You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Otu ndị dọkịta Naịjirịa akwụsịtụla abụbụ ọrụha malitere kamgbe ụbọchị iri

Otu jịkọtara ndị dọkịta na Naịjirịa akpọrọ 'National Association of Resident Doctors' na bekee akwụsịla abụbọ ọrụ ha ha malitere kamgbe ụbọchị iri.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ogbunigwe a hụrụ n'Afaraukwu dị ka nke si oge agha Biafra - Gọvanọ Ikpeazu

    Gọọmentị Abịa steeti ekwuola na ha na-agba mbọ ịchọpụta ebe ogbunigwe a hụrụ n'ụlọakwụkwọ Union Praịmari dị n'Afaraukwu nke dị n'Okpuru Ọchịchị Umuahia Nọt si.

    N'akwụkwọ mgbasaozi John Okiyi Kalu bụ Kọmishọna Mgbasaozi na Steeti ahụ binyere aka, ha sị na ha na-eche ka ngalaba na-ahụ maka ogbunigwe nke Uweojii Naịjirịa a kpọrọ EOD wepụta mpụtara nnyocha ha.

    Mana ọ sị na iji gbochi ọn̄dachị, gọọmentị Abia emechiela ụlọakwụkwọ ahụ na nwa mgbe nta.

    Gọvanọ Abia bụ Okezie Ikpeazụ amanyela ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ chọpụta ebe ọzọ ụdịrị ihe a dị.

  2. Nsogbu Owerre: Agbala Otu nwaikorobịa gbara ọsọ n'ụlọ nkpọrọ ọkụ

    Ndị Ihodimeze di n'Okeduru LGA Imo Steeti agbaala otu nwa Ikorobia ọkụ m'ihi na ọ laghachiri mebe ajọ ihe ka osorondị otu ya gbapụ n'nkpọrọ.

    Ya bụ nwa ikorobịa bụ onye Ọgwa mana otoro n'ikwu nne ya Umuawom ihodimeze.

    Atụrụ ya nkpọrọ n'ihi na ọ na atọrọ mmadụ ma na ezukwa ohi Oji egbe aga.

    Ngwa ngwa ọgbapụtar na mkpọrọ, ọjiri egbe gaa igbu ndị niile gbaboro ya aka ebe, ya mere ndị obodo jiri nwude ya ma gbaa ya ọkụ

    Ozu nwata nwoke ahụ ka tọgbọrọ ugbua n'ncherita ihu Ikeduru local government.

  3. BBC Nkeji

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  4. Na Akpọtụ Ugbu A, Ọ bụ ndị uweojii na-agba egbe n'Aba

    Otu onye nọ Aba agwala BBC Igbo na ụda egbe na-ada aghara aghara n'ụfọdụ mpaghara Aba di n'Abịa steeti bụ n'aka ndị uweojii ka o si.

    Onye a na-achọghị ka akpọpụta aha ya sị na ọ bụ n'ime abalị ka ha malitere ịnụ ụda egbe ahụ mana ka ha lere anyị, ha chọpụtara na ọ bu ndị uweojii nọ na ebe nche ha na-agba egbe mmaja.

    BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojji na'Abia Steeti bụ Geoffrey Ogbonna mana ọ saghi ekwentị ya.

    Onye ọzọkwa na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwukwara na ọ bụ ndị uweojii nke ngalaba SARS (nke a na-akpọzi SWAT ugbua) na-agba ya bụ egbe.

    Onye ahụ kwuru na ọ bụ na mpaghara Amaogbonna ka ya bụ ihe na-eme.

    Ọ gwara anyị sị: "Otu onye SARS na otu onye nkịtị ọzọ nwere nghọtahie, mana onye uweojii ahụ gara kpọta ndị otu ya ha wee malite ịgbali egbe elu nakwa imebi ihe ndị mmadụ."

    Mana akụkọ ọzọ na-ekwukwa na ọ bụ mmadụ kpọrọ ndị uweojii ka ha bịa nwuchie onye ya na ya nwere nsogbu.

    BBC Igbo ka na-agba mbọ ịchọpụta kpọmkwem ihe merenụ.

  5. Ụmụnna abụọ na-azọ onye ga-eli nna ha n'Ebonyi Steetị

    Onyeisioche okpuruọchịchị Afikpo North dị n'Ebonyi bụ Obiageri Oko Enyim na nwanne ya nwoke bụ Ogbonnia Oko Enyim na-ama onwe ha aka n'ihu onye ga-eli nna ha nwụrụ anwụ n'obodo Amasiri.

    Nna ha bụ Simon Oko Enyim nwụrụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2020.

    Ogbonnia tinyere ụbọchị ọ ga-eli nna ha 8 Eprelụ, 2021 ebe Obiageri tinyere nke n'ụbọchị 8 nke ọnwa Mee, afọ 2021.

    Ọ bụ otu nna mụrụ Obiageri na Ogbonnia mana nne ha dị iche iche.

    Ogbonnia bụbu onyeisioche okpuruọchichi Afikpo North mana Obiageri nọchiri anya ya mgbe e mere ntuliaka okpuruọchịchị n'afọ 2020

    Ogbonnia chọburu ịzọ ọkwa ahụ ọzọ mana a sị ya hapụ ebe nwanne ya nwaanyị bụ Obiageri mechara zọọ ọkwa ahụ ma merie.

    Mana gọvanọ Dave Umahi mechara nye Ogbonnia ọkwa dịka onye enyemaka banyere agụmaakwụkwọ mana o mechara gbaa arụkwaghịm.

  6. Gọọmentị Ebonyi ehiwela otu nchekwa ọhụrụ iji gbochie ọgbaaghara

    Gọọmentị ehiwela otu nchekwa ọhụrụ iji wulite ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ.

    Odeakwụkwọ Ebonyi steeti bụ Kenneth Ugbala kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde dịka ndị isi gọọmentị nwechara ọgbakọ n'Abakiliki gbasara nchekwa.

    O kwuru na okpuru ọchịchị iri na atọ dị n'Ebonyi steeti ga ewepụta mmadụ ndị ga-emezu ya mmadụ narị asaa bụ ndị ga-ehibe otu nchekwa ahụ.

    Gọọmentị ga-enyekwa ndị a ahọpụtara ọzụzụ pụrụ iche maka ọrụ nchekwa, ma azụtakwa ụgbọala ruru otu narị na iri abụọ iji kwadoo ọrụ ha.

    Ọ bụ n'izuụka abụọ na-abịa abịa ka gọọmenti ga-emepe otu nchekwa a ka ha malite ọrụ n'uju.

    Kenneth Ugbala rịọkwara ndị steeti ahụ ka onye ọbụla sepụ aka n'ihe ọbụla nwere ike ibute ọgbaaghara na steeti ahụ.

  7. Onye ọrụ mba Myanmar na Briten sị na ndịagha chụpụrụ ya n'ezi

    Onye na-anọchịte anya mba Myanmar na Briten sị na ya larụrụ n'ime ụgbọala ya dịka a chụpụrụ ya na ụlo ọrụ ha.

    Kyaw Zwar Minn sị na ọ bụ onye agha na-arụrụ mba ahụ ọrụ na Briten chụpụrụ ya na ndị ọzọ ma sị ya na ọ bụzighi ya na-anọchiteanya mba ha.

    Odeakwụkwọ mba Briten bụ Dominic Raab akatọọla ụdị agwa dị etu a.

    Cheta na ndịagha were ọchịchị n'ike na mba Myanmar n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Febụwarị nke butere ngagharịiwe ọtụtụ izuụka.

    Kyaw Zwar Minn akpọọla oku ka ndịahga tọhapụ onye ndu ha bụ Aung San Suu Kyi e ji eji.

    E gbuola ihe ruru mmadụ 500 gụnyere ọtụtụ ụmụaka dịka ndị chọrọ ka eweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya.

  8. Ndị ojiegbe wakporo isi ụlọ ọrụ ndị uweojii dị na Mbieri

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ndị oji egbe wakporo isi ulọ ọrụ ndi uweojii n'obodo Mbieri.

    Maazi Ikeokwu kwuru na achụpụrụ ndị a mere mwakpo a mana ndị uweojii abụọ merụrụ ahụ ma na-anata ọgwụgwọ n'ụlọ ọgwụ.

    Akụkọ ka na-abịa.

  9. BBC Nkeji

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  10. Igbo ndị ọma anyị ekele ooo

    Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ụtụtụ taa.

    Gbalịa sonyere anyị na BBC Igbo.

  11. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa n'otu nkeji

  12. Owerri Attacks: Gọọmenti, werenụ ezi obi so okwu nchekwa - Abaribe

    Senetọ na-anọchite Abia-South n’ Ụlọomeiwu Ukwu bụ Enyinnaya Abaribe akpọọla Gọọmenti Etiti oku ka ha were eziobi soro okwu nchekwa obodo n’Naijiria.

    Abaribe kwuru nke n’ozi o wepụtara ụbọchị Wenezde n’ọsịsa mkpamkpa kpaara n’Owere ebe ndị ji egbe wakporo ụlọmkpọrọ ma tọhapụ ndị mkpọrọ karịrị otu puku.

    N’ozi nkeọnụ na-ekwuru ya bụ Uche Awom binyere aka, Abaribe sịrị “Oge eruola ka gọọment gbaso eziobi nakwa atụmatụ zuru Naijiria ọnụ n’igbo nsogbu chere Naijiria aka mgba, ọ kachasị nsogbu nchekwa na agbụrụ di iche iche.”

    Abarịbe, onye tiri ndị uweojii ihe metụtara aka n’obi,katọrọ mwakpo na-arị elu n’Ala Igbo, ma kpọọ oku ka e mee ezi nnyocha zuru oke.

  13. Enweghi 'sacrament' jikọrọ anyị na Nnamdi Kanu - Onye ndu mba Ambazonia

    Otu Ambazonia ekwuola na enweghi sacrament jikọrọ ha na otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob dịka ozi na-efegharị na 'onyeisi ha' bụ Lucas Cho Ayaba na Nnamdi Kanu ga-agwa ọha okwu n'abalị abụọ na-abịa.

    Ha kwuru nke a n'ozi si n'aka Samuel Sako bụ ezigbote onyeisi ha ziputara na websaịt ha, ebe o kwukwara na ha na Naịjiria enweghi nsogbu ọbụla n'ihi etu Naịjiria si anabata ndị nke ha gbara ọsọ ndụ.

    Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị ụlọntaakụkọ dị na Naịjiria nakwa ndị ọzọ kesara ozi kwuru na Ayaba na Kanu ga-etikọta aka ọnụ wee gwa ọha okwu n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Epreelụ.

  14. Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo eyinyela Usman Alkali Baba uwe ọrụ ọhụrụ ya

    Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo eyinyela Usman Alkali Baba uwe ọrụ ọhụrụ ya dịka onyeisi ndị uweojii Naịjiria.

    Nke a mere dịka Mohammed Adamu nyefere Baba ọchịchị n'emume e mere n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja taa.

    Cheta na e bugoro Baba n'ọkwa n'ụbọchị Tuzde, (Epreelụ 6, 2021) dịka e wepụrụ Adamu na ya bụ oche mgbe ọ gara njem ọrụ n'Imo steeti.

  15. BBC Nkeji nke ehihie

    Gere akụkọ BBC Igbo maka ihe mere n'ụwa n'ime otu nkeji.

  16. Mmadụ asatọ awnụọla dịka 'bandits' wakporo ha n'ụzọ Kaduna

    Ndị omekome a kpọrọ 'bandits' na bekee egbuola mmadụ asato ma meruo mmadụ anọ n'okpuru ọchịchị Kajuru na Kachia dị na Kaduna steeti.

    Kọmishona na-ahụ maka nchekwa ime obodo na Kaduna bụ Samuel Aruwan depụtara na n'ime otu mwakpo mere ụnyahụ, ndị omekome gbara otu ụgbọala bu ndị mmadụ nakwa nke bụ nkụ ma gbuo mmadụ ise , meruo mmadụ atọ ahụ na mwakpo ahụ.

    O depụtakwara na ndị omekome bakwara otu ime obodo ebe ndị na-achị ehi na-anọ n'obodo ahụ , gbuo otu onye ma chịkọrọ ehi ruru otu narị na iri asatọ.

    Aruwan kwuru gọvanọ Kaduna bụ Nasir El-Rufai egosila nwute ya gbasara ya bụ mkpa mkpa ma tie ezinulọ ndị ihe a metụtara aka n'obi.

    O kwuru na ndị ọrụ nchekwa na-eleba anya ka ha mara ka ya bụ mwakpo si mee.

  17. Ndị ntoroọbịa Ohanaeze akatọọla ebubo ndị uweojii na-ebo Ipob maka mwakpo Owere

    Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo akatọọla ebubo onye bụbu onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Muhammed Adamu boro Ipob maka mwakpo mere n'isiụlọọrụ ha nakwa ụlọmkpọrọ dị n'Owere, Imo Steetị.

    Nke a dị n'akwụkwọ onyeisi ha bụ Igboayaka wepụtara sị na ebubo a bụ okwu ụmụaka na-esoghi n'usoro e ji arụ ọrụ.

    Ọ sị na ọ bụ n'isi asị na ekworo gọọmentị Naịjirịa nakwa ndị Fulani nwere n'ebe ndị Igbo nọ mere Adamu ji boo Ipob ụdị ebubo ahụ.

    Ọ dọrọ aka na ntị ka Adamu kpachara anya ka ọ ghara ịkpalite okwu n'ime esemokwu dịbụla adị.

    Igboayaka sị na akpachaghị anya na o nwere aka Adamu dị na mwakpo a nọrọ awa anọ n'isiụtụtụ ụbọchị Mọnde.

  18. Amnesty International akatọọla mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Owere

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ikike dịịrị onye n'ụwa bụ Amnesty International akatọọla mwakpo mere n'isi ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọmkpọrọ dị n'Owere, Imo Steetị.

    N'ozi ha wepụtara, ha sị na onweghi ihe kwesịrị ime ka ndị mmadụ wakpoo ụlọọrụ ndị mmadụ nakwa ndị ọrụ nchekwa.

    Ha sị na ndị mere nke a egosila na ha enweghi nkwanye nye mmadụ nakwa ndụ.

    Ha kpọkuru gọọmentị Naịjirịa ka ha sie asaa n'imi chọpụta ndị mere nke a ma taa ha ahụhụ ruru ha.

  19. Naịjirịa anatala ọgwụ Astra Zeneca dị 100,000 n'aka mba India

    Gọomentị etiti nọọrọ n'ụbọchị Tusde kwuo na ha anatala ọgwụ mgbochi coronavirus Astra Zeneca dị otu puku narị site n'aka mba India.

    Onyeisioche otu na-ebuagha megide coronavirus na Naịjirịa bụ Boss Mustapha kwuru nke a n'Abuja mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

    Ọgwụ a bụ onyinye gọọmentị mba India nyere nke Naịjirịa ga-enye aka ibulite ọnụọgụgụ ndị Naịjirịa gbara ọgwụ mgbochi coronavirus.

    Ọ ga-ezu mmadụ ruru puku iri ise dịka Mustapha si kwuo.

    Mustapha sị na aha otu ọtawaike ha ga-agbanwe bụrụzie 'Presidential Steering Committee on Covid-19 site n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprelụ, 2021.

    Ọ sị usoro otu a ji arụ ọrụ ga-agbanwe gụnyere ime ihe gbatagbata banyere coronavirus ruo ngwụcha ọnwa Disemba.

  20. Coronavirus asụọla ndị mmadụ ka akwụ na Brazil n'otu ụbọchị

    Mmadụ puku anọ anwụọla n'ọrịa coronvirus na mba Brazil na-erughị awa iri abụọ na anọ bụ ọtụ ụbọchị dịka ndị butere ọrịa ahụ bidoro rịwakwa elu.

    Ndị mmadụ jụpụtara n’ụlọọgwụ ma na-anwụ dịka ha na-eche ịnata ọgwụgwọ.

    Ndị nwụrụla n'ọrịa coronavirus na mba ahụ dị 337,000 bụ ọnụọgụgụ na-esote nke mba Amerịka bụ ndị mbụ.

    Mana Onyeisiala ha bụ Jair Bolsonaro jụrụ ịmachi njem n'obodo iji belata mfesasị a.

    Ọ sị na mkpamkpa nke a ga-ebute n'akụnaụba karịrị nke ọrịa a ga-ebute n'onwe ya.

    Ọ gakwara n'ihu imebi ụfọdụ iwu mmachi ndị ọchịchị okpuruobodo nakwa steetị tinyere.