Mmadụ 53 anwụọla mgbe ụgbọ epepe bu ndị Afrịka eme njem kpuru n'osimiri

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ụgbọ epepe bu mmadụ iri ise na ise gụnyere ụmụaka eku n’aka abụọ ekpuola n’osimiri dị n’akụkụ mba Libya dịka ngalaba na-ahụ maka njem nke otu United Nations si kwuo.
Naanị ndị fọrọ ndụ n’ọdachi ahụ bụ ụmụnwaanyị Naịjirịa abụọ bụ ọrụ mba Libya zọpụtara n’ụbọchị Fraịde dịka ụlọọrụ International Organisation for Migration (IOM) si kwupụta na Mọnde.
Ha kwuru na ụgbọ epepe ahụ bu ndị si mba Afrịka dị iche iche na-eme njem ịbanye mba ofesi.
Ụgbọmmiri ahụ kpuru dịka oke ifufe osimiri kụrụ ya n’ihe dịka awa isii o si n’ọnụmmiri obodo al-Zawiya ndị na Libya pụọ njem.
Ụlọọrụ IOM kwuru na ndị njem ruru narị ise anwụọla maọbụ fuo dịka ha na-agba mbọ isi na mba Libya gafee osimiri Mediterranean kamgbe afọ 2026 a.
Libya abụrụla ebe ọtụtụ ndị njem a si mba Afrịka na-esi abanye mba ofesi Yurope kamgbe e gbuchara onyendu ha bụ Muammar Gaddafi n’afọ 2011.
Ndị a fọrọ ndụ gwara ụlọọrụ IOM na ụgbọepepe ahụ hapụrụ obodo al-Zawiya n’elekere iri na otu nke abalị ma kpuo dịka ọtụtụ awa gachara.
A mabeghi ihe mere akụkọ a jiri nọtee aka tupu ọ na-apụta ihe.
Otu n’ime ndị a fọrọ ndụ kwuru na di ya nwụrụ n’ọdachi ahụ ebe onye nke ọzọ kwuru na ụmụaka ya abụọ nwụrụ.
Ụlọọrụ IOM na-enye ụmụnwaanyị ndị a ọgwụwgọ na-egbughi oge.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:














