Aka na-achị Ebonyi steeti ekwuola na ihe mere aka na-achị steeti dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ ejighi kwenye ihibe ihe dị ka Amotekun n'Ọwụwa Anyanwụ.
Umahi sị na eziokwu eziokwu onweghi ihe
dị ka "regional security outfit" na Naịjerịa dum.
Ọ sị: "Onweghi ebe otu ndị nchekwa steeti hibere na-esi steeti ha aga ọrụ na steeti ọzọ. Iwu Naịjirịa akwadoghị atụmatụ regional security network na ụdị a."
Ọ sị na ihe ha were n'Ọwụwa Anyanwụ bụ kọmitee na-enye steeti dị iche ndụmọdụ.
Umahị sị: "Ọ bụ ihe a
iwu NAỊJIRỊA kwadoro."
Ndi na-enye nsogbu maka atụmatu a anọghi na Naịjirịa
Ụmahi gara n'ihu kwuo na ọtụtụ n’ime
ndị na-ekwu maka atụmatụ Ọwụwa Anyanwụ inwe otu ngalaba nchekwa anọghị n’Ọwụwa
anyanwụ.
Ọ sị: "Ha nọ n’ofesi na-eti mkpu. Ha amaghi ihe ọbụla na-eme."
Nsogbu ka mfe n'Ọwụwa Anyanwụ
Umahị si na ọ bụ
eziokwu na nsogbu dị na Ọwụwa Anyanwụ makana ihe na-emetụta mpaghara ndị ọzọ
na-eru ebe ahụ.
Ọ sịkwa na nke bụ eziokwu bụ na onweghi ebe dara juu ruo Ọwụwa Anyanwụ
na Naịjirịa dum.
"Obi dị ndị
na-achị ọwụwa anyanwụ mma maka etu ha siri ruo ọrụ ma dịka ndị ha na-achị."
Onweghi otu
ọrụ nchekwa ọbụla anyi ga-ehiwe n’Ọwụwa Anyanwụ.
N'ịsa ajụjụ ma ha a ga-ege ntị n'oku a na-akpọ banyere inwe ihe dị ka Amotekun, Umahị sị "Anyị were “Joint
Security Commitee” na-ahazi ọnọdụ nchekwa n’Ọwụwa Anyanwu."
Uche ya were bụrụ na nke a zuru ihe a chọrọ ka e mee.
Umahi sịkwa
na onweghi ihe dị iche na atụmatu “Community Policing nakwa vigilantee. Ọ sị na
ha achọghị na ndị uweojii chịwa ndị “community committe” makana o kwesiri ị bụ
ndị obodo nọ n’isi ya. Ọ sị na iwu eji hibe Community Policing ka nke eji hibe
vigilantee mma.
Umahi sị: "Anyị
anabataghị atumatụ nke a nke onyeisi ndị uweojii Naịjirịa wetere. Anyi
ahaziagharịala ya ugbua."