Etu mmadụ anọ si tufuo ndụ ha oge ndị ekperima wakporo Kajuru, Kaduna steeti

Samuel Aruwan bụ kọmishọna okwu nchekwa dị n'aka na Kaduna steeti kwupụtara nke a n'ụbọchị Sọnde

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Anambra chọtara ọrịa covid n'ahụ mmadụ 334

    ncdc

    Ebe foto si, ncdc twitter page

    Mmadụ 344 ebutela ọrịa coronavirus n’Anambra steerti n’ụbọchị Tuusde dịka ngụko ngalaba NCDC si kwuo. Ọ pụtara na ihe ruru mmadụ otu ouku na narị atọ na iri isii na asatọ na Naịjirịa niile butere ọrịa ahụ.

    N’otu aka ahụ mmadụ gafere otu puku na Plateau, n’Anambra nakwa Abuja gbakerela n’ọrịa ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Gọọmentị ga-etinye CCTV n'okporoụzọ iji gbochie ntọrị mmadụ

    CCTV Camera

    Ebe foto si, Getty Images

    Mịnịsta na-ahụ maka ndị uweojii bụ Muhammad Dingyadi ekwuola na gọọmentị ga-etinye igwe ose foto n'okporoụzọ awarawara niile na Naịjirịa iji kwụsịlata ntọrị mmadụ.

    Dingyadi kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị Channels TV nwere ma kwuo na Onyeisiala Muhammadu Buhari enyelarị nkwado maka ya.

    O kwuru ha na ụlọọrụ NPS technology enweela nkwekọrịta maka imezi igwe osefoto niile gọọmeentị tinyeburu bụ ndị anaghị arụzị ọrụ ugbua.

  3. Mbappe agwọọla Barcelona ka Abacha n'azụụlọ ha

    Mbappe

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mbappe mere ndị Barcelona ịwa

    Kyllian Mbappe egosila ihe o ji bụrụ 'e lelịa nwa ite ọ gbọnyụọ ọkụ' oge o nyere goolu atọ n'asọmpi Champions League dị n'etiti Barcelona na PSG n'abalị Tuzde.

    Ọkpụ goolu anọ asatara naanị otu ka ndị PSG ji nweta mmeri n'asọmpi ahụ bụ nke a gbara n'ama egwuregwu Camp Nou, bụ ogige ndị Barcelona.

    Lionel Messi nyere goolu nke mbụ na asọmpi ahụ, mana oteghi aka, Mbappe sara ya.

    Oge agba nke abụọ malitere, Mbappe nyekwara goolu abụọ ọzọ ebe Moise Kean nyekwara otu goolu.

    Agba nke abụọ nke asọmpi a ga-adị n'izuụka abụọ na-abịabịa iji mata ndị ga-agafe n'agba nke ọzọ nke asọpi Champions League

  4. Ụtụtụ ọma

    Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi.

    Anyị amalitela mgbasaozi nke taa bụ Wenezde ahị Afọ, abalị iri na asaa nke ọnwa Febrụwarị afọ 2021.

    Daalụ maka isonyere anyị.

  5. Gọmenti Legọs ebugharịala ụbọchị aga-emepe akwa mmiri 'third mainland', Kama ha ga-emepe ya na ngwụcha ọnwa Febụwarị 2021

    Gọmenti Legọs ebugharịala ụbọchị aga-emepe akwa mmiri 'third mainland'

    Ebe foto si, LASG/Twitter

    Nkọwa foto, Gọmenti Legọs ebugharịala ụbọchị aga-emepe akwa mmiri 'third mainland'

    Gọmenti Legọs kwuru maka mbugharị ha bughariri mmepe akwa mmiri 'third mainland' site n'igwe Twitter ha:

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. 'Ọnwụ Michael Nnadi akụzịghịrị Naịjirịa ihe ka ọ gbachara otu afọ' Matthew Kukah

    Press Association

    Ebe foto si, Michael Nnadi

    Dịka ọ gbachara otu afọ ndị ogbu ara ọbara tọchaara ma gbufuo nwaadị Igbo bụ Michael Nnadi na-aga ọzụzụ ụkọchukwu na Seminary dị na Sokoto, Bishọpụ ebe ahụ bụ Matthew Kukah etiela mkpu na ọnwụ ya bụ nwaamadị gbara afọ 18 enweghị ihe mgbanwe ọ nwetere n'ọrụnchekwa na Naịjirịa.

    Ọ sị, "ọ bụ ihe mwute na ka ọgbachara otu afụ, anyị azọbeghị ọkpa njem iru ebe anyi kwesiri ga.".

    Kukah kwuru nke a na-ncheta ọnwụ Michael Nnadi mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Febuwarị 2021.

  7. Kevin De Bruyne amalitela egwu ọzọ ka o meruchere ahụ otu ọnwa gara aga

    N'egwuregwu, Kevin De Bruyne nke Manchester City esila n'akwa ọrịa kule n'ahụ nke o meriri na ihe ruru otu ọnwa ugbua. Onye nkuzi otu egwubọọlụ ahụ bụ Pep Guardiola sị na o so mee ọzụzụ taa.

    Kevin De Bruyne

    Ebe foto si, Press Association

  8. Ụgbọmmiri kpuru na Congo egbuola mmadụ 60

    N'Afrịka, ihe ruru mmadụ iri na isii anwụọla ihe mberede ụgbọmmiri maka ịsu okwute n'abalị na mba Congo. Ebe azọpụtara mmadụ dị narị atọ, a ka na-achọ ịhe karịrị narị abụọ achọ ebe ahụ.

    Ụgbọ kpuru na Congo

    Ebe foto si, Getty Images

  9. Nkeji Coronavirus

  10. Ndị ọrụ ahụike Naịjirịa kee nkwụcha maka Ebola selitere isi ọzọ

    Ndị n'eli onye nwụrụ site n'ọrịa Ebola

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba ahụike mba Naịjirịa ezigarala ndị ọrụ ahụike niile ozi ike nkwụcha dịka ọrịa Ebola selitere isi ọzọ na mba Gini.

    Minista ahụike bụ Osagie Ehanire kwuru na ha ga-ebido nnyocha ụzọ niile esi abata ala Naịjirịa iji hụ na akwụsịrị ọrịa ahụ ịbata ọzọ.

    O kwukwara na ha dị njikere ịzigara ngalaba ahụike bụ WHO ndị ọrụ enyemaka iji lụsọ ọrịa ahụ ọgụ na mba Gini. “Anyi jisike eso akụkọ gbasara ọrịa a dịka ọ na-efe na mba ahụ (Gini) ka o kwuru.

  11. Onye bụbụ onyeisi bọọlụ na CAR ga-azara ọnụ ya na ICC taa

    Patrice Edouard Ngaissona

    Ebe foto si, AFP

    Onye bụbu onyeisi ngalaba bọolụ na mba Central African Republic ga-azara ọnụ ya taa maka mpụ o mere n’oge agha n’ụlọikpe kachasị n’ụwa bụ International Criminal Court (ICC).

    E boro Patrice-Edouard Ngaissona bụ onyeisi otu megidere Balaka ebubo mmegbu ndị mmadụ nke ọ gọsiri ike.

    Ya na Alfred Yekatom bụ ndị eboro ebubo ịkpa nkata nakwa ịwakpo ndị okpukpere Alakuba site n’afọ 2013 rue afọ 2014.

    Ọgbaghara dapụtara n’ebe ahụ n’afọ 2013 mgbe ndị okpupere alakuba weghara ọchịchị n’ike na mba ebe ndị okpukpere chineke kachasị n’ọnụọgụgụ.

  12. Mmadụ 1528 agbakeela n'ọrịa coronavirus

    ncdc

    Ebe foto si, ncdc twitter page

    Ọnụgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus n’ụbọchị Monde bụ narị ise na iri asaa na anọ dịka ngalaba NCDC si kwuo. Ọṅụọgụgụ ndị gbakerela site n’ọrịa ahụ n’ime Monde ahụ bụkwa mmadụ otu puku na narị ise na iri abụọ na asatọ. Cheta na n’ụbọchị ole gara aga ndị butere ọrịa a na Naịjirịa na-agafe otu puku kwa ụbọchị. Nke a mere na ndị niile butere ya bụ ọrịa na Naịjirịa gafere otu puku narị na iri anọ na isii

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Ndewonu!

    Igbo ndị ọma, anyị abịala n'isi njedebe nke mgbasaozi taa.

    Anyị ji n'aka na emume Valentine gị gara nke ọma.

    Ka ọ dị nụ echi.

  14. Ndị isiabaokpu weghaara ọchịchị na Myanmar adọọla ndị ngagharịiwe aka na ntị

    Ndị isiabaokpu weghaara ọchịchị na Myanmar adọọla ndị na-eme nagagharịiwe aka na ntị na onye ọbụla ha jidere na-agbagha ha okwu ga-esị 'rọd' n'imi ọgụ afọ ma aka kpara ha.

    Ndị ngagharịiwe a n'esiọnwụ ka ndị agha wechitere ha ọchịchị onye kwuo uche ya ma tọghapụ ndị niile ha kpọchiri.

    Ngagharịiwe Myanmar

    Ebe foto si, Getty Images

  15. EFCC anwụchiela ụmụ gayị mmadụ iri abụọ n'Owerri

    Ndị ụlọọrụ EFCC anwụchiela mmadụ iri abụọ ji ịtụakwụkwọ ịntanetị mere akaọrụ n'owere ụbọchị Frịade.

    Ndị ngalaba ụlọọrụ ahụ n'ahụ maka mpaghara Port Harcourt sị na ha ga-akpọpụ ụmụntorobịa ụlọikpe mgbe ha mechere nnyocha ha.

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

  16. Nkeji coronavirus

  17. Ọ bụghị eziokwu na Buhari nyere m ọrụ na DPR - Bashir Ahmed

    Bashir Ahmad bụ onye enyemaka onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe banyere ọgba mgbasaozi ịntanetị ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ya nwetere ọrụ na mpaghara gọọmentị na-ahụ makana mmadụ agbdị Bekee kpọrọ "Department of Petroleum Resources.

    Ọ bụ ụlọ ntaakụko People's Gazzette dere akụkọ na mmadụ gbara ha ama na Onyeisiala Buhari ijirila nwayo nwayo nye Maazị Ahmad ọrụ ha sị otuzughi, gụnyere nke ọ na-arụ.

    Maazị Ahmad gọrọ aka n'ụkwụ na ya enweteghị ọrụ ọhụrụ ọbụla.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Mana, ọgụgọ ya ahụ bịara n'azụ ọtụtụ ndị mmadụ gbarụchara ihu were n'ekwu na ihe ahụ ulọ ntaakụkọ ahu kwuru bụ akaebe na Onyeisiala Buhari na-eme ịma mmadụ ọtụtụ.

    Otu onye were iwe bu onye otu patị All Progressives Congress a ma ama na Twiter aha ya bụ Gbenga Gold.

    Mana, Maazị Ahmad gwara ya na ọ bụghị eziokwu.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Ka ọ kwụ ugbua, gbenga na-ewu na Twitter dịka ndị mmadụ ji mba ọ bara na-ama Maazị Gold akaja.

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  18. Lee okwu ọhụrụ Enyinnaya Abaribe gwara Buhari

    Enyinnaya Abaribe

    Ebe foto si, Enyinnaya Abaribe

    Okwu gbara okpurukpu Enyinnaya Abaribe na-anochite anya Abia central n'ụlọomeiwu ukwu dịka a na-agba ya ajụjụ ọnụ.

    Enyinnaya Abaribe ekpurula nkata n'ihu gwa onyeisiala Muhammadu Buhari okwu gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

    O kwuru si na onyeisiala anaghị eji aka ya ekwuputa okwu mgbe ọ dị mkpa dịka ihe gbasara nchekwa nakwa ọrịa coronavirus, kama na ọ na-ezi ọnụ na-ekwuchitere ya mee nke a.

    Okwu Abaribe pụtara ihe dịka ya ndị ụlọntaakụkọ Channels nwere nkparịtaụka.

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na enweghi ezi nchekwa na-arị ibe ya elu na gburugburu ala Naịjirịa.

    O kwukwara na o nwere olileanya na Naịjirịa ga-aọghachi ọnọdụ mma ebe ọ dịbu na mbụ.

  19. A gaghị m ekwe ka otu ọbụla kewaa Naịjiịrịa - Onyeisiala Buhari

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, @MBUHARI/Twitter

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọ gaghị ekwe ka otu ọbụla kewaa Naịjirịa site n'ịmegide otu nakwa agbụrụ ndị ọzọ.

    O kwuputere n'akara Twitter ya na ọchịchị ya ga-echekwa ụmu Naịjirịa dịka iwu ala si debe.

    Nke a na-abịa dịka esemokwu ghọrọ ọgbaghara dapụtara n'ahịa shasha dị n'Oyo steeti nke ndị uweojii kwuru tara isi otu mmadụ.

    Aka na-achị steeti ahụ bụ Seyi Makinde gakwara nleta n'ahịa ahụ iti ndị ọdachi a metụtara aka n'obi ma kwee nkwa na ha ga-enweta ikpe ziri ezi.

  20. Ndewo nu!

    Unu abọọla chi?

    Taa bụ mbido izu ọhụrụ! Ka ihe ọmaa saa gị arụ n'izu a niile.

    Jisinu ike n'isoro anyị.