Ndịagha Amerịka batara Naịjirịa bụ maka ikwalite ikike ndịagha Naịjirịa imeri ndị na-eyi ọha egwu - DHQ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'izu a.

Nchịkọta

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Ihe dị na nnyocha Amerịka mere banyere mkpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa

    Onyeomeiwu mba Amerịka Riley Moore na ndịisi ụlọụka na Naịjirịa

    Ebe foto si, Rep. Riley Moore/X

    Onyeomeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore ewepụtala akwụkwọ nnyocha ha mere banyere akụkọ mkpagbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa ma ziga ya n’obi ọchịchị ha bụ “White House’

    N’akwụkwọ ozi ahụ, o kpughere ọtụtụ ihe dị iche iche ha chọpụtara nke gụnyere na “Naịjirịa bụ ebe kachasị ọjọọ n’ụwa ịbụ onye okpukperechi Kraịst.”

    Ozi a kwuru ndị ojiegbe si agbụrụ Fulani nakwa ndị otu ozọ na-eyi ndụ egwu na-awakpo ma na-egbusi ndị ụka Kraịst, ọkachasị na mpaghara ugwu.

    O Kwuru na ụfọdụ iwu dị ire na mpaghara ugwu Naịjirịa ka e ji egbochi ikike nkwuwa okwu ma na-akpagbu ndị Kraịst bi na mpaghara ahụ.

    Omeiwu Riley Moore na ndị otu ya tụrụ arọ usoro e nwereike iji kwụsị ma gbochie mkpagbu ndị a.

    Akwụkwọ ozi a pụtara dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gbọpụtara Naịjirịa dịka mba a na-elekwasị anya dị aṅaa a kpọrọ ‘Country of Particular Concern’ n’ọnwa Ọktoba 2025.

    Onyeisiala Trump nyere omeiwu Riley Moore na ndị ọzọ iwu ka ha mee nnyochaa banyere akụkọ ogbugbu a na-egbusi ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.

    Mana gọọmenti Naịjirịa jụrụ ịnabata mkpọpụta ahụ ma kwuo na Naịjirịa nsogbu nchekwa nke na-emetụta ma ndị ụka Kraịst, ndị okpukperechi Alakụba nakwa ndị ọdịnala.

    Lee ụfọdụ ntọala ha wepụtara e nwereike iji gbochie ogbugbu ndị Kraịst

    Akwụkwọ ozi ahụ tụrụ arọ ihe ndị enwereike ime nke gụnyere;

    • Ka gọọmenti Naịjirịa kagbuo iwu Sharia na kwulu okpukperechi
    • Ihiwe nkwekọrịta n’etiti Naịjirịa na Amerịka n’ihi banyere nchekwa ndị ụka Kraịst ma kpochapụ ndị na-eyi ndụ egwu.
    • Wezuga ndị ojiegbe Fulani gbachiri ọtụtụ ọrụ ugbo ndị mmadụ ma mee ka ndị mmadụ gbara ọsọ ndụ lọghachite n’obodo ha.
    • Ka a machie ma kwụsị ndị maọbụ otu ọbụla aka ha dị n’ịkwado ogbugbu ndị mmadụ na Naịjiria ka ha ghara inwete akwụkwọ njem Visa.
    • Ịkwụsị enyemaka ego mba Amerịka na-enye Gọọmenti Naịjirịa ruo mgbe ha ga-akwụsị ogbugbu a na-egbu ndị ụka Kraịst.
    • Ịchọ ụzọ napụta ndị ojiegbe Fulani ngwaagha site n’igbochi ha ibupu maọbụ ire anụ ehi na mba ndị dịka Ivory Coast, Ghana, Saụt Afrịka na Senegal.
    • Arọ ọzọ gụnyere inwe ezi mmekọrịta ha na mba ndị dịka Fransị, Hungari na Briten.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  2. Gọọmenti etiti akwụsịla ikpe Mike Ozekhome ikpe

    Mike Ozekhome na ndị ọzọ mgbe ha nọ n'ụlọikpe.

    Ọkaiwu kachasị na Naịjirịa bụ Lateef Fagbemi akwụsịla ikpe ọkachamara Mike Ozekhome ikpe.

    Cheta na ụlọọrụ ‘Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission, (ICPC)’ kpụpụrụ Mike Ozekhome ụlọikpe maka ebubo atọ gbadoro ụkwụ n’ugha na inwe akwụkwọ ụlọ adịgboroja.

    Mgbe okwu ahụ pụtara n'ụlọikpe ka onyeisi na ngalaba na-ekpe ọha ikpe bụ Rotimi Oyedepo gwara ụlọikpe na Ọkaiwu kachasị na Naịjirịa chọrọ ka ya napụ ICPC ikpe ahụ, ma rịọ ụlọikpe ka e nye ya oge ọ ga-eji tulee ihe dị n’ikpe ahụ.

    Mike Ozekhome na ndị ọzọ mgbe ha nọ n'ụlọikpe.

    Oyedepo gwara ụlọikpe na e nyere ya iwu ka ya wepụta okwu ahụ n’ụlọikpe.

    N'aka nke ọzọ, Paul Erokoro na ndị ọzọ bụ ọkaiwu nọchitere anya Ozekhome enweghị etu ha si na ha achọghị ka e wepụta okwu ahụ n’ụlọikpe.

    Nke a mere ụlọikpe jiri kagbuo ma wepụ ebubo niile e boro Mike Ozekhome nke ICPC ji kpụta ya ụlọikpe.

    Lee akụkọ ọzọ ga-adị gị mma:

  3. Oge eruola mgbe anyị ga-eguzobe ndị uweojii steeti - Tinubu

    Onyeisiala Bola Tinubu na ndị ọzọ.

    Ebe foto si, Bayo Onanuga / X

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekwuola na oge eruola mgbe ya ga-eguzube ndị uweojii steeti na Naịjrịa.

    Bola Ahmed Tinubu mere ka a mata nke a mgbe ya na ndị Gọvanọ nakwa ndị ndu dị icheiche mechiri ekpere n'Abuja dịka ndị alakụba na ndị ụka kraịst na-ebu ọnụ.

    N'okwu ya "nchekwa bụ ntọnaala ọganiru. E wepụ ya, ndị ọrụ ugbo agaghị eme nke ọma. Azụmaahịa agaghị eme nke ọma. Ezinaụlọ agaghị ehi ụra mechie anya ha abụọ".

    "Anyị ga-eguzobe ndị uweojii steeti ka anyị beleta ọnọdụ enweghị nchekwa. Nke a abụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ bụ maka ihe na-eme ugbua".

    Tinubu gara n'ihu kwuo na ime ka steeti nwee ndị uweojii nke ha "bụ ikwado steeti ka ha nwee akụrụngwa ha ga-eji chekwaa ụmụ amaala ha dịka ha na-eme ka Naịjirịa kwụrụ chịmchịm".

    "Anyị kwesiri inwe obi siri ike ma gbanwe ihe na-adịghị arụ ọrụ. Anyị ga-ejikọ aka ọnụ chekwaa ihe anyị wekọrọ ọnụ. Naịjirịa ga-abụ ebe nwere ezi nchekwa, sie ike".

    Lee akụkọ ọzọ ga-adị gị mma:

  4. O meela afọ anọ mba Rọshịa wakporo Ukren: Lee ihe ị kwesiri ịma

    Mgbe mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe droonu na mpaghara Kyiv, n'ime obodo  a kpọrọ Sofiivska Borshchahivka, dị na Kyiv, na Februwarị 22, 2026.

    Ebe foto si, Getty Images

    O meela afọ anọ kamgbe mba Rọshịa wakporo mba Ukren. Mana, n’oge Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin bidoro iwakpo Yukren na Februwarị 24, 2022 ka ọ kọwara ihe mere o jiri bido agha ahụ.

    Putin kwuru na ihe ndị ahụ gunyere “ime ka mba Yukren hara inwe ndị agha nakwa ime ka ha kwụsị ịbụ ndị Nazi”.

    Putin kwuru na ya achọghị ka Rọshịa nweghara ọchịchị na nlekọta mba Yukren n’ike.

    O kwukwara na ya chọrọ ịkwụsị otu ‘Nato’ inwe ọnọdụ na mba Yukren ma mee ka Yukren hara inwe ndị ha kwụnyere n'etiti Nato na Rọshịa.

    Putin ejighị ọnụ ya kwuo na ya chọrọ inwepụ ọchịhị Onyeisiala mba Yukren n'ọchịchị mana ọ dị ka nke a eso n’ihe Putin chọrọ ime.

    Onyeisiala Volodymyr Zelensky ekwuola sị “ndị iro etinyela m dịka onye mbụ ha chọrọ igbu; ezinaụlọ m dịka ndị nke abụọ”.

    Ụlọọrụ mgbasaozi mba Rọshịa a na-akpọ Ria Novosti nwere mgbe ha kesere akụkọ kwuru maka ‘ịkwụsị ndị Nazi na inwepụ Yukren” nke pụtara ime ka a hara inwe mba a na-akpọ Yukren n’ụwa ọzọ.

    Cheta na Onyeisiala mba Rọshịa na-ekwu na enweghị mba a na-akpọ Yukren n’ụwa, ma na-ekwu na Yukren na Rọshịa bụ otu ndị na-enweghị nkewa.

    Lee akụkọ ọzọ ga-adị gị mma:

  5. Ọkụ gbara n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed Airport dị na Legọs - Ụlọọrụ FAAN

    E kwuru na ha zọpụtakwara mmadụ iri na anọ niile ndị tọrọ atọ n’ebe ahụ n'enweghị nsogbu ma kpọpụ ha kpamkpam n'ebe ahụ.

    Ebe foto si, Olukayode Jaiyeola/NurPhoto via Getty Images

    Nkọwa foto, E kwuru na ha zọpụtakwara mmadụ iri na anọ niile ndị tọrọ atọ n’ebe ahụ n'enweghị nsogbu ma kpọpụ ha kpamkpam n'ebe ahụ.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ọdọụgbọelu na Naịjirịa bụ Federal Airport Authority Nigeria (FAAN) ekwuola n'ụbọchị Mọnde na ọkụ gbara n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed Airport dị na Legọs.

    Ụlọọrụ a kwupụtara nke a n’akara soshal midịa X ya kwukwara na enweghị ọnwụ ọ bụla sitere n’ọkụ ọgbụgba ahụ dịka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ nọ nso iji gbochie ọkụ ahụ.

    Ha kwuru na ha tinyere akụrụngwa kreen n'ọrụ iji kwado ọrụ nnapụta ndị nọ n’ebe ‘Control Tower,’ dịka a zọpụtakwara mmadụ iri na anọ niile ndị tọrọ atọ n’ebe ahụ n'enweghị nsogbu ma kpọpụ ha kpamkpam n'ebe ahụ.

    Ha kwukwara na ihe ruru mmadụ isii ọkụ ahụ metụtara gụnyere ụmụnwoke atọ na ụmụnwaanyị atọ, ha niile nọ n'ọnọdụ dị mma ugbua.

    Ụlọọrụ ahụ kwukwara na e bugara otu onye n'ụlọọgwụ nke ụlọọrụ FAAN maka nnyocha ahụike ọzọ ma na ọ nọgidere na-enwe ahụike dị mma.

    Ha gara n’ihu kwuo na nchọpụta mbụ ha mere gosiri na ọkụ ahụ sitere n’ụlọ ebe sava dị n'ogogo mbụ nke Terminal 1.

    E kwuru na ọtụtụ ụlọọrụ tinyere ụgbọala na-agbanyụ ọkụ na akụrụngwa ndị ọzọ maka ọrụ iji gbochie ọnọdụ ahụ, chekwaa ndụ, na ichekwa akụrụngwa dị mkpa n'ọdọụgbọelu ahụ.

    Ebe foto si, FAAN/X

    Nkọwa foto, E kwuru na ọtụtụ ụlọọrụ tinyere ụgbọala na-agbanyụ ọkụ na akụrụngwa ndị ọzọ maka ọrụ iji gbochie ọnọdụ ahụ, chekwaa ndụ, na ichekwa akụrụngwa dị mkpa n'ọdọụgbọelu ahụ.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị

    Ụlọọrụ FAAN kwuru na ọtụtụ ụlọọrụ tinyere ụgbọala na-agbanyụ ọkụ na akụrụngwa ndị ọzọ maka ọrụ iji gbochie ọnọdụ ahụ, chekwaa ndụ, na ichekwa akụrụngwa dị mkpa n'ọdọụgbọelu ahụ.

    Dịka ịkwalite ọnọdụ nchekwa, ụlọọrụ ahụ kwuru na akpọpụla ndị niile nọ n’ogogo nke isii nke ụlọ ebe ahụ ọkụ metụtara kpamkpam iji kwado ọrụ gbatagbata na-aga n'ihu na ibelata ihe egwu.

    O kwuru na ha agbanyụọla ọkụ gbara n'ime ụlọ ọpụpụ dịka ndị ọrụ gbatagbata na-aga n'ihu na-enyocha nke ọma iji gbochie mgbasa ọ bụla gaa n’akụkụ ebe dị nso ọdọụgbọelu ahụ.

    Ha kwuru na nchọpụta mbụ ha mere gosiri na ọkụ ahụ sitere n’ụlọ ebe sava dị n'ogogo mbụ nke Terminal 1.

    Ebe foto si, FAAN/X

    Nkọwa foto, Ha kwuru na nchọpụta mbụ ha mere gosiri na ọkụ ahụ sitere n’ụlọ ebe sava dị n'ogogo mbụ nke Terminal 1.
  6. Mba Chad emechiela okeala ya na Sụdan iji kwụsị mgbasa esemokwu

    Chad anabatala ọtụtụ narị puku ndị gbara ọsọ ndụ si Sụdan n'ime afọ atọ gara aga

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Chad anabatala ọtụtụ narị puku ndị gbara ọsọ ndụ si Sụdan n'ime afọ atọ gara aga

    Mba Chad emechiela okeala ọwụwa anyanwụ ya na Sụdan "ruo mgbe a ga-enye ọkwa ọzọ" na Mọnde, na-ekwu na ọ dị mkpa ka e mee nke a, iji kwụsị mwakpo otu ndịagha nnupụisi nke Sụdan na-eme ugboro ugboro.

    Onye na-ekwuchitere gọọmentị kwuru na mkpebi a bụ maka nchekwa ụmụafọ mana o kwukwara na ọ bụ naanị "ọnọdụ pụrụ iche, nke a kwadoro nke ọma site n'ihe gbasara ọdịmma mmadụ", nke ikike ya sitere n'aka ndị ọchịchị ka e nwereike ikwe ka ọ gafere.

    A mara ọkwa mmechi ahụ mgbe agha siri ike malitere n'obodo Al Tina dị n'okeala Sụdan n'etiti ndịagha nnupụisi RSF nke Sụdan na ndịagha obodo nke so n'otu ndịagha Sụdan.

    E kwuru na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu nde ndị Sudan agafeela okeala ha banye mba Chad kemgbe agha obodo malitere n’afọ 2023.

    Cheta na okeala mba Chad bụkwa ebe dị mkpa maka ndị ọrụ enyemaka na ndị otu njem na-aga na mpaghara ndị ahụ agha bibiri.

    Lee akụkọ ọzọ ga-adị gị mma:

  7. Gọọmenti Anambra Steeti agbachiela ọdọ ahịa akụrụngwa ụgbọala dị na Nkwo Nnewi

    Mgbe a gbachiri ọdọ ahịa ebe a na-ere akụrụngwa ụgbọala na Nkwo Nnewi.

    Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service

    Gọọmenti Anambra Steeti agbachiela ọdọ ahịa ebe a na-ere akụrụngwa ụgbọala dị na Nkwo Nnewi maka emepeghị ọdọ ahịa ha n'ụbọchị Monde.

    Gọọmenti Anambra steeti nyere iwu ka a gbachie ọdọ ahịa ahụ otu izu ụka bido taa ruo n’abalị asaa ọzọ na-abịa abịa.

    Onye ndụmọdụ Gọvanọ Anambra steeti bụ Evarist Uba bụ onye duru ndị ọrụ gọọmenti ga gbachie ọdọ ahịa ahụ. Ha ji igodo gbachie ya.

    Uba si na ọ “Gọọmenti gbachiri ahịa ahụ maka ọtụtụ ihe nke gunyere emeghị ihe Gọvanọ steeti ahụ gwara ha mee dịka imepe ụlọahịa ha n’ụbọchị monde ma kwụsị ị nọ n’ụlọ n’ụbọchị monde ọbụla”.

    Uba kwuru na “ị gbachi ọdọ ahịa ahụ abụghị ka a taa ndị ahịa ahụhụ, kama na ọ bụ ime ka ihe juo oyi maka na gọọmenti na-ahụta abịaghị ahịa n’ụbọchị monde dịka imegide ọnọdụ akụnụba steeti ahụ”.

    A na-atụ anya na ndị ọrụ nchekwa nakwa gọọmenti Anambra steeti ga-ahụ na a gbachiri ụlọahịa ahụ ruo abalị ole ha chọrọ ịgbachi ya.

  8. ‘Onyeisiala Tinubu na-emetọ ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa’ - Atiku Abubakar

    Onye bụbu osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar

    Ebe foto si, Atiku Abubakar / X

    Nkọwa foto, Atiku Abubakar

    Onye bụbu osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar ekwuola na etu ndị mmadụ si ghara ịpụta n’igwe na ntuliaka e mere maka okpuruọchịchị n’Abuja gosiri na gọọmenti Onyeisiala Tinubu na-emetọ ọchịchị onyekwuouche ya.

    Atiku kwupụtara nke a n’ozi Paul Ibe bụ ọnụ na-ekwuru ya wepụtara, ma kwuo na ndị pụtara sonye na ntuliaka ahụ erughị pasentị iri abụọ.

    N’okwu ya "ọ bụghị ihe mgbagwoju anya etu ndị mmadụ esighị pụta tụọ vootu n’Abuja kama ọ bụ ihe gosiri etu ndọrọndọrọ ọchịchị jupụtara na tigbuo zogbuo nakwa mkpagbu gọọmenti na-akpagbu ụmụafọ Naịjirịa".

    Atiku gara n'ihu kwuo na oge ọbụla ndị mmadụ enweghị ntụkwasị obi n’usoro ndọrọndọrọ ọchịchị, mara na ọchịchị onyekwuouche ya akpụla afọ n'ala.

    O mere ka o doo anya na “ọchịchị onyekwuouche ya agaghị ezuoke ma ọ bụrụ na ndị nọ n'ọchịchị ebughị ebumnobi na ọdịmma ndị obodo n'obi.

  9. Mmeri APC wetere n’Abuja na-egosi nkwado ndị mmadụ na-enye Onyeisiala Tinubu – Wike

    Nyesom Wike bụ mịnịsta na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa, Abuja

    Ebe foto si, Nyesom Wike / X

    Nkọwa foto, Nyesom Wike

    Nyesom Wike bụ mịnịsta na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa, Abuja ekwuola na mmeri otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Congress (APC) wetere n’Abuja nakwa Rịvas steeti na-egosi na ndị mmadụ na-akwado Onyeisiala Tinubu.

    Nyesom Wike kwuru na mmeri ahụ bụ maka iwu na usoro ọchịchị Onyeisiala Tinubu, nakwa ntukwasị obi ndị mmadụ were na ya.

    N’okwu ya “mmeri APC meriri n’ime obodo dí icheiche n’isi obodo Naịjirịa gosiri na atụmatụ dị icheiche gọọmenti wepútara na-emetụta ndụ ndị mmadụ”.

    Ọ sị na ọ bụ nke mbụ APC na-eweta mmeri n’ọtụtụ mpaghara dị icheiche ọkachasị n'ụlọomeiwu dí n’ime obodo n'Abuja.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  10. Ndị uweojii azọpụtala ụmụaka ise furu efu n’Ebonyi Steeti

    Foto ụmụaka ise ahụ a zọpụtara

    Ebe foto si, Ebonyi State Police Command

    Gọọmenti Ebonyi steeti ekwuola na mbọ ha na ndị uweojii gbara emeela ka a zọpụta ụmụaka ise furu efu n’ebe dị iche iche na steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Joshua Ukandu kwuru na ndị ọrụ ha gbara mbọ zọpụta ụmụaka ahụ ma kwuo na ha enyefeela ha n’aka mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị n’Ebonyi steeti ka ha mee nnyocha ma nyefee ụmụaka ahụ n’aka ezinaụlọ ha dị iche iche.

    Kọmishọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị na mmepe obodo n’Ebonyi steeti bụ Felicia Nwamkpuma kwuru na ha hụrụ ụmụaka ahụ ka ha na-akpagharị tupu ndị uweojii azọpụta ha.

    Ọ gara n’ihu kpọọ oku ka ndị nne na nna mụọ ụmụaka ole ha nwereike ịzụ ma gbochie itinye ụmụaka ha n’oke ahụhụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  11. Etu e si gbuo onye na-ebu ọgwụike a na-akpọ 'El Mencho' na mba Meziko

    Nemesio Oseguera Cervantes e jiri ‘El Mencho’  mara.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, ‘El Mencho’

    Onye na-ebu ọgwụike a maama na mba Meziko anwụọla mgbe ndị ọrụ nchekwa bịara ịkpụrụ ya.

    El Mencho bụ onye ndu otu a na-atụ egwu ma na-ebu ọgwụike adịgboroja a na-akpọ Jalisco New Generation (CJNG).

    Gọọmenti mba Meziko kwuru na ezigbo aha ‘El Mencho’ bụ Nemesio Oseguera Cervantes, ma kwuo na ọ nwụrụ n’ụbọchị Sọnde na mmeru ahụ o wetere mgbe ndị otu ya na ndị ọrụ nchekwa kwakọtara mgbọ.

    E gburu ndị otu ya mmadụ anọ n’obodo a na-akpọ Tapalpa, dị n’etiti Jalisco steeti.

    N'oge ahụ, ndị ọrụ nchekwa mmadụ atọ meruru ahụ.

    Mara na ọ bụ mba Amerịka gbala ama nye mba Meziko ha jiri gaa wakpo El Mencho na ndị otu ya.

    Ndị CJNG bidoro na-agba ụgbọala ọkụ, na-emechi okporoụzọ ụgbọala ma na-awakpo ndị ọrụ nchekwa na steeti asatọ na mba ahụ.

    Akụkọ dnị ọzọ ga-amasị gị:

  12. Onyeisiala Tinubu etoola pati APC maka mmeri ha nwetara na ntuliaka okpuruọchịchị e mere n'Abuja

    Foto Onyeisiala Bola Tinubu na-achị ọchị

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu etoola pati All Progressives Congress (APC) maka mmeri ha meriri na ntuliaka okpuruọchịchị e mere n’Abuja n’ụbọchị Satọde 21 Febụwarị, 2026 nakwa ntuliaka ndị ọzọ e mere na Rivas Steeti nakwa Kano Steeti.

    Ozi ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara, kwuru na Onyeisiala Tinubu toro ndị ji aha APC zọọ ọkwa na ntuliaka ndị ahụ ma nweta mmeri ma gwa ha ka ha rụọ ọrụ ga-enweta mgbanwe, udo nakwa ọdịmma ndị obodo họpụtara ha.

    Onyeisiala Tinubu tokwara ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec), ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị tụrụ vootu na ntuliaka ahụ ma kọwaa mpụtara ntuliaka ahụ dịka ihe akaebe nye mbọ gọọmenti ya na-agba iji mee ka ọchịchị onyekwuouche kwụdosie ike na Naịjirịa.

    Akụkọ dnị ọzọ ga-amasị gị:

  13. Ndị be anyị unu asaala chi

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 23 Febụwarị, 2026.

    Ọfọ anyị bụ ka izuụka ọhụrụ a mịtara gị na ezinaụlọ gị ezi mkpụrụ.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche ga-amasị gị.

    Ya gazie!

  14. Etu e si gbuo nwoke a na-akpọ Austin Martin n'ebe ụlọ Donald Trump

    Foto Onyeisiala Donald Trump na ụlọ ya a na-akpọ Mar-a-Lago.

    Ebe foto si, Getty Images

    E gburu otu nwoke aha ya bụ Austin T. Martin n’ebe ụlọ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump.

    Austin Martin dị afọ iri na otu. Ọ bụ onye Cameron, North Carolina dịka e si gwa ụlọọrụ mgbasa ozi CBS News.

    Ndị ọrụ nchekwa gbagburu ya n’ebe ụlọ Donald Trump a na-akpọ Mar-a-Lago.

    Ndị ọrụ gọọmenti na-ekwu na nwaamadị ahụ ji egbe na ihe dịka ihe mmanụ agbịdị mgbe ọ batara na Mar a Lago dịka onye ọbịa si ebe ahụ na-apụ.

    Ezinaụlọ Martins adịla na mbụ kwuo na ọ na-efu efu dịka CBS si kwuo.

    Mar-A-Lago bụ ụlọ Onyeisiala Donald Trump na Florida.

    A rụrụ ụlọ ahụ n’afọ 1927 mana Donald Trump zụtara ya n’afọ 1985 ma nwere ebe ahụ rụọ ebe ezinaụlọ ya bi.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  15. Lee ụgbọala gbatagbata ọhụrụ Gọọmenti Ondo Steeti wepụtala

    Osote Gọvanọ Ondo steeti bụ Olayide Adelami nọchitere anya Gọvanọ ha bụ Lucky Orimisan Aiyedatiwa na mmeme ahụ.

    Ebe foto si, Ondo state ministry of Health

    Nkọwa foto, Olayide Adelami

    Gọọmenti Ondo steeti ewepụtala ụgbọala gbatagbata ọhụrụ maka ikwado ọnọdụ ahụike na steeti ahụ.

    Ụgbọala gbatagbata ahụ yiri ihe e jiri Keke na-peperụpụta.

    Ha gosiri nke a mgbe ha na-ekpuhe ihe dị icheiche ha rụrụ na ngalaba ahụike nakwa ngala mmiri ọṅụnụ na steeti ahụ.

    Ụgbọala gbatagbata gọọmenti Ondo steeti wepụtala

    Ebe foto si, Ondo state ministry of Health

    A na-ahụ ụgbọala (keke) gbatagbata a dịka otu n’ime ihe pụrụiche ọchịchị Gọvanọ Lucky Aiyedatiwa megoro n'emume ncheta otu afọ gọọmenti ya banyere n'ọkwa.

    Ihe ndị ọzọ ha rụrụ gunyere imezi ụlọọgwụ, ime obodo dị icheiche nakwa igwupụta mmiri ala ha kesere ga-enye ụlọọgwụ dị icheiche mmiri n'ebe dịka nakwa ụlọọgwụ ime ododo dị icheiche ha meziharịrị nakwa Akure na steeti ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasịkwa gị:

  16. Ọtụtụ mmadụ anwụọla site na mwakpo mba Pakịstan wakporo Afghanịstan

    Ụgbọala na ụlọ mwakpo ahụ metụtara

    Ebe foto si, EPA/Shutterstock

    Akụkọ kwuru na mba Pakịstan awakpola Afghanịstan dịka Taliban kwuru na ọtụtụ mmadụ nwụrụ ebe ndị ọzọ gụnyere ụmụaka na ụmụnwaanyị merụrụ ahụ.

    Islamabad kwuru na mwakpo bụ ogige otu ndịagha nnupuisi asaa dị nso n’okeala Pakịstan na Afghanịstan ka ha bu n’obi mee ya maka na ha tụrụ ọtụtụ ogbunigwe na Pakịstan.

    Afghanịsta katọrọ mwakpo ahụ ma kwuo na o metụtara ụlọ ndị nkịtị nakwa ụlọakwụkwọ ndị ụka.

    Mwakpo a na-abịa dịka mba abụọ a nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ n’Ọktoba maka esemokwu okeala dị n’etiti ha.

    Mịnịstrị nchekwa Taliban kwuru na ọ bụ ogige obibi ndị nkịtị dị na mpaghara Nangarhar na Paktika ka a wakporo.

    Ndị ọrụ na Nangarhar gwara BBC na mwakpo ahụ metụtara ụlọ otu nwoke aha ya bụ Shahabuddin ma gbuo ndị ezinaụlọ ya ruru iri abụọ gụnyere ụmụaka na ụmụnwaanyị.

    Mịnịstrị mgbasaozi mba Pakịstan kwuru na ha mere nnyocha banyere ogige ndịagha nnupuisi asaa ahụ tupu ha mee ya bụ mwakpo ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasịkwa gị:

  17. Lee etu mpụtara ntuliaka okpuruọchịchị isiobodo (FCT) nke Naịjirịa ji kwụrụ ugbua

    Christopher Maikalangu, Kasim Mohammed na Joshua Ishaku ndị zọrọ ọkwa onyeisioche n'okpuruọchịchị ndị dị n'isiobodo Naịjirịa FCT

    Ebe foto si, Screen shot

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) amalitela ịkpọpụta mpụtara ntuliaka nke okpuruọchịchị ndị dị n’Abuja bụ isiobodo Naịjirịa.

    E mere ntuliaka ahụ n’ụbọchị Satọde 21 Febụwarị, 2026 n’okpuruọchịchị isii nke mejupụtara isiobodo Naịjirịa, gụnyere AMAC, Abaji, Kwali, KUJE, Gwagwalada, Bwari.

    Dịka o s kwụrụ ugbua, Christopher Maikalangu nke pati All Progressive Congress (APC) bụ onye ji ọkwa onyeisioche Abuja Municipal Area Council (AMAC) meriri ọzọ na ntuliaka ahụ.

    Maikalangu ji vootu 40,295 merie ebe onye ji aha pati African Democratic Congress (ADC) ji vootu 12,109 gbaa onye nke abụọ.

    N’okpuruọchịchị Bwari, Joshua Ishaku nke pati APC ji vootu 18,466 merie dịka onyeisioche, ebe onye zọrọ ọkwa n’aha ADC ji vootu 4,254 gbaa onye nke abụọ ebe onye nke Zenith Labour Party (ZLP) nwetere vootu 3,515 iji gbaa onye nke atọ.

    Kasim Mohammed nke People Democratic Party (PDP) ji vootu 22,165 merie dịka onyeisioche okpuruọchịchị Gwagwalada. Onye zọrọ ọkwa n’aha APC bụ Yahaya Shebu ji vootu 17,788 gbaa onye nke abụọ.

    Nuhu Daniel nke pati APC tuuru ugo na ntuliaka nke onyeisioche okpuruọchịchị Kwali dịka o ji vootu 17,032 merie ndị zọzara ya ọkwa dịka Haruna Pai Mohammed nke PDP onye ji vootu 8,575 gbaa onye abụọ.

    Na nke yiri ibe ya, Umar Abdullahi Abubakar nke pati APC ji vootu 15,535 merie n’okpuruọchịchị Abaji ebe onye na-esote ya bụ onye ji aha pati Young Progressive Party (YPP) zọọ ọkwa ahụ nwetere vootu 5,357.

    A ka na-eche mpụtara ntuliaka okpuruọchịchị atọ fọrọ afọ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  18. A na-atụ anya mpụtara ntuliaka okpuru ọchịchị e mere n'Abuja

    Foto nwaanyị na-etinye akwụkwọ vootu ya n'ime igbe e ji eme ntuliaka

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ndị uweojii na ndị ọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC), adọọla aka na ntị ka ọhanaeze ghara ịkpa agwa nwereike ibute ọgbaaghara dịka a na-atụ anya mpụtara ntuliaka e mere n’ime obodo Abuja n’ụbọchị Satọde 2 Febụwarị, 2026.

    Onyeisi ndị ọrụ NSCDC n’Abuja bụ Olusola Odumosu dọrọ aka na ntị a ma kwuo na ndị ọrụ ya kwụrụ chịm igbochi ma megide ndị maọbụ out ọbụla chọrọ itinye ọgbaghara dịka a na-eche mpụtara ntuliaka ahụ.

    Onyeisioche ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) Joash Amupitan kwuru na ha ji igwe IRev etinye mpụtara ntuliaka na webụsaịt e ji ekiri mpụtara ntuliaka.

    Okpuru ọchịchị e mere ntuliaka ahụ gụnyere Abaji, Abuja Municipal, Bwari, Gwagwalada, Kuje na Kwali - a tụnyekwaara ndị isioche isii na ndị nnọchiteanya 62 nke Bekee kpọrọ councillor n'obodo 68 dị n'Abuja.

    Nke a bụ ntuliaka mbụ a haziri kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ a kpọrọ Electoral Amendment Act n'ụbọchị 17 Febụwarị 2026.

    Akụkọ ndị ọzọ nwereike ịmasị gị:

  19. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 22 Febụwarị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche ga-amasị gị.

    Nnọọ!