Anyị enweghị atụmatụ ịkpọbata ndị gbara ọsọ ndụ n’Ehime Mbano – Gọọmenti Imo steeti

Akụkọ ndị kachasị mkpa na mbaụwa n'ọnwa Sepụtemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Nwaanyị etiela mkpu ka ọ chọpụtara na di ya nyere ya ọgwụike ka ndị ọzọ rịa ya elu n’ike

    Nwanyị tirimkpu ka ọ chọpụtara na dị ya nyere ya ọgwụ ike ka ndị ọzọ rịe ya enu n’ike

    Gisèle Pélicot dị afọ iri asaa na abụọ (72) agwala ụlọikpe etu di ya si nye ya ọgwụike ka ụmụnwoke ndị ọzọ ọnụọgụ ha ruru iri ise na otu (51) rịa ya elu n’ike.

    Gisèle Pélicot bụ onye mba Fransị gwara ụlọikpe na ya na di ya bụ Dominique Pélicot ebiela afọ ịrị ise (50).

    Gisèle boro di ya na ụmụnwoke ndị ọzọ ọnụọgụ ha ruru iri ise na otu (51) ebubo ịma ya elu n’ike.

    Mana akwụkwọ ndekọ ndị uweojii ji na-egosi na Dominique Pélicot bụ nwoke dị afọ ịrị asaa na otu (71) kwetara na ọ bụ eziokwu na ya mere nwunye ya ihe ahụ ma bụrụkwa ihe na-enye ya obi aṅụrị na ya na-ekiri ka ụmụnwoke ndị ọzọ si arị nwunye ya elu.

    Mana ọtụtụ n’ime ụmụnwoke ahụ Gisèle Pélicot boro ebubo gwara ụlọikpe na ha chere na ọ bụ egwuruegwu ka ha na-egwu, na enweghị mgbe ha ji mee ya n’ike.

    Ka Gisèle Pélicot na akọwa ihe mere, o kwuru na e jidere dị ya ebe ọ ji ekwenti na-ese ike nwanyị n’ụlọ ahịa. Mana oge ndi uweoji gwara ya na dị ya bịa na ya chere na ọ bụ maka ihe ahụ omere.

    “Mana ndi uweoji bidoro na-aju m etu m sị ebi ndụ akwamiko. A gwara m ha na m enweghị oge nwoke ọzọ ji rịa m elu ma ọ bu m enwe mmeko adị mmadụ ịtọ eme.

    Na m ama nkwe ka nwoke ọzọ metu m aka” “Mana donye uweoji gwara na ya ga-egosi ihe nwereike ịgbawa m obi. Ogosiri Foto m amaghị nwoke na nwanyị nọ n’elu akwa ma jụọ m, ihe ọ bụ akwa m na-edina?”

    “Ọ tara m ahụhụ ịchọpụta m ịyị akwa n’ụdị m na-amaghị. Oge ahụ ka o gosiri foto ọzọ, nyekwa m nke atọ”.

    “A gwara m ya kwụsị. Nke a gbagwojuru m anya. Obi tiwara m. Anọ m n’elu akwa, nwoke ana ama m elu n’ike. Ndụ m gbasara agbasa”.

    Gisèle Pélicot kwuru ruo oge okwu a pụtara na ya na dị ya bị n’udo. Na ha abụọ ataara ahụ. Na ya gbaghara ya oge e jidere ya maka iji ekwenti seta ike nwanyị.

    “Ugbu a ihe niile anyị jịkọrọ aka ọnụ meputa etisaala. Ụmụaka anyị atọ, ụmụ ụmụaka anyị anọ bụ ndị na-ahụ anyị ka ndị a ga-enyomi”.

    “Ọdị m ka m mie ala. Mana m ga-agwa ụmụ m na ndị uweoji awuchiela nna ha. Agwara m dị nwa m nwanyị ka ọ nọrọ nso oge m gwara ya na nna ha mara m elu n’ike ma mee ka ụmụnwoke ndị ọzọ rịa m elu”.

    Ugbua Gisèle Pélicot chọrọ ka ụlọikpe kewaa ya na dị ya.

  2. Ọhanaeze, Afenifere, NLC, NBA etinyela ọnụ maka mbuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala

    Ọnụahịa mmanụ ụgbọala e buliri elu

    Otu dị icheiche akpọọla oku ka gọọmenti etiti Naịjirịa kwụsị ndị Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL) ibuli ọnụ ego mmanụ ụgbọala site na N617 ruo N900.

    Otu jikọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC), otu ọdịnaala jikọrọ ndị Yoruba bụ Afenifere, na otu jikọrọ ndị ọkaikpe bụ Nigeria Bar Association (NBA) so na ndị kpọrọ oku gwa gọọmenti etiti ka ha kwụsị ibuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    Mana n’aka nke ọzọ, otu jịkọrọ ndị Igbọ bụ Ọhanaeze Ndi Igbo kwuru na ha achọghị itinye ọnụ n’ihe gbasara itinye ego maọbụ ịwepu ego n’ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    Ndị NLC n’akara X soshal mịdịa ha kwuru na ha na-ekwu ka “enweghachịta ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala bụ nke NNPCL buliri elu na mpaghara Naịjirịa niile”.

    Onyeisi Nigeria Bar Association (NBA) bụ Afam Josiah Osigwe n’akara X-soshal mịdịa kwuru na itinye ego n’ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala ga-emetuta onye ọbụla nakwa ọnọdụ akụnụba.

    “Ego a manyere n’ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala ga-akwalita oke agụụ, ụbịam na ihe isi ike bụ nke na-emekpa ụmụ Naịjirịa ahụ ugbua”.

    NBA kwetakwara na gọọmenti were ikike ihazi akụnụba Naịjirịa ma mee ihe na-ataakpụ “mana nke a abụghịzị gọọmenti ime ihe ga-emekpa ndị mmadụ ahụ”.

    “NBA na ahụ ibuli ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala dịka ihe mmadụ agaghị akọwawu ma bụrụ ihe mwute”.

    Mana otu ọzọ BBC Igbo gbara ajuju ọnụ bụ Ọhanaeze ndị Igbo nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnia kọwara na ha achọghị itinye ọnụ n’ihe ọbụla gbasara itinye maọbụ iwepu ego n’ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    “Anyi na ekiri n’anya. Naanị ndụmọdụ ka anyị ga-enye ụmụ Igbo ka ha mara na ihe dị ọkụ ga-ajụ oyi”.

    Alex Ogbonnia rụtụrụ aka na ihe mere Ọhaneze ndị Igbo ji kwuo na ha achọghị itinye ọnụ bụ etu ntụlịaka e mere na 2023 ịhọpụta onyeisiala Naịjirịa si gaa, nke mere na nwaafọ Igbo abanyeghị n’ọchịchị.

  3. Ngagharịịwe adaala n’Ilorin n’ihi oke ọnụ mmanụ ụgbọala

    Ndị na-eme ngagharịiwe n' Ilorin

    Ndị ọkwọ keke, ọkada emeela ngagharịiwe n’isiobodo Kwara steeti bụ Ilorin ụbọchị Tọzde n’ihi mbuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    Ngagharịiwe ahụ dapụtara n’ụtụtụ taa na ntụmadị dịka ndị ọkada na ndị ọkwọ keke gbochiri okporoụzọndị dị mkpa na Ilorin ma jụ na ụgbọala agaghị aga iji gosi iwe ha maka mbuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    Gọọment Etiti buliri ọnụahịa mmanụ ụgbọala site na N617 rue N897 mana n’ Ilorin a na-ere ya agbata ₦1,200 na ₦1,300.

    Ndị na-eme ngagharịiwe n' Ilorin
  4. Ihe bụ uche ndị mmadụ maka mbuli ọnụ mmanụ agbịdị

    Aha onyonyo, Ihe ndị mmadụ chere maka ụkọ mmanụ ụgbọala

    BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ maka ụgwọ mmanụ agbịdị nke gọọmentị etiti buliri site n'ụlọorụ NNPC.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ izuụka gachara kemgbe e nwere ụkọ mmanụ ụgbọala.

    Ụfọdụ mmadụ gụnyere ụlọọrụ NLC, otu Afenifere nakwa onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu akatọọla ya bu mbuli ma gwa gọọmentị etiti ha megharịa ya.

  5. Ọ bụghị anyị zipụrụ ndị na-anakọ ndị nwere "Generator" na "Solar" ego ụtụisi

    Gọvanọ Enugu steeti bụ Peter Mbah agọrọla isi onwe ya

    Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/Supplied

    Gọmenti Enugwu enyela iwu machie ịnakọ ndị mmadụ ego akpọrọ “ Industrial Gas Emission Levy”, ma chụọ ndị niile malitere atụmatụ ahụ n’ọrụ ha.

    N’ozi onye odeakwụkwọ gọọmenti Enugwu bụ professor Chidiebere Onyia wepụtara n’Enugwu, kọwara na ndị e nyere ọrụ ngo ahụ na ministri nke Envirọmentị rụụrụ ọrụ ha gafee ihe gọmenti nyere ha iwu mee.

    O kwuru na nkea kpatara Gọvanọ Peter Mbah jiri kagbuo ọrụ ịnakọ ego ahụ ma chụọ ndị ọrụ ngo ahụ n’ọkwa.

    Nchọpụta gosiri na ihe bụ isi okwu malitere oge gọmenti Enugwu bọlitere iwu” section 4(2) na section 124 nke Enugwu nke akpọrọ “Enviromental and Climate protection Law 2024, nke nyere gọmenti iwu ichekwa ka ndị mmadụ si ewepụta ikuku ọjọọ n’emebi gburu gburu mmadụ.

    Nke mere ejiri guzobe otu ahụ ka achọpọta ka a ga-esi kwụsi ikuku ọjọọ ahụ

    GINI KPATAZIRI NSOGBU N’ETITI NDỊ ỌRỤ GBANỤ GBANỤ AHỤ NA NDỊ ENUGWU?

    Ọ bụzị ihe mgbagwojuanya na ndị Enugwu malitere n'ọnwa gara aga n’enweta akwụkwọ ka onye ọbụla gaa n’ụlọ akụ kwụọ akatamkpi ego maka inwe igwe n’enye ọkụ bụ “Generator” yana ụgwọ maka inwe nke anwụ n’enye ọkụ bụ “Solar” n’ụlọ ha nakwa ụlọ ọrụ.

    Ọ bụzị mkpu ahụ ndị mmadụ tiri na soshal midia butere gọmenti Enugwu jiri kagbuo ya bụ ihe.

    Gọvanọ Mbah nyekwara iwu ka enyeghachi onye ọbụla kwụrụ ụgwọ ahụ ego ya ozigbo ozigbo.

    Ozi ahụ kọwara na ọ bụ ezi onwu na iwu obodo nyere ikike ihụ na gburu gburu dị mma, mana gọọmenti Enugwu ka na atịkọ isi ọnụ, na enyebegji onye ọbụla ikike nakọba ego.

  6. Rebecca Cheptegei anwụọla dịka enyi ya nwoke mụnyechara ya ọkụ

    Rebecca Cheptegei

    Ebe foto si, Alamy

    Onye egwuregwu Rebecca Cheptegei anwụọla dịka abalị olemaole gachara enyi ya nwoke wụrụ ya mmanụ ụgbọala mụnye ya ọkụ dịka ndị isi na mba Yuganda si kwuo.

    Cheptegei dị afọ 33 bụ ọgbọsọ so zọ ọla na Paris nọ n'ọnọdụ ọjọọ dịka ọkụ gbariri ahụ ya niile dịka awakpochara ya n'ụbọchị ụka.

    Ndị hụrụ ebe ihe mere na mpaghara ugwu Kenya ebe Cheptegei bi kwuru na ọ bụ mgbe o si ụlọụka alọghachite ka nwoke ahụ chechiri ya n'ụzọ ma wakpo ya.

    Mkpesa nke otu ndị isi obodo ebe ahụ mere gosiri na ọ bụ ala na-esere ha abụọ okwu dịka ndị uweojii na-ekwu na nyocha gbasara ya bụ okwu na-aga n'ihu.

    Ndị mmadụ na-echekasị maka etu e si awakpo ndị egwuregwu ndị nwaanyị na mba Kenya dịka ọtụtụ nwụrụla site na ya bụ ihe.

    Akụkọ kwuru na enyi ya nwoke ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ dịka ọkụ merụrụ ya n'onwe ya ahụ mgbe ọ munyere nwaanyị ahụ ọkụ.

    Ezinaụlọ ya ekwuputebeghi ozi ọnwụ ya mana Dọkịta Owen Menach onyeisi ụlọọgwụ nkuzi Moi dị n'Eldoret ebe ebugara Rebecca gwara ndị ntaakụkọ na ọ nwụrụ dịka ngwa ime ahụ ya niile kwụsịrị ịrụ ọrụ.

  7. Ndị ọrụ nchekwa ejịkọla aka ịchọpụta ndị wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steeti

    Ndị ọrụ nchekwa

    Ebe foto si, Imo Police Command

    Kọmịsọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma na ndị isi ọrụ nchekwa ndị ọzọ na steeti ahụ ejikọọla aka ịnyochapụta ndị omekome wakporo ụlọọrụ okpuruọchịchị Isiala Mbano nakwa ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Obowo.

    N'ozi nke Henry Okoye bụ ọnụ na-ekwuru ha weputara, ọ sị na ndị ahụ echeere bụ ndị otu Ipob bịara n'igwe ha ma malite ịkwa mgbọ, ịtụ ogbunigwe nakwa imebisi ihe n'ụlọ ndị kwụ ebe ahụ.

    "A nwara ịkwasa ndị ahụ mgbọ mana ọ mịtaghị mkpuụrụ dịka ndị ọrụ nchekwa obodo abụọ nakwa otu onye uweojii nwụrụ na ya bụ ihe" ka ozi ahụ kwuru.

    Onyeisi ndị agha na steeti ahụ bụ Øchiagha UA Lawal. onyeisi ndị agha mmiri bụ MB Salisu, Onyeisi ndị NSCDC bụ Matthew Ovey, onye nọchiri anya onyeisioche Isiala Mbano bụ Chika Okirike na ndị ọzọ katọrọ ya bụ ihe mere.

    Ha gwakwara ndị ọrụ nchekwa niile ha gbado anya ghara inwe obi ịda mba maka ọnọdụ nchekwa kama ha jikọọ aka hụ na ememinara mpụ na nchekwa ọjọọ kpam kpam na steeti ahụ.

    Kọmishọna ndị uweojii jikwa ohere ahụ zigara ezinaụlọ ndị ọrụ nchekwa nwụrụ ozi iti aka n'obi ma kwee ha nkwa na udo ga-alaghachite na steeti ahụ.

    Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na ndị agha

    Ebe foto si, Imo Police Command

    Ndị ọrụ nchekwa na-elegharị anya n'ebe ihe ahụ mere

    Ebe foto si, Imo Police Command

  8. A tụọla nwokorobia mkpọrọ maka iji aha Flavour ekwu wayo

    IKpaka Courage/Flavour

    Ebe foto si, EFCC/Flavour-Instagram

    Ụlọikpe atụọla otu nwokorobịa mkpọrọ afọ abụọ maka iji aha otiegwu Chinedu Okoli a ma ama dịka "Flavour" kwuo nwaafọ Amerịka ego dị puku dọla iri ise na atọ(USD58,000).

    Ọkaikpe Jọstịs Dehinde I. Dipeolu nke ụlọikpe Ukwu Etiti dị n’Ikoyi Legọs mara Ikpaka Courage bụ onye butara onwe ya 'Flavour’ were site n’ụzọ ahụ napụ nwa Bekee ahụ a kpọrọ Oriakụ Yvelte M. Thompson ego gbara ọkpụrụkpụ.

  9. A họpụtala Nnenadi Esther Usman ka onyeisioche ndị nlekọta otu Labour Patị

    Nnenadi Usman, Alex Otti na Darlington Nkwocha

    A họpụtala ndị ga-anọ n’ọkwa nchereoge dịka onyeisioche nakwa ode akwụkwọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Patị (LP) na Naịjirịa.

    Sịnatọ Nnenadị Esther Usman nwetara ọkwa dịka onyeisioche ebe Sịnatọ Darlington Nwokocha nwetekwara ọkwa dịka ode akwụkwọ.

    Nenadị Esther Usman bụbụ mịnịsta na-ahụ maka akụnụba obodo na Naịjirịa.

    N'Eprelu afọ 2011, Usman meriri na ntụlịaka ma bụrụ sịnatọ na-anọchịta anya mpaghara Kaduna Saụt n'ụlọomeiwu.

    Usman ji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ PDP were zọọ ọkwa ahụ mana n’afọ 2023 o si na ya febanye otu Labour patị.

    N'aka nke ọzọ Darlington Nwokocha sị na mpaghara Abịa Central, Abịa Steeti. Nwokocha gakwara ụlọ omeiwu nta Naịjirịa bụ ebe ọ nochitara anya ndị Isiala Ngwa Saụt/Nọt nke Abia Steeti.

    N'okwu Sịnatọ Esther Usman jiri nabata ọkwa ahụ, o kwere nkwa na ya ga-arụ ọrụ maka ọdịmma ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ niile ma kwụwa aka ya ọtọ ma mee ka onye ọbụla nweta oke ya.

  10. Ndị uweojii anwụchiela nwoke na-atụ mgbere ụmụaka n'Anambra

    Nwoke ahụ akpọpụtaghị aha ya

    Ebe foto si, Anambra state Police Command

    Ndị uweojii n'Anambra steeti anwụchiela otu nwoke bụ onye otu ndị na-atụ mgbere ụmụaka site na Naịjirịa rue mba ndị ọzọ dị gbara ya gburugburu.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga weputara, o kwuru na otu ahụ na-akpọpụ obere ụmụaka si afọ 13 rue 16 na mba dị icheiche gụnyere Ghana, Benin Republic na ndị ọzọ.

    "Nwuchi a bịara dịka Kọmịshọna ndị uweojii bụ Nnaghe Obono Itam nwetara oke mkpesa banyere ofufu ndị mmadụ ọ kachasị n'akụkụ Okokpo dị n'Onịcha" ka ozi ahụ kwuru.

    Dịka ihe si kwuru ugbua, onye ahụ ezupuru n'obodo Accra dị na mba Ghana alacghachitela dịka ndị uweojii ka na-agba nwoke ahụ ha jichiri ajụjụ ọnụ iji chọta ndị otu ya ma zọpụta ndị ọzọ tọrọ n'aka ya.

    Cheta na ọ bụ izu olemaole gara aga ka ihe onyonyo na-efegharị ebe ụfọdụ ụmụaka dị afọ 13 gbagoo na-arịọ ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka dịka a tụrụ ha mgbere gaa na mba Gana ebe a kwabara ha n'ịgba akwụna.

    Itụ mgbere mmadụ bụ otu n'ime mpụ na-enyekarị ala Naịjirịa nsogbu ọ kachasị ugbua ihe siri ike n'obodo.

  11. Anaghị akwụ ụtụisi nke ọma na Naịjirịa – Bill Gates

    Bill Gates

    Ebe foto si, Getty Images

    Akajiakụ mba Amerịka bụ Bill Gates ekwuola na Naịjirịa anaghị akwụ ụtụisi nke ọma.

    Oge ọ na-ekwu okwu n’ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n’okwu gbasara ihe ndị na-edozi ahụ a haziri n’Abụja, onyeisioche ụlọorụ obi ebere Bill and Melinda Gates Foundation kwuru na Naịjirịa ga-abụ mba na-atụpụ ihe oriri n’ogogo buru ibu n’ọdịnịihu.

    “N’ihe gbasara ọrụ ugbo, Naịjirịa bụ otu n’ime mba kachasị atụbata ihe oriri site na mba ofesi, mana i lee ọnụọgụ mmadụ dị na mba ahụ ị ga-achọpụta na ha nwere ike ịkwalite nkọpụta ihe oriri iji bụrụ ndị kachasị atụpụ ihe oriri n’ụwa dum,” ka Bill Gates kwuru.

    Ọ kpọrọ ndị ọrụ ugbo Naịjirịa oku ka ha gbasoo usoro ọgbaraọhụrụ e ji akọpụta ihe oriri ma werekwa akụmakụ na mkpụrụosisi ndị na-eme nke ọma.

    Ọ kpọkwara gọọmenti Naịjirịa oku ka ha kwalite ngalaba ahụike.

    Dịka o siri kwuo “e kwesịrị iji ngalaba ahụike kpọrọ ihe dị ezigbo mkpa. O teela gọọmenti jiri malite ime atụmatụ ịlekọta ngalaba ahụike mana nke bụ eziokwu bụ na anaghị akwụ ụtụisi nke ọma na Naịjirịa.”

  12. Ndị ojiegbe atụọla ogbuniigwe n’Isiala Mbano, wakpoo ndị uweojii n’Obowo dị n’Imo steeti

    Ndị ojiegbe atụọla ogbuniigwe n’Isiala Mbano, wakpoo ndị uweojii n’Obowo dị n’Imo steeti

    Ebe foto si, Imo state police command/X

    Ndị ojiegbe wakporo Umuelemai bụ isi ụlọọrụ Okpuru ọchịchị Isiala Mbano dị n’Imo steeti ma gbuo ụfọdụ mmadụ.

    Ozi anyị nwetara kwuru na njinji ahụ jiri n’ụbọchị Tuzde 4 September 2024 oge ndị ojiegbe wakporo ogige ụlọọrụ ahụ ma mụnye ya ọkụ.

    Ha mere mwakpo ahụ dịka pati All Progressives Congress (APC) kwupụtara na ha ga-ahazi ntụliaka imeụlọ maka ndị ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa Onyeisioche Okpuru ọchịchị Imo steeti n’ụbọchị ahụ.

    Onye ntaakụkọ anyị kwuru na amatabeghị mmadụ ole merụrụ ahụ maọbụ ndị nwụrụ n’oge ihe ọdachi ahụ mana otu onye a ma ama na pati APC na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị ojiegbe ahụ wụchiri oge ha hazichara ntụliaka imeụlọ ha.

    O kpuhere na ndị nwụrụ oge e mere mwakpo ahụ bụ ndị ọrụ nchekwa Ebubeagu na-echekwa ogige ụlọọrụ Okpuru ọchịchị ahụ.

    Ọ sịrị “Anyị ahapụla ogige ụlọọrụ Okpuru ọchịchị Isiala Mbano tupu e mee mwakpo ahụ. Anyị ahazichaala ntụliaka imeụlọ anyị tupu ha atụọ ogbuniigwe”.

    “Ndị nwụrụ bụ ndị ọrụ nchekwa Ebubeagu na-echekwa ogige ụlọọrụ ahụ. Ọnọdụ a bụ nke dị ezigbo mwute,” ka o kwuru.

    N’ọzọ yiri nke ahụ, ndị ojiegbe wakpokwara ụlọorụ ndị uweojii dị n’Obowo n’abalị Tuzde 3 Septemba 2024 nakwa n’ụtụtụ Wenezde 4 Septemba 2024.

    Akụkọ anyị nwetara kwuru na ha bụ ndị ojiegbe mụnyere ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ ma gbuokwa onye uweojii n'ụlọ ya.

    Ka osiladị, anyị ka na-eche ka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye zaghachi ozi anyị zigaara ya.

  13. Onyeisiala Tinubu ghọgburu anyị, bulie ọnụego mmanụ ụgbọala - Otu NLC

    Onyeisiala Bola Tinubu, onyeisi NLC Joe Ajaero, onyeisi TUC Festus Osifo

    Ebe foto si, Dada Olusegun/Instagram

    Otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress akatọọla mbuli ọnụego mmanụ ụgbọala nke gọọmenti onyeisiala Bola Tinubu mere.

    Onyeisi otu NLC bụ Joe Ajaero kwuru nke a n’ozi o wepụtara ụbọchị Tuzde, 3 Septemba, 2024.

    N’okwu ya, Ajaero kwuru na mbuli ọnụego mmanụ ụgbọala esoghị na nkwekọrịta ha na onyeisiala nwere oge ha kwetara ị nara ụgwọọnwa opeketampe 70,000.

    “Anyị nabatara 70,000 maka na onyeisiala Tinubu kwere anyị nkwa na ọnụego mmanụ ụgbọala agaghị agbago”, ka Joe Ajaero kwuru.

    Ọ gara n’ihu kwuo na nke a gosịrị na onyeisiala Tinubu enweghị ezi ebumnobi ebe ndị ọrụ Naịjirịa.

    Joe Ajaero kpọrọ oku ka gọọmenti kagbuo mbuli ọnụego mmanụ ụgbọala ahụ ma gụpụta ihe ndị ọzọ ha chọrọ ka gọọmenti mee nke gunyere:

    1.Ịtọghapụ ndị e boro ebubo isonye na ngagharịwie e mere na nsonso a

    2.Kwụsị iwuchi na mkpagbu ndị e boro ebubo

    3.Butuo ọnụego tarif pasenti 250 e tinyere n’ọkụ latrik.

    4.Kwụsị mwakpo ụlọọrụ mịnịstri na-ahụ maka ọrụ na ndị ọzọ.

    Ajaero mere ka a mata na otu NLC ga-akpọ ọgbakọ ndị otu na Naịjirịa iji kparịtaụka usoro ha ga-eso n’oge na-abịa

  14. E zigala ndị ọrụ nchekwa n’ụlọakwụkwọ dị n’Abia Steeti

    Gọvanọ Alex Otti

    Ebe foto si, Alex Otti/X

    Gọọmenti Abia steeti ekwuola na ọ na-aga n’ihu inweta nchekwa n’ụlọakwụkwọ dị na steeti ahụ dịka ụlọakwụkwọ na-akwado ịmalite na 16 Septemba.

    Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Okey Kanu kwupụtara nke a na ngwụcha ọgbakọ Gọvanọ Alex Otti na ndị ọrụ ya nwere.

    Kanu kwuru na nke a bụ ebumnobi na nkwa Gọvanọ Alex Otti kwere iji nweta nchekwa nye ụlọakwụkwọ, ụmụakwụkwọ nakwa ndị nkụzi ma nweta mgbanwe n’ụlọakwụkwọ steeti ahụ.

    N’okwu ya, onye ndụmọdụ Gọvanọ Otti n’ihe gbasara agụmakwụkwọ bụ Kenechukwu Nwosu kwuru na ọnọdụ enweghị nchekwa na mwakpo ụlọakwụkwọ, bụ ihe mere gọọmenti ji nwee mkpebi a.

    Nwosu gara n’ihu kwuo na gọọmenti na-akwado ịgba ngwuru n’ogige ụlọakwụkwọ ụfọdụ dị na steeti ahụ iji nweta nchekwa ụmụakwụkwọ na ọhanaeze.

  15. Enweghị nsogbu dị n’etiti onyeisiala Tinubu na osote ya Kashim Shettima - Ụlọọrụ Onyeisiala

    Bola Tinubu na Kahim Shettima

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook/Kashim Shettima/fACEBOOK

    Ulọọrụ onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ọbụghị eziokwu na e nwere nsogbu dị n’etiti onyeisiala Bola Tinubu na osote ya bụ Kashim Shettima.

    Onye ọdụmọdụ pụrụiche osote onyeisiala bụ Stanley Nkwocha kwurur nke a n’ozi o wepụtara n’emume ncheta ụbọchị ọmụmụ osote onyeisiala Kashim Shettima.

    Nkwocha kọwara akụkọ ahụ na-ekwu na onyeisiala na osote na-enwe nsogbu dịka ụgha, ma kwuo na Kashim Shettima na aba uru dị mkpa n’ọchịchị onyeisiala Tinubu.

    Ọ gara n’ihu kwuo na Kashim Shettima nwere ezi nrube isi ebe onyeisiala Tinubu nọ.

    E nweela akụkọ na-ekwu na onyeisiala Bola Tinubu na osote na-ese okwu.

    Nke a abụghị oge mbụ a na-enwe esemokwu n’etiti onyeisiala na osote ya na Naịjirịa.

    Nke kacha pụta ihe bụ esemokwu dị n’etiti Olusegun Obasanjo na osote bụ Atiku Abubakar oge ha nọ n’ọchịchị.

  16. Onye bụ Andrew Wynne onye gọọmenti Naịjirịa na-achọ achọ?

    Andrew Wynne

    Ebe foto si, Andrew Wynne/Nigeria Police

    Ndị uweojii Naịjirịa nọrọ ụbọchị Mọnde 2 Septemba 2024 kwuo na ha na-achọ nwamadị abụọ aha ha bụ Andrew Wynne (onye a mara dịka Andrew Povich) na Lucky Ehis Obiyan achọ maka ebubo iyi ọha egwu na ịkpa nkata ịkwatu ochịchị Onyeisiala Bola Tinubu.

    Ebubo ọzọ e boro ha gunyere ịkwado ndị ahụ mere ngagharịiwe na-akpọ oku ka onyeisiala Bola Tinubu rituo n’ọchịchị.

    Akụkọ BBC nwetara kwuru na Andrew Wynne abụghị onye a na-achọ chọ na mbụ.

    Nke a bụ ihe anyị chọpụtara banyere ya site na mkparịtaụka ya na ndị ụlọ mgbasaozi.

    O kwuru na ọ bụ onye ọgụlọego nakwa onye na-enye ndụmọdụ gbasara ego. Ya na gọọmenti ụfọdụ gọọmenti na Naịjirịa arụkọọla ọrụ na mbụ. Andrew bidoro ịbịa mba Naịjirịa kemgbe afọ 2000.

    Ọ bụ onye mba Briten. Ọ malitere ịbịa Afrịka ihe dịka afọ 50 gara aga oge ọ na-akụzi n’ụlọakwụkwọ sekọndrị na mba Sudan.

    O nwere ebe ọ na-ere akwụkwọ ọ kpọrọ -Iva Valley Books – nke dị n’isi ụlọọrụ otu Nigeria Labour Congress dị n’Abuja. O kwuru na o mepere ya afọ asaa gara aga.

    Nwunye ya bụ onye Naịjirịa. Aha ya bụ Helen. O kwuru na ya na Helen mara onwe ha kemgbe afọ asatọ tupu ha nụọ n’afọ 2023.

    Onye bụ Lucky Obiyan?

    Lucky Ehis Obiyan bụ onye Ekpoma dị n’Edo Steeti. N’akara soshal midia Facebook ya, ọ kọwara onwe ya dịka onye na ekwupụta maka mkpagbu, onye na-ekwuchitara ndị na-enweghị mmadụ nakwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    O so na ndị kwadoro ndị mere ngagharịiwe na Naịjirịa n’ọnwa Ọgọst 1 ruo 10.

    Dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị, Obiyan kwuru na ọchọrọ ị zọọ ọkwa gọvanọ Edo steeti n’ọnwa Ọgọst, 2023. A ga-eme ntụliaka ahụ n’ọnwa Septemba, 2024.

    Ọ gara mahadum Ambros Ali University, Ekpoma.

    N’otu ihe onyonyo ya dị na Facebook, Obiyan kwuru na ebunobi otu ya bụ ‘The African Federation (TAF) bụ inweta nwereonwe na ọganiru Afrịka.

    Enweghị onye ma ka Obiyan anọ Naịjirịa ka ọ pụọla.

  17. Mmanụ ụgbọala anyị ga-arụpụta ga-adị ka nke mba America – Dangote

    Aliko Dangote

    Ebe foto si, Dangote/X

    Aliko Dangote bụ onye nwe ụlọọrụ na-arụpụta mmanu ụgbọala na Legọs ekwuola na mmanụ ụgbọala ya ga-adị ka nke ndị mba Amerịka.

    Aliko, onye kwuru na ụlọọrụ ya adịla njikere ire mmanụ ụgbọala ha rụpụtara n’ahịa Naịjirịa kwuru na ugbua bụ oge aṅụrị na Naịjirịa.

    O kwuru na “ụmụ Naịjirịa ga-enwe ezigbo mmanụ ụgbọala nke ga-enye aka mee ka njini ụgbọala ndị mmadụ hara ị dị na-emebi ngwangwa”.

    “Mmanụ ụgbọala anyị ga-arụpụta ga-adị mma dịka nke ndị Amerịka. Anyị ga-agba mbọ mee ka a ghara inwe ndị mmanụ ụgbọala ha ga-aka nke anyị mma”.

    “Anyị ga-amalite ire mmanụ ụgbọala n’ime ahịa ma ọ bụrụ na anyị na ndị Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL) nwee nkwekọrịta n’usoro anyị ga-eji ree ya”.

    N'ọnwa Disemba afọ gara aga ka Dangote malitere njem ịrụpụta mmanụ ụgbọala. Ha kwuru na tupu afọ agwụ na ha ga-enwe ike ịrụpụta ihe niile ha bu n’obi n’uju dịka ụlọọrụ siri kwadoo.

  18. Ndị ojiegbe atụọla ogbuniigwe n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Anambra steeti

    Ndị ojiegbe awakpoola ndị uweojii n’Anambra steeti, gbuo otu onye

    Ebe foto si, Anambra Police Command

    Ndị uweojii na ụlọorụ nchekwa ndị ọzọ gụnyere ndịagha, ndịagha mmiri na ndị Civil Defence ejikọtala aka ugbua iji chọpụta ndị ekperima n’Oba dị n’Anambra steeti na obodo ndị ọzọ gbara ya agbataobi.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwupụtara nke a n’ozi o mere ka rute BBC Igbo aka n’ụbọchị Tuzde 3 Septemba 2024.

    Ikenga kwuru na ndị ọrụ nchekwa malitere ọrụ ahụ n’ihi mwakpo ndị ekperima mere n’isi ụlọorụ ndị uweojii dị n’Oba na Oba Civic Centre n’ụzọ ụtụtụ Tuzde 3 Septemba 2024.

    Ọ sịrị na ndị ahụ a na-enyo enyo ịbụ otu na-achọ nkewa malitere ịgbapụ mgbọ aghara aghara iji nwee ike banye n’ụlọorụ ndị uweojii ahụ ma tụọkwa ogbuniigwe, nke mere ka ọkụ gbaa ụfọdụ ụlọorụ dị ebe ahụ tinyere Oba Civic Centre.

    Ozi ahụ kwuru na otu onye uweojii nwụrụ n’ihi nnukwu mmerụahụ ebe ndị uweojii nọ n’ọrụ na ndị ọrụ nchekwa ọzọ nyere aka kụnyụọ ya bụ ọkụ.

    Ka osiladị, kọmịshọna ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Nnaghe Obono Itam akatọọla mwakpo ahụ ma kwuo na ha ga-achọpụtarịrị ndị aka ha dị na ya.

  19. Ọnụego mmanụ ụgbọala ugbua bụzi N897 kwa otu lita – NNPC

    Ụlọorụ NNPC

    Ebe foto si, NNPC

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Nigeria National Petroleum Company Limited (NNPCL) ebuliela ọnụego mmanụ ụgbọala site na N617 ruo N897 kwa lita.

    Ha kwuru na ọnụego ọhụrụ a ga-amalite n’ụbọchị Tuzde 3 Sepụtemba 2024.

    Nke a na-abịa n’ime ihe karịrị otu afọ Onyeisiala Tinubu banyere n’ọchịchị, mmanụ ụgbọala e jirila ihe karịrị pasentị narị ise (500%) rịa elu na Naịjirịa.

    Ha gwara ụlọorụ ha niile ka ha gbaa mbọ hụụ na ọnụego ọhụrụ gosiri n'igwe mita ha ji ere mmanụ ụgbọala.

  20. Nwaafọ Britain a na-ebo ebubo ịgba ọchịchị Tinubu mgba okpuru azarala ọnụ ya

    Nwaafọ Britain a na-ebo ebubo ịgba ọchịchị Tinubu mgba okpuru azarala ọnụ ya

    Ebe foto si, Other

    Nwaafọ Briten ndị uweojii Naịjirịa kwupụtara dịka onye a na-achọ achọ n’ihi ebubo ịkpa nkata ịkwatu ochịchị Onyeisiala Bola Tinubu azarala ọnụ ya n’ebubo a na-ebo ya.

    O mere ka a mata nke a n’ihe omume ụlọmgbasaozi Channels Television haziri n’ụbọchị Mọnde 2 Septemba 2024.

    Nwaafọ Briten ahụ, onye sịrị na aka ya adịghị n’ajọ akparamaagwa ọbụla kwuru na ya anaghị agba ọsọ kama ya dị njikere ikwuru ndị ọchịchị Naịjirịa okwu.

    “Amaghị m na m bụ onye na-ezo ezo, amaghịkwa m na m bụ onye na-agbara iwu ọsọ, ana m abịa Naịjirịa kemgbe afọ iri abụọ na ise (25) gara aga”.

    “Enwere m ụlọahịa a na-ere akwụkwọ n’ụlọorụ NLC dị n’Abụja kemgbe afọ asaa gara aga mana ndị ọrụ nchekwa enwebeghị mmasị ịkpọ m oku,” ka nwaamadị ahụ kwuru.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ya nwere naanị otu mba ebe aha dị n’akwụkwọ njirimara passport ya bụ Andrew Wynne nke nwere aha otutu.

    Ọ sịrị na obi ga-adị ya ụtọ ikwuru ndị uweojii okwu, inwe mkparịtaụka n’ọbaozi Whatsapp maọbụ Zoom maọbụ ịga Lọndọn gaa zute ndị ọrụ nke ụlọọrụ nnọchiteanya Naịjirịa.

    “Ọ bụrụ na ha chọrọ ịmalite mkparịtaụka, echere m na nke ahụ dabara adaba,” ka Wynne gwara ndị ntaakụkọ.