Ọpekata mpe mmadụ 21 anwụọla na Kharkiv ebe atụrụ ogbunigwe, Russia na-agba mbọ iwakposi mpaghara Kharkiv ike
Meyọ mpaghara Kharkiv bụ mpaghara nke abụọ kacha ibu na mba Ukraine ekwuola na ihe ruru mmadụ 21 nwụrụ ebe mmadụ 112 merụrụ ahụ dịka ogbunigwe mba Russia dara ebe ahụ.
Gọọmentị mpaghara ahụ kwuru na ha egbochiela ya bụ mwakpo iga n’ihu dịka Gọvanọ Oleh Synegubov kwuru na ọtụtụ ndị ịrọ ha bụ ndị agha Russia nwụrụ ebe ha busoro ha agha n’abali Tuzde.
Ndị agha elu mba Ukraine kwuru na ha meminara ọtụtụ ndị agha Russia mgbe ha batara mpaghara ukwu Kharkiv.

Ebe foto si, EPA











