Ndi bu egbe agbagbuola ndị mmadụ n'ebe abụọ ha wakporo, ma tọrọ ndị ofesi mmadụ abụọ na mgbede Fraide dịka ha na-amanye ndị mmadụ iube isi n' oku nọrọnụlọ abalị ise nke otu alaka otu 'Indigenous People of Biafra'(Ipob) kpọrọ.
Mana ndị uweojii Imo steeti jụrụ ikwu ihe ọbula banyere ọdachi a mere ụnyaahụ dịka mbọ nile a gbara ịnụta olu ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abattam amịtaghị mkpụrụ.
Otu alaka Ipob kpọrọ onwe ha "Autopilot" nke Simon Ekpa na-edu tinyere iwu onye nọrọ n'ụlọ abali ise malite n'ụbọchị Fraide abalị Itoolu nke ọnwa Disemba, afọ 2022.
Mana ndị mmadụ bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị iche iche egeghị ha ndị, kama ha gawara mkpa, mana egwu dagharịrị ka ehihie ruru.
A gbagburu nwanne nwoke Osita Iheme, omeeihe ejije Nollywood a ma ama dịka "Paw-Paw" bụ Chidi Iheme n'Ụbomiri dị n'Okpuru Ọchịchị Mbaitoli n'ehihie Fraide dịka ha na-aga oku achumtavootu nke Akarachi Amadi bụ onye APC na-azọ ịnọchịte ndị Mbaitolu /Ikeduru n'Ụlọomeiwu kpọrọ.
Iheme nọ n’ime ụgbọala Kọmịshọna Imo steeti na-ahụ maka ọnatarachi bụ Martin Eke oge ihe ahụ mere.
Ndị ojiegbe ahụ gbukasịrị Eke mma, e buga Eke ụlọọgwụ a kpọghị aha ya maka nleta.
N'otu aka ahụ, ndị omekataraihedaaụjọ gbukwara ndị mmadụ n'Umuna dị n'Okpuru Ọchịchị Onuimo dịkwa na steeti ahụ.
N' aka nke ọzọ, ndị ojiegbe bu ụgbọala atọ tọọrọ ndị ndịọcha na-elekọta ọrụ okporoụzọ Owere gawa Okigwe nke ụlọọrụ ndị Jamini a ma dịka "Cremburg " na-arụ n' Umunachi dịkwa n'Imo steeti dịka ha gbatuchara ndị ọrụ nchekwa e chere bụ ndị na-echekwa ndịọcha ahụ.
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia na mgbede Fraide nke onye ntaakụkọ huru gosiri okorobia abụọ ọbara juru ahụ tọgbọ nke ndị nọ n'ihe onyonyo ahụ na-ekwu na o mere na Umuna.
Ka ọ dị ugbua, Amadi, onye kọwara Iheme dịka otu na ndị na-enye ya ezi nkwado ya, katọrọ ogbugbu ya nakwa ahụ e merụrụ Kọmishọna Ọnatarachi steeti ahụ.
N'ozi iti aka n'obi nke ọnụ na-ekwuru Amadi bụ Darlington Irobi binyere aka ma wepụta n'abalị Fraide,ọ sịrị, " Ọ bụ n'obi arịrị na mwute ka anyị ji akatọ ihe mere taa n' Amawuihe dị n'Okpuru Ọchịchị Mbaitoli."
"Ozi na a wụrụ mgbọ n'Amawuihe Ubomiri tara isi otu ezi onye nkwado APC bụ Chidi Iheme, oge anyị nọ n'obodo Egbeada na-achụ nta vootu bụ ihe tara ọjị anya."
"Anyị na-akatọkwa wakpo a wakporo Kọmịshọna Imo steeti na-ahụ maka ọnatarachi bụ Martin Eke bụ onye ya na Iheme nọ n'otu ụgbọala."
Ọnọdụ nchekwa akpụọla afọ n'ala n'Ọwụị̀a Anyanwụ kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021 bụ mgbe oke ogbugbu mmadụ, ịwakpo ogige ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ntọ na mpụ ndị ọzọ riri elu.
Gọọmentị Etiti eboola otu Ipob ebubo na ọ bụ ha nyụrụ ihe na-esi.
Mana Ipob agọọla nke onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu agọọla ugboro ugboro site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful na aka ha dị ọcha.
Alaka Ipob nke Simon Ekpa na-edu tinyere nọọnọọ n'ụlọ abalị ise si na ọ bụ iji kwado ndị Biafra nọ n'Ọwụwa anyanwụ maka ikewapụta Biafra na Naijiria bụ nke o kwuru gaemezu n'afọ 2022.
OỌnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful, na ọtụtụ ndị okenye Igbo na ndị onụ na-eru n'okwu gụnyere otu Ohaneze katọọ atụmatụ nọọn'ụlọ ahụ si na ọ bụ ịta ndị Igbo nọrọla n'oke ihe isi ike ahụhụ.