Imo state: Gọọmenti Naịjirịa amalitela ịkwara mmiri Oguta/Orashi ụzọ banye n'osimiri Atlantic

Ebe foto si, Community reporter
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo agbapeela ọrụ imalite ịkwara mmrịrị Oguta na Orashị dị n'Imo steeti ka ọ banye nke ọma na nnukwu mmiri mba ụwa bụ Atlantic Ocean.
Osinbajo kwuru na ya bụ ọrụ, nke a kpọrọ "Oguta/Orashi River development project", bụ nke ga-eweta ezigbo mmepe na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Ya bụ mmemme ka e mere ụnyaahụ Tọzde 11th Mee 2023 n'okpuru ọchịchị Oguta dị n'Imo steeti.
Osinbajo kwere nkwa na ya bụ "dredging" a malitere na mmiri Oguta bụ iji kwalite azụmahịa na mmekọrịta n'etiti ndị Igbo na obodo ndị ọzọ n'Afrịka nakwa n'ụwa niile.

Ebe foto si, Hope New Media
O kwuru na ndị so na ya bụ nkwekọrịta gụnyere ndị ọrụ agha Naijirịa, gọọmenti Imo steeti, nakwa gọọmentị etiti nke onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isi ya.
N'okwu nke ya, onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Chief Emmanuel Iwuanyanwu kwuru na obi dị ya ụtọ na ụdị mmepe a a na-achọ ka mgbe amalitela, were rịọ ka arụruo ya n'isi njedebe.
Iwuanyanwụ jikwa ohere ahụ rịọ ka onyeisiala Buhari tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu tupu orituo n'ọkwa na Mee 29th.
Onye ji ọkwa Chief of Naval Staff, bụ Vice Admiral Awwal Gambo, kwuru na ya bụ "dredging" nke mmiri Oguta /Orashi ga-akwalite akụnụba Imo nakwa Naịjirịa wee kelee gọọmenti ka o siri nye ndị ọrụ Navy ọrụ nchewa ebe ahụ.
Gọvanọ Hope Uzọdimma dugharịrị ndị niile zukọrọ na ya bụ ebe ịgba akaebe na ọrụ amalitela.
