You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

"Ọ bụ ekpere ga-azọpụta Naijirịa n'aka ndị Omekome" - Enoch Adeboye

Ụkọchukwu ukwu nke Redeemed Christian Church of God emeela njem nleta na nke gọvanọ Ekiti steeti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Oby Ezekwesili ekpeela Omojuwa n'aka ndị uweojii

    Oby Ezekwesili ekwuola na o kpesala Omojuwa bụ onye nwe ụlọorụ Alpha Reach n'aka ndị uweojii.

    Dịka o si kọwaa n'akara Twitter ya, o kwuru na ụlọọrụ ahụ azaghị ajụjụ ọ jụrụ ha maka etu ha si mee ya onyeisi n'ụlọorụ ahụ n'ajụghị ha.

    Cheta na Japhet Omojuwa banyere na nsogbu mgbe ọ pụtara ihe na ya na ndị na-eme mkpọtụ ozi akpọrọ influencers' na Bekee na-achọ ka atọghapụ otu nwoke bụ Alex Saab nke ejichiri na Cape Verde maka ebubo mpụ.

    Ihe ọzọ pụtara bụ na Ezekwesili soro bụrụ otu ndị onyeisi ụlọorụ ahụ nke ọ gọrọ kpam kpam ma kwuo na ọ maghị mgbe nke a jiri mee.

    Nke a mere ka o jiri ndị ọkaikpe ya zigara Omojuwa ozi sị ya weta ihe akaebe igosi na ọ kwenyere ịsonye n'ụlọorụ ahụ.

    Japhet zaghachikwara Oby n'onwe ya.

  2. Ebe Coronavirus kwụ n'Afrịka taa

  3. "A nwụọla m" - Etu nwaanyị e zuru nwa ọhụrụ ya si tipu mkpu

    Ndị ụweojii n’Imo steeti ekwuola na ha ka na-enyocha akụkọ na-efegharị na agbakara ụzọ zuru nwa dị ọnwa atọ n’ụlọ otu nwaanyị.

    Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ gwara BBC Igbo n’ekwentị na “ọ hụrụ ya bụ akụkọ na soshal midia mana ọ na-eme nyocha nke ya”.

    Nwaanyị ahụ ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru bụ Chidinma Silas kwuru na ọ kpọchiri ụmụ ya abụọ gụnyere nwa ya ọzọ dị afọ abụọ nakwa nke taata dị ọnwa atọ were pụọ ịzụta ihe.

    Ọ sị na mgbe ọ batara ọ hụ na igodo o ji kpochie ụzọ dịka mmadụ emetụla ya aka.

    O kwukwara na ọ gara kpesaara ndị uweojii nakwa ndị isi n’Esteeti ebe o bi n’Owerri dị n’Imo.

  4. O nweghị ala enweghị onye nwe ya n’ala Igbo - Ohaneze Ndigbo

    Otu Ohaneze Ndigbo agwala ndị mbịara mbịara nọ n’ala Igbo na o nweghị ebe ọbụla n’ala Igbo enweghị onye nwe ya.

    Onyeisi otu ahụ bu Ọkammụta George Obiozor, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere ụbọchị Tọzde n’Enugwu, kwuru na ebe niile n’ala Igbo nwere onye maọbụ arụsị nwe ya.

    “E nweghị ala mmadụ enweghị n’ala Igbo. Ala bụ ihe e jighị egwu egwu n’ala Igbo maka na ala nwere ndị nwe ya, arụsị so nwere ala n’ala Igbo. Ndị na-aba n’ala Igbo na-achọ ndị be anyị na arụsị anyị okwu.”

    Okwu a na-abịa dịka akụkọ mwakpo ndị e chere na ha bụ ndị ochiehi na-arị elu n'Ọwụwa-anyanwụ.

  5. A wakpoghi ụlọakụ ọbụla n'Ogbunike - Ndị uweojii Anambara steeti

    Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na enweghi mwakpo ọbụla e mere n'ụlọakụ dị n'Ogbunike, n'okpuruọchịchị Oyi, ụnyaahụ.

    Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na e nwere ọgbaghara n'ahịa Oye Olisa dị nso ụlọakụ, mana ndị omekome ahụ abanyeghi na ya bụ ụlọakụ.

    Ikenga Tochukwu Anipr bụ onye na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ kwuru na mgbọ egbe ndị omekome a na-amabeghi ndị ha bụ nọ na-agbali elu aghara aghara, tụrụ ụmụakwụkwọ abụọ nọ n'ime keke napep na-agafe.

    Ka o si kwuo, e bugara ụmụakwụkwọ ahụ ụlọọgwụ, ebe dọkịta nọ kwuo na ha anwụọla.

    Monday Bala Kuryas bụ kọmishọna uweojii na steeti ahụ tiri ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ aka n'obi, ma kwuo na ha na-ama imi n'ala ịchọta ndị omekome a bụ ndị gbakwara ụgbọala abụọ ọkụ ebe ha na-agba ọsọ.

  6. CBN ekwuola na gọọmenti steeti ga-amalite kwụwa ụgwọ mbibi CBN gbanyere ha

    Godwin Emefiele, onyeisi CBN kwuru nke a ogeọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na Nasarawa Steeti ụbọchị Tụzde n’ọsịsa ajụjụ metụtara ebubo nke gọvanọ Godwin Obaseki nke Edo boro na gọọmenti etiti biri ego ruru nde naira irise maọbụ iri isii iji mezuo ego nkenta steeti.

    “Ọ dị mkpa ikwupụta na anyị binyere steeti niile dị na Naijiria ego iji kwado bọjet maka afọ 2015/16.

    “A gwụbeghị ego ahụ rue ugbua. Anyị ga-agba isi akwara na steeti nile ga-akwụwa ụgwọ ndị a ahụ ebe ọ bụ na ha na-ebozi anyị ebubo maka ịgbanye ha mbibi.”

  7. Etu nwaanyị si were ọgwụ 'tụsa tụsa' gbagbuo nwa nwoke di ya

    Otu nwaanyị ewerela ọgwụ tụsa tụsa gbagbuo nwa nwoke di ya n’Enugwu maka na ọ sị na di ya anaghị elebara ya na nwa ya nwaanyị anya.

    Nwaanyị a aha ya bụ Nnenna Egwuagu gbara afọ iri abụọ na itoolu ebe nwata a o gburu dị naanị afọ atọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steetị bụ Daniel Ndukwe sị ha nwuchiri nwaanyị a n'obodo Umulumgbe dị n'okpuruọchịchị Udi.

    Ọ sị na ọ bụ di ya bụ Justine Egwuagu kpọtụrụ ndị uweojii ma sị na ọ bụ agwa nwunye ya kpasara nwa nwoke mere o ji nwụọ.

    Ebe nwaanyị sị na ihe mere o ji mee ya bụ maka na ọ chọrọ ka di ya mefuo ego n'ụlọọgwụ iji gwọọ nwata ahụ ọrịa.

    A na-atara ya mkpo na mkpịsị o jiri gbaa nwata ahụ ọgwụ ọjọọ a dịka ha ka na-eme nyocha banyere ya.

    Kọmishọna ndị uweojii bụ Mohammed Ndatsu Aliyu nyere ndị di na nwunye ndụmọdụ ka hụụ onwe ha n'anya ma biri n'udo na-agbanyeghi ọnọdụ ọbụla.

  8. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  9. A na-achọ ndị o ji isi aghọ mgbọ 66 gbara ọsọ n'ụlọmkpọrọ dị n'Ebonyi

    Gọọmentị Ebonyi Steetị enyeela iwu ka e nyochaa etu ndịisi agha mmadụ iri isii na isii na-ebute ọgbaghara na steetị ahụ jji si n'ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ.

    Odeakwụkwọ gọọmentị bụ Kenneth Ugbala gwara ndị ntaakụkọ nke a na ngwụcha ozukọ nchekwa nke ndịisi ọchịchị Ebonyi Steetị mere ụnyaahụ.

    Ọ sị gọọmentị gbarụrụ ihu n'etu ndị nnupuisi a na-ebute ọgbaghara n'Ezza/Effium e ji eji si gbaa ọsọ na ọ bụ ya mere e ji hiwe kọmitii ga-enyocha ihe mere ha ji gbaa ọsọ.

    Ugbala sị na e nyekwara iwu ka anwụchie ndị na-ekesa ihe onyonyo adịgboroja na soshal midia nke nwereike ibute ọgbaghara n'obodo.

    Ọ rịọrọ ndị obodo Ezza/Effium ka ha dere jụụ ma biri n'udo nakwa ịhụnanya na gọọmentị na-agba mbọ inyere aka pụrụiche.

    Ọ sị ka ndị obodo hiwe otu nchekwa n'etiti ha ebe okpuruọchịchị otu nchekwa "Ebubeagu Security Network."

  10. Nkeji BBC Igbo nke ụtụtụ

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  11. Lee mgbe a ga-amalitekwa inye ndị mmadụ akara ekwentị ọhụrụ

    Gọomentị etiti ekwuola na a ga-amalitekwa inye ndị mmadụ akara ekwentị ọhụrụ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Eprelụ ma ọ bụrụ na e rubee isi n'usoro nyocha dị na ya.

    Nke a dị n'ozi Femi Ademiluyi bụ onye enyemaka mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi n'ekwentị bụ Isa Pantami wepụtara.

    Cheta na gọọmentị mechara ndị mmadụ ịzụ 'sim card' ọhụrụ n'ọnwa Disemba afọ 2020 dịka a malitere inyocha ọtụtụ akara ekwentị ndị dị adị.

    Ha sị na nyocha a dị mkpa iji hụ na ụlọọrụ ndị na-agbasa ozi n'ekwentị soro usoro gọọmentị hiwere maka idebanye akara ekwentị ndị mmadụ.

    Mmalite inye akara ekwentị ọhụrụ na-abịa dịka gọọmentị na-akwado inwogharị usoro ndebanye aha na njirimaara akara ekwentị ndị mmadụ.

  12. Igbo ndị ọma anyị ekele unu n'ụtụtụ a

    Obiọma na aṅụrị ka anyị ji anabata unu n'ụbọchị taa, biko n'ọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.

  13. Ọbụghi ụlọakụ ka awakporo kama akụkụ ụlọakụ - Ndị uweojii

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ọ bụghị ụlọakụ nke dị n'Abagana ka ndị ojiegbe wakporo dịka akụkọ na-efegharị si kwuo.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ọ bụ n'akụkụ ụlọakụ ahụ ka awakporo.

    O kwuru na ọ nyocha na-aga n'ihi ugbu ịjeru n'isi ihe mere.

    Ihe ọzọ Ikenga kwuru bụ na ndị ahụ ruru mmadụ iri bu ọkọlọtọ Biafra agagharị mgbe ha na-agbali egbe elu.

    Nke a mere ka ndị nọ n'akụkụ ebe ahụ gbapụ ọsọ ndụ.

    Dịka ọ dị ugbua, amabeghi ma o nwere onye nwụrụ na mwakpo ahụ mana akụkọ ka na-abịa.

  14. Akụkọ Coronavirus ka o si dị n'Afrịka

  15. Onyeisiala Buhari esila mba Briten laghachite ala Naịjirịa

    Onyeisiala Muhammadu Buhari alaghachitela ala Naịjirịa na mgbede ụbọchị Tọzde.

    Ọ si mba Briten ebe ọ gara njem nleta ahụike ya nata.

    Cheta na ọ bụ n'izuụka gara aga ka onyeisiala Buhari fepụrụ Naịjirịa gawa mba UK maka nleta ahụ.

  16. ENDSARS so n'ihe mere Twitter jiri buru isiụlọọrụ Afrịka ha gawa Ghana - Lai Mohammed

    Minista na-ahụ maka mgbasaozi na omenala bụ Lai Mohammed ekwuola na ọ bụ mkparị si na ngagharịiwe ENDSARS so n'ihe mere Twitter jiri buru isiụlọọrụ ha gawa Ghana.

    O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ ajụrụ gbasara ụlọorụ Teknụzụ bụ Twitter ịburu isiụlọọrụ ya hibe na Gana karịa Naịjirịa.

    Mohammed kwuru na ndị ji Twitter eme ihe n'ala Naịjirịa karịrị ndị ji ya eme ihe na Ghana nke gosiri na ọ bụghị mkpebi achụmnta ego ka ọ bụ.

    O kwukwara na ọ bụ naanị Twitter ka ọ dịịrị ịhọpụta ebe ha ga-ehibe ụlọorụ ha.

    "Ọ bụrụ na ịkwapịa ụlọ gị, kedụ ebe ị ga-ebi" ka o kwuru.

  17. Amalitela ikesa mita n'efu n'Enugwu

    Ọ bụrụ na inweghị mịta ọkụ latrik, zie ume ndụ n'ihi na gọọmenti etiti ewepụtala atụmatụ a kpọrọ National Mass Metering Programme iji nye ndị enweghị mita mita na mpaghara dị iche iche na Naijiria.

    Ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik na mpaghara Enugwu bụ Enugu Electricity Distribution Plc bụ ndị gbara ama n'akara Facebook ụbọchị Tọzde kwuru na ha ga-ekesa mịta dị puku iri itoolu narị atọ iri asatọ na otu na atụmatụ ikesa mita ọkụ nke ga-abụ n'efu. bụ n'efu, ma kwụkwa na na o nweghị ihe dị mkpa ka onye ọbụla chọrọ mita mee iji nweeta ya dịka a ga-agbado ụkwu n' ebe e nwegara nke bekee Feeder were kee ya.

  18. Etu ndị o ji egbe si wakpoo ma gbuo ndị uweojii atọ n'Abakaliki

    Ndị oji egbe a na-amaghị ndị ha bụ wakporo ndị uweojii nọ n'ọrụ na njikọ ụzọ Onuebonyi na Nwezenyi dị n'Abakaliki, Ebonyi Steetị n'abalị ụbọchị Wenesde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steetị ahụ bụ Loveth Odah sị na ndị oji egbe gburu ndị uweojii mmadụ atọ nọ n'ọrụ ebe ahụ.

    Ọ sị nke mere n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị Wenesde 14 Eprelụ afọ 2021 ndị mere mwakpo a mere ka ha si n'ịkwa ozu mmadụ na-alọta.

    Ọ sị na ndị a ji ọgbatumtum abụọ, Keke abụọ nakwa ụgbọala Sienna abụọ bịa mee mwakpo ahụ.

    Loveth sị na kọmishọna ndị uweojii n'Ebonyi ezipụla ndị ọrụ ya n'ebe ahụ iji maara ka mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ.

    Loveth sị na a na-eche na ndị a so n'otu wakporo ndị uweojii n'obodo Umuoghara dị n'Izza n'ụbọchị 8 nke ọnwa Eprelu mana ndị uweojii chụrụ ha ọsọ.

    N'oge ahụ, na ndị uweojii nwuchiri mmadụ abụọ n'ime ha bụ ndị sị na ha gburu otu uweojii ma nara ya egbe n'oge gara aga.

  19. Obaseki na Zainab na-arụ onwe ha aka maka ego a sị gọọmentị bipụtara

    Gọvanọ Godwin Obaseki nke Edo Steetị akatọọla mịnịsta akụnaụba bụ Zainab Ahmed maka ịkpọ ya onye asị n’okwu banyere gọọmentị ibipụta ego.

    Obaseki sị na gọọmentị bipụtara ego dị ijeri naịra iri isii n’ọnwa Maachị bụ nke ha kere steetị mana Zainab sị na nke ahụ bụ asị.

    Obaseki nyere nkatọo n'ozi o wepụtara na twitter sị ka Zainab hapụ ime ka ọ maghị na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.

    Ọ gara n'ihu nye gọọmentị etiti ndụmọdụ ka ha hie asaa n'anya chọpụta ụzọ a ga-eji gbochie oke mmefu ego aghaLinkraghara.

  20. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.