Obodo dị iche iche na-eme ngagharịiwe megide ndị ọrụ ICE na mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2026.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. A malitela nnukwu ngagharịiwe megide gọọmenti na Tehran na obodo ndị ọzọ dị n’Ịran

    A kọkwara akụkọ ngagharịiwe n'ọtụtụ ogbe ndị ọzọ, gụnyere Kermanshah

    Ebe foto si, Middle East Images / AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, A kọkwara akụkọ ngagharịiwe n'ọtụtụ ogbe ndị ọzọ, gụnyere Kermanshah

    Ọtụtụ mmadụ na-eme ngagharịiwe n'isi obodo Iran na obodo ndị ọzọ, dịka vidiyo na-efegharị n’ịntanetị siri gosi.

    A na-ekwukwa na ọ bụ ngosipụta ike kachasị ukwuu nke ndị na-agaba ụlọọrụ ụkọchukwu n'ime ọtụtụ afọ ụkwụ.

    A hụkwara ngagharịiwe udo emere na Tehran na obodo Mashhad n'abalị Tọzde, nke ndị nchekwa na-anaghị achụsasị, na vidiyo BBC Persian kwadoro.

    Mana mgbe e mesịrị, otu ndị na-enyocha ihe mere ka a mara na-akwụsịrị ịntanetị ịrụ ọrụ n'ofe mba ahụ.

    A nụkwara ndị ngagharịiwe n'ihe onyonyo a ka ha na-akpọ oku ka a kwatuo Ayatollah Ali Khamenei, Onyeisi Kasị Elu nke mba Iran, nakwa ka Reza Pahlavi, nwa nwoke Shah nke a chụgara mba ọzọ, lọta, onye gbara ndị na-akwado ya ume ka ha pụta n'okporoama.

  2. Tinubu etiela Chimamanda Adichie aka n'obi maka ọnwụ nwa ya nwoke

    Chimamanda Adichie

    Ebe foto si, Chimamanda Adichie

    Onyeisiala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu ezigarala ezinaụlo onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Adichie ozi iti aka n'obi maka ọnwụ nwa ya nwoke.

    Otu n'ime ụmụejima Adichie nwụrụ n'ụbọchị Wenezde ka ọ rịachara ahụ nwa oge, dika akwụkwọ ozi ezinaụlọ ahụ wepụtara ụbọchị Tọzde siri kwuo.

    Ozi ahụ kwuru na nwata ahụ bụ Nkanu Nnamdi dị ọnwa 21 nwụrụ ka ọ rịachara ahụ nwa oge.

    Onyeisiala Tinubu kwuru n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Bayo Onanuga binyere aka ma wepụta sị, " Ọ bụ n'nnukwu obi iru ụjụ ka m ji akasi Ms Chimamanda Ngozi Adichie, di ya bụ Dr Ivara Esege, na ndịezinaụlọ ha nile obi n'ihi ọnwụ nwa ha nwoke bụ Nkanu Nnamdi."

    Tinubu onye kwuru na o nweghị ihe na-afụ ụfụ ka nwa ịnwụnarị ndị mụrụ ya, gara n'ihu kpee ekpere nkasiobi.

    Chimamanda Adichie, gbara afọ 48, onye e jiri akwụkwọ, 'Half of a Yellow Sun' mara, mụrụ nwa ya mbụ n'afọ 2018.

    O mechara mụta ụmụejima n'afọ 2024 site na-enye maka onye ọzọ buru ya afọ ime.

  3. E nwere 'ihe iyi egwu' na mba Amerịka ga-awakpo Kolombịa – Ka Onyeisiala Gustavo gwara BBC

    Onyeisiala mba Kolombịa, Gustavo Petro
    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Kolombịa, Gustavo Petro

    Onyeisiala mba Kolombịa, Gustavo Petro, agwaala BBC na ya kwenyere na enwere "ihe iyi egwu" na mba Amerịka ga-eme mwakpo megide mba Kolombịa.

    Petro kwuru na mba Amerịka na-emeso mba ndị ọzọ dịka "alaeze ukwu" nke mba Amerịka.

    Nke a na-abịa mgbe Onyeisiala Trump ji agha yie Kolombịa egwu.

    O kwuru na mba Amerịka nwereike ịgbanwe site na "ịchị ụwa" gaa na "ịnọpụ iche n'ụwa."

    O borokwa ndị ọrụ Immigration and Customs (ICE) nke mba Amerịka ebubo na ha na-eme ihe dịka "ndị Nazi brigades".

    Trump agbasaala ọrụ ICE nke ukwuu dịka gọọmenti ya kwuru na bụ mwakpo mpụ megide ndị si mba ọzọ abata na mba Amerịka n'ụzọ iwu na-akwadoghị.

    Ka o si dị, BBC agakwurula White House ka ha kwuo okwu banyere ebubo ndị a.

  4. Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 9 Jenụwarị 2026.

    Anyị na-asị na ọ ga adịrị onye ukwu mma ma dịkwara onye nta mma.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ndewo!

  5. Pati APC na Riva Steeti ajụla ma katọọ nkata a na-akpa iji ịchụpụ Fubara dịka Gọvanọ

    Foto njimara pati APC na foto Gọvanọ Siminalayi Fubara na-achị Riva Steeti

    Ebe foto si, Siminalayi Fubara/X

    Pati All Progressives Congress (APC) mpaghara Riva Steeti ekwuola na ha anabataghị atụmatụ ahụ ụlọomeiwu steeti ahụ malitere iji chụpụ Gọvanọ Siminalayi Fubara na osote ya bụ Ngozi Odu n’ọkwa ọchịchị ma kọwaa ya dịka ihe enweghị na ihe adịghị mkpa.

    Ozi ọnụ na-ekwuru pati ahụ bụ Darlington Nwauju wepụtara mere ka o doo anya na ọ bụ eziokwu na ụlọomeiwu ahụ nwere ikike iwu obodo nyere ya ma kwuo na ha agaghị akwado atụmatụ ịchụpụ Gọvanọ ahụ bụ onye otu APC n’ọkwa.

    APC gara n’ihu dọọ ndị omeiwu ahụ aka na ntị ma gwa ha ka ha sepụ aka onwe n’ofe ma ghara ime ihe ga-etinye maọbụ bute nsogbu na steeti ahụ.

  6. Renee Nicole Good: Ngaghariiwe adaala na Minneapolis dika onye ọrụ 'ICE gbagburu nwaanyị

    Renee Nicole Good

    Ebe foto si, Renee Nicole Good

    A matala aha nwaanyị ndị ọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Amerịka a kpọrọI'mmigration and Customs Enforcement'(ICE) gbagburu na Minepolis dị na mba Amerịka ụbọchị Tozde

    Renee Nicole Good, gbara afọ 37 ma jide ụmụ atọ na-anyapụ ụgbọala ya iji gbalahụ ndị ọrụ ICE na-akwụsị ya oge otu n'ime ha gbara ya egbe , ọ nwụ na-egbufgị oge.

    Ọnwụ Good akpalitela ngagharịiwe na mpaghara ahụ na ndị gọọmentị Trump boro nwaanyị ahụ ebubo ị bụ "onye oyi ndụ egwu ụlọ"

    Good kwatara ọhụrụ na mpaghatra ahụ bụ onye nwere ikike ile ihe ICE na -eme n'ogbe ahụ.

    Ọnwụ Renee n'aka ndị ọrụnchekwa na-abịa otu afọ, George Floyd nwụrụ n'aka ndị uweojii ji ikpere pịgbuo ya n'otu mpaghara ahụ.

  7. Trump ewepụla Amerịka n'otu mbaụwa karịrị 12

    Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ewepụla aha Amerịka n'ọtụtụ otu mbaụwa nke gụnyere otu na-agba mbọ maka nchekwa ihu igwe(climate change.)

    N'ime otu a ruru 66, nke ọkara ya bụ otu 'United Nations' nke gụnyere otu nwere nkwekọrịta etu a ga-esi akwụsị oge ekpomọkụ nke mbaụwa (global warming.)

    Ụlọọrụ Onyeisiala bụ 'White House' kwuru na e mere nzọpụụkwụ a n'ihi na otu " enweghị kwa uru ọ bara Amerịka kama ha na-akwado atụmatụ mmegide ya.".

    Trump agalarị n'ihu napụ ụfọdụ otu jikọrọ Amerịka na mba ndị ọzọ ihe ha anaghị amasị ya ego nkwado ma sị na nkwekọrịta e nwere maka mgbanwe ihuigwe nke sayensi kwadoro bụ ajambele.

  8. Onye ọrụ ụlọọrụ na-ahụ maka mbata na ọpụpụ na mba Amerịka agbagbuola nwaanyị na Minneapolis

    Ndị uweojii gbara gburugburu ebe onye ọrụ ICE gbagburu otu nwanyị na Minneapolis

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii gbara gburugburu ebe onye ọrụ ICE gbagburu otu nwanyị na Minneapolis

    Otu onye ọrụ ụlọọrụ na-ahụ maka mbata na ọpụpụ na mba Amerịka agbagbuola otu nwaanyị dị afọ iri atọ na asaa n'obodo Minneapolis, nke kpalitere esemokwu mgbe ndị ọrụ obodo jụrụ ihe ọchịchị Trump kwuru na ọ bụ nchekwa onwe ya.

    Ka ọ dị ugbua, ngalaba nchekwa obodo kwuru na nwaanyị ahụ bụ Renee Nicole Good, bụ "onye na-eme ngagharịiwe ike" nke gbara mbọ ịgbanarị ndị ọrụ Immigration and Customs (ICE) ọsọ.

    Mana aka na-achị obodo Minneapolis bụ Jacob Frey kwuru sị, "Nke a bụ onye nnọchi anya ji ike eme ihe n'echeghị echiche na nke a ga-ebute ọnwụ mmadụ," na-agwa ndị ọrụ ICE ka ha si n'obodo ahụ pụọ.

    E tinyela ọtụtụ narị ndị ọrụ ICE na Minneapolis, na steeti Minnesota, dịka ọrụ obi ọchịchị mba Amerịka bụ White House na-emegide mbata na ọpụpụ n’ụzọ iwu na-akwadoghị.

  9. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma unu.

    Anyị ji obi aṅụrị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 8 Jenụwarị 2026.

    Ekpere anyị n’isi gị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ya gazie!

  10. Ndị omekome agbagbuola mmadụ anọ n'Oyo steeti

    Onye bu egbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị bu egbe a mabeghị ndị ha bụ agbagbuola o pekata mpe mmadụ anọ n'ọhịa 'National Park Service' (NPS) dị n'obodo Oloka dị n'Okpuru Ọchịchị Orire n'Oyo steeti n'abalị Tuzde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii steeti ahụ bụ Ayanlade Olayinka kwuru na mwakpo ahụ bụ eziokwu n'ozi o wepụtara.

    Olayinka kwuru na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndi ọzọ awụbaala ọhịa ịchọ ndị kpara mkpamkpa ahụ.

    O kwukwara na Komishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Femi Haruna na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ azọpụla ije ịga ebe ihe mere.

  11. E gbochiela atụmatụ igbu onye ndu mba Bọkịna Faso bụ Ọchịagha Ibrahim Traore

    Ozi gọọmenti mịnịsta na-ahụ maka nchekwa mba ahụ bụ Mahamadou Sana wepụtara kwuru na ọ bụ Kọnel Paul Henri Damiba bụ onye Ọchịagha Traoré wepụrụ na Septemba 2022, kpara nkata ahụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Atụmatụ igbu onye ndu mba Bọkịna Faso bụ Ọchịagha Ibrahim Traoré akpụọla afọ n’ala.

    Ozi gọọmenti mịnịsta na-ahụ maka nchekwa mba ahụ bụ Mahamadou Sana wepụtara kwuru na ọ bụ Kọnel Paul Henri Damiba bụ onye Ọchịagha Traoré wepụrụ na Septemba 2022, kpara nkata ahụ.

    Sana kwuru na gọọmenti mba Bokịna Faso nwetere kepu kepu banyere nkata ahụ a na-akpa iji gbuo onye ndu ha ma wakpo ụfọdụ ụlọọrụ gọọmenti dị iche iche. O kwuru na nkata ahụ nwetara nkwado n’aka mba Aịvri Kost.

    Mana ka ọ dị ugbua, Damiba nakwa mba Aịvri Kost ekwubeghị ihe ọbụla banyere ebubo a.

    E nweela nkata abụọ a kpara iji wepụ Ọchịagha Traoré n’ọchịchị kemgbe ọ napụrụ ọchịchị n’ike na mba ahụ dịka mkpamkpa ndịagha nnupuisi na-akpa mkpamkpa na mba ahụ emeela ka ọtụtụ ndị obodo gbapụ n’ụlọ ha dị cihe iche.

    N’agbanyeghị ihe aka mgba ndị a, nwaamadị ahụ gbara afọ 37 kwụrụ chịm ma bụrụkwa onye ọtụtụ mba n’Afrịka na-akwado.

  12. Ameríka na-akpa nkata iweghara mba Greenland, ụlọọrụ Onyeisiala

    Greenland

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-enwe mkparịtaụka ụzọ mba ahụ ga-esi weghara mba Greenland nke gụnyere iji ike ndịagha mee otu a, dịka ụlọọrụ onyeisiala Amerịka a kpọrọ 'White House' na Bekee si kwuo.

    White House gwara BBC na iweghara Greenland - bụ mpaghara kwụụrụtụ onwe ya nke nọ n'okpuru mba Denmark bụkwa mba so na NATO bụ ụzọ ichekwa mba Amerịka.

    Ozi a na-abịa dịka ndị ndu Yurop wepụtara ozi nkwado nye Denmark, bụ nke na-gba mbọ ịhụ na ebunombi Trump emejupụtaghị.

    Trump kwuru ugboro ugboro na ngwụcha izuụka na Greenland dị Amerịka mkpa maka nchekwa nke mere ka Praim Minista Denmark Mette Frederiksen ji kwuo sị na Amerịka wakpoo Greenland, ị mara na ọgwụgwụ NATỌ abịala.

    Greenland bụ obodo mmiri gbara okiri kachasị buo ibu n'ụwa nke mba Denmark chiburu.

  13. Trump ekwuola na Venezuela 'ga-enyefe' Amerịka ihe ruru barelụ mmanụ agbidi ruru nde iri ise

    Nkea na-abịa dịka Trump kwupụtara na Ụlọọrụ mmanụ Amerịka ‘ga-adị njikere ịmalite ọrụ’ na Venezuela n’ime ọnwa iri na asatọ n’abịa.

    Ebe foto si, screenshot

    Nkọwa foto, Nkea na-abịa dịka Trump kwupụtara na Ụlọọrụ mmanụ Amerịka ‘ga-adị njikere ịmalite ọrụ’ na Venezuela n’ime ọnwa iri na asatọ n’abịa.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na Venezuela 'ga-enyefe' Amerịka ihe ruru barelụ mmanụ agbidi ruru nde iri ise (50m) nke ọnụ ego ya ruru ijeri dọla abụọ na nde asatọ $2.8bn (£2.1bn) dịka ndịagha mba Amerịka wakporo Venezuela ma wepụ Nicolás Maduro n’ọchịchị.

    N’ozi Trump wepụtara na soshal midịa ya, a ga-ere mmanụ ụgbọala n'ọnụ ahịa ya ma jiri ego pụtara na ya mee ihe bara uru nye ndị Venezuela na Amerịka.

    Nke a na-abịa dịka Trump kwupụtara na Ụlọọrụ mmanụ Amerịka ‘ga-adị njikere ịmalite ọrụ’ na Venezuela n’ime ọnwa iri na asatọ n’abịa.

    Trump ekwuola na Venezuela 'ga-enyefe' Amerịka ihe ruru gbọmgbọm mmanụ ruru nde iri ise

    Ebe foto si, screenshot

    Nkọwa foto, Trump ekwuola na Venezuela 'ga-enyefe' Amerịka ihe ruru gbọmgbọm mmanụ ruru nde iri ise
  14. Ndị Igbo, unu asaala chi?

    Ka chi fotere taa nwetere anyị na unu niile ihe ọma na obi anụrị dịka anyị na-anabata unu n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Anyị ji ọtụtụ akụkọ gbara ọkpụrụkpụ bịa taa bụ Wenezde 7 Jenụwarị, 2026.

    Cheta sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!

  15. Mmadụ isii anwụọla na Yurop, dịka a kagburu ọtụtụ njem ụgbọelu n’ihi nsogbu snoo

    Mmadụ isii anwụọla na Yurop, dịka a kagburu ọtụtụ njem ụgbọelu n’ihi nsogbu snoo

    Ebe foto si, Getty Images

    Nnukwu snoo na-ada na Yurop, nakwa oke oyi emeela ka a kagbuo ọtụtụ njem ụgbọelu na mpaghara ahụ.

    Ka ọ dị, e kwupụtala mmadụ isii dịka ndị nwụrụ n’ihi ọdachi ndị sitere n’ọnọdụ ihu igwe na mpaghara Yurop.

    Ndị ọchịchị kwuru na mmadụ ise anwụọla na mpaghara abụọ dị iche iche na mba Fransị n’ihi ọnọdụ ịkwọ ụgbọala dị njọ.

    Ha kwukwara na otu nwaanyị nwụrụ n’isi obodo Bosnịa bụ Sarajevo oge nnukwu snoo dị 16in (40cm) dara n’obodo ahụ.

    A kagbuola ọtụtụ njem ụgbọelu gburugburu Yurop, dịka puku kwuru puku mmadụ tọrọ n’ọdọụgbọelu ndị e nwere na Paris nakwa Amsterdam.

    A tụrụ anya na ọnọdụ a ga-aga n’ihu ruo n’ụbọchị Wenezde.

  16. Mmadụ 22 si mba Itiopịa akwaaga mba ọzọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ 'dị egwu'

    Mmadụ 22 si mba Itiopịa akwaaga mba ọzọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ 'dị egwu'

    Ebe foto si, Afar Communication Bureau/Facebook

    Nkọwa foto, Mmadụ 22 si mba Itiopịa akwaaga mba ọzọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ 'dị egwu'

    Ndị ọchịchị kwuru na ihe dịka mmadụ iri abụọ na abụọ si mba Itiopịa akwaga mba ọzọ anwụọla, ebe mmadụ iri isii na ise merụrụ ahụ mgbe otu gwongworo ha nọ na ya gbapụrụ n'akụkụ ugwu ọwụwa anyanwụ nke Itiopịa.

    Ihe dịka mmadụ iri asatọ na ise na-eme njem n'ụzọ njem ọwụwa anyanwụ mgbe gwongworo ahụ dakpọsịrị n'obodo Semera n'ụtụtụ Tuzde, dịka otu onye ọrụ gọọmenti dị elu nke ndị Afar bụ Mohammed Ali Biedo si kwuo n'okwu ya.

    E kwuru na amaghị ebe ndị ahụ na-aga mgbe ihe mberede ahụ mere mana ụzọ ahụ bụ ebe esikarịrị na Itiopịa agafee Djibouti, gafee Oke Osimiri Uhie ruo Yemen, wee gawa Saudi Arabia na mba ndị ọzọ dị na mpaghara Middle East.

    Ọzọ, Yemen bụ ụzọ dị mkpa maka ndị si mba Afrịka akwaga mba ndị nọ na Gulf ịchọ ọrụ.

  17. Onyendu otu na-agba gọọmenti ụkwụ na Venezuela etoola ihe mba Amerịka mere megide Maduro

    María Corina Machado etoola ihe mba Amerịka mere megide Maduro

    Ebe foto si, Bloomberg via Getty Images

    Nkọwa foto, María Corina Machado etoola ihe mba Amerịka mere megide Maduro

    Onyendu otu na-agba gọọmenti ụkwụ na Venezuela bụ María Corina Machado ekwuola na nwụchi mba Amerịka nwụchiri Nicolás Maduro bụ nnukwu ihe nyere “ụmụ mmadụ, nnwere onwe na ugwu mmadụ”.

    Cheta na a kpọọrọ Maduro na nwunye ya Cilia Flores n'ogige ha dị na Caracas n'ụbọchị Satọde wee buru ha gaa Amerịka maka ọrụ ndịagha pụrụ iche.

    Mgbe ọ na-agwa Fox News okwu, awa ole na ole ka Maduro pụtara n'ụlọikpe dị na New York, Machado kwuru na o "nwere obi ụtọ" maka ihe onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump mere.

    Cheta na Machado hapụrụ Venezuela n'ọnwa gara aga iji nara ihe nrite Nobel Peace maka ọgụ ya megide ihe Kọmitii Nobel nke Norway kpọrọ ọchịchị aka ike - mana ọ lọtabeghị kemgbe ahụ.

    Chetakwa na mgbe Maduro na nwunye ya pụtara n'ụlọikpe n’ụbọchị Mọnde 5 Jenụwarị 2026, ọ gwara onye ọkaikpe na ya "ka bụ onyeisiala" dịka o kwuru na ikpe amaghị ya maka ịzụ ahịa ọgwụ ike na ebubo ndị ọzọ e boro ya.

  18. Ndị Igbo, unu asaala chi?

    Ka chi fotere taa nwetere anyị na unu niile ihe ọma na obi anụrị dịka anyị na-anabata unu n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Anyị ji ọtụtụ akụkọ gbara ọkpụrụkpụ bịa taa bụ Tuzde 6 Jenụwarị, 2026.

    Cheta sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!

  19. Ọtụtụ mmadụ anwụọla oge ụgbọmmiri kpuru na Yobe Steeti

    Ndị mmadụ gbakọrọ ebe ụgbọmmiri kpuru na Yobe steeti na-enyere ndị ihe metụtara aka

    Ebe foto si, Audu ABBA KURAMA / AFPTV / AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ ebe ụgbọmmiri kpuru na Yobe steeti na-enyere ndị ihe metụtara aka

    Ndị ọchịchị na Yobe Steeti ekwuola na ọtụtụ mmadụ nwụrụ ka ụgbọmmiri kpuru n'oge mgbede ụbọchị Satọde 3 Jenụwarị, 2026 dịka a ka na-achọ ihe ruru mmadụ iri na anọ.

    Ụgbọmmiri ahụ kpuru oge o si obodo Adiyani dị na Jigawa steeti na-erute nso na mpaghara Garbi dị na Yobe Steeti.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojji na Yobe Steeti bụ Dungus Abdulkarim gwara BBC na ndị ọrụ gbatagbata ebupụtala ozu mmadụ iri na ise nwụrụ anwụ, mana ndị ntaakụkọ sị na ndị nwụrụ ga-eru iri abụọ na ise.

    E zigaala ndị ọrụ gbatagbata ka ha nweeike chọta ndị ka dị ndụ ebe ahụ dịka gọọmenti malitere ime nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọdachi ahụ.

    Ihe gbasara ụgbọmmiri ikpu na Naịjirịa bụ nke na-arị elu mana ndị ọkachammara si na ihe na-akpata ya bụ na ndị na-akwọ ụgbọmmiri na-etinye ọtụtụ ndị mmadụ n’ime ya, ebe ụfọdụ ụgbọmmiri e ji eme njem emeela ochie.

    Ahụ mmadụ nọ n'ime ụgbọmmiri dịka nwọke abụọ na-ele anya

    Ebe foto si, Audu ABBA KURAMA / AFPTV / AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ihe ọdachi a mere dịka ụgbọmmiri si obodo Adiyani nọ na Jigawa steeti kpuru dịka o rutere nso nso mpaghara Garbi na steeti Yobe.
  20. Ndị Igbo, unu asaala chi?

    Ka chi fotere taa nwetere anyị na unu niile ihe ọma na obi anụrị dịka anyị na-anabata unu n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Anyị ji ọtụtụ akụkọ gbara ọkpụrụkpụ bịa taa bụ Mọnde 5 Jenụwarị, 2026 ma bụrụkwa ahịa Orie.

    Cheta sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!