Lee ka emume 'palm sunday' si aga n'ụlọụka' dị iche iche

Taa ka ndị ụka Kraịst na-eme emume 'palm sunday' iji nabata izuụka nso

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nkeji Coronavirus

  2. Etu ndị oji egbe si gbagbuola ndị uweojii atọ n'Abiriba Abia Steetị

    Ụgbọala ndị uweojii

    Ebe foto si, Abia Facts News

    E nwere ihe iko n’elu na Abiriba, Ohafia North nke abia dika State,ndi oji egbe wakporo ndi uweoji nọ n'ọrụ, gbuo mmadụ atọ n’ime ha, ma gba ụlọala ha ọkụ.

    Onye omeiwu na-anọchite anya ha n’ụloomeiwu Abia Steeti bụ Mandela Obasi sị na nke a mere n'elekere asatọ nke ụtụtụ, ma katọọ ya bụ agwa.

    N’otu aka ahụ kwa, Osote aka na-achi steetị Abia bu Ude Okochukwu agbaruola n’ogbe ahụ ma jiri anya ya hụ ka ihe si dị.

    Osote Gọvanọ Abia, Ude Okochukwu

    Ebe foto si, Abia Facts News

    Ọ kasikwara ndị obodo obi, kwuo na ọchịchị Okezie Ikpeazụ nọ n’isi ya ga-eme ihe nile aka ya ruru ihụ na nchekwa Abia bụ isi a hụrụ kwawa okpu.

    Mbọ niile BBC Igbo gbara inụrụ olu onye nkwuchite ọnụ ndi uweoji n'Abia Steetị bụ Geoffrey Ogbonna kụrụ afọ n'ala .

    Dịka ọ dị ugbua a mabeghi ndị bụ ndị oji egbe a na-akparụ megide ndị ọrụ na mpaghara Owụwa Anyanwụ.

  3. Nkeji BBC Igbo

    Gere akụkọ mere n'ụwa n'olu Igbo nakwa n'ime otu nkeji.

  4. Onye oji egbe agbagbuola mmadụ iri na Colorado

    Ụlọahịa a gbara egbe

    Ebe foto si, CHET STRANGE

    Onye oji egbe egbuola mmadụ iri tinyekwara onye uwe oji na na ahia di na mba Colorado.

    Ndi uwe oji kwuru na nwakpu a kpọrọ iri ala mmụọ nike ebe ọtụtụ nwetara mmerụ ahụ di iche iche.

    Akụkọ garakwara nihu kwuo na aka mechara gbara nwa amadi ana enyo enyo gkpara ya bụmarụ, gbanye na ya bụ njinji bodoro na o jiri ọkara gafee elekere asatọ nke abalị ụnyaahụ dika onye ekperima wụrụ ukwụ n'ụlọ ahia ọlọrọ ọhụrụ a bido kwaawa mgbọ egbe aghara aghara.

    Ka ihe dika nkeji iri abụọ gachara ndi uweoji zipụrụ na twitter na enwere na akwa mgbọ egbe akwụsị akwụsi na ụlọ anhịa king Soopers di na ogbe table mesa street.

    Ndi uwe oji gakwara n’ihu gwa ndi mmadụ ka ha hara iga nso n’ogbe ahụ dika awa abụọ gachara, ma dụkwa ha ọdụ ka ghara izipụ ozi ọbụla di aṅa ha hụrụ na ogbe soshal media.

    N’okwu ya n’etiti ndi nta akụkọ , onye isi ndi uweoji na Boulder, Mazi Maris Herold kpuhere na ha ejidela onye a ana enyo enyo gbara ya bụ egbe, ebe ọna anara ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ ,masiri ọhaneze obi ike inye ha nchekwa tọrọ atọ.

    O kwuputara aha onye uweojii a zutere ọnwụ mberede ya site na mkpamkpa a dika Eric Talley gbara afọ iri na otu onye sonyere ngalaba ụlọọrụ ndi uweoji ha kamgbe afọ 2010.

  5. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Anyị ji aka na unu hiri ụra nke ọma? Biko buru oche gị bịa soro anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.

  6. Ndị ọnụ na-eru n'okwu etinyela aka n'akwụkwọ maka udo toroatọ n'etiti ndị Ezza na Effium, N'Ebonyi steeti

    Ezza na Effium crisis

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu etinyela aka n'akwụkwọ maka udo tọrọatọ n'etiti ndị Effuim na Ezza dị n'Ebonyi Steeti.

    Ndị nọ na ya bụ ndị ọrụ nchekwa dị ichi iche na ndị ọnụ na eru n'ogwu n'obodo abụọ ahụ.

    Mgbe ha tinyechere ya bụ aka n'akwụkwọ, onyeisioche Okpuruọchịchị Ohaukwu bụ Omekannaya Odah rịọrọ gọvanọ steeti ahụ mgbaghara maka ajọ agwa ha.

    Ka o kwuchara nke a, onye nnọchite anya Ohaukwu North Constituency bụ Chinedu Awo rịọkwara mgbaghara maka ajọ agwa ndị be ha kpara.

    Gọvano Dave Umeahi jara ndị Effium na Ezza ike maka aka nke udo ahụ ha kwekọrịtara ma sịkwa na ya enyela ikike ka e bugara ndị gbara ọsọndụ n'ime ha nri enyemaka.

  7. EU amachiela Eritrea maka mmedu na mkpagbu ndị obodo ha

    Eritrea

    Ebe foto si, Getty Images

    N’Afrịka, otu ọgbakọ European Union amachiela mba Eritrea maka ebubo na ha na-egbu ọchụ na-akpachị ọtụtụ mmadụ n’ike na be ha.

    EU sị na ha ga-ejichi akụnaụba ndị a niile aka ha dị n’ịkpa ajọ agwa ahụ.

    Eritrea akatọkwaala ya bụ okwu na-akọwa na EU enweghị ihe ha ji aka ebo ya bụ ebubo.

    EU na-ebo ndị ọụ nchekwa mba ahụ ebubo igbu ndị mmadụ na ịkpachị ndị mmadụ n'ike.

    N'ihe ya, ha sị na ha ga-amachị ndị ọrụ nchekwa obodo ahụ.

  8. Ndị ngagharịiwe ajụla mkpebi ụlọikpe gbasara Ararume

    Otu kpọrọ onwe ha Okigwe Zonal Youth Alliance si Ọgbọnta vootu Sineti nke Imo North mere ngagharịiwe taa n’ogbe ahụ.

    Ha sị na-akwadoghị ya bụ mkpebi ụlọikpe ukwu nyere Ifeanyi Ararume dịka onye ga-anọchite anya ya na Sineti.

    Ha na-akọwa na ọ bụ Emmanuel Okewulonu nke PDP ka e kwesiri ịnye ya kemgbe APC enweghị onye nnọchite anya na ya bụ ntuliaka. Cheta na ụlọikpe ukwu dị n'Imo steeti kagburu aha Ifeanyi Ararume agbanyeghị na nke Abuja gụnyere ya.

    Ndị ngagharịiwe
  9. Nkeji Coronavirus

  10. Lee etu e si akwa ozu onye bụbu onyeisiala Tanzania

    Akwamozu onyeisiala Tanzania

    A malitela akwamozu John Pombe Magufuli bụbu onyeisiala mba Tanzania nwụrụ n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị n’isi obodo ha bụ Dodoma.

    Akwamozu onyeisiala Tanzania

    Ndị isiala mba Afrịka gụnyere nke Saụt Afrịka, Kenya, Zimbabwe, Mozambique na DR Congo awụchiela ebe ahụ.

    Akwamozu onyeisiala Tanzania
    Akwamozu onyeisiala Tanzania
  11. Nne na nna ụmụakwụkwọ Mahadum Agriculture a tọọrọ emeela ngagharịiwe

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Emmanuel Junior Zaka

    Ndị nne na nna ụmụakwụkwọ mahadum Agriculture dị na Kaduna Steetị emeela ngagharịiwe maka akwụkwọ ahụ a tọọrọ kamgbe ihe ruru izuụka abụọ.

    N'ime ọtụtụ ndị a tọọrọ, a zọpụtala mmadụ ruru otu narị na iri asatọ ebe ndị ruru iri atọ ka nọ n'aka ndị ntọrị.

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Emmanuel Junior Zaka

    Ndị nne na nna a na-akpọ oku ka gọọmentị gbaa mbọ hụ na a tọhapụrụ ụmụ ha ndị a tọọrọ.

    Akụkọ kwuru na ntọrị sị na ha chọrọ ka gọọmentị na ndịisi ụlọakwụkwọ kwụọ ha nde kwuru nde ego tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ ndị fọrọ afọ.

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Emmanuel Junior Zaka

  12. Ejila Onitsha Ado Vigilantee etinyere ESN aja na garrị - Nnamdi Kanu

    Igwe Achebe na Nnamdi Kanu

    Onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu akatọọla otu nchekwa a kpọrọ Onitsha Ado nke Igwe Alfred Achebe hiwere.

    Kanu sị ka Igwe Achebe ekwela ka e were ọkwa ya bute nsogbu nye ndị Eastern Security Network bụ nke Kanu n'onwe ya hiwere.

    Ọ sị ma ọ bụghị ya na Igwe Achebe na ndị otu ya ga-ebe akwa.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Okwu a Nnamdi Kanu kwuru wutere ọtụtụ ndị mmadụ nke mere ha ji na-akatọkwa ya n'akara Twitter.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Cheta na Obi nke Onitsha bụ Igwe Alfred Achebe nọọrọ n’izuụka gara aga kpuhe otu nchekwa Onitsha Ado Vigilante Network a iji belata mpụ na-arị elu n'ogbe ahụ.

  13. Coronavirus egbuola Guy-Brice na-azọ ọkwa onyeisiala Congo Brazzavile

    Guy-Brice Parfait Kolela

    Ebe foto si, Getty Images

    Guy-Brice Parfait kolelas otu onyegbapụtara ihe so na ndi na akwangu ndọrọndọrọ ọchichi ọkwa ọchịchị onyeisila mba Congo –Brazzaville nwụrụ ụnyaahụ bụ Sọnde n'ọria coronavirus.

    Onye isioche ichụnta nkwado ya gwara ụlọ mgbasa ozi AFP na mazi kolelas nwụrụ n’ụgbọelu eji ebu ndi ọria biara ibupu ya na mba brazzaville n'ehiehie unyaahụ.

    Nwamadi a gbara afọ iri isi na otu mabutere nje coronavirus n’ụbọchi Fraịde bụkwanu ụbọchị ichụnta vootu ga-akụrụ ọnụ.

    A chọpụtara na o bu ọria shuga tupu o bute ọrịa coronavirus a nke gburu ya.

    Ndi ji anya ha hụ kwuru na ntuliaka emere n’ụbọchi Sunday gara sịrịrị werere ma na ndi mmadụ apụtaghị n’uju bianye aka na ntuliakaụ ahụ.

    Tupu ụbọchị ntuliaka ahụ, a hụrụ maazi Kolelas n’ihe onyonyo ka ọ nọ ka onye ike gwụrụ ebe e kpunyere ya igwe e ji eku ume ma gaa n’ihu ịgba ndi mmadu ume ibianye aka.

    Ọ bụ nwa nwoke onye buburu Prime Minister ma bụrụ onye minister okwu mmiri na ikụ azụ kapụchara n’ochie, burụkwa onye ọru bekee.

    Iwu metụtara ntuliaka akwadoghi ikagbu ntuliaka ma ọ bụrụ na otu onye so azọ ọkwa ọchichi anwụọ.

  14. Lee ihe ndị oji egbe mebiri n'ụlọọrụ ndị uweojii nke Isiala Mbano

    Ụlọọrụ uweojii Isiala Mbano

    Ebe foto si, Imo Police

    Ndị uweojii Imo Steetị ewwpụtala foto mkpamkpa ndị oji egbe kpara n'isi ụlọọrụ ha dị n'Isiala Mbano nke steetti ahụ.

    Nke a pụtara mgbo kọmishọna uweojii n'Imo Steetị bụ Nasiru Mohammed mere njem nleta n'ebe ahụ.

    Ụlọọrụ uweojii Isiala Mbano

    Ebe foto si, Imo Police

    Mohammed sị na ndị a merụrụ otu onye ọrụ ha ahụ, onye mechara nwụọ ka ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.

    Ọ sị ha mebiri ọtụtụ ihe mana ndị e bughi ngwa egbe ọbụla pụọ dịka akụkọ na-efegharị.

    Ụlọọrụ uweojii Isiala Mbano

    Ebe foto si, Imo Police

    Cheta na ndị oji egbe a na-amaghị ndị ha bụ wakporo ụlọọrụ ndị uweojii a dị n'Isiala Mbano, Imo Steetị n'abalị ụbọchị Satọde 20 Maachị, 2021.

    Ụlọọrụ uweojii Isiala Mbano

    Ebe foto si, Imo Police

  15. Igbo ndị ọma anyị na-ekele unu n'izuụka ọhụrụ a

    Ọ bụ obi dị ọcha ka anyị ji asị ka izuụka a maara unu mma nke ukwuu.

    Biko gbalịa n'isonyere anyị na BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.