Dịka akụkọ na-efegharị na onye gbabuuru Super Eagle bọọlụ bụ Tijani Babangida, anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ, nchọpụta anyị gosiri na ọ dị ndụ.
Tijani Babangida, nwunye ya, na nwanne ya nwoke nọ n'ụgbọala nwere ihe mberede ụbọchị Tọzdee abalị Itoolu nke ọnwa Mee, afọ 2024 n'okporo ụzọ awara awara si Kaduna gawa Zaria.
Ya na nwunye ya pụtara na ndụ , e buga ha ụlọọgwụ akpọghị aha ya maka nletaebe nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ bụ Ibrahim Babangida nwụrụ n'ihe mberede ahụ.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na Tijani Babangida so ndị ogbo dịka Kanu Nwakwo, Daniel Amokachi dịka 'Dream Team gbara Naijiria bọọlụ n'asọmpi Olipik nke afọ 1996 , danyere n'ihe mberede okporoụzọ tara isi ya Mana ozi nke bụ eziokwu bụ na nwamadi ahụ na,nwunye napụtara isi ha, ebe nwa nne ya nwoke bụ Ibram Babagida nwụrụ.
Mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu bụ Sịnetọ John Owan Enoh kasiri ezinaụlọ Tijjani Babangida obi maka ihe mberede ahụ mere.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru minịsta ahụ Diana-Mary Nsan binyere aka ma wepụta ụbọchị Friade, Sinetọ John Owan Enoh gara n'ihu kpọkuo ọha na eze ka ha kwado ma tinye ezinaụlọ Tijani Babangida n'ekpere n'oge ihe iri uju a.
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Tijani Babangida
Tijjani Babangida, onye nwetara ihe nrite ọla edo 'Gold' n'asọmpi Olympic nke Atlanta 1996 ma bụrụ onyeisi otu ndị ọkachamara n'egwuregwu bọọlụ na Naijiria (PFAN.)
Ndị ya na ya gbara otu egwuregwu Super Eagles gụnyere Sunday Oliseh, Finidi George, Taribo West, Emmanuel Amunike, Uche Okechukwu, Victor Ikpeba, Kanu Nwankwo, Daniel Amokachi , Jay-Jay Okocha, Celestine Babayaro, Garba Lawal na ndị ọzọ
Lee ihe ị kwesịrị ịma maka Tijani Babangida A mụrụ ya na Kaduna n'abalị 25 ọnwa Septemba afọ 1973. Mgbe ọ gbara afọ 17, Tijani binyere aka maa gbarụ otu egwuregwu bọọlụ Roda JC nke dị na obodo Netherlands.
Ọ gara n'ihu gbara otu egwuregwu bọọlụ Ajax bọọlụ bido n'afọ 1996. O nyere ọtụtụ goolu dị mkpa ma nyere aka kwalite otu egwuregwu Ajax n'asọmpi Champions League.
Otu egwuregwu Tijani Babangida gbara bọọlụ gụnyere Gençlerbirligi dị na Turkey, Vitesse dị na Netherlands, Al-Ittihad nke Saudi Arabia, Tianjin Teda na kwa Changchun Yatai dị na China gụnyere FC Barcelona dị na Spain. Ọ gbara otu egwuregwu Super Eagles Naịjirịa bọọlụ ma soro n'otu Super Eagles mmeri n'asọmpi Olympic afọ 1996.
Ọ gbara Naịjirịa bọọlụ n'asọmpi mba ụwa nke afọ 1998 na kwa nkwado n'asọmpi mba ụwa afọ 2002. Tijani Babangida gbara Super Eagles bọọlụ ugboro 36 ma nye goolu ise.