NDLEA ejichiela ọgwụike e zoro n’ime akpụkpọụkwụ na Lagos

Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Ụlọọrụ na-ebu agha megide ịṅụ na ire ọgwụike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ejichiela ogogo ọgwụike cocaine dị iche iche gụnyere tramadol, pentazocine, morphine sulphate, ketamine na ọtụtụ ndị ọzọ.
Ozi ọnụ na-ekwuru NDLEA bụ Femi Babafemi wepụtara n’ọbaozi ụlọọrụ ahụ n’ụbọchị Sọnde 14 Julaị 2024, kọwara na e zoro ọgwụike ndị ahụ n’ime akpụkpọụkwụ, akwa na ngwongwo ndị ọzọ a chọrọ ịtụga mba Amerịka na Saịprọs.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, ọ bụ ndị ọrụ NDLEA nke ngalaba Directorate of Operations and Investigations (DOGI) nyopuru ọgwụike ndị ahụ na Legọs steeti.

Ebe foto si, NDLEA/Facebook
N’otu aka ahụ, ndị ọrụ NDLEA jichikwara ọgwụike loud arụ ya dị 440 gram nke e si Kanada atụbata Legọs steeti.
Ka osiladị, ndị ọrụ NDLEA nọọrọ n’ụbọchị Wenezde 10 Julaị 2024 jichie otu ụgbọala na mpaghara Ewu Junction dị n’Okpuruọchịchị Esan Central oge ha nwetara kepukepu banyere ya.
Oge ha mere nnyocha, ha chọpụtara na otu n’ime ndị njem nọ n’ime ụgbọala ahụ bụ Aminu Abdullahi gbara afọ iri atọ na abụọ (32) kwajuru ọgwụike tramadol dị puku atọ (3,000) n’ime iko custard.
Mgbe a gbara ya ajụjụ, ọ sịrị na ya zụtara ọgwụike ndị ahụ n’Ọnịcha dị n’Anambra steeti ma buru ya na-aga Mararaba dị n’Abụja ebe ọ chọrọ ịga ree ya.

Ebe foto si, NDLEA/Facebook








