Osote Donald Trump bụ JD Vance atụọọla vootu ya

Ebe foto si, Getty Images
Osote Donald Trump bụ JD Vance atụọọla vootu ya na Cincinnati, Ohio.
Vance, nwunye ya na ụmụaka bịara ebe ahụ ọ nọ nwee tụọ vootu.
Akụkọ na-egosi etu ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka 2024 si aga
Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji

Ebe foto si, Getty Images
Osote Donald Trump bụ JD Vance atụọọla vootu ya na Cincinnati, Ohio.
Vance, nwunye ya na ụmụaka bịara ebe ahụ ọ nọ nwee tụọ vootu.

Ebe foto si, Getty Images
Amalitela ime ntuliaka na steeti California, Idaho, Nevada na Oregon.
Ka ọ ugbua, ọ bụ naani Alaska na Hawaii ka a na-amalitebeghị ime ntuliaka.
California bụ steeti ọnụọgụ elektọral vootu 54, nke kachasi na mba Amerịka niile. A na-ekwu na ọ bụ steeti otu pati Demokrats nwereike inweta mmeri na ya.
O ge ikpeazụ pati Repụblikan meriri na California bụ n’afọ 1988

Ebe foto si, Getty Images
A ga-emechi ntụliaka agba nke mbụ ma ọ kụọ elekere isii (6pm EST) n’abalị Tuzde ebe agba nke abụọ ga-akwụsị n’elekere mbụ (1am EST) n’ụtụtụ Wenezde.
A nụrụ npụtara ntuliaka e mere oge gara aga n’abalị ụbọchị e mere ntuliaka maọbụ n’ụtụtụ ụbọchị na-esote ya.
N’afọ 2020, a nụrụ npụtara ntuliaka afọ ka abalị anọ gasịrị, ebe npụtara ntuliaka afọ 2016 gbara n’anwụ n’ime awa ole n’ole akwụsịrị ntuliaka.
Npụtara ntuliaka afọ 2012 pụtara ihe n’abalị ụbọchị e mere ntuliaka ahụ.
Mana ntuliaka afọ 2024 bụ nke kpụ ọkụ n’ọnụ, ya mere akụkọ ji kwuo na npụtara ya nwereike inwe ọtụtụ oge tupu a nụ ya.

Ụfọdụ ndị mmadụ apụtawala n’ọgbọ ebe a na-atụ vootu iji họpụta onyeisiala ọhụrụ.
Ụfọdụ bụ na mpaghara New York ebe ndị mmadụ na-atụ vootu ha n’ụlọakwụkwọ Anna SilverElementary dị na Manhattan.
Ebe ọzọ bụkwa na Georgia na Michigan, Pennsylvania ebe a hụrụ ka ndị mmadụ kwụụ n’ahịrị.

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Reuters


Ebe foto si, Getty Images
Ọgbọ ntuliaka mepere na steeti dị iche iche n’ihe dịka elekere isii nke ụtụtụ na mba Amerịka nke bụ elekere iri na abụọ nke ehihie na Naịjirịa.
Ndị mmadụ amalitela ịtụ vootu na steeti dịka Connecticut, Indiana, Kentucky, Maine, New Jersey, New York na Virginia.
N’ime obodo ndị a, steeti New York kachasị nwee ndị na-ahọpụta onyeisiala a kpọro ‘electoral college votes’ ruru 28. Steeti kachasị nwee nke obere bụ Maine dị naanị anọ.

Ebe foto si, Reuters
N’obodo Washington bụ ebe ndọrọ ọchịchị kachasị ekpo ọkụ na mba Amerịka, ọtụtụ ụlọ azụmaahịa mechiri dịka ha na-akwado maka ntuliaka.
Ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa kwụchịm n’ebe di iche iche n’isiobodo Amerịka nakwa steeti ndị ọzọ dịka Alabama, Arizona, Delaware, Iowa, Illinois, North Carolina na New Mexico.
Adịla mbụ jiri igwe mgbochi gbaa isiụlọọrụ gọọmentị bụ ‘White House’ okirikiri na mbido ọnwa Ọktoba – E mekwara nke ahụ n’ụlọ gọọmentị dị iche iche gụnyere DC building, Capitol na ndị ọzọ

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Donald Trump pịachiri oge achụmnta vootu ya, anyị na-ewetere unu mpụtara nke mbụ n’ụbọchị ntuliaka a – ebe Kamala Harris na Donald Trump gbara nhatanha.
E mepere ọgbọ ntuliaka aka mbụ na mba Amerịka n’etiti abalị n’ime obodo dị na mpaghara Hampshire a kpọro Dixville Notch.
A maara obodo a dịka ndị na-eji abalị atụ vootu. Mpụtara ntuliaka ha gosiri na Trump nwere nkewa atọ ebe Harris nwetere nkewa atọ.
Ọtụtụ ọgbọ ntuliaka ndị ọzọ na Hampshire agaghị emepe ruo n’ụtụtụ taa mgbe ndị Amerịka ndị ọzọ tetara n’ụra. Iwu bụ ọgbọ vootu ga-emepe n’elekere 11 nke oge ha nke bụ elekere ise nke mgbede na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Reuters
Kamala Harris bụ osote onyeisiala mba Amerịka so na-azọ ọkwa a ekwuola okwu ikpeazụ iji pịachie oge achụmnta vootu ya.
Okwu ikpeazụ gụnyere arịrịọ ọrịọrọ ndị ntoroọbịanakwa ndị ga-atụ vootu mbụ ha ma gwaa ha na ọ hụla etu ha si akpa ike na obi juru ya afọ dịka ọ sịri ka ha tụnyere ya vootu.
O doro Harris anya na ọ ga-achọ ọtụtụ ọnụọgụgụ vootu ọkachasị nke si n’aka ndị ntoroọbịa ma ọ bụrụ na ọ ga-emeri na ntuliaka a.

Ebe foto si, Reuters
N’aka nke ọzo, Donald Trump mere mgbasaozi ikpeazụ n’achụmnta vootu ya na Steeti Michigan bụ ebe ọ pịachiri nke afọ 2020.
Ọ jụrụ ndị bịara ọgbakọ ha ma ahụ ọ dị ha mma ugbua karịa ka ọ dị n’afọ anọ gara aga, nke ndị ahụ tiri mkpu na nzaghachị.
O kwuru na ozi ya nye ụmụafọ Amerịka bụ na ha ekwesighi ị na-ebi ndụ etu ha si ebi ugbua ma rịọ ka ha tụnyere ya vootu maka mgbanwe.
Ntuliaka mba Amerịka nke afọ a kpụụ nnukwu ọkụ n’ọnụ maka etu ndị na-azọ ọkwa bụ Donald Trump na Kamala Harris si chụọ nta vootu ha.
A na-atụ anya na ntuliaka nwereike ibu okwu n’ụlọikpe dịka ngagharịiwe nwereike ịbụ ihe ịtụ n’anya.
Mana dịka ọ dị ugbua ekeela mba ụzọ abụọ n’etiti ndị kwenyere na Trump maọbụ Harris dịka mpaghara abụọ ga-ezukọ n’ọgbọ ebe a na-atụ vootu iji kwupụta uche n’onye ha chọrọ.
Mana n’ikpeazụ otu onye ga-eturu ugo dịka onye nwere mmeri.
Ntuliaka Onyeisiala mba Amerịka ebirila ọkụ n'ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba 2024.
Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ a ebe ị ga-agụ akụkọ niile banyere etu ntuliaka a si aga nakwa onye na-emeri dịka a ga na-ewepụta mpụtara ntuliaka a.
Buru oche nọnyere anyị maka akụkọ ndị a n'uju.
Daalụ!