You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Taa ka a ga-ahazi ntuliaka ime obodo n'Abuja, nke mbụ kemgbe e binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'izu a.

Nchịkọta

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Tinubu, Chanselọ mba Jamini ga-agbakọ aka na nchekwa, ọkụ latrik - Obi ọchịchị Naịjirịa

    Onyeisiala Bola Tinubu na Chanselọ mba Jamini bụ Friedrich Merz ekpebiela ịkwalite mmekọrịta dị n’etiti Naịjirịa na Jamini.

    Ha kwuru na ebumnobi nke a bụ iji kwalite mgbakọaka n’ihe gbasara nchekwa, ọkụ latrik na ngalaba okporoigwe.

    Na mkparịtaụka ha nwere n’ekwentị na mgbede Wenezde 18 Febụwarị 2026, ndị ndu abụọ ahụ gosipụtara njikere ha dị ijikọta aka kwalite ngalaba nka na ọrụaka.

    N’ozi obi ọchịchị Naịjirịa wepụtara n’abalị Wenezde, Tinubu na Merz kwuru okwu gbasara atụmatụ Presidential Power Initiative, bụ nke Tinubu kwuru na Naịjirịa ga-achọ enyemaka maka nkesa ọkụ latrik.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Ozi ahụ kwuru na Chanselọ mba Jamini kwere nkwa na ụlọọrụ Siemens ga-adị njikere inye aka na ngalaba ahụ, ebe ụlọakụ Deutsche Bank ga-adị njikere iji ego kwado atụmatụ ndị ahụ.

    Onyeisiala Tinubu kpọkwara oku ka e zitere mpaghara Sahel ụgbọelu helikọpta ndị e jirila mee ihe iji nye aka n’ihe gbasara nchekwa na mpaghara ahụ.

  2. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nu!

    Ka ụbọchị taa mịtara gị mkpụrụ ọma.

    Nnọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 19 Febụwarị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile taa.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa.

    Ndewo.

  3. Oke osisi dara n'ebe Awhum 'monastery' ma gbuo mmafụ karịrị ise

    Akwa akwa na iru uju na-ada ugbua n'Obodo Awhum dị n'okpuru ọchịchị Udi n'Enugwu steeti, Naịjirịa maka na otu osisi dara ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ ruru iri na otu.

    Nnukwu ọdachi a mere n'ụbọchị Tuzd, Feb 17, 2026.

    Ọ bụ nnukwu osisi a na-akpọ 'Ukwu akpụ" bụ ihe dara ma dagbuo ndị na-eme njem nọ n'ụgbọala.

    Oge BBC rutere n'ahia Awhum, bụ ebe mkpamkpa kpara, ụzụ akwa ka na-ada ebe niile.

  4. Onyeisiala Tinubu ebinyela aka n’iwu ọhụrụ a ga-eji eme ntuliaka 2027

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Ahmed Tinubu ebinyela aka n’iwu ọhụrụ a ga-eji eme ntuliaka nke afọ 2027.

    Iwu ọhụrụ ahụ e nwere ugbua bụ ‘Iwu ntuliaka 2026’ mana ọ bụbu ‘Iwu ntuliaka 2022’ tupu ndị omeiwu agbanwee ya ma hazịharịa ya.

    Cheta na nke a na-eme dịka ndị omeiwu mere ka ụlọọrụ INEC nweike ijiri usoro akụrụngwa ‘elektọnịk’ nakwa iji aka nkịtị nke a kpọrọ 'manụal' n'olu bekee na-edekọ mpụtara na ntuliaka.

    Ndị omeiwu ekweteghị ka e mee ka ọ bụrụ iwu na ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) ga-ejiriri naanị akụrụngwa ‘eletrọnịk’ nwere na-eziga mpụtara ntuliaka n’IREV ka a tụchara vootu.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  5. Rọshịa na Yukren: mparịtaụka akwụsịla mana e nwetabeghị udo

    Mkparịtaụka mba Rọshịa na Yukren na-enwe abịala na njedebe mana mba abụọ ahụ enwebeghị udo.

    N’agbenyighị na Rọshịa na Yukren nwere ọtụtụ ihe ha kwekọrịtara, nke gụnyere “ihe gbasara ‘ndịagha, nkwụsịtụ ịkwa mgbọ, ntọhapụ ndị e jidere n’agha”.

    Ihe ọzọ na-ese okwu nke ha na-enweghị nkwekọrịta maka ya gunyere mpaghara Donbas (ya bụ Donetsk na Luhansk) nke mba Rọshịa chọrọ ka ha were ma na-ahụ maka ya.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  6. Aka akparala nwaanyị sụgburu di ya bụ onye ọrụ 'Immigration' n'Umuahia

    Ndị uweojii Abia Steeti sị ha anwuchiela otu nwaanyị ji mma sụgbuo di ya bụ onye ọrụ ‘Immigration n’Umuahia maka ebubo ịgba n’ezi.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Maureen Chinaka kwuru na nwaanyị na na ngalaba ndị uweojii CID maka “ebubo igbu mmadụ” dịka nnyocha na-aga n’ihu.

    Akụkọ kwuru na ihe a malitere dịka esemokwu n’etiti di na nwunye ahụ mechara bute ọnwụ onye ọrụ ‘immigration’ a na-arụ ọrụ n’Umuahia a kpọrọ Chidiebere James, site na nghọtahie ya na nwunye ya.

    Nke a mere n’ụlọ ha dị n’obodo Umuihi, Umuogba Ekeoba dị n’Ohuhu nke okpuruọchịchị Umuahia North nke steeti ahụ.

    Anya hụrụ ka ihe a si mee ma bụrụkwa onye ezinaụlọ ahụ kwuru na nwunye Chidebere sụrụ ya mma n’isi ụtụtụ Mọnde.

    O kwuru na nsogbu dapụtara na Sọnde, mgbe di na nwunye ahụ nwechara nrụrịtaụka banyere ahụike nwa ha nke e boro ebubo na nwoke ahụ eweteghi ego e ji akwụ ụgwọ ahụike nwa ha.

    Nwunye ya gakwara n’ihu boo ya ebubo ịgba n’ezi n’ihi ozi ndị dị aṅaa ọ bụrụ n’ekwentị di ya bụ nke a sị na ndị ezinaụlọ mechara kpezie.

    Mana esemokwu ha malitere ọzọ n’ụtụtụ Mọnde nke butere ọgụ na mmebi ekwentị. Ọ bụ n’oge ahụ ka nwaanyị weere mkpa sụọ di ya n’ahụ, ọ dara n’ala , e buru ya gawa n’ụlọọgwụ mana o mechara nwụọ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  7. Amerịka ekwuola na olileanya dị dịka mkparịtaụka udo na Yukren na-abanye abalị abụọ

    Onye nnọchiteanya mba Amerịka bụ Steve Witkoff ekwuola na enweela olileanya na mkparịtaụka dị n’etiti Yukren na Rọshịa banyere ịkwụsị ịkwa mgbọ n’agha dị n’etiti ha abụọ dịka mba abụọ ahụ na-abanye n’abalị abụọ mkparịtaụka ahụ na Geneva n’ụbọchị Wenezde 18 Febụwarị, 2026.

    Mana olileanya ahụ dị ntakịrị maka na Onyeisiala Volodymyr Zelensky mba Yukren kwuru na ọ dịghị mma na Onyeisiala Trump mba Amerịka na-agwa ya ka o leghara anya n’ihe ụfọdụ ma kwuo na udo agaghị adị ma ọ bụrụ na Rọshịa nweta mmeri.

    Onyeisiala Trump ekwuola n’oge gara aga na ọ bụ Yukren ka ọ dị n’aka ịhụ na mkparịtaụka a na-enwe na mba Switzerland.

    Mba Rọshịa nọ n’oke ala Yukren ruru pasenti iri abụọnke gụnyere mpaghara Donbas ọwụwa anyanwụ.

    Isiobodo Kremlin kwuru na ha chọrọ ka mba Yukren nyefee ha mpaghara ahụ niile mana Yukren anabataghị nke a.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  8. Ọtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọ n'ọgbakọ BBC NEws Igbo taa bụ Wenezde 18 Febụwarị, 2026 ma bụrụkwa ahịa orie.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile taa.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa.

    Nnọọ.

  9. Ndị uweojii ejirila anwụrụ anyammiri chụsaa ndị ngagharịiwe maka mgbasa mpụtara ntuliaka ozugbo n'ịntaneetị

    Ndị uweojii ejirila anwụrụ anyammiri chụsaa ndị ntoroọbịa na-aga n’ihu n’ime ngagharịiwe maka itinye mgbasa mpụtara ntuliaka ozugbo n’ịntaneetị n’ime Iwu Ntuliaka 2022 nke e megharịrị emegharị.

    Nke a mere ka abalị nke ise nke ngagharịiwe ‘Occupy National Assembly’ ndị ntoroọbịa na-eme n'ọnụ ụzọ ụlọ ọgbakọ ndị omeiwu dị n’Abuja bịa na njedebe n’ike.

    Akụkọ kwuru na a gbara anwụrụ anyammiri nke mbụ, mgbe ụfọdụ ndị ngagharịiwe gbalịrị ịga n'ọnụ ụzọ ụlọomeiwu Naịjirịa dị n’Abuja.

    Nke a bụ mgbe onye bụbu minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Oby Ezekwesili na Omoyele Sowore hapụrụ ebe ogige ngagharịiwe ahụ.

    Cheta na ọtụtụ ụmụafọ Naijiria gụnyere ndị ntoroọbịa, ndị otu kpọrọ onwe ha 'Obidients' na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị malitere ime ngagharịiwe n'ihu Ụlọọmeiwu Naijiria n'Abuja n'ụbọchị Fraide iji gosi iwe ha banyere iwu ntuliaka ọhụrụ nke Ụlọọmeiwu Ukwu Naijiria binyere aka na nsonso a.

    N'ụbọchị Wenezde 4 Febụwarị 2026 ka ndị omeiwu Sineti kwuru na ha ga-akwado mbufe mpụtara ntuliaka n'ịntanetị dịka o dị na Iwu Ntuliaka nke 2022.

    Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

  10. Ihe ndị uweojii kwuru gbasara mmadụ abụọ a tọọrọ n’Umuahia, Abịa Steeti

    Nnukwu egwu adịla n’ụfọdụ mpaghara isi obodo Abịa Steeti bụ Ụmụahịa n’ihi ozi gbasara mmadụ abụọ a tọọrọ n’ime otu ụbọchị n’Ụmụahịa Saụt.

    Ndị obodo kwuru na ọ bụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ọchịehi Fụlanị bu ngwaọgụ mere mwakpo abụọ ahụ.

    Ka ọ dị, ndị nchekwa kọwara ndị mere mwakpo ahụ naanị dịka ndị omekome na ndị ekperima.

    Ọdachi ndị ahụ mere n’obodo Avodim Ubakala nakwa Amakama dịcha n’Ụmụahịa dị n’Abịa Steeti.

    N’obodo Avodim Ubakala, ezinaụlọ na-aga ebe ha na-azụ ezi kwuru na ihe karịrị mmadụ asatọ bu ngwaọgụ wakporo ha na mberede ma gbaa ha okirikiri n’ọnụụzọ ụlọ ezi ha.

    Otu n’ime ndị ọnọdụ a metụtara bụ Ndubuisi Ibegbu gwara BBC na ndị ahụ mere ha mwakpo nyere iwu ka ha nyefee onwe ha, ma yiekwa egwu igbu ha ma ọ bụrụ na ha gbaa isi akwara.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Na nke ọzọ mere n’Amakama, ndị uweojii Abịa Steeti kwuru na ha napụtara ndị ezinaụlọ a tọọrọ n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa Steeti bụ Maureen Chinaka kwuru na ọdachi a bụ nke mbụ ha nwetara mkpesa ya na ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ubakala.

    Ka o sina dị, Chinaka kwuru na Kọmịshọna ndị uweojii Abịa Steeti bụ Danladi Isa ezipụla ndị ọrụ ha na mpaghara ahụ, dịka o kwuru na ndị uweojii gbakọọrọ ndị nche obodo aka iji nyopuo ndị ahụ a na-enyo enyo n’Amakama.

  11. Ndị na-azụ ndịagha Amerịka, ngwaọrụ erutela Naịjirịa – Isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa

    Isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa kwuru na ndịagha mba Amerịka dị otu narị na ngwaọrụ ha erutela Bauchi.

    N’ozi o wepụtara n’ụbọchị Mọnde 16 Febụwarị 2026, ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Samaila Uba kwuru na e zitere ndịagha ahụ dabere na nkwekọrịta nchekwa dị n’etiti Naịjirịa na Amerịka.

    Uba kwuru na Gọọmenti Etiti rịọrọ Amerịka maka enyemaka n’ihe gbasara ọzụzụ ndịagha, nkwado na ịkekọrịta ozi ndị dị oke mkpa.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Dịka Uba siri kwuo, ndịagha Amerịka a bụ ndị ọkachamara, ọrụ ha bụ naanị inye ọzụzụ na ndụmọdụ.

    O kwuru na ndịagha ahụ abịaghị maka ibu agha, kama ihe niile ha ga-eme bụ nke Gọọmenti Naịjirịa ga-ahụ maka ya site na nchịkọta ndịagha Naịjirịa.

  12. "Anọ m na-ehi ụra mgbe nwaodibo ahụ kụrụ m akaọdụ mgbe ọ kugbuchara nwanne m nwoke"

    Nwada Ogechukwu Success Nwite bụ nwanne nwaanyị nwoke ahụ nwaodibo ya ji aka ọdụ kugbuo n'Onitsha Anambra Steeti akọwaala etu ihe a siri mee.

    Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Ogochukwu sị na ọ nọ na-ehi ụra mgbe nwaodibo ahụ a kpọrọ Chiemerie Anieka ji akaọdụ kụọ ya n'isi nke mbụọ, kụọ ya nke abụọ ma tupu ọ kụọ ya nke atọ, o jiri aka ya gbochie nwaodibo ahụ ma gbaa ọsọ ndụ ya.

    "Anọ na-ehi ụra, ihe ọzọ m nụrụ bụ ihe dara n'isi ọ bụrụ akaọdụ nwaodibo ahụ kụrụ m n'isi.

    "Ọ kụrụ m nke mbụ, kụọ m nke abụọ mana tupu ọ kụọ nke atọ, eji m aka m gbochie ma gbapụ ọsọ ịchọ enyemaka."

  13. Onyendu ikike mmadụ na mba Amerịka bụ Jesse Jackson anwụọla ka ọ gbara afọ 84

    Onyendu ikike mmadụ a ma ama na mba Amerịka bụ Jesse Jackson anwụọla mgbe ọ dị afọ iri asatọ na anọ.

    E kwuru na Jackson nwụrụ n'udo n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde abalị iri na asaa nke ọnwa Febụwarị 2026 dịka ezinụlọ ya gbara ya gburugburu.

    "Nna anyị bụ onyendu ma bụkwa odibo - ọ bụghị naanị nye ezinụlọ anyị, kamakwa nye ndị a na-emegbu, ndị na-enweghị olu, na ndị a na-eleghara anya gburugburu ụwa," ka ezinụlọ Jackson kwuru.

    Cheta na Jackson lụrụ ọgụ maka ikike mmadụ n'afọ 1960, ya na Martin Luther King Jr., ma bụrụkwa onye a họpụtara ugboro abụọ maka ịzọ ọkwa onyeisiala n’otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Democratic Party n'afọ 1984 na 1988.

    Akụkọ kwuru na a chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa Parkinson n'afọ 2017, a kpọgakwara ya n'ụlọọgwụ n'ọnwa Nọvemba gara aga maka nleta anya mgbe a chọpụtara na ọ nwere ọrịa ahụ.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  14. Ọchịchị Trump na-ekpuchi ọtụtụ ihe dị na ndekọ Epstein - Hillary Clinton

    Hillary Clinton bụ nwunye onye bụbu Onyeisiala mba Amerịka eboola ọchịchị Onyeisiala Donald Trump ebubo ‘ikpuchi’ ọtụtụ ndekọ gbasara ndekọ ikwa iko Jeffrey Epstein.

    Hillary Clinton kwuru sị “mee ka ndekọ ahụ niile pụta. Ha ji nwanyọọ na nwanyọọ na-eme ya”.

    Hillary gwara BBC nke a na Berlin mgbe ọ bịara ọgbakọ mba ụwa.

    Mana ọchịchị Trump na-ekwu na ‘ha emeelana ndị e mejọrọ ezigbo ihe karịa etu ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Demokrat si meere ha’.

    Mgbe a jụrụ Hillary Clinton ajụjụ na ọ kwadoro ka Andrew Mountbatten-Windsor gaa ụlọ omeiwu ga zara ọnụ ya, ọsịsa ya bụ na "Onye ọbụla a sị ya bịa zara ọnụ ya kwesiri ịga zara ọnụ ya”.

    Mana aha mmadụ ịpụta na ndekọ Esptein apụtaghị na onye ahụ dara iwu ọbụla. Andrew adịla na mbụ kwuo na aka ya dị ọcha.

    Cheta na Bill Clinton ga-aga zara ọnụ ya na Februwarị 27, 2026, ebe Hillary Clinton ga-aga na Februwarị 26, 2026. Mana enwebeghị onye e mejọrọ na ndekọ Estein pụtara boo ha abụọ ebubo imejọ ha maọbụ ịda iwu.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  15. Ụmụ Igbo anyị ekelee unu

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara gị nakwa anyị niile mkpụrụ ọma.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa taa.

    Udo dịrị gị!

  16. Ndị omekoome awakpola ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Anambra steeti

    Ndị omekoome amaghị ndị ha bụ awakpola ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe University nke ndị n'isi obodo Ọka, Anambra steeti n’ụbọchị Sọnde abalị iri na ise nke ọnwa Febụwarị afọ 2026 ma merụọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ ahụ, dịka ụlọmgbasaozi mpaghara si kwuo.

    Akụkọ kwuru na ụmụakwụkwọ ndị ahụ nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị batara ụlọakwụkwọ ọhụrụ nọ na-aga ịgụ akwụkwọ ha tupu ndị ojiegbe nke a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi awakpoo ha n’ụzọ.

    Akụkọ gara n'ihu kwuo na ndị omekome ahụ bepụrụ mkpịsị aka otu nwataakwụkwọ nwoke mgbe ọ na-agbalị ichekwa onwe ya mana ọ nọ n'ụlọọgwụ ugbua.

    E kwuru na ọdachi ahụ mere n'elekere itoolu n’abalị n’okporouzo Ifite.

    E kwukwara na ọnụ na-ekwuchitere mahadum ahụ bụ Louis Njelita kọwakwara nke a dịka eziokwu, kwukwara na onye na-ahụ maka nchekwa na mahadum ahụ na-eme ihe ugbua gbasara imkpa mkpa ahụ mere.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

  17. Ndị ojiegbe egbuola ọtụtụ ndị mmadụ ma tọrọ ụfọdụ na Niger steeti

    Ndị ọchịchị ekwuola na ha hụrụ ozu mmadụ iri atọ na otu na Naịja steeti ebe ndị ojiegbe bu ọgbatumtum bịa mee mwakpo n’ime obodo, gbuo ọtụtụ ndị mmadụ, tọrọ ụfọdụ ma mụnye ụlọ obibi nakwa ụlọ ndị uweojii ọkụ.

    Ufọdụ ndị akaebe nakwa ndị uweojii nọ na steeti ahụ dị na mpaghara etiti Naịjirịa sị kwuo, ndị ojiegbe ahụ mere mkpa mkpa site n'obodo Tunga-Makeri, Konkoso na Pissa.

    Ụlọọrụ gbatagbata na steeti ahụ bụ ‘Niger State Emergency Agency (NISEMA) kwuru na eliela ozu ndị ahụ ha hụrụ n'ime obodo Konkoso dịka a ka na-ahụta ụfọdụ ozu ndị mmadụ.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Ụfọdụ ndị isi obodo ebe e mere mwakpo sị na mkpa mkpa ndị ojiegebe ahụ kpara siri ike ma kwuo na ha bepụrụ aka onyeisi obodo Konkoso bụ onye nọ n’ụlọọgwụ ugbua.

    Ndị ọchịchị sị na ọtụtụ ndị mmadụ gbapụrụ mgbe ndị ekperima ahụ bịara nke mere o jiri sie ike imara mmadụ ole ndị a tọrọ.

    Mana ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Wasiu Abiodun sị na ndị ojiegbe ahụ gburu mmadụ isii na Tunga-Makeri ma tọrọ ọtụtụ ndị mmadụ nke amaghị ọnụọgụgụ ha tupu ha abanye Konkoso na Pissa ebe ha gburu mmadụ ruru iri abụọ.

    Cheta na e gbubụgo ndị ọrụ ugbo ruru iri atọ na abụọ na mpaghara obodo ahụ ndị ojiegbe mere mwakpo ugbua.

  18. Tinubu akpọọla oku ka a tọhapụ osote onyeisiala Saụt Sudan bụ Riek Machar

    Onyeisiala Bola Tinubu ekwughachila ịdị njikere Naịjirịa maka itinye nkwekọrịta udo e tutegharịrị na Saụt Sudan n’ọrụ.

    N’ihi nke a, Tinubu kpọrọ oku ka e mee ngwangwa tọhapụ osote onyeisiala mbụ mba Saụt Sudan bụ Riek Machar nakwa ndị ọzọ a ma ama na-agba gọọmenti ụkwụ.

    Nke a gosiri ọnọdụ Onyeisiala Tinubu, n’ozi o zipụrụ site n’aka osote onyeisiala bụ Kashim Shettima.

    A gụpụtara ozi ahụ n’ọgbakọ ndị isi kara aka n’otu jikọtara mba Afrịka bụ African Union High-Level Ad Hoc Committee for South Sudan, nke a kpọkwara C-5 Plus Summit.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    A haziri ọgbakọ ahụ n’isi obodo Itiopịa bụ Addis Ababa, dịka akụkụ ọgbakọ ndị isi obodo na gọọmenti, agba nke iri atọ na itoolu.

    Onye hụrụ maka ọgbakọ ahụ bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa.

    Tinubu rụtụrụ aka, na Naịjirịa kwụ n’azụ mba Afrịka ndị ọzọ n’ịhụta ọchịchọ ụmụafọ Saụt Sudan maka udo, ezi mmepe na idozi ọgbaaghara ngwangwa.

  19. Gọọmenti adọọla ndị Naịjirịa aka na ntị maka isonye ndịagha mba ọzọ n’ụzọ iwu akwadoghị

    Mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesi nke Naịjirịa adọọla aka na ntị gbasara ihe ọ kọwara dịka mmụba nke ndị mmadụ a na-ewe n'ọrụ n’ụzọ iwu na-akwadoghị iji lụọ ọgụ n'agha mba ofesi.

    Nke a na-abịa mgbe ndị ọrụ gọọmentị Yukren kwuru na ha hụrụ ozu mmadụ abụọ nke ndị Naịjirịa ha kwuru na ha nwụrụ n'agha n'afọ gara aga.

    Gọọmenti Naịjirịa ekwenyebeghị maka ọnwụ ndị ahụ mana n’okwu ha wepụtara n'ụbọchị Sọnde nke ọnụ na-ekwuchitere ndị na-ahụ maka mba ofesi bụ Kimiebi Imomotimi Ebienfa binyere aka, kpughere na "e zigara ọtụtụ ndị Naịjirịa ọnọdụ ọjọọ a metụtara bụ ndị eji ụzọ aghụghọ were n’ọrụ ndịagha n'ebe a na-alụ ọgụ mgbe e duhiere ha ma manye ha ịbịanye aka na nkwekọrịta ọrụ agha".

    Cheta na mba Kenya nyekwara ndị obodo ya ịdọ aka na ntị yiri nke ahụ.

    Dịka ndị ọrụ gọọmentị Naịjirịa si kwuo, nnyocha ha mere na-egosi na ụfọdụ ndị Naịjirịa na-enweta nkwa ọrụ a na-akwụ ụgwọ nke ọma, ọrụ nchekwa, oghere agụmakwụkwọ maọbụ ihe mkpali ịkwaga mba ọzọ, mana mechaa na-ahụta onwe ha n'ebe agha na-aga n'ihu.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  20. Gọọmenti Kwara Steeti ekwuola na ha ga-eme nnyocha banyere mwakpo mere n’obodo Woro na Nuku

    Gọọmenti Kwara steeti ekwuola na ha amalitela ime nnyocha banyere ihe onyonyo ahụ na-efegharị nke gosiri ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị ojiegbe tọọrọ n’obodo Woro na Nuku dị n’okpuru ọchịchị Kaiama nke steeti ahụ.

    Cheta na ndị ojiegbe gburu mmadụ otu narị na steeti ahụ na mmalite ọnwa a.

    A kpọtụrụla ndịisi obodo abụọ ahụ ka nyere aka chọpụta ndị ndị a hụrụ n’onoyonyo ahụ ebe gọọmenti steeti ahụ kwuru na achọpụtala na ụfọdụ ndị nọ n’onyonyo ahụ bụ ndị obodo Woro.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ nchekwa na-enyocha ihe onyonyo ahụ dịka a na-agba mbọ ịchọpụta mmedụ ole ndị ojiegbe ahụ tọọrọ.

    Ndịisi obodo kwuru na mbụ na ọ bụ ụmụnwaanyị na ụmụaka 38 ka a tọọrọ nke gụnyere nwunye na ụmụaka eze ọdịnala obodo.