You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Nnamdi Kanu trial: Etu ikpe ya si gaa taa - Emma Powerful

Otu Indigenous People of Biafra (IPOB) etinyela ọnụ n'etu DSS si jụụ ịkpọpụta Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Nnamdi Kanu case today: Anwụchiela ihe dịka mmadụ asaa ndị bịara ịkwado Nnamdi Kanu

    Ndị uweojii anwụchiela ihe ruru mmadụ asaa bụ ndị bịara ịkwado Nnamdi Kanu dịka a na-ekpe ya ikpe taa n'Abuja.

  2. Okaiwu ndị otu Ipob bụ Alloy Ejimakor awụchiela ụlọikpe

    Lee ka onye ọkaiwu ndị otu Ipob si wuchie n'ụlọikpe maka ikpe Nnamdi Kanu.

  3. Onye uweojii wepụtara egbe chụsaa ndị nkwado Nnamdi Kanu

    Otu onyeisi ndị uweojii bịara chụsasịa ndị na-akwado Nnamdi Kanu.

    Ọ wepụtara egbe ya were chụọ otu onye n'ime ha ọsọ dịka ha were nghọtahe.

  4. Etu ihu na anya dị 'Federal High Court' Abuja n'ụtụtụ a dịka a na-eche ịmalite ikpe Nnamdi Kanu

    Ogige ebe a ga-ekpe Nnamdi Kanu ikpe nke dị n'Abuja deere duu dịka ọtụtụ ndị ntaakụkọ nọ na nkwadọ na-eche ka ya bụ ikpe bido.

    Na-agbanyeghị na ọ bụ naanị ụlọ nta akụkọ iri nwere ohere ịji ihe onyonyo sete ya bụ ikpe n'ime ụlọ ikpe, ọtụtụ ndị ntaakụkọ ọzọ na-eche ka ebido.

    Lee ihe onyonyo na-egosi etu nchekwa siri dị ebe ahụ ugbua.

  5. Naanị ụlọ mgbasaozi 10 ga-esete etu ikpe Nnamdi Kanu ga-esi gaa taa

    Akwụkwọ na-efegharị na soshal midia gosiri ụlọọrụ mgbasaozi iri gụnyere NTA, CHANNELS, AIT, NATION, THISDAY, TVC, HERALD, DAILY INDEPENDENT, NEWS AGENCY OF NIGERIA nakwa ONLINE PREMIUM TIMES dịka ụlọ ntaakụkọ ndị ga-esete etu ikpe Nnamdi kanu si aga.

    BBC na Punch esoghị na ya.

    Ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ kwuru na yabụ akwụkwọ si n'aka Department for State Services mana ihe anya na-ahụ n'isi akwụkwọ ahụ bụ njirimara 'Federal High Court'nke Naịjirịa.

    Anyị ka na-enyocha ka anyị mara nke bụ nke.

  6. Ikpe Nnamdi Kanu ga-amalite taa

    Ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob.) ga-amalite taa bụ Jụlaị 26, 2021.

    Mịnịsta ikpe mabụrụkwa Ọkaiwu Naijiria bụ Abubakar Malami bụ onye gbara ama n’ụbọchị June 29, 2021 oge ya na ndị ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka ma kwuo na anwuchiri Kanu ụbọchịụka(27/6/2021) na mba oke ya jịkọtara ya na Naịjirịa, mana ọ kpọpụtaghị aha mba ahụ.

    Jọstis Binta Nyako nke Ụlọikpe Abụja nyere iwu ka e jichie Nnamdi Kanu na mkpọrọ ndị uweojii nzuzo a kpọrọ Department for State Service were rue abalị 26 nke ọnwa Julai bụ oge a ga-akpụpụta ya n'ụlọikpe ọzọ.

    Nke ahụ mere dịka ọkaiwu nọchiteregọọmentị etiti bụ Shuaibu Labaran gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ma rịọ ka e jichie Kanu.

    Labaran kwuru na ọ dịghị mma ka a hapụ Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa n'ihi na mbụ a hapụrụ ya n'afọ 2017 mana ọ gbara ọsọ.

    Gọọmentị etiti kwuru na ha nwụchiri Nnamdi Kanu maka ebuboọhụrụ ịkpa nkata ikewapụ Biafra na Naijiria nakwa ibute ogbugbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ.

    Ọkaiwu Kanu bụ Alloy Ejimakor mechara kwuo na ọ bụ na mba Kenya ka a nọ wee nwụchie Kanu mana gọọmenti mba Kenya gọrọ ụkwụ na aka ha.

    Ikpe a na-aga n'ihu agbanyeghị na ndị ọkaikpe Naịjirịa nọ ezumike nwantiti oge nke afọ 2021.

  7. Ndewonụ ndị Igbo!

    Ụnụ asaala chi eeeh.

    Ugo eberela na mgbagbu gbasara ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndụ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).

    Nọnyere BBC Igbo ka ị wee mata ka ya bụ ikpe si aga!