Nnamdi Kanu case today: Anwụchiela ihe dịka mmadụ asaa ndị bịara ịkwado Nnamdi Kanu


Ndị uweojii anwụchiela ihe ruru mmadụ asaa bụ ndị bịara ịkwado Nnamdi Kanu dịka a na-ekpe ya ikpe taa n'Abuja.

Otu Indigenous People of Biafra (IPOB) etinyela ọnụ n'etu DSS si jụụ ịkpọpụta Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.
Chioma Obianinwa


Ndị uweojii anwụchiela ihe ruru mmadụ asaa bụ ndị bịara ịkwado Nnamdi Kanu dịka a na-ekpe ya ikpe taa n'Abuja.

Lee ka onye ọkaiwu ndị otu Ipob si wuchie n'ụlọikpe maka ikpe Nnamdi Kanu.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post

Otu onyeisi ndị uweojii bịara chụsasịa ndị na-akwado Nnamdi Kanu.
Ọ wepụtara egbe ya were chụọ otu onye n'ime ha ọsọ dịka ha were nghọtahe.



Ogige ebe a ga-ekpe Nnamdi Kanu ikpe nke dị n'Abuja deere duu dịka ọtụtụ ndị ntaakụkọ nọ na nkwadọ na-eche ka ya bụ ikpe bido.
Na-agbanyeghị na ọ bụ naanị ụlọ nta akụkọ iri nwere ohere ịji ihe onyonyo sete ya bụ ikpe n'ime ụlọ ikpe, ọtụtụ ndị ntaakụkọ ọzọ na-eche ka ebido.
Lee ihe onyonyo na-egosi etu nchekwa siri dị ebe ahụ ugbua.






Ebe foto si, Ndị ntaakụkọ
Akwụkwọ na-efegharị na soshal midia gosiri ụlọọrụ mgbasaozi iri gụnyere NTA, CHANNELS, AIT, NATION, THISDAY, TVC, HERALD, DAILY INDEPENDENT, NEWS AGENCY OF NIGERIA nakwa ONLINE PREMIUM TIMES dịka ụlọ ntaakụkọ ndị ga-esete etu ikpe Nnamdi kanu si aga.
BBC na Punch esoghị na ya.
Ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ kwuru na yabụ akwụkwọ si n'aka Department for State Services mana ihe anya na-ahụ n'isi akwụkwọ ahụ bụ njirimara 'Federal High Court'nke Naịjirịa.
Anyị ka na-enyocha ka anyị mara nke bụ nke.

Ebe foto si, Arise TV
Ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob.) ga-amalite taa bụ Jụlaị 26, 2021.
Mịnịsta ikpe mabụrụkwa Ọkaiwu Naijiria bụ Abubakar Malami bụ onye gbara ama n’ụbọchị June 29, 2021 oge ya na ndị ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka ma kwuo na anwuchiri Kanu ụbọchịụka(27/6/2021) na mba oke ya jịkọtara ya na Naịjirịa, mana ọ kpọpụtaghị aha mba ahụ.
Jọstis Binta Nyako nke Ụlọikpe Abụja nyere iwu ka e jichie Nnamdi Kanu na mkpọrọ ndị uweojii nzuzo a kpọrọ Department for State Service were rue abalị 26 nke ọnwa Julai bụ oge a ga-akpụpụta ya n'ụlọikpe ọzọ.
Nke ahụ mere dịka ọkaiwu nọchiteregọọmentị etiti bụ Shuaibu Labaran gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ma rịọ ka e jichie Kanu.
Labaran kwuru na ọ dịghị mma ka a hapụ Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa n'ihi na mbụ a hapụrụ ya n'afọ 2017 mana ọ gbara ọsọ.
Gọọmentị etiti kwuru na ha nwụchiri Nnamdi Kanu maka ebuboọhụrụ ịkpa nkata ikewapụ Biafra na Naijiria nakwa ibute ogbugbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ.
Ọkaiwu Kanu bụ Alloy Ejimakor mechara kwuo na ọ bụ na mba Kenya ka a nọ wee nwụchie Kanu mana gọọmenti mba Kenya gọrọ ụkwụ na aka ha.
Ikpe a na-aga n'ihu agbanyeghị na ndị ọkaikpe Naịjirịa nọ ezumike nwantiti oge nke afọ 2021.
Ụnụ asaala chi eeeh.
Ugo eberela na mgbagbu gbasara ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndụ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).
Nọnyere BBC Igbo ka ị wee mata ka ya bụ ikpe si aga!