You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chukwuma Soludo anatala asambodo mmeri ya n'Awka
Ụlọọrụ Inec enyefeela asambodo mmeri n'aka Chukwuma Soludo n'ụbọchị Fraịde n'Awka.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka mmadụ ikwu okwu nwereike ibute nkewa
CAN asaala El-Rufai n'okwu 'Muslim-Muslim ticket'
Gịnị bụ 'fuel subsidy' a ọha kpụ n'ọnụ ugbua?
Gịnị bụ 'fuel subsidy' a ọha kpụ n'ọnụ ugbua?
Ụfọdụ ihe agaghị echefụ maka ọchịchị Onyeisiala Muhammdu Buhari
Anyị nwuchiri ụfọdụ ndị 'Yoruba Nation' wakporo ụlọọrụ anyị na Legọs Steeti taa - Ndị uweojii
Bola Tinubu Inauguration: Lee nwale ise na-echere onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa
Ooni of Ife, Pete Edochie handshake: Ihe ndị chiri echichi Igbo na Yoruba na-ekwu
Dangote Refinery: Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ụlọ nrụpụta ọhụrụ a
Etu ndị ekperima si wakpo ma gbuo ndị ọrụ mba Amerịka n'Ogbaru
Ụlọịkpe mkpegharị akwụstula ikpe kagburu mmeri Alex Otti
Nke bụ eziokwu na mwakpo ndị ojiegbe mere n'obodo anyị - Awgbu President General
Emmanuel Iwuanyanwu: Ọ bụ isi kara aka ga-ebuli okiti nke Ohaneze Ndigbo
Anambra US Convoy Attack: Ndị uweojii agbapụtala mmadụ abụọ ndị ekperima tọọrọ n'Ogbaru
Gịnị ka gọọmentị Anambra Steeti na-eme iji kwụsị oke ihe mberede okporoụzọ na mpaghara Agu-Awka?
Lee ndị ọkaikpe nọn'isi ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ụlọikpe mkpegharị
Ihe omimi etu e si degharịa mpụtara ntuliaka n'ụfọdụ ebe na Naịjirịa
Kosi kara imalite inyere m aka na nleta nna ya dara ahụ kemgbe afọ 26 – Nne nwaada a magburu
Imo state: Gọọmenti Naịjirịa amalitela ịkwara mmiri Oguta/Orashi ụzọ banye n'osimiri Atlantic
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo agbapeela ọrụ imalite ịkwara mmrịrị Oguta na Orashị dị n'Imo steeti ka ọ banye nke ọma na nnukwu mmiri mba ụwa bụ Atlantic Ocean.
Osinbajo kwuru na ya bụ ọrụ, nke a kpọrọ "Oguta/Orashi River development project", bụ nke ga-eweta ezigbo mmepe na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Ya bụ mmemme ka e mere ụnyaahụ Tọzde 11th Mee 2023 n'okpuru ọchịchị Oguta dị n'Imo steeti.
Osinbajo kwere nkwa na ya bụ "dredging" a malitere na mmiri Oguta bụ iji kwalite azụmahịa na mmekọrịta n'etiti ndị Igbo na obodo ndị ọzọ n'Afrịka nakwa n'ụwa niile.
O kwuru na ndị so na ya bụ nkwekọrịta gụnyere ndị ọrụ agha Naijirịa, gọọmenti Imo steeti, nakwa gọọmentị etiti nke onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isi ya.
N'okwu nke ya, onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Chief Emmanuel Iwuanyanwu kwuru na obi dị ya ụtọ na ụdị mmepe a a na-achọ ka mgbe amalitela, were rịọ ka arụruo ya n'isi njedebe.
Iwuanyanwụ jikwa ohere ahụ rịọ ka onyeisiala Buhari tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu tupu orituo n'ọkwa na Mee 29th.
Onye ji ọkwa Chief of Naval Staff, bụ Vice Admiral Awwal Gambo, kwuru na ya bụ "dredging" nke mmiri Oguta /Orashi ga-akwalite akụnụba Imo nakwa Naịjirịa wee kelee gọọmenti ka o siri nye ndị ọrụ Navy ọrụ nchewa ebe ahụ.
Gọvanọ Hope Uzọdimma dugharịrị ndị niile zukọrọ na ya bụ ebe ịgba akaebe na ọrụ amalitela.