Ihe gọọmentị sị ha ga-emere ndị Ebonyi maka mwakpo dakwasịrị ha

Gọọmentị etiti ekwela nkwa inyere ndị Ebonyi Steetị aka na mwakpo e mere ha n'izuụka a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Mmadụ 90 esila n'ụlọ mkpọrọ gbafuo na Liberia

    Ndị uweojii Liberia

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ndị uweojii Liberia gbara mbọ ịkwụsị ngagharịiwe ahụ.

    Opekatampe ndi mkpọrọ iri itoolu esila n'ulo mkpọrọ rie mbọmbọ dika a na-eme nghagharị iwe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mba Liberia.

    Onyeisiala mba ahụ bụ George Weah etinyela mmachi mkpagharị na mpaghara ahụ bụ Maryland nke dị nso n'oke ala Liberia na Ivory Coast.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Liberia bụ Moses Carter gwara BBC na ndị ahụ na-eme ngagharịiwe tiwara ụzọ banye n'ime ụlọ mkpọrọ ahụ n'ihi na otu onye e boro ebubo na o gburu mmadụ nọ n'ime ebe ahụ.

    Ihe ruru mmadụ puku iri atọ so mee ngagharịiwe ahụ nke mere na o kweghị ndị uweojii njikwata.

    Carter kwuru na ndị ngagharịiwe ahụ nke ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụnwaanyị gbara ụlọ onye isi ụlọ omeiwu mba ahụ ọkụ.

  2. Ndi uweoiji Naịjirịa eguzobela ụlọọrụ mgbasaozi redio

    Ụlọọrụ redio ndị uweojii

    Ebe foto si, Ndị uweojii Naịjirịa

    Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu mepere ụlọọrụ radio.

    Ndi uweojii ehiwela ụlọọrụ mgbasa ozi redio nke isi sekpụ nti ya bụ ikwalite mmekọrịta ndị uweojii na ọhaneze.

    Onyeisi ndi uwe oji bu Mohammed Adamu kwuru na ụlọọrụ ahụ ga agbasakwa ozi metutara nchekwa ime obodo nke ga enyere ohaneze aka.

    Ụmụ Naịjirịa na ndi uweoji enweela otutu nghọtahie nke mere ndi mmadu ji ebo ha ebubo mmaja, imeto ugwu ruoro mmadu nakwa ọtụtụ agwa ndi ozo di aṅaa.

    Cheta na ndị ntorobịa Naịjirịa nuputara nigwe na afo 2020 ma mee ngagharị iwe ka emechie ngalaba ndi uweojii a kpọrọ SARS, nke mere ejiri nwetụ mgbanwe n'isi otu ndị ndi uwe oji.

    E mechara hiwe otu otawike ga elebe anya na mkpesa ọhaneze gbasara nsogbu ọbụla na mmekpa ahụ ha nwetara na aka ndi uwe oji.

  3. Enweghị ihe akaebe doro anya gbasara ogbugbu mmadụ na Lekki Tollgate - Mba US

    End SARS

    Ebe foto si, US Dept. of State/EPA

    Mba Amerịka ekwuola na onweghi ihe akaebe doro anya gbasara ndị e gburu na Lekki Toll Gate n'oge ngagharịiwe End SARS na Naịjirịa n'afọ 2020.

    Ha kwuru nke a n'ime akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenezde nke ha kpọrọ "2020 Country Reports on Human Rights Practices: Nigeria".

    N'ime akwụkwọ ozi a, Amerịka kwuru na "otu Amnesty International kwuru na ndịọrụ nchekwa Naịjirịa gburu mmadụ iri, mana onweghị ndị ọzọ gbara akaebe na ihe ha kwuru bụ eziokwu".

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ụlọ ntaakụkọ dị icheiche na Naịjirịa emeela nnyocha ma dee etu ọtụtụ ndị mmadụ si tufuo ndụ ha n'aka ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na ngagharịiwe ahụ.

    Mana mba Amerịka kwuru na ebubo ndị ahụ edochaghị anya n'ihi na enweghi ihe aka ebe doro ewu na ọkụkọ anya gbasara ihe merenụ.

  4. Sudan akwụọla US nde $335 maka ịkwado akaọrụ ndị ọmekataraihe pụọ ụjọ al-Qaeda

    Sudan

    Mba Sudan akwụọla Amerika nha dị nde dọla narị atọ na iri atọ na ise ($335) maka ogbunigwe ahụ a tụrụ n’ụlọọrụ ha dị na Kenya na Tanzania n’afọ 1998.

    America boro ebubo na aka Sudan dị na ya bụ arụ ha sị na al-Qaeda bụ nke Sudan na-akwado mere were gbuo ọtụtụ mmadụ ma mebikwaa ọtụtụ ihe.

  5. UK adaala Chris Oyakhilome nha £125,000 maka imegide iwu coronavirus na be ha

    PASTOR CHRIS OYAKHILOM

    Ebe foto si, YOUTUBE/ PASTOR CHRIS OYAKHILOM

    Ụlọọrụ na-echekwa iwu mgbasa ozi na Briten bụ Ofcom adaala ụlọọrụ mgbasa ozi, LoveWorld nke Pastọ Chris Oyakhilome nha maka ihe ha kpọrọ ajọ ozi megide ọrụ nchekwa coronavirus.

    Ofcom sị na Oyakhilome na-eduhie ndị ụka ya ụzọ site n'izasa ozi na-ezighịezi nye ndị na-ege ha ndị.

    Ha kọwara na nke a bụ nke ugboro abụọ Love World na-ada iwu ha n'otu afọ

    Ha sị na ya bụ iwu Love World dara di ọjọọ ya mere ha jiri rie ya iwu.

    Ha sị na Oyakhilome nyụrụ ya bụ ọgbụ na-emume ụka ya akpọrọ Global Day of Prayer bụ ebe o kwuru na coronavirus bụ akụrụakụ.

    Na ọgwụ mgbochi ya bụ ụzọ ha ji chọọ ịjide ndị mmadụ n'ọrụ.

    Ọ sị na "onocha ha na-eme maka coronavirus bụ iji rafụ ndị amaghị ihe", sịkwa na ọ bụ 5G na-ebute ya bụ ọrịa.

    N'ihe ihe ndị a ka ha jiri daa ya nha £125,000.

  6. Nkeji Coronavirus

  7. Ụfọdụ ndị mere ngagharịiwe na London nye Onyeisiala Naịjirịa mere njem ahụike ụbọchị Wenezde

    Ụmụamaala Naịjirịa ụfọdụ bi na London echebirila onyeisiala Mohammadu Buhari na obi Naịjirịa dị na mba ahụ na ngagharịiwe ụbọchị Wenezde.

    Ndị ahụ na-ekwu ka Buharị onye mere njem ahụike izu abụọ lọghachị azụ ga mezie ụlọọgwụ dị na Naijirịa.

    Ọba nzịkọrịta ozi BBC hụrụ n'akọwa na ndị ahụ bịara ngagharịiwe yi uweo ojii buru ọkọlọtọ etere ọbara iji gosi nkwado ha na naghaarịiwe #Endsars emere na ngwụcha afọ gara aga.

    Ụdọdị jikwa ohere ahụ ekwụ ihe ndị ọzọ dị ha mkpa nke gụnyere ịkagbu ọkwụkwọ iwu Naịjirịa nke 1999.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. E duola onyeisiala mba CAR ọhụrụ n'iyi ọrụ

    Faustin-Archange Touadéra

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Faustin-Archange Touadéra zọtara ntuliaka n'ọnwa Disemba 2020

    E duola Faustin-Archange Touadéra n'iyi ọrụ dịka onyeisiala ọhụrụ nke mba Central African Republic (CAR).

    Nke a mere n'ụbọchị Wenezde, n'emume nke ndị isi a hụrụ kwaba okpu dị iche iche gbakọtara maka ya n'isiobodo Bangui.

    Touadéra zọtara oche ịchị nke ugboro abụọ n'ụbọchị 27 nke ọnwa Disemba 2020.

    Ndị bịara ya bụ emume gụnyere Moussa Faki bụ onyeisioche ngalaba African Union, onyeisiala mba Burundi bụ Evariste Ndayishimiye, Edouard Ngirente bụ Praịm Minista mba Rwanda, Rose Christiane Ossouka Raponda bụ Praịm Minista mba Gabon nakwa Joseph 'Ngute' Dion bụ Praịm Minista mba Kamerun.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Nkịta Joe Biden ataala mmadụ ọzọ

    Nkịta Joe Biden

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkịta Joe Biden bụ onyeisiala mba Amerịka a ma dịka 'Major' atakwaala mmadụ ọzọ na-erughi abalị ole na ole o si ebe a kpọgara ya maka ọzụzụ ka ọ tachara mmadụ lọghachite.

    Michael laRosa bụ onye nkwuchite ọnụ nwunye Jill nwunye Biden, kwuru na ya bụ nsogbu dapụtara n'ụbọchị Mọnde, mgbe nkita a na-aghọ onwe ya ime ka ogbe ọhụrụ ahụ mara ya ahụ, rịpụrụ ma taa otu onye na-agara onwe ya.

  10. A nwụchiela ndịagha 'chọrọ iweghara' ọchịchị onyeisiala mba Niger n'ike

    Ndị nchekwa mba Niger

    Ebe foto si, AFP

    A nwụchiela ndịagha a na-eche na ha chọrọ iweghara ọchịchị onyeisiala mba Niger n'ike n'isi ụtụtụ Wenezde.

    Akụkọ kwuru na o mere n'isiobodo Niamey, dịka a nụrụ ka ụda egbe na-arị ibe ya elu nso obi gọọmentị onyeisiala mba ahụ, ihe dịka ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ.

    Onye ọrụ gọọmentị achọghị ka a kpọo ya aha kwuru na a nwụchiela ụfọdụ ndị agha so wee na-achọ iweghara ọchịchị n'ike, ma kwuo na ndị nchekwa nke onyeisiala gbochiri ha irute n'obi gọọmentị.

  11. Ndị Sunshine Stars nke Ondo steeti mere ngagharịiwe

    N'egwuregwu, ndị otu egwu bọọlụ Sunshine stars nke Ondo emeela ngagharịiwe ma gbochie ọnụ ụzọ ama ụlọobibi gọọmenti steeti ahụ n’ihi kepukepu a nụrụ na gọọmentị nwere atụmatụ ire ya bụ otu egwu.

    Ka ha na-akatọ nzọpụ ụkwụ gọọmenti, ha kwuru na n'agbanyeghi mbọ ha niile na ya bụ otu, na gọọmentị ahụ enwebeghi ụzọ ọbụla o si kwalite ọnọdụ obibi ndụ ha.

    Akara njirimara ndị Sunshine Stars

    Ebe foto si, Sunshine Stars/Twitter

  12. Buhari ga-esinwu na London na-achịkwa Naịjiria - Garba Shehu

    Buhari

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye nnukwu enyemaka puruiche nke onyeisiala Naịjiria na mgbasa ozi bụ Garba Shehu ekwuola na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-arụnwu ọrụ, bianye aka n'akwụkwọ ọbụla o kwesiri ibianye site n'ebe ọbụla ọ nọ, ma kwuo na ọ ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara iji ịntanetị arụ ọrụ.

    Shehu kusuru ndi na-akatọ onyeisiala na o ji ọsọ gbapụ gaa njem nlekọta ahụike na mba Briten, ruturu aka na o nweghi ihe ọbụla dika njem gbatagbata onyeisiala mere n’ihi na njem a o mere bụ ụdịrị nke ọ na-emebu na mbụ.

    Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ Channels TV nwere ụnyaahụ, o kwuru na ọ bụ njem maka ọnọdụ ahuike ka onyeisiala gara, ganye na onweghi ihe dika ọnọdụ gbatagbata ma otu di na ya.

    O kwuru na onyeisiala agaghi ya bụ njem ahụike n'afọ gara aga n’ihi nje covid-19 tọpụrụ ọgọdọ gbara ọtọ mere ejiri machie ime njem iga mba ofesi.

    N’isa ajuju ma Buhari onyefere osote ya, Yemi Osinbajọ ọkwa ọchịchị, Shehu kwuru na Buhari ma nke o riri n’ihe gbasara iji ịntanetị arụ ọrụ.

    Dika akwụkwọ iwu ala Nigeria si kwuo; na onyeisiala kwesiri inyefe osote ya ọkwa ọchịchi ma ọ bụrụ na ọ gaghị anọ ya ihe ruru abalị iri abụọ na otu, Shehu kwuru na nke a adighi mkpa ugbua.

    N’otu aka ahụ kwa, shehu si na onyeisiala ga-agba ọgwụ mgbochi nje coronavirus nke agba nke abụọ ya ma ọ lọghachite ala Naịjiria; o kwuru nke a mgbe a jụrụ ya ma onyeisiala ọ ga-agba ya bụ ọgwụ mgbochi na mba Briten.

  13. Osote onyeisi ndị ọrụ Abịa steeti, Ukpai Agwu Ukpai anwụọla

    Okezie Ikpeazu bụ gọvanọ Abịa steeti ekwuputala akpataoyi wụrụ ya gbasara ọnwụ osote onye isi ndị ọrụ ya bụ Ukpai Agwu Ukpai, onye kuru ume ikpeazụ ya ụnyaahụ.

    N'ozi John Okiyi kalu bụ kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ ziputara, gọvanọ Ikpeazụ kwuru na ọnwụ nwaamadị a ewutela ya nke ukwu.

  14. Ọrịa coronavirus egbuola mmadụ 2,056 na Naịjiria - NCDC

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi mfesa ọrịa bụ NCDC n'ịchafụ, kwuru na mmadụ otu narị na iri abụọ na otu ọhụrụ ebutekwuola ọrịa coronavirus na Naịjiria.

    Nke a ebutela ọnụọgụgụ ndị buterela ya ruo 162,762 na Naịjiria.

    N'otu aka ahụ, ha kwukwara na ọrịa a egbuola mmadụ puku abụọ na iri ise na isii na mba a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Aguero ga-efere Manchester City aka na ngwụcha sizin

    Sergio Aguero

    Ebe foto si, Reuters

    N’egwuregwu, o doola anya na Sergio Aguero ga-ahapụ Manchester City na ngwụcha sizin a mgbe nkwekọrịta ya na ha gwụchara.

    Otu egwu bọọlụ dịka Barcelona, PSG, Juventus na Chelsea na-arọ ya bụ onye egwu Manchester City nyere aka ibute iko karịrị atọ n’afọ iri.

  16. E bola ndị agha ụgbọelu France ebubo igbu ọchụ na Mali

    Ụgbọelu agha mba France

    Ebe foto si, Getty Images

    N’Afrịka, nchọpụta ndị United Nations mere na-egosi na ụgbọelụ agha ndị France gburu mmadụ iri na itoolu ndị abụghị ndị agha na Mali.

    Ndị agha France gọrọ na-ekwu na nke ahụ abụghị eziokwu, na ọ bụ naanị ndị omekatara ihe pụọ ụjọ Alakụba ka ha gburu.

  17. E mere nagaghrịiwe n'Oji River taa bụ Tuzde gbasara ajọ n'ebute ihe mberede okporoụzọ

    Ngagharịiwe

    E mere ngagharịiwe n’Oji River, Enugu steeti gbasara ajọ ọnọdụ okporoụzọ na mpaghara ahụ n’ụbọchị Tuzde.

    Onye nọ ebe ya bụ ihe mere gwara BBC Igbo na iwe ndị ụmụntorobịa bụ oke ihe mberede okporoụzọ na-eme na-ebe ahụ n’ihi ajọ ụzọ.

    Ya bụ onye kwuru na "ụgbọala niile hapụrụ okporoụzọ awaraawara gbawazi ụzọ ochie gaferee Oji Wonderful, na ọ bụ ya mebiri ụzọ ahụ n'ebute oke ihe mmberede na ya bụ ụzọ".

    O kwukwara na mmadụ abụọ nwuru ụnyaahụ na ya bụ ụzọ, bụ ihe butere ya bụ ngagharịiwe.

    Ọ kwuru na onye na-akwọ ya bụ ụgbọala nwere ya bụ ihe mberede nwụrụ n'otu ntabị anya ahụ ebe onye fọkụnaịza nọ na-akụkụ ebe ahụ meruru ahụ.

    Otu nwaanyị nọ na ya bụ ụgbọala nwụrụ n'ụlọọgwụ.

    Kọmishọna mgbasaọzi Enugwu steeti bụ Chidi Arọ sị na ya anụbeghị maka ya bụ ihe mgbe anyị kpọrọ ya.

    Ọ sị BBC kpọchie ya n'otu awa mana ọ zaghị ekwe ntị ya.

    Onyeisioche Okpuruọchịchị ebe ihe a mere ekweghị aza ekwentị ya.

  18. Oke Ugo Naịjiria atụgbuola agụiyi ndị Lesotho

    Ndị egwu bọọlụ Super Eagles

    Ebe foto si, Nigeria Super Eagles Twitter

    Otu egwuregwu bọọlụ Naịjiria bụ Super Eagles ji ọkpụ goolu atọ chara acha asataghị otu ji kụkpọọ ndị mba Lesotho anya n'asọmpi e ji ama ndị ga-etozu iso azọ Iko Mba Afrịka n'afọ 2022.

    Goolu atọ ahụ si n'ụkwụ Victor Osimhen na nkeji 23, Oghenekaro Etebo na nkeji 50 nakwa Paul Onuachu na nkeji 83, zuru ịchụla ndị Lesotho bịara n'azụ ụlọ ndị Super Eagles.

    Mmeri a e meriri Lesotho emenyụọla olileanya ọbụla ha nwere itozu maka ya bụ asọmpi ka ọkụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Cheta na Naịjiria tozuru maka iso na ndị ga-azọ Iko Mba Afrịka a mgbe mba Lesotho na Sierra Leone gbara onye lawa onye lawa, ebe Naịjiria ji otu ọkpụ goolu asaghị asa merie Bene Repọblik n'izu gara aga.

  19. Nkeji Coronavirus

  20. Gọọmentị etiti ewepụtala ụbọchị ezumike abụọ maka emume Ista

    Rauf Aregbesola bụ Minista na-ahụ maka ihe na-eme na Naịjiria ekwuola na Fraịde bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Epreelụ na Mọnde bụ ụbọchị ise ga-abụ ụbọchị ezumike.

    O kwuru na nke a bụ iji wee mezuo mmemme maka oge Ista bụ ncheta mbilite n'ọnwụ Kraịst.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2