You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Lee ka emume 'palm sunday' si aga n'ụlọụka' dị iche iche

Taa ka ndị ụka Kraịst na-eme emume 'palm sunday' iji nabata izuụka nso

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ka ọ dị nụ echi

    Anyi akpachiela ọba akụkọ a.

    Echi anyi abịa ọzọ.

    Daalụ nụ

  2. Na Akpọtụ Ugbu A, Ihe ruru mamdụ 32 anwụọla ka ụgbọ oloko abuọ kwakọrọ isi n'Ijipt

    Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba Ijipt ekwuola na ihe ruru mmadụ 32 nwụrụ ebe ihe ruru 60 merụrụ ahụ dna mberede ụgbọ oloko.

    Ihe onyonyo na foto si ebe ihe a mere na mpaghara Sohhag dị na ndịda Ijipt gosiri ụgbọ oloko kwụpụrụ n'ụzọ ya n'akụku ụzọ mmiri.

    Ijipt na-enwekarị mberede ụgbọ oloko maka anaghi elete ngalaba ahụ anya ọfụma.

  3. A ga-eli Magufuli taa

    Okporoụzọ nile ga echewe ihu na Chato dika aga-eli ozu onye buburu onyeisiala mba Tanzania John Magufuli taa bụ Friday na ama nna ya di na Chato na mpagara ugwu mba Tanzania

    Aga-enwe emume laa n’udo n’isi obodo ahụ bụ Dodoma n’ụbọchị Monday , akụkọ kwuru na onyeisiala a gbara afọ iri isi n’otu nwụrụ site na gbalụgbalụ ọrịa obi.

    Onyeisila ọhụrụ mba ahụ bụ Samia Suluhu derpụtara na akara twitter ya, kelere ndi nile n’ọnyere ha , kwado ha, na kwa ndi nile zitere ha ozi karobi n’oge ọdachịa dakwasịrị ha.

    Akụkọ kwuru na ndi uweoji nwụchịrị mmadụ anọ abali ole na ole tupu ụbọchị olili ozu ya nihi iji ọnwụ ya eme ihe akaja.

    Ụlọ ọrụ ndi uwe oji mpagara ndịda obodo Mbeya , Urich Matei, kwuru na anwụchiri ndia n’ihi na chọrọ ibute ọgbaghara na obodo.

    Mba Tanziania akwụsịchaala ememu ha nile ruo abalị iri abụọ n’otu ọmawapụtara iji rie uju ọnwụ onyeisiala ha lara mụọ.

  4. Ikukwu mmiri egbuola mmadụ ise n'Amerịka

    Opekatampe mmadụ ise anwụọla na mba Alabama dika oke ebuli mmiri na aga n'ihu ikpamkpa na ndịda mba America.

    Ọnwụ ndị mmadụ a mere na Oatchee ntakiri obodo di na di na mba Calhoun, ụlọ ọrụ onọdụ gbatagbata kwuru na ụtụtụ ụlọ lara niyi ,tinyekwara akụ ndi ọzọ.

    Ka ọdi oke ikuku mmri a bikwara obodo Chilton aka ọjọ.

    N’okwu ya Gọvanọ kay Ivey kpọkuru ndi nile bi na obodo oke ebuli mmiri a n’eyi egwu igba mbọ mụrụ anya ka azụ, kwuo na ebuli mmiri a ederebeghi duu.

    Na afọ 2019 ihe karịrị mmadụ iri abụọ tinyekwara ụmụaka atọ nwụrụ site na mpamkpa oke ebuli mmiri nke kuriri ọtụtụ ụlọ na okporoụzọ na mpagara ọwụwa anyanwụ Alabama.

    Nwunye onyeisiala mba America Jill Biden akagbuola njem oyiburu ya na Jennifer Garner na eme ihe ejije gara eme ma mba ahụ n’ihi oke ebuli mmiri.

    Oteela aka atụwara anya odoziakụ Biden na mba Birmingham inwe nnọkọiji itinye ọnụ gbasara ngwogwo eji enyere ndụ aka maka ọdachi nje coronavirus na mba ahụ.

  5. Unu asaala chị?

    Dika anyị na-amalite taa, anyi na na-asi akwụ chaala onye ọbụla

  6. "Anyị na-achọ nwokorọbịa bepuru nne ya isi n'Oji River Enugwu"

    Ndị uweojii Enugwu Steetị ekwuola na otu nwokorọbịa egbuola nne ya ma bepu ya isi n'obodo Egwu Achi in Oji River nke Enugwu Steetị.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n"Enugwu bụ Daniel Ndukwe mere ka BBC Igbo maka na ha ka na-eme nyocha banyere nke a mana ọ kpọghị aha nwokorọbịa

    Ọ sị na nwamadị a bepuru isi nne, lie ya iche ma lie kwa ozu nne iche.

    Ndukwe sị na nwokoroọbịa riri mbọbọ ọsọ na ha ka na-achọ ya achọ ugbu dịka nyocha na-aga n'ihu.

    Foto na-efegharị na soshal midia gosiri na ndị mmadụ bọpụtara ozu na isi nne nwokoroọbịa.

  7. Anyị na-akwụ N120bn kwa ọnwa iji belata ọnụ mmanụ ụgbọala - NNPC

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ NNPC etiela ebewu na ha na-akwụ ego dị otu ijeri narị naịra na iri abụọ (N120bn) kwa ọnwa.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ Mele Kyari kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Tọsde n'Abuja.

    Ọ sị na ibu dị n'isi ụlọọrụ NNPC n'ibelata ọnụ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa na-anyịgbu ha.

    N'isi ọnụego a ha na-akwụ, Kyari sị na ụmụafọ Naịjirịa ga-ebido ịkwụ ụgwọ ọnụego ole mmanụ ụgbọala na-ada n'oge na-adịghị anya.

    Ọ sị na a na-ere ya n'ọnụ dị aka karịa ọnụego e ji bubata ya na Naịjirịa nke mere ụlọọrụ NNPC ji akwụ nke fọrọ afọ.

    Ọ sị na NNPC agaghịzi ebuli ibu ịkwụ ụgwọ a, na oge eruola mgbe ndị na-ere ahịa ga-ekpebi ọnụego mmanụ ụgbọala ga-ada.

    Mana Kyari ekweghi ekwu mgbe ụlọọrụ NNPC ga-akwụsị ịkwụ ụgwọ a.

  8. Nkeji Coronavirus

    Gere akụkọ niile banyere coronavirus dịka o si kwụrụ n'Afrịka.

  9. Otu ọkammụta agaala nga afọ atọ n'Akwa Ibom n'ihi nrụrụaka na ntuliaka

    Ụlọikpe dị n’Akwa Ibom Steetị nọọrọ n'ụbọchị Tọsde 25 Maachị, 2021 maa otu ọkammụta mahadum Uyo ikpe ma tụọ ya nga afọ atọ maka nrụrụaka na ntuliaka.

    Ọkaikpe Augustine Odokwo maara Peter Ogban ikpe maka ịkpọpụta mpụtara adịgboroja na ntuliaka ụlọomeiwu e mere n'Akwa Ibom n'afọ 2019.

    Ọ bụ ụlọọrụ Inec gbara ọkammụta akwụkwọ n'ụlọikpe dị n'Uyo n'ebubo ime nrụrụaka n'oge ntuliaka afọ 2019 bụ nke a malitere ikpe ya na Nọvemba afọ 2020.

    Ogban bụ onye na-agụkọ vootu na ntuliaka sịnetọ ga-anọchi anya mpaghara Akwa Ibom North-West n'ụlọomeiwu ukwu.

    Ọkammụta Ogban na-akuzi ihe na mahadum Calabar nakwa nke Uyo rụrụrụ aka na mpụtara ntuliaka iji nyere Godswill Akpabio nke APC aka ka o merie ndị PDP.

    Ndị gbara akaebe megide Ogban sị na mpụtara ọ kpọpụtara dị iche na vootu ole ha gụkọọrọ ma nye n'oge ntuliaka ahụ.

    Nke a mere ọkaikpe Odokwo ji chabie ikpe ma tụọ Ogban mkpọrọ afọ atọ a na-agaghị ejinwu ego gbapụta ya.

  10. BBC Nkeji

    Gere akụkọ BBC Igbo maka ihe mere n'ụwa n'ime otu nkeji.

  11. Yusuf Buhari 'ga-alụ Zarah Nasir Ado Bayero n'afọ a'

    Yusuf Buhari, nwa onyeisiala Naịjirịa bu Muhammadu Buhari 'ga-alụ Zarah Nasir Bayero, nwa Ado Bayero bụ Emir Bichi' ma emechaa emume Sallah n'abịa.

    Otu onye nọ Obi ezi Bichi nso gwara BBC Hausa na ezinaụlọ abụọ a ezutere onwe ha iji kpa maka atụmatụ ịhụnanya dị n'etiti mmadu abụọ a.

    Onye ma maka ihe a achọghị ka akpọ aha ya sị na ndị na-anọchite anya oneyisiala Naịjirịa agaala hụ ndị be Ado Bayero bụbụ zze Kano iji riọ arịrịọ aka nwa ada ahụ maka ọlụlụ.

    "Ezinaụlọ abụọ ahu enwerela nkwekọrịta ime emume alụmdi na nwunye Yusuf na Zarah ruo oge agbachara Sallah," bu ihe onye ahu kwuru.

    Ọ bụ na mba Briten ka Yusuf na Zarah zutere onwe dika ha na-agụ akwụkwọ, dịka onye a ma maka akụkọ a siri kwuo.

    Yusuf ga-abụ nwa Aisha Buhari nke atọ gbara akwụkwọ kemgbe Buhari rigoro n'ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2015.

    Akukọ Yusuf wuru ewu oge ọgbatumtum ya nwere mberede okporoụzọ na 2017.

  12. Anyị na Tinubu di ka nnu na mmanụ - Ụlọ ọrọ onyeisiala Naịjirịa

    Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na onweghi ihe ọbụla na-esere onyeisisla Muhammadu Buhari na Asiwaju Bola Ahmed Tinubu, ma sị na ọ bụ akaọrụ ndị ọchọngaloku.

    N'akwụkwọ ozi ha wepụtara na-akọwa na onweghi ihe ịdụ aka n'ọnụ ọbụla dị n'etiti Onyeisiala Buhari na Tinubu.

    Ha gakwara n'ihu kwuo na Buhari na Tinubu ejighi ọdimma APC eti epele n'inweta atụmatụ mgbanwe bụ ebumnobi na ụgwọ ha ji ụmụafọ Naịjirịa.

    N'otu aka ahụ, ha sị naa kepukepu na-efegharị n'ikuku ugbua nke sị na e nwere esomokwu n'etiti Onyeiisiala na nwamadị a chiburu Lagos State bụ asị ọcha.

    Ọ rụtụrụaka na ọ bụ ihe jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ na ụfọdụ ụlọọrụ mgbasaozi ga-abụ ndi ga na-abọlite akụkọ na-eko achịcha kpaliri ndi o ji akpa eli ozu ibu akụkọ asị akpagharị.

    Ụlọọrụ Onyeisiala mere ka a mata na ọ bụrụ na Asiwaju abụghi ihu a na-ahụ kwamgbe n'obi ọchichị etiti na ọ pụtara na o soghi na ndịisi ọchịchi etiti, na nke a apụtaghị na ọ bụghị ezigbote enyi Buhari.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na-ekwu na aka a chiburu Lagos Steetị ma bụrụkwa otu onye gbapụtara ihe na pati APC na Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ na esemokwu.

  13. Mba Jamini na-eche iweghachite nka ndi Bini ndi ọcha buru gbalaga mgbe gbuo

    Mba Jamini na ama-amuma iweghachitere Nigeria nka ama dikaụzụ ọdinala benin ka otu commite ehiwara kwuru.

    Ezuru nkaa a n'obi eze benin bụ mpagara ndida nigeria ugbu a n'oge ndi ọcha na achị ka ahụrụ ya na ụlọ ebe ana echekwa akụrụngwa ọkpụtọrọkpụ nwa DC kporọ museum di na isi obodo mba Germany.

    Ụlọọrụ na ahụ maka nkwalite omenala, Prussian Cultural Heritage Foundation (SPK) nke ụlọ ọrụ meseum berlin ha ahụ maka ya kwuru na ndi otu ha ekwetala na ogbugbo nyere ụzụ a ga abụ iweghachiri ha.

    Site na okwu ya, ụlọọrụa kwuru na enwela mkparịta ụka tọrọ atọ ọtutụ oge imara ntọọala ya bụ nka.

    Onye minister okwu mba ofesi nke mba Germany, Heiko Mass nọrọ ụnyiahụ kwuo na okwu "iweghachi akụrụngwa ọdinala a gbanyere ụkwụ na nkwụwa aka ọtọ nke ọchịchị nwa bekee, ọbụ okwu ikpenkwụmọtọ"

    N'okwu gbasara ụzụ benin a akpụrụ akpụ,"anyị na adakọrịta nti n'etiti ndi nkea metụtara na Nigeria na mba Germany iji nwe otu olu na otu obi tụmadị mbakọ akaọnụ ụlọ Messuem ọdịda anyanwụ mba Africa di na benin city.

    Ụlọ ọrọ ethnological mesuem nwere akụrụngwa ọkpụtọrọkpụ iri ise na atọ esi na obodo benin wepụ tinyekwara ụzụ a akpụrụ akpụnarị anọ na iri anọ dika ụlọ ọrụ mgbasa ozi AFP siri dee.

    Ọgbanyere na adịla njikere iwepụta ụfọdụ n'ime ha maka igba ya nkiri na ihe emumehumboildt forum nkeafọ a na mba Berlin

  14. Nkeji coronavirus

  15. BBC Nkeji

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  16. Shuaibu Ibrahim bụ onyeisi ụlọọrụ ndi ji otu afọ efe ala nna ha bụ National Youth Service Corps (NYSC) adọla ndị ndọrọ ndọrọ ọchichi aka na ntị ka ha kwụsị imekpa ndị ntoroọbịa a ahụ n’oge ntuliaka.

    Ibrahim sị ma ọ bụghị ya na a ga-akwụsị iziga ndị a ọrụ n’ebe a na-eme ntuliaka

    Onyeisioche kwuru nke n'ụbọchị Tusde dika ọ biara ile otu onye ntoroọbia ji otu afọ efe ala nna ya a gbara egbe na ntuliaka e mere n'obodo Omuo di n'Ekiti Steetị.

    N’okwu ya “a chọrọ m irịọkwa ọzọ, mgbe ọbụla e nwere ntuliaka, emetukwala ndi ntoroọbia m aka. Ya enwekwala onye ọbụla ga anwa anwa metụ ndi ntoroọbia m ji otu afọ efe ala Naịjirịa aka.”

  17. Gọvanọ Ortom ezutela Onyeisiala Buhari maka nchekwa obodo

    Aka na-achi steetị Benue bụ Samuel Ortom akpọturala Onyeisiala Muhammadu Buhari n’obi ọchịchị gọọmenti di n'Abuja ụnyaahụ ka abalị atọ ndi na achi ehi wakpuchara ya.

    Na ngwụcha ọgbakọ mkparịtaụka, Ortom gwara ndi ntaakụkọ na ọnọdụ enweghi nchekwa n'ala Naịjirịa ugbua ga-emetụta ntuliaka afọ 2023.

    Ortom sị na onweghi etu a ga-esi ekwu okwu ntuliaka afọ 2023 ma e bughi ụzọ chekwa ala Naịjirịa maka na onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.

    Cheta na Ortom ghọrọ onwe ya aghọ na aka ndi ogbuọchụ n'ubi ya di na Markurdi nke steetị ahụ.

    Ọ riọrọ ọhaneze ka ha hara ikwe ka ọchụchọ obi ọkwa ọchichị afọ 2023 kụsasia udo na idi n’otu obobdo Naịjirịa.

    Ortom gakwara n’hu ikpọku ka onye ọbụla gbakọọ aka ọnụ kwalite nchekwa na Naịjirịa, kwuo na okwu ncheka abụghi naanị nke onyeisiala ma ọ bụ nke ndi gọvanọ.

  18. Gọvanọ Obiano ezutele ezinaụlọ ndị uweojii e gburu n'Anambra

    Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra Steetị bụ M.B Kuruyas n'aha onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu egosila gọvanọ Willie Obiano ezinaụlọ ndị uweojii ahụ ndị oji egbe gburu n'Anambra.

    Gọvanọ Obiano na nzaghachị nyere ezinaụlọ ndị uweojii ego iji tie ha aka n'obi maka ọnwụ nna ha nakwa ụmụ nne ha.

    Kọmishọna Kuruyas kelere gọvanọ Obiano maka onyinye a ma kwee nkwa na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ agaghị ezu ike ruo mgbe aka ga-akpara ndị oji egbe kpara arụ a.

    Ndị ọzọ so mee njem a gụnyere onye ndu ndịagha mmiri n'Onitsha bụ Adekunle Kamal Okeniyi, onyeisi ndị nche ụlọmkpọrọ bụ Emmanuel Anekwe Nwakeze, onyeze obodo Omor bụ Igwe Chris Oranu na ndị ọzọ.

  19. Igbo ndị ọma ụtụtụ ọma nụ ooo

    Ọkpa ekele ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ nke taa. Biko bịa nọnyere anyị

  20. Easter: Lee ihe ndị Katolik Diayọsis nke Legọs gbanwere n'ihi Covid-19

    Ụka Katolik na Legos ahazigharịala usoro emume na ofufe ha n'oge emume Ister n'usoro iji gbochie nkesa ọrịa coronavirus.

    N'akwụkwọ ntuziaka nke nnụkwụ Ukọchukwu na-elekọta Legọs achịdayọsis bụ Achịbishọp Adewale Martins zigara ndị ụkọchụkwụ na ndị ụka Katọlik na Legọs, o kwuru na a gaghị eme ụfọdị ihe ndị ofufe a na-emebu n'oge emume mbilitenọnwụ Kraistị n'afọ a n'ihi nje coronavirus.

    Dịka o siri kọwaa, ihe ndị agaghị eme gụnyere; ejijie ahụhụ Kraistị nke a na-eme ụbọchị 'Good Friday'; isusu obe ọnụ, emume Galilee ụbọchị 'Easter Monday' wdg..

    N'aka nke ọzọ, nhazigharị ihe ndị ọzọ gụnyere; a ga-akwụ otu ebe mee "Ngagharị nke Obe".

    Martins dọrọ aka na ndị ka a mata n'iwu niile banyere usoro mgbochi coronavirus ka dịkwa ire rịọrọ sị: Dịka anyị na-eme emume mbilitenọnwụ Kraistị, ka anyị cheta iwu maka Covid-19: Kwọ aka gị, tee mmanụ sanitiser, yiri mkpucchi imi, nọpụrụ onwe gị."