Ndị uweojii ekwuola ka ha si nwuchie ndị 'Unknown Gunmen' kpara mkpa n'Owerri taa
Ndị uweojii ekwuola ka ha si nwuchie ndị 'Unknown Gunmen' kpara mkpa n'Owerri taa
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Gwongworo bu ehi akpatala mberede gburu ihe karịrị mmadụ ise n'Awka
Gwongworo bu ehi ebutela ihe mberede kpatara ọnwụ ihe karịri mmadụ ise na ' Kwata Junction' nke dịọ n'Ọka Anambra steeti.
Ndị akaebe na-ekwu na onye na-anya ya bụ ụgbọala nwere ohere igbochi ya bụ mberede kama ha kwuru na ọ nyabara ya bụ gwongworo n'ebe ụgbọala ndị ọzọ nọ.
Ya bụ gwongworo gbakwunyere ụgbọala asaa.
Ihe mberede a metụtara ndị na-ere ahịa, ndị nọrọ onwe ha n'ime ụgbọala na ndị na-agafe.
Dịka o siri dị, ndị uweojii na ndị na-ahụ maka njem ụgbọala na Naijirịa bụ FRSC n'aha ịchafụ ekwubeghi mmadụ ole nwụrụla na ya bụ ihe mberede.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ kwuru na ndị Uweoji na ndị agha nọ ebe ahụ mana ha enweghị ike ịkwụsị ihe na-eme n'ihi egwu na kwa ọnụ ọgụgụ ụmụ ntorobịa nọ ebe ahụ.
Kama ugbua agha amalitela ịgba egbe iji chụsasia ndị nọ ebe ahu.
Usman Alkali Baba aghọọla Onyeisi ndị uweojii kpomkwem
Ebe foto si, NPF
Kaụnsụl na-ahụ maka ndị iweojii bụ 'Police council' na Bekee ebinyela aka ka Usman Alkali Baba rụrụ ọrụ gawa n'ihu dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria.
Ha nwere mkpebi a ụbọchị Fraide n'Abuja n'ọgbaka Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isi ya.
Minista na-ahụ maka okwu metụtara ndị uweojii bụ Maigari Dingyadi,bụ onye gbaara ndị ntaakụkọ ama a n'Abuja ụbọchị Fraide.
Cheta na Buhari họpụtara Usman Baba ka ọ rụwa dịka onyeisi ndị uweojii n'abalị isi nke ọnwa Eprelu dịka a chụturu Mohammed Abubakar nọ n'ọkwa ahụ oge ọ gara njem ọrụ n'Imo steeti.
Glazer so nwere Manchester United ga-aga ọgbakọ ndị nkwado ha
Joe Glazer bụ otu n’ime ndị nwe otu egwuregwu Manchester United ga-apụta isonye ndị nkwado ha na mkparịtaụka, n’ihe bụ mbụ ọ na-eme ya kemgbe afọ iri na ise o ji nwere ya bụ otu egwuregwu.
Nke a na-abịa dịka Glazer kpebiri itinye uchu n’ịnabata atụmatụ ndị nkwado ha dịka ha mechara ngagharịiwe megide ya mgbe Man Utd so binye aka n’ihe gbasara asọmpi European Super League.
Gọvanọ Kwara steeti bụ Abdulrahman Abdulrazaq akwaala arịrị maka nwaada ahụ nwụrụ ka adịnchara ya n'ike
Ebe foto si, Abdulrahman Abdulrazaq?Twitter
Abdulrahman
Adbdulrazaq bụ aka na-achị Kwara steeti, akatọọla ndina n'ike nakwa ogbugbu
Olajide Omowumi Blessing bụ nwaakụkwọ mahadum Ilorin.
O kwuru na o nyela ndị nchekwa iwu
ka ha sie imi n’ala siputa ndị kpara arụ a, ebe ọ kasikwara ezinaụlọ nwaada ahụ
na ndị ma ya obi.
Egwu akwaala Alexanda-Arnold n'asompi Euro 2020
Ebe foto si, Reuters
N'egwuregwu, egwu ahọọla Trent Alexanda-Arnold nke England n'asọmpi nke Euro 2020 n'abịabụ.
Arnold meruru ahụ n'asompi egwuregwu enyi na enyi nke ha na Austria gbara ụbọchị Wenedzde.
Ndị uweojii Hong Kong anwụchiela otu nwaada ama ama maka ịme ngagharịiwe maka ọgbaaghara Tiananmen Square
Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, anwuchiela nwaada Chow Hang Tung dịka emume ncheta ndị nwụrụ n'ọgbaghara Tiananmen Square Hong Kong nke ugboro iri atọ na abụọ na-akpudebe nso.
Hong Kong amachielarị ya bụ emume dịka ha na-ebo nwaanyị ahụ ebubo ịkpọ ọgbakọ n'ụzọ iwu anabataghị.
Abaribe akatọọla aka gọọmentị ji eso ọgbaaghara n'ala Igbo
Onyendụ pati ejighị ọchịchị n'ụlọ omeiwu ukwu bụ Enyinnaya Abaribe akatọọla usoro gọọmentị etiti ji eso ọgbaghara dapụtara na mpaghara ọnwụnwa anyanwụ Naịjirịa.
Abarịbe sị na ndị ọrụ nchekwa na-anwụchi ụmụokorobịa aka ha dị ọcha n'ụdị na ha na-achọ ndị omekome na-emebi ihe.
Ụmụibe unu asaala Chi ee! Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị
Naịjirịa aghọọla ebe iru uju na obi ọjọọ na-eru ka mmiri - Obasanjo
Nkọwa foto, Olusegun Obasanjo
Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo atụọla arịrị na Naịjirịa
kwesịrị ịbụ obodo mmiriara na mmanụaṅụ na-eru na ya abụrụla obodo ilu na obi ọjọọ
jupụtara.
Obasanjọ kwuru nke a n’ụbọchị
Tọzde n’Abeokuta, ma rịọ ka ndị ọnụ na-eru n’okwu jikọọ aka ọnụ tụọ alo iji zọpụta
Naịjirịa.
O kwuru nke a oge ọ natara akwụkwọ nke ode akwụkwọ bụ Femmy Carena dere maka ya.
Obasanjo kwuru sị: "Ekpere m bụ ka anyị niile tikọọ aka ọnụ ma mee obodo a ka ọ bụrụ ihe Chineke kere ya ka ọ bụrụ - ebe mmiri ara na mmanụ aṅụ na-eru."
"Ka ọ dị ugbua, ala anyị bụ ebe iru uju na obi ọjọọ naeru, ọ bụghị ihe a ka Chineke chọrọ ka anyị bụrụ."
"Anị ka ọ dị n'aka ịgbanwe akụkọ obodo. Anyị kwesịrị iji olu ọma dụọ onwe anyị ọdụ."
Ndị otu nzuzo gbara otu nwoke egbe n'Enugwu
Ebe foto si, NPF
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na nwaokorobaia ndị amaghị egbe egbe bụ aka ọrụ ndị otu nzuzo.
Oke na ngwere nọ n'ọsọ n' Agbani Road, Enugwu n'ụtụtụ Tọzde dịka ndị amaghị ndị ha bụ ji egbe gbatụru otu nwaokorobia.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ David Ndukwe kwuru n'ozi o wepụtara na " ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu nzuzo gbara otu nwookorobịa n'okporoụzọ Agbani Road, nso ahịa Gariki dị n' Awkunanaw Enugwu".
Ndukwe, onye kwuru na ndị uweojii gbugara nwa amadi ahụ buga ya ụlọọgwụ ebe ọ na-anata nleta.
Ọ gbara ama na Kọmishọna ndị uweojii Kọmishọna ndị uweojii bụ Mohammed Ndatsu Aliyu, psc, enyela ntuziaka ka ngalaba ndị uwejii na-ahụ maka mgbochi nzuzo mee nnyocha iji nw uchi ndị kpara mkpamkpa ahụ.
Nigeria vs Cameroon: Lee ebe i ga-ekiri asọmpi a ga-adị n'ụbọchị Friday
Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa na Cameroon ga-ezute onwe ha n'asọmpi enyi na enyi n'ụbọchị Fraịde, abalị anọ nke ọnwa Jun, nakwa ụbọchị Tuzde, abalị asatọ nke ọnwa Jun afọ 2021.
Nke a ga-eme ya nke ugboro 23 na 24 mba abụọ a na-ezute onwe ha n'asọmpi bọọlụ.
Kamgbe afọ 2000, Cameroon emeribeghị Naịjirịa n'asọmpi bọọlụ, mana ọtụtụ na-ekwu na nzute nke a ga-akpụ ọkụ n'ọnụ.
Etu ị ga-esi lee asọmpi a
Ebe foto si, Getty Images
Ya bụ asọmpi ga-adị n'obodo Vienna nke bụ isi obodo mba Austria.
Ọ bụ n'elekere asatọ n'ọkara nke abalị Fraịde ka ya bụ asọmpi ga-ebiri ọkụ.
Ụlọọrụ mgbasaozi egwuregwu bụ Super Sports kwuru na ha ga-egosi asọmpi a n'akara 204.
Ugboro ole Naịjirịa na Cameroon zuterela onwe ha
Ebe foto si, Getty Images
Oge ọbụla Naịjirịa na Cameroon zutere onwe ha n'asọmpi bọọlụ, ọ na-adị ka ebe enyi abụọ gbara mgba.
Mba abụọ a so na mba ndị kacha agba bọọlụ na mpaghara Afrịka niile.
Lee ugboro ole mba abụọ a zuterela:
26 Apr 1960 Nigeria 0-0 Cameroon, Asọmpi enyi na enyi
08 Dec 1962Nigeria 3-1 Cameroon Nkrumah Cup
15 Apr 1963 Cameroon 1-3 Nigeria Asọmpi enyi na enyi
31 Aug 1967 Nigeria 1-1 Cameroon Asọmpi enyi na enyi
07 Dec 1968 Nigeria 1-1 Cameroon Ntozu oke makaIko mba ụwa
22 Dec 1968 Cameroon 2-3 Nigeria Ntozu oke makaIko mba ụwa
22 Jan 1975 Nigeria 1-0 Cameroon Asọmpi enyi na enyi
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa etinyela iwu ọhụrụ nke ewetara n’isi njedebe ịkpaoke dị n’etiti ndị ji asambodo Degree na nke HND n’ọrụ oyibo Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka kọmiti na-ahụ maka ụlọọrụ gọọmentị nakwa ụlọakwụkwọ dị elu wepụtachara ozi si na nnchọpụta ha mere.
Ozi ahụ kwuru na iwepụ nkewa ahụ ga-eme ka e mewa onye etu e mere ibe ya, ma nye aka inweta ndị nwere nka ga-egbo mkpa Naijiria ebe ọ dị uju.
Twitter na-eme ihu abụo - Gọọmentị etiti
Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed, ebola ụlọọrụ Twitter ebubo ime ihu abụọ maka ihichapụ ozi onyeisiala Muhammadu Buhari dere.
Onyeisiala Buhari wepụtaburu ozi na Twitter ebe o kwuru na ya ga-eji anya ihe mere n'Oge Agha Biafra were gwara ndị na-eti mkpu nnwereonwe okwu na-asụsa ha ga-aghọta, nke ọtụtụ hụrụ ndịka okwu mmaja na-echetara ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ihe ha gabigara n'oge agha.
Ebe foto si, Lai Mohammed/Facebook
Ọ bụ ụgha na anyị mechiri ụlọọrụ anyị niile n'Ọwụwa-Anyanwụ - First Bank
Dịka ụfọdụ ndị mmadụ buru akụkọ na ụlọakụ First Bank emechiela ụlọọrụ ha niile dị na mpaghara Ọwụwa-anyanwụ kpam kpam, ha apụtala kwuo na ọ bụghị eziokwu.
Folake Mumuni bụ ọnụ na-ekwuru ha kwuru na ụlọọrụ ha niile dị na mpaghara ahụ mepere emepe, ma sị ndị mmadụ leghara akụkọ ụgha ahụ na-efegharị.
@YemieFASH dere na Twitter ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Juun na ụlọakụ ahụ emechiela ụlọọrụ ha niil dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ, nke mere ka ndị mmadụ kpụrụ ha n'ọnụ.
Ebe foto si, Twitter/YemieFash
@YemieFASH mechara degharịa na ọ bụ nghọtaghịe, na ọ bụ n'ihi nọrọ n'ụlọ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra tinyere n'ụbọchị 31 nke ọnwa Mee.
Kingsley Moghalu bụ onye zọburu ọchịchị ọkwa onyeisiala akatọọla okwu
onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru gbasara “ịsa ndị na-eme ọgbaghara n’asụsụ ha
ga-aghọta”.
Moghalu kwuru na ihe a abụghị ụdịrị okwu onyeisiala ọbụla kwesịrị ikwu ọkachasị
ebe mba ya nọ n’ụdịrị ọnọdụ nchekwa ọ nọ, n’ihi na o nwereike ikpasu iwe.
Ọ sị na ọ ghọtara ebe Onyeisiala Buhari si abịa n'ihe gbasara iwe ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche a na-emebisi.
Moghalu sị na Onyeisiala Buhari kwuteburu ihe ọ na-ekwu gbasara ndị na-achọ nnwereonwe ebe dịka o kwuru na ndị na-akwanye ọkụ na-achọ agha bụ ndị na-ahụghị agha, mana o mebiri okwu ya mgbe o kwuru sị na "ọ ga-asa ha n'asụsụ ha na-aghọta".
O kwuru sị na ọ hụrụ agha oge ọ dị na nwata wee mara na agha bụ ajọ ihe, na ọ bụ ihe e kwesịghị itinye isi na ya maọlị.
Gọvanọ Zamfara steeti achụọla ndị ọrụ ya niile
Bello Matawalle bụ aka na-achị Zamfara steeti achụọla ndị ọrụ ime obi ya
niile.
Ka o mere nke a, o kwuru sị ka ha niile nyefee ọchịchị n’aka ndị kacha
selite isi n’ụlọọrụ ndị ha na-achịkọtabu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ancelotti agbaala Everton alụkwaghịm ma laghachị Real Madrid
Ebe foto si, Getty Images
Carlo Ancelotti bụ onye nkuzi ndị Everton alaghachila azụ na Real Madrid
nke ugboro abụọ.
Ọ ga-anọchi anya
Zinedine Zidane dịka o tinyegoro Real aka n'akwụkwọ afọ atọ na-abịanụ.
Cheta na Ancelotti buliri iko anọ mgbe ọ chịkọtara Real Madrid site n'ọnwa Juun 2013 ruo Mee nke 2015.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
'Ọnweghị ihe dị njọ n'ime Mee 30 ụbọchị ezumike n'ala Igbo' - Umahi
Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ekwuola na onweghị ihe dị njọ ime Mee 30 ụbọchị ezumike maka ndị egburu n'agha Biafra na Naịjirịa.
O kwukwara na ọ bụ ụmụ Igbo ji aka ha emebi ala Igbo, na ọ bụghị ndị ọbịa.
Umahi kwuru nke a na mkparịta ụka ya na Channels TV ụnyaahụ.
Ọ sị na ndị na-emebi ihe n'ala Igbo abụghị 'unknown gunmen" na ọ bụ ụmụ Igbo ji aka ha emebi ihe ha nwere.
Umahi turu ilu si na "onye kpatara nkụ ahụhụ sị ngwere bịara ya ọrụ", dịka ọ na-akọwa na ọ bụ ụmụ ikorobia Igbo bụ ndị ọdịnaihu Igbo di n'aka ji aka ha emebi ihe ha.
Ọ jakwara ndị ọrụ nchekwa nọ n'Ebonyi steeti mma maka otu ha siri nwere obi umeala arụ ọrụ agbanyeghị iwe niile ana akpasu ha.
O wutere ya maka ndị ọrụ nchekwa niile egburu n'ihu ọrụ ma kwado ha maka ịzọ isi onwe ha mgbe ọnọdụ tawara ike.