Azọgbuola ihe ruru mmadụ 174 n'ọgbọ egwuregwu n'Indonesia
Ọtụtụ mmadụ nwụrụ ebe ụfọdụ meruru ahụ n'ama egwuregwu dị n'Indonesia.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Anyị anwụchiela Tukur Mamu - DSS
Ebe foto si, Desert Herald Newspaper
Ụlọọrụị DSS ekwuola na ha anwụchiela onye na-enye aka ezipu ozi n'etiti ndị omekome na ezinaụlọ ndị atọrọ bụ Tukur Mamu.
Ha kwuru na ọ bụ ndị otu ndị uweoji Naịjirịa kwụsịrị ya n'ụzọ na mba Ijipt mgbe ọ si ebe ahụ a ga mba Saudi Arabia maka emume Hajj obere.
"Ugbua a akpọlatala ya ala Naịjirịa taa bụ ụbọchị asaa nke Sepụtemba ma nọrọ n'aka anyị" ka ozi ahụ kwuru.
Nwuchi ya so ozi ndị agha Naịjirịa zigaara ibe ha nọ na mba ndị ọzọ inyere ha aka kpọlata Mamu ka ọ bịa zaa ajụjụ gbasara nnyocha ndị ha na-eme metụtara nchekwa obodo Naịjirịa.
Ha kọwara n'ozi ahụ Peter Afuanya binyere aka ka ndị mmadụ mara na iwu ala Naịjirịa ga-esoro usoro kwesiri ekwesi.
Onye bụ Tukur Mamu?
Ọ bụ onye Fika na Yobe steeti
Ya na ụkọchukwu ụka alakụba a ma ama bụ Sheikh Gumi bụ ezigbo enyi
Ọ bụkwa onye enyemaka Sheikh Gumi na mgbasaozi
Ọ bụ ya nwe ụlọ ntaakụkọ a na-akpọ 'Desert Herald Newspaper
Ọ dị afọ 52; ọ na-alụ ụmụ nwaanyị anọ ma mụọ ụmụ iri
Burundi enweela Prime Minster ọzọ!
Ebe foto si, AFP
Ndị omeiwu na mba Burundi ekwekọrịtala ka Gervais Ndirakobuca nọchie anya Prime Minister mba ahụ bụ Alain Guillaume
Bunyoni.
Ha niile kwekọrịtara ka Ndirakobuca nọchịe
Bunyoni bụ onye ekwubeghị ihe ọ
mere.
Nke a na-eme dịka Bunyoni gbaburu ama na ọ nwere ndị ukwu na-achị iwepụ ya n'ọrụ.
O kwuru na ya ga-emeri ndị ahụ ọ sị na-agba ya mgba okpuru.
Onyeisi ụlọọrụ Inec ekwegharịala nkwa na ọ ga-ebipụta aha ndị niile gbatara PVC mgbe adịghị anya
Ebe foto si, Inec?Twitter
Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu arịọla ndị
mmadụ ka ha dere jụụ na ha ga-ebipụta aha ndị
niile gbatara akwụkwọ atụmvootu PVC mgbe adịghị anya.
Yakubu kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị
ntaakụkọ okwu ụnyaahụ n'emume ha mere n'Abuja, mgbe ọ na-azaghachị
ndị na-ebo na Inec agaghị ebibuta ya bụ akwụkwọ igosi ndị niile gbatagoro PVC.
Canada stabbing: egwu ji ndị obodo dịka a ka na-achọ ndị gburu mmadụ aghara aghara gbaa ọsọ
Abalị abụọ ka e gbuchere mmadụ aghara aghara n'obere obodo Saskatchewan dị na Canada, ndị a na-enyoneyo aka ha dị na ya bụ ọchụ ka nọ n'ọsọ.
Kepukepu kwuburu ụbọchị Tuzde na a hụrụ Myles Sanderson na mpaghara James Smith Cree Nation mechere bụrụ asị.
A na-achọ ya achọ kemgbe Sọnde maka igbu mmadụ iri meruo mmadị iri na asatọ ọzọ ahụ.
Ya bụ mnwakpo etinyela ọtụtụ mmadụ ụjọ ahụ n'obere obodo ahụ.
Ndị uweojii adọọla aka na ntị ka ndị mmadụ kee nkwụcha n'ozi ha zipuru n'ekwentị
Ya bụ kepụkepụ maka onye ahụ e jidere emeghị ka obi ndị mmadụ dajụọ na James Smith Cree Nation na obodo dị ya nso bụ Weldon dịka ha ka na-eru uju maka ọnwụ nwa amaala ha bụ gbara afọ iri asaa na asaa bụ Wes Petterson bụ onye e gburu n'ihu ụlọ ya.
Weldone bụ obere obodo ebe mmadụ narị abụọ (200) bi, bụ ebe nwekarịrị otu ogogo ụlọ, ụka abụọ, otu post ofisi, otu ụlọ azụmahịa.
Ọtụtụ ụzọ gbachiri agbachị maka egwu, agbanyeghị na ndị ntaakụkọ juru ebe ahụ.
Otu onye egwu kwere ịgwa BBC okwu bụ Ruby Works sị na ndị mmadụ nọ be ha na-enyo na mpio be ha.
Ọ sị, "egwu ka juru onye obula anya".
Ukraine akwadola UN maka ịkewapụta ogige ebe agaghị akwa mgbo na gburugburu Zaporizhzhia ebe a ruru ogbunigwe nuklia
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky ekeleela ndị isi United Nations maka ịkewepụta ogige nsọ na gburugburu ebe a ruru ogbunigwe nuklịa na Zaporizhzhia.
Ndị agha Russia bụ ndị jichiri ụlọọrụ Nuklịa ahụ kemgbe ya bụ agha amalitere.
Mba abụọ ahụ na-akwakọrịta mgbo n'akụkụ ụlọọrụ ahụ na-arụkọrịta onwe ha aka ụta.
UN na-adọ aka na ntị ka akwụsị ịkwa mgbọ maọbụ itụ ogbunigwe na gburugburu ebe ahụ ngwangwa.
Ha sị na ịtụ ogbunigwe n'akụkụ ebe ahụ nwereike ịkpaze ihe ga-ebute nsogbu.
N'akwụkwọ ha depụtara ụbọchị Tuezde, ndị otu na ahụ maka ogbunigwe nukia bụ International Atomic Energy Agency (IAEA) sị na ụgbụọala agha ndị Russia dị n'ogige ụlọọrụ ahụ nwereike ibute nsogbu ebe ahụ.
Ogbunigwe na-ada ebe ahụ mgbe ndị ọrụ nnyocha IAEA mmadụ 14 nọ ọrụ nnyocha ebe ahụ dịka onye ndụ ndị ọrụ nnyocha ahụ bụ Rafael Grossi na-adọ aka na ntị na mgbọ ndị ahụ nwereike ịkpaze ya bụ ogbunigwe nukia.
Agbanyeghị na ndị ọrụ nyocha ahụ sị ebe ahụ pụọ ka ha rụchara ọrụ abalị abụọ, mana ha sị na ndị otu ha mmadụ abụọ ga-anọgide ebe ahụ.
Zelensky sị na ya ga-akwado ka ndị agha pụọ ebe ahụ maọbụrụ na a ga-amachị ndị agha n'ogige ahụ mee ya ogige nsọ.
Unu asaala chi e! Ya gaziere nwoke na nwaanyí taa bụ Orie.
Azọpụtala ụmụaka iri na ise achọrọ ire na Rivas Steeti
Ndị uweojii Rịvas Steeti ekwuola na ha azopụtala ụmụaka iri na ise n'aka ndị omekome na-agba mgbere ụmụaka.
Ọ bụ kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Friday Eboka kwuru nke a ma sị na ụfọdụ ụmụaka ndị a na nne na nna ha nọ ugbua.
Ha gosikwara ndị ntaakụkọ otu nwaanyị bụ ụkọchukwu adigboroja onye ha na-eche bụ isi sekpụ ntị maka mgbere ụmụaka a.
Nyocha ka na-aga n'ihu.
Ebe foto si, Nigerian Police force/Facebook
Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa
Ndewo anyị na-anabata gị na ọdọ akụkọ anyị taa
Gọọmentị Naijirịa akwụsịtụla ụtụisi 5% nke ekwentị ha chọburu itinye
Gọọmentị
Naijirịa akwụsitụla atụmatụ itinye ụtụisi passentị n’ego a na-etinye n’ekwe ntị
maka ikwu okwu na nke data.
Ọ bụ Isa Pantami
bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na ego ịntanetị Naijirịa kwuru nke a ma sị na
ya onwe ya akwadoghị ya bụ atụmatú n'ihi na ó ga-egbochi iji íntanetí kpata ego.
Panatmi kwuru na ọ nyere onyeisiala Naijiría bụ Muhammadu Buhari ndụmọdụ ka ahara ihiwe ya bụ atụmatụ
Ebe foto si, Professor Isa Ali Pantami/Facebook
Anyị na-arịọ gọọmentị Anambra steeti ha nyetukwuo anyị oge - Miyetti Allah
Nkọwa foto, Ehi a na-achịgharị n'ezi na Naịjirịa
Otu jikọrọ ndị na-achị ehi na Naịjirịa bụ Miyetti Allah arịọla gọọmentị Anambra steeti arịrịọ ka enyetụkwuo ha obere oge.
Onyeisi ha n'Anambra steeti bụ Gidado Sidiki kọwaara BBC Igbo n'ekwentị ihe mere ha ji arịọ arịrịọ a.
Sidiki sị na hanwa bụ ndị na-achị ehi achọọla ịtụgharị ọrụ ha ka ọ banye ọgbara ọhụrụ mana ọ kọwara na atụmatụ ahụ ga-ewe ogologo oge.
"Anyị kwesiri ịkuziri ndị otu anyị ụfọdụ ihe, ma wulitekwa ọnọdụ anyị nọ na ya,nke a ga-ewe anyị ọtụtụ oge nakwa nnukwu ego nke anyị enweghi" ka o kwuru.
Ọ sịkwa na ọ bụrụ na gọọmentị azaghị ha oku, na ha ga-edebe iwu ahụ etinyere nke machiri ịchịgharị ehi n'Anambra steeti.
Cheta na Chukwuma Soludo bụ Gọvanọ Anambra kwuburu n'izuụka ole gara aga na amachiela ehi iji ụkwụ agagharị na steeti ahụ.
Ọ kọwara na nke a bụ iji chekwa ala steeti ahụ nwere n'aka mbuze nke na-eri ala n'ike n'ike.
Idris Salako bụ Kọmịshọna nhazi ụlọ na Legọs steeti arịtuola n'ọkwa.
Nke a na-abịa dịka ụlọ ogogo asaa dara n'akụkụ steeti ahụ akpọrọ Oniru ma gbuo mmadụ ise.
Ọ bụ n'ụbọchị Monde ka ozi Salako ịrịtu n'ọkwa pụtara ihe mana amabeghi mgbe o si n'ọkwa ahị rituo kpọm kwem.
Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu 'kelere Salako maka ọrụ ya niile na steeti ahụ ma kwuo ka ọ gaziere ya n'ọdịnihu'.
Cheta na gọọmentị steeti ahụ anwụchiela ndị niile aka ha dị n'ịrụpụta ụlọ elu ahụ dara n'ụbọchị ụka.
Nkeji Coronavirus
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile maka coronavirus
NDLEA anwụchiela otu nwaanyị na-akụ Igbo be ya
Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Otu nwaanyị bụ ojiegoachụego abanyela n'aka ndị na-alụso ọgwụike agha na Naịjirịa bụ NDLEA dịka ha gara be ya chọta Igbo ọ kụrụ n'azụ ụlọ be ya.
Ha kwuru na ọ bụ isi imi n'ala bụ ihe du ha gaa na be nwaanyị ahụ n'Abuja.
Ha sị kwa na mgbe ha ruru be nwaanyị ahụ dị na Galadimawa ndị ọrụ ha hụkwa mkpụrụ Igbo nke ndị akụbeghi akụ.
Ha anwụchiela nwaanyị ahụ bụ onye Abia steeti dị afọ iri atọ na asatọ ugbua.
E bupụtala ozu atọ ọzọ n'ime ụlọelu dara ada na Legọs
Ebe foto si, NEMA
Ndị ọrụ gbata gbata nke Legọs steeti agụpụtala ozu mmadụ abụọ ọzọ taa bụ Mọnde n’okpuru ụlọ dara n’akụkụ Oniru.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ National Emergency Management Agency (Nema) bụ Ibrahim Farinloye gwara BBC na otu n’ime ndị a bụ nwoke kara nka.
Nke a ga-eme ya ozu mmadụ ise a gụpụtarala n’okpuru ụlọ a.
Nema kwuru a na e nweghi onye ọbụla agụpụtarala na ndụ kemgbe ha malitere ọrụ mgbapụta ebe ahụ.
Cheta na ụlọelu ogogo asaa a dara na mpaghara Oba Idowu nke dị nso n'ụlọọgwụ Ave Maria na Lekki, Legọs Steeti n'ụbọchị Sọnde, Sepụtemba 9.
William Ruto emeriela n'ụlọ ikpe dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba Kenya
Ebe foto si, WilliamrRutoTeam/Instagram
Ụlọikpe kachasị na mba Kenya ekpebiela na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere n'ọnwa Ọgọst 2022 dabara adaba.
Nke a pụtara na mkpọpụta a kpọpụtara William Ruto dịka onye meriri ntuliaka ahụ bụ eziokwu.
Ndị ọkaikpe niile nọ n'ụlọikpe 'Supreme Court' kwenyere na mkpebi a.
Cheta na Raila Odinga kpụpụrụ William Ruto nakwa ngalaba nhazi ntuliaka mba Kenya ụlọikpe, na-ebo ha ebubo nrụrụaka.
Mana ụlọikpe kụchapụrụ ebubo niile Odinga boro ma kwuo na ya bụ ntuliaka kwụ ọtọ.
A na-ele anya mpụtara ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Kenya
Ndị ọrụ nchekwa amụrụla anya ka azụ na mba Kenya dịka a na-eche mkpebi ụlọikpe maka mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere na mba ahụ n'ọnwa Ọgọst afọ a.
Cheta na ọ bụ osote Onyeisiala William Ruto ka a kpọpụtara dịka onye meriri ya bụ ntuliaka, mana Raila Odinga bụ onye ya na ya so zọọ ọkwa ahụ gara ụlọikpe ma boo ebubo na nrụrụaka banyere na ntuliaka ahụ.
Taa ka a na-atụ anya na ụlọikpe ga-ekpebi ya bụ ikpe, nke mere ndị ọrụ nchekwa jiri kee ajị n'ume iji gbochie ọgbaaghara ọbụla nwere ike ịdapụta,
E mechiela okporoụzọ niile gawara ụlọikpe ebe a ga-anọ kpebie ikpe a, ụmụakwụkwọ agaghịkwa akwụkwọ taa.
Ezigakwala ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa na mpaghara dị icheiche ebe e chere na ọgbaghara ga-adapụta.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Raila Odinga na William Ruto
N'afọ ise gara aga, ụlọikpe kachasị na mba Kenya mere ihe tụrụ ụwa n'anya oge ha kagburu ntuliaka ọkwa Onyeisiala nke afọ ahụ, ma nye iwu ka e megharịa ya.
Mana nke ugbua, Raila Odinga chọrọ ka ụlọikpe kpọpụta aha ya dịka onye meriri ntuliaka ahụ, maọbụ kagbuo ya bụ ntuliaka kpamkpam.
Odinga boro ebubo na agụzughị voot o nwetara agụzu, mana ngalaba nhaziaka na-ekwu na nke a abụghị eziokwu.
Odinga chọkwara ka ụlọikpe machie onyeisi ngalaba nhazi ntuliaka nke mba Kenya bụ Wafula Chebukati ịnọ n'isi ntuliaka nke ọhụrụ a ga-ahazi.
Ala, ụlọ, ụlọahia, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ NDLEA chọtara n'aka Abba Kyari
Ebe foto si, Abba Kyari/Instagram
Gọọmentị Naịjirịa ewetala ebubo iri abụọ na anọ ọzọ
megide onye jibu ọkwa Kọmishọna ndị uwe ojii a chụrụ n’ọrụ bụ Abba Kyari.
N'ime ebubo ndị a, ha na-ekwu na a chọpụtara ọtụtụ ụlọ, ala, ụlọahịa nakwa nde kwuru nde naịra n’ọba ego ya.
Abba Kyari bụbu onyeisi ngalaba ndị uweojii a kpọrọ 'Intelligence Response Team', mana ngalaba mgbochi ọgwụike bụ 'National Drug Law Enforment Agency' jichiri ya n'ihi ebubo na ọ na-ebu ọgwụ ike.
N'akwụkwọ ebubo ọhụrụ nke gọọmentị gbara megide Abba Kyari, NDLEA kwuru na chọpụtara ego dị narị nde naịra abụọ na asaa (N207 million) nakwa Є17,598 n'ọba ego ya n'ụlọakụ atọ na Naịjirịa.
N'otu aka ahụ gọọmentị etiti gbakwara akwụkwọ n'ụlọikpe megide Sunday Ubua, bụbu osote Abba Kyari na IRT, ma bụrụkwa onye a chụrụla n'ọrụ ndị uweojii ugbua.
Lee ihe ndị NDLEA sị na ha napụtara Kyari:
Ala: plot 1927 Blue Fountain Estate, Karsana, Abuja
Ụlọ estate nke dị na Linda Chaulker Road, Asokoro Extension
Ala: plot 5 (BO/4546)plot 9 (BO/1037)
plot 10 (CER/4319)
plot 33 (BO/4319); dịcha na Maiduguri, Borno State.
Ụlọahịa (shopping mall) - NE/1229 - na Maiduguri
Ama egwuregwu Polo - plot 270 - na Maiduguri
Ala ubi dị n'okporoụzo si Abuja gawa Kaduna
Ụlọahịa (plaza) a ka na-arụ arụ na mpaghara Guzape, n'Abuja.
Burnaboy, Wizkid, Adekunle Gold... Lee ndị niile tuuru ugo n'emume Headies nke afọ a
Ebe foto si, Getty Images
Emume Headies nke afọ 2022 abịla ma gafee, mana akụkọ ya ka ọtụtụ ndị ntorobịa ka kpụ n'ọnụ ọ kachasị na soshal midia na Naịjirịa taa.
Headies so na nturuugo ndị otiegwu nke a kacha akwanyere ugwu na Naịjirịa.
Ihe pụrụ iche n'emume Headies nke afọ a bụ na e mere ya n'obodo Atlanta nke dị na mba Amerịca.
Ọtụtụ ndị otiegwu a ma ama na Naịjirịa nakwa ụfọdụ ndị ka na-ebilite ebilite ritere nturuugo dị icheiche
Wizkid na Burnaboy gosikwara ihe ha ji bụrụ ndị otiegwu a kacha anụ aha ha na Naịjirịa ugbua.
Onye ọhụrụ kacha mee ọfụma n'afọ a (Rookie of the year) – Fave
Egwu kacha metụ n'obi ('Inspirational Single') – Kcee na Okwesili Eze group - Cultural Praise
Ụtụtụ ọma
Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi.
Nke onye chiri ya zere; ka izuụkaa maara gị mma.
Ngwa, ka anyị zọpụ njem na mgbasaozi anyị nke izuụka a.
Agụputala ozu mmadụ abụọ n'ụlọ dara na Lekki, Legọs Steeti- NEMA
Ebe foto si, NEMA
Ngalaba gbatagbata nke Legọs steti bụ Lagos State Emergency Management Authority bụ LEMA n'aha ịchafụ ekwuola na ụlọ elu ogogo asaa daala n'Oba Idowu nke dị nso ụlọọgwụ Ave Maria dị na Lekki, Legọs Steeti.
Ha kwuru na mmadụ isii ka tọọrọ n'ime ya bụ ụlọ ebe ngalaba gbatagbata nke Naijirịa bụ NEMA n'ịchafụ kwuru na agụpụtala ozu ụmụnwoke abụọ na ya bụ ụlọ dara