Ụka Katọlik
na mba Tanzania ekwuola na ndị ụkọchukwu iri abụọ na ise nakwa ndị Rev Sister
iri isii anwụọla n’ime ọnwa abụọ gara aga n’ihi ọrịa yitere covid19.
Fr Charles Kitima bụ odeakwụkwọ nke otu Tanzania Episcopal Conference kwuru na ọrịa covid19 na-akpa ike na Tanzania n'agbanyeghị na gọọmentị achọghị ime ihe ọbụla maka ya.
Gọọmentị Tanzanịa anaghị ekwe ewepụta ezigbo ngụkọ maka ọrịa covid-19 na mba ahụ.
Ha ekweghịkwa etinye mmachi mkpagharị maọbụ imechi ụlọakwụkwọ iji gbochie mfesa ọrịa ahụ.
Fr Kitima kwuru sị: "Ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ichekwa onwe anyị n'ihi ọrịa a, ọ kachasị ndị okenye na ndị na-arịabu ọrịa."
"Nke ka njọ bụ na ndị mmadụ anaghị enyocha onwe ha. ụlọụka anyị nwere ụlọọgwụ 500 n'obodo a mana anaghị ekwe ka anyị nyochaa maka covid19, anyị enweghịkwanụ akụrụngwa eji eme ya bụ nnyocha."
Cheta na onyeisiala Tanzania bụ John Magufuli kwuru na coronavirus abụghị maka ndị kwere na Chineke.