Ihe dị na nnyocha Amerịka mere banyere mkpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa

Ebe foto si, Rep. Riley Moore/X
Onyeomeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore ewepụtala akwụkwọ nnyocha ha mere banyere akụkọ mkpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa ma ziga ya n’obi ọchịchị ha bụ “White House’
N’akwụkwọ ozi ahụ, o kpughere ọtụtụ ihe dị iche iche ha chọpụtara nke gụnyere na “Naịjirịa bụ ebe kachasị ọjọọ n’ụwa ịbụ onye okpukperechi Kraịst.”
Ozi a kwuru ndị ojiegbe si agbụrụ Fulani nakwa ndị otu ozọ na-eyi ndụ egwu na-awakpo ma na-egbusi ndị ụka Kraịst, ọkachasị na mpaghara ugwu.
O Kwuru na ụfọdụ iwu dị ire na mpaghara ugwu Naịjirịa ka e ji egbochi ikike nkwuwa okwu ma na-akpagbu ndị Kraịst bi na mpaghara ahụ.
Omeiwu Riley Moore na ndị otu ya tụrụ arọ usoro e nwereike iji kwụsị ma gbochie mkpagbu ndị a.
Akwụkwọ ozi a pụtara dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gbọpụtara Naịjirịa dịka mba a na-elekwasị anya dị aṅaa a kpọrọ ‘Country of Particular Concern’ n’ọnwa Ọktoba 2025.
Onyeisiala Trump nyere omeiwu Riley Moore na ndị ọzọ iwu ka ha mee nnyochaa banyere akụkọ ogbugbu a na-egbusi ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.
Mana gọọmenti Naịjirịa jụrụ ịnabata mkpọpụta ahụ ma kwuo na Naịjirịa nsogbu nchekwa nke na-emetụta ma ndị ụka Kraịst, ndị okpukperechi Alakụba nakwa ndị ọdịnala.
Lee ụfọdụ ntọala ha wepụtara e nwereike iji gbochie ogbugbu ndị Kraịst
Akwụkwọ ozi ahụ tụrụ arọ ihe ndị enwereike ime nke gụnyere;
- Ka gọọmenti Naịjirịa kagbuo iwu Sharia na kwulu okpukperechi
- Ihiwe nkwekọrịta n’etiti Naịjirịa na Amerịka n’ihi banyere nchekwa ndị ụka Kraịst ma kpochapụ ndị na-eyi ndụ egwu.
- Wezuga ndị ojiegbe Fulani gbachiri ọtụtụ ọrụ ugbo ndị mmadụ ma mee ka ndị mmadụ gbara ọsọ ndụ lọghachite n’obodo ha.
- Ka a machie ma kwụsị ndị maọbụ otu ọbụla aka ha dị n’ịkwado ogbugbu ndị mmadụ na Naịjiria ka ha ghara inwete akwụkwọ njem Visa.
- Ịkwụsị enyemaka ego mba Amerịka na-enye Gọọmenti Naịjirịa ruo mgbe ha ga-akwụsị ogbugbu a na-egbu ndị ụka Kraịst.
- Ịchọ ụzọ napụta ndị ojiegbe Fulani ngwaagha site n’igbochi ha ibupu maọbụ ire anụ ehi na mba ndị dịka Ivory Coast, Ghana, Saụt Afrịka na Senegal.
- Arọ ọzọ gụnyere inwe ezi mmekọrịta ha na mba ndị dịka Fransị, Hungari na Briten.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:




















