Lee ka ọkụ si gbaa ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo dị na Lagos

Ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo bụ ebe a na-ere akụrụngwa ụgbọala na Legọs, nwurula ọkụ n'isi ụtụtụ Sọnde.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Anyị ga-ewulite ogige ebe a na-achị ehi na Naịjirịa - Ụlọọrụ Onyeisiala

    Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Garba Shehu/Twitter

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na a ga-ewulite ogige ebe a na-azụ ehi niile dị na steetị di iche iche iji gboo nsogbu ndị ọchi ehi na ndị ọrụ ugbo.

    Nke a dị n’ozi onye ndụmọdụ ya bụ Garba Shehu wepụtara bụ ebe ọ katọọrọ mkpebi ndị gọvanọ Ndịda Naịjirịa na mkpebi ha ịmachi nchịgharị ehi.

    Shehu sị na ịmachi ngagharị njem nke ndị gọvanọ a mere megidere iwu na nwereonwe na Naịjirịa nke bụ na onye ọbụla nwere ikike ibi maọbụ gaa ebe ọbụla masịrị ya na Naịjirịa.

    Ọ sị na atụmatụ a bụ nke minista na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ Sabo Nanono wepụtara ma degaara onyeisiala bụ nke o binyere aka na ya n'ọnwa Eprelụ.

  2. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  3. Joe Igbokwe ekwuola maka akụkọ na-awakporo ya nso nso a

    JOE IGBOKWE

    Joe Igbokwe bụ onye ndụmọdụ nye gọọmenti Lagos steeti n'ihe gbasara mkpocha na nzacha gburugburu Lagos steeti ekwuola na akụkọ na ndị ntoroọbịa wakporo ya na Lagos na nso nso a bụ okpotokpo asị.

    Igbokwe gwara BBC Igbo na ndị na-ebugharị akụkọ ahụ na-ekwu ya dịka ihe ha chere ya n'echịche mana ọ gaghị emezuru ha.

    Akụkọ pụtara n'izu ụka gara aga na ndị ntoroọbịa bi na Legọs wakporo nwa amadi a ka ya na ọkwọ ụgbọala ya na-agba n'ezi mana ha lara ije dịka ha riri mbo mbo ọsọ.

  4. Ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steetị ga-aga n'ihu n'ọnwa Nọvemba - INEC

    Ndị na-eme ntuliaka

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ Independent INEC ekwuola na na-agbanyeghịọkụ gbarala ụfọdụ ụlọọrụ ha dị na n'Ọwụwa anyanwụ, na ha ga-aga n’ihu ime ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti ga-adị n’ụbọchị isii nke ọnwa Nọvenba afọ 2021

    Festus Okoye bụ ji ọkwa National Commissioner na Information and Voter Education Committee kwuru nke a n’akwụkwọ ozi o zịgara ndị ntaakụkọ nso nso a.

    Okoye sị na ọkụ nke gbara n'ụlọọrụ ha dị n'Anambra steetị mebiri ọtụtụ ihe mana o metụtaghị igwe kaadị reader.

    Ọ sị na ndịisi ụlọọrụ Inec zukọrọ n'ụbọchị Mọnde iji mara ka ha ga-eji kee nkwụcha banyere etu e si awakpo ọtụtụ ụlọọrụ ha dị n'Ọwụwanyanwụ.

  5. BBC Nkeji nke ụtụtụ

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  6. Igbo mma mmanụ oo!

    Njem iwetere ụnụ akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ amalitela!

    Sonyere anyị.

  7. Anyị nwụchiri ndị omekome abụọ ma napụta ha ọtụtụ egbe - Uweojii Ebonyi

    Ihe a natara ndị omekome

    Ebe foto si, Ebonyi police

    Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola etu ha si nwụchie ndị omekome abụọ a na-eche bụ ndị ohi ma napụta ha ngwaọgụ dị iche iche.

    Ha kwuru na ha nwụchiri otu nwamadi bụ Eluu Ekpehu Emmanuel, kpọrọla ha gaa n'ụlọ onyeisi otu ha a ma dịka 'blood' bụ ndị na-enye mpaghara okpuruọchịchị Isu Onicha nsogbu.

    Ndị uweojii kwuru na a na-eche na ọ bụ Blood du ndị omekome wakporo ụlọọrụ ndị uweojii atọ dị n'Onicha, Abaomege na Ohaozara nso nso a.

    Ha kwuru na Blood na ndị otu ya malitere ịkwa ndị uweojii mgbọ mgbe ha rutere, mana ha nwụchiri Blood mgbe mgbọ egbe merụrụ ya ahụ dịka ndị ọzọ bucha mmerụ ahụ gbaba n'ime ọhịa.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Loveth Odah, kwuru na a chọtara ọtụtụ ngwaọgụ gụnyere:

    • Egbe abụọ na mgbọ iri na otu
    • Osisi ndị uweojii atọ
    • Otu ogbunigwe
    • Otu gaasị anyammiri
    • Mgbado ukwu ndị uweojii abụọ
    • Ekwentị redio ndị uweojii abụọ bụ nke e zuru mgbe a wakporo ma gbaa ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ohaozara ọkụ n'ụbọchị anọ nke Febrụwarị 2021
    • Ọkọlọtọ ndị Biafra anọ
    • Otu igbe nsị

    Ndị uweojii kwuru na a kpọgara onye merụrụ ahụ n'ụlọ, ebe ọ nọ nwụọ.

  8. Jiri otu nkeji gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa

  9. Ndị India nwụrụla n'ọrịa coronavirus akarịala puku narị atọ

    Onye na-arịa coronavirus

    Ebe foto si, Reuters

    Ọrịa coronavirus ka na-anyụ ndị mba India ịkpakwụ dịka o gbuola ihe karịrị mmadụ puku narị atọ ugbua dịka ọrịa a ka na-amụba.

    Ndị ọkachamara sị na ọnụọgụgụ a nwereike ịkarị, na e nwere ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ a na-edebanyeghi n’akwụkwọ.

    Ndị buterela ọrịa n'India eruola nde iri abụọ na isii - ndị abụọ na-esote mba Amerịka mana ugbua ọ bụ ebe ọrịa a kachasị akpa ike.

    India bụ ndị atọ n'ụwa ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọrịa a ga-akarị puku narị atọ na-esote Amerịka na Brazil.

    O weghi ihe ruru otu ọnwa ka ọnụọgụgụ ruo otu puku narị nke ikpeazụ a.

    Coronavirus nke ugboro abụọ malitere na mba India n'izuụka abụọ gara aga kpụụ ọkụ n'ọnụ ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ bụ nke karịrị ndị ọrụ ahụike ha aka.

    Igwe e ji eku ume na ọgwụ kọchara n'ọtụtụ ụlọọgwụ.

  10. Etu ndị ngagharịiwe si kpochie ụzọ awarawa si Abuja gawa Kaduna

    Ndị obodo Guaraka na-eme ngagharịiwe

    Ndị obodo Guaraka dị na Niger Steetị emeela ngagharịiwe ma kpochie ụzọ awarawa si Abuja gawa Kaduna maka oke ntọrị mmadụ na-eme n’obodo ha.

    Ndị a kpọrọ mụnyere ọkụ n’ụzọ ma sị gọọmentị etiti wulite ọnọdụ nchekwana mpaghara ebe ha iji kwụsị oke ntọrị.

    Nke a na-abịa dịka ndị ntọrị wakporo ogige ahụ ma tọọrọ mmadụ karịrị iri na ise ma gbuo mmadụ atọ n'ụbọchị Satọde na Sọnde.

    Ndị obodo Guaraka na-eme ngagharịiwe

    E nwere kepukepu na-ekwu na ndị Boko Haram batara n'obodo Guaraka mgbe Gọvanọ Abubakar Bello kwuchara ha ndị oyi ndụ egwu a konyere ọkọlọtọ ha na Niger Steetị n'ọnwa Eprelụ.

    Obodo Guaraka ji ihe dịka kilomita ise dị nso n'isiobodo Nịajirịa bụ Abuja.

    Ndị obodo ahụ sị na ha anaghị ehizi ụra maka mkpamkpa ndị n'obodo ha.

    Ha kọwaara na a tọrọla ihe karịrị mmadụ otu narị kamgbe ọnwa Jenụwarị rute ugbua.

  11. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  12. Lee ihe e mere ndịagha ha na General Ibrahim Attahiru nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu

    Attahiru

    Ebe foto si, Nigerian Army twitter page

    Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka efetụnata ọkọlọtọ n’ogo ọkara n’ụlọ gọọmenti niile dị na Naịjirịa bịdọ taa bụ Mọnde ruo Wednesday.

    Odee akwụkwọ gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha kwuputere nke ama kwukwa na ọ bụ iji kwanyere onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Lieutenant General Ibrahim Attahiru na ndị agha ndị ọzọ nwụrụnụ ihe mberede ụgbọelụ n’ụbọchị Fraide.

    Mustapha kwukwara na onyeisiala Buhari ekwuola ka ndị agha Naịjirịa were Mọnde (May 24, 2021) dịka ụbọchị ezumike.

    Cheta na e liri Attahiru nakwa ndị agha iri ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ọdọ ụgbọelu n'ụbọchị Satọde na "National Military Cemetery" dị n'Abuja.

  13. Nkeji BBC nke ụtụtụ

    Gere akụkọ BBC Igbo n'ime otu nkeji.

  14. Njiji ndị oji egbe ejiela n'Awka dị n'Anambra steeti

    Ụlọ na-agba ọkụ

    Ebe foto si, INEC

    Ndị oji egbe agbaala isi ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) dị n’Awka n’Anambra steeti ọkụ ụbọchị ụka gara aga.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwetere na ya bụ mkpa mkpa kpara mana ọ matachabeghị ka o si mee.

  15. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo!

    Nke onye chiri ya zere o.

    Anyị na-ewetere ụnụ akụkọ niile dị mkpa n'ala Igbo nakwa mba ụwa. Sonyere anyị.