 2025, binye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta udo na ntuliaka ahụ.
Mmemme ahụ nke e mere n'ogige International Convention Center, Awka isi obodo Anambra Steeti, bụ otu National Peace Committee nke Bishọpụ Hassan Kukah nọ n'isi, bụ nke a chikọbara iji hụ na ndị na-azọ ọkwa ahụ na pati dị iche iche rubere isi nye iwu nakwa usoro e ji eme ntuliaka ahụ.
Bishọpụ Kukah kwuru na nkwekọrịta udo a bụ nke ga-kwalite ọchịchị onyekwuouche ya ma kpọkuo ụlọọrụ INEC ka hazie ntuliaka ahụ dịka iwu si kwuo.
Gọvanọ Charles Soludo ji ohere ahụ kwuo na ọ dị mkpa ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mara na ha niile bụ ụmụnne ma ghara ime ihe ga-eweta ọgbaaghara na ntuliaka.
Gọvanọ Soludo kwuru na o nwere ntụkwasị obi na ụlọọrụ INEC ga-ahazi ntuliaka dịka iwu sịrị kwuo.
N'aka nke ọzọ, onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun kwuru na ndị ọrụ ya kwụrụ chịm ịhụ ma weta ezi nchekwa na udo na ntuliaka ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-arụkọ ọrụ iji hụ na ntuliaka ahụ gara nke ọma.