You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chukwuma Soludo anatala asambodo mmeri ya n'Awka
Ụlọọrụ Inec enyefeela asambodo mmeri n'aka Chukwuma Soludo n'ụbọchị Fraịde n'Awka.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Anambra Flooding: Etu ụmụaka enwe-nne 40 si tọ n'ụlọelu 'orphanage' ha n'ihi oke idemmiri
Etu ndị ojiegbe si mee mwakpo n'Ọwụwa Anyanwụ na ngwụcha izuụka
Ọ bụ eziokwu na mmadụ 80 nọ n’ime ụgbọmmiri ahụ kpuru n’Ogbaru?
Ihe ndị ị maghị maka Vincent Ogbulafor
Ka osi gaa n'ikpe 'ntọrọ' Nnamdi Kanu taa- Ọkaiwu Ejiofor
'Inye Peter Obi ụbọchị agbamakwụkwọ anyị bụ naanị onyinye anyị nwereike inye ya'
Ụlọomeiwu Rivas steeti ekepbiela iwepụ oke Celestine Omehia dịka onye bụbụ Gọvanọ
Ụlọomeiwu Rịvas steeti ekpebiela ka Gọvanọ Nyesom Wike kwụsị inye Celestine Omehia oke na ugwu dịka onye bụbu gọvanọ steeti ahụ.
N’okwu nke onyeisi otu pati kachasị n’ụlọomeiwu ahụ bụ Martin Amaewhule, kpalitere, o kwuru ka ha kagbuo mkpebi nke ụlọomeiwu steeti ahụ kpebiri n’abalị 10 nke ọnwa Juun afọ 2015, ka a nabata Omehia dịka aka chịburu steeti ahụ ma nye ya oke niile ruru ya dịka ọkwa ahụ sị dị.
Amaewhule, kwuru na ịnabata Omehia megidere mkpebi Ụlọikpe Kachasị nyere n’afọ 2007 ebe ụlọikpe ahụ wepụrụ Omehia sị na ọ bụghị ya meriri na ntuliaka e mere n’afọ ahụ.
Dịka ha gbaghachara okwu ahụ, mmadụ 21 n’ime ha kwadoro mkpebi ahụ nke Onyeisi ụlọomeiwu bụ Iku-Owaji Ibani, kwuru na ọ bụ ihe ziri ezi.
Cheta na Celestine Omehia nke otu PDP bụbụ gọvanọ Rivas steeti malite n’ọnwa Mee afọ 2007 ruo abalị 25 nke ọnwa Oktoba 2007 bụ oge Ụlọikpe Kachasị wepụrụ ya, sị na ọ bụghị ya meriri na ntuliaka ahụ kama ọ bụ Rotimi Amaechi.
Amaechi meriburu ntuliaka imeụlọ PDP mana pati ahụ wepụrụ aha ya tinye nke Omehia nke mere ka Amaechi kpụpụ ha ụlọikpe ebe o mechara merie.
Ụtụisi gọọmentị na-achọ ịtọgbu anyị - ụfọdụ ndị bi n'Anambra na-ekwu
Ihe dị n'ozi Mike Ozekhome nyere Onyeisiala Buhari maka Nnamdi Kanu
Ụlọ anyị nọ n'okpuru mmiri kemgbe idemmiri a malitere - Ndị bi n'Ogbaru
Aisha Wakil : Etu e si tụọ 'Mama Boko Haram' mkpọrọ
Ihe ụfọdụ kwuru maka ngagharị nkwado e meere Peter Obi n'akụkọ Naịjirịa dị iche iche
Nigeria Independence Day: 'Aga m ahụ na vootu ndị mmadụ kwuru onye ga-emeri na 2023 - Buhari
Timi Dakolo: “Ọ bụrụ na Naịjirịa bụ mmadụ gbara afọ 62 a ga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị”
Etu mmachi otu jikọtara ndị keke si emetụta ndị Anambra steeti
Etu e siri gbuo ndị agha n’Umunze Anambra steeti
2023 Campaign kickoff: Lee ndị niile na-azọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa
Peter Obi: Anyị amaghị ndị otu Afenifere sị na ha agaghị akwado ya
Xi Jinping: Ihe ị kwesịrị ịma maka onyeisiala mba China