You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Etu mmadụ anọ si tufuo ndụ ha oge ndị ekperima wakporo Kajuru, Kaduna steeti

Samuel Aruwan bụ kọmishọna okwu nchekwa dị n'aka na Kaduna steeti kwupụtara nke a n'ụbọchị Sọnde

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. "Wike bịa sonye otu APC" - Orji Kalu

    Orji Uzor Kalu agwaala aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike ya bịa sonye otu ndọrọndọrọ ya bụ APC nke Wike jụrụ ajụ

    Ọ kpọrọ ya oku a dịka ọ gara nleta ihe ụfọdụ Gọvanọ Wike rụpụtara na steeti ya iji wulite ọnọdụ ndị steeti ahụ

    N’otu aka ahụ Nyesom Wike dụụrụ ndị nọ n’ọchịchị ndụmọdụ sị ha ghara iji maka ahụhụ covid-19 butere ghara ịwulite ngalaba dị icheiche n’ebe ha na-achị.

    O kwuru na n’agbanyeghị ọrịa ahụ na ihe o mebiri na ọdịmma ndị mmadụ ka dị mkpa.

  2. "O nweghị onye nwụrụ n'ime ụlọnkuzi anyị" - Mahadum Alvan Ikoku

    Mahadum Alvan Ikoku dị n'Owerre apụtala ịkatọ akụkọ na-efegharị na otu onye nkuzi ha nwụrụ n'ime ụlọ nkuzi dịka ọ na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe n'ụbọchị Tuusde.

    Ha kọwara na ọ bụ eziokwu na nwoke ahụ nwụrụ mana ọ nọghị nso na mahadum ahụ mgbe ọ nwụrụ dịka kepu kepu si kwuo.

    "Ihe anyị ji asaa okwu ụgha a na-efegharị bụ iji kasie ndị mmadụ obi gbasara okwu na ọ bụ ọrịa coronavirus butere ọrịa onye nkuzi anyị nwụrụ" ka ha kwuru.

    "Mgbe ozi ọnwụ Michael Echetama rutere anyị ntị, ọ tụrụ mmadụ niile na-anya n'ihi na ọ nweghi ihe mere ya ụnyaahụ ọbịara ọrụ" ka ha kwukwara n'ozi ahụ ha ziputere.

  3. Mmadụ 877 ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus

    Ngalaba NCDC na-ekwu na ọ bụ mmadụ narị asatọ na iri asaa na asaa bụ ndị butere ọrịa coronavirus dịka emechatra nnyocha n'ụbọchị Tọzde.

    Ọtụtụ mmadụ gbakerela n'ọrịa ahụ na steeti Legọs nakwa kwara bụ ndị nọ n'ụlọ gwọ onwe ha.

    Nke a na-abịa dịka ngalaba na-elekọta ọgwụ na nri bụ NAFDAC n'ịchafụ nyere ikike gbata gbata ka amalite ịnye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi coronavirus bụ Astrazeneca na Oxford.

  4. Unu abọọla chi?

    Ụmụ Igbo daalụ nụ maka ịsonye anyị taa.

    Taa bụ ụbọchị pụrụiche n'ihi na ọ bụ taa ka anyị gbara afọ atọ n'ọrụ ntaakụkọ anyị

    Bịanụ soro anyị ṅụrịa ọṅụ!

  5. Anyị ga-akpụpụ gọọmenti etiti ụlọikpe - Ndị ọrụ ugbo Ọwụwa Anyanwụ

    Otu jikọrọ ndị ọrụ ugbo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ha ga-agba gọọmentị etiti akwụkwọ n'ụlọikpe maka n'ihi etu ndị ọchị ehi si emebisi ihe ha kọrọ n'ụgbọ.

    Ọkaiwu ndị otu a bụ Paul Achalla kwuru na ha chịkotara ndị ọrụ ugbo ka ha wee nwee ọnụ na-ekwuchitere ha.

    Achala kwuru na "mgbe ọbụla a kpọrọ nzụkọ, ọ bụ naanị ndị ọchịehi na-enwe ndị na-anọchịte anya ha, o nweghi onye na-anọchite ndị ọrụ ugbo.

    " O kwuru na ọ dịghị mma etu ehi si emebi ihe ndị mmadụ kọrọ n’ugbo nakwa etu e si awakpo ndị mmadụ n’ubi ha.

    Achala kọwara na ọtụtụ ndị ọrụ ugbo na-anata ego mbibi n’aka ụlọakụ iji kọọ ihe mana ehi na-aga laa ihe ndị ahụ n'iyi.

    “Anyị nwere iwu bụ ‘customary law’ na Bekee megidere mmadụ ịhapụ anụmanụ ya ka o mebie ihe onye ọzọ”.

    Achalla gwara BBC na o teela aka ehibere otu ahụ jikọtara ndị ọrụ ugbo "mana ugbua, ndị ntorobịa adaala mba nke mere na ha amaghịzi ihe dị na ihe adịghị."

    Ọ kọwakwara na ha ewepụbeghị okwu ahụ ụlọikpe mana nke ahụ ga-eme n’oge adịghị anya.

    “Ọ bụ n’ụlọikpe dị n’ala Igbo ka anyị ga-amalite ya bụ ikpe n’etiti otu anyị na gọọmentị etiti," Achala kwuru. "Ihe anyị chọrọ n’aka gọọmentị bụ ijeri naịra itoolu kwa steeti ebe emebiere ndị ọrụ ugbo ihe."

  6. Naịjirịa e sila n'ọnọdụ ọtanisi pụta

    Ọnọdụ akanuba Naijeria ejirila percent iri na otu gbago elu nke wepụrụ ya na onodu ọtanisi Bekee kpọrọ recession dịka ụlọọrụ .

    Nke a na abia dika e nwechara ọnọdụ ọtanisi kpuchiri akụnụba azụ nke agba abụọ ya.

    N’afo 2020 ,ọtanisi jịdere akụnaụba Nigeria ji otu percent n’ụma iri isi na asatọ, gbatute ala nyere percent anọ n’ụma iri abụọ ọ nọbụ n’afọ 2019.

    N’otu aka ahụkwa,ego na-esoghi na nke akpatara na mmanụ agbidi tunyere pasenti iri itoolu n’ụma iri asatọ na anọ n’afọ 2020 karia ihe ọ nọbu bụ pasenti iri itoolu na ụma, iri abuo na abuo n’afo 2019.

  7. Nkeji Coronavirus

  8. Novak Djokovic apịapụla Aslan Karatsev mkpụrụ ọkwụrụ n'anya na Austrialian Open

    N’egwuregwu, Novak Djokovic apịapụla Aslan Karatsev n’asọmpi tenis nke na-akpọtụ na Melbourne, Australia ugbua.

    Mmeri a mere ka Djokovic banyezie n'agba nke ikpeazụ na ya bụ egwuregwu.

    Novak Djokovic bụ onye chigoro eze na asọmpị Australian Open kemgbe ọ ritere mmeri nke mbụ ya n'afọ 2008 sị na "asọmpị ahụ na-adị ya ka ya anọ n'ụlọ".

    Naanị ugboro atọ ka e merigoro Novak Djokovic na ya bụ egwuregwu nke Karatsev merigoro ya otu ugboro.

    Ọ teela aka ya bụ oke enwe tawara akwụ n'ọhịa nke bụ na Karatsev amalitebeghị rị ịpịwa asọmpi nke ndị ukwu ya mgbe Djokovic tịagoro Grand Slam nke iri atọ n'itoolu ya.

  9. Mba Guinea ga-amalitela Ịgba ọgwu mgbochi ebola na M

    Mba Guinea ga-amalịtela ịgba ọgwụ mgbochi na-obodo ebe Ebola ka njọ dịka ya bụ ọrịa malitere ịkpa mkpamkpa ọzọ izuụka gara aga.

    Ha na-atụ anya ịnweta ọgwụ mgbọchị dị puku iri abụọ n'aka ndị WHO nakwa mba US n'ịzụka na-abịanụ bụ nke ha ga-amalite ịke na Monde.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ anọ anwụọla n'aka ya bụ ọrịa, nke mere ka egwu baa ndị mmadụ ahụ n'ọwụwa anyanwụ Afrịka.

  10. Ana m ekpe ekpere ka Covid-19 ghara ịkwụsị akwụsị - Apostle Johnson Suleman

    Onye ụkọchukwu a ma ama na Naịjirịa bụ Apostle Johnson Suleiman na-ewu ewu ugbua na soshal midia n'ihi ihe o kwuru na nsonso a.

    Onyonyo gosiri ebe Johnson Suleiman kwuru na ya zụtara ụgbọelu ọhụrụ n'ime oge a coronavirus na-akpụ onye ukwu na onye nta isi.

    O kwuru na ụgbọelu a ọ zụrụ ọhụrụ bụ nke atọ n'ime ụgbọelu o nwere.

    Johnson Suleiman gara n'ihu kwuo na ya na-ekpe ekpere ka coronavirus ghara ịkwụsị akwụsị ka ego ya na-asụ ka mmiri ọkụ.

    Nke a mere kaọtụtụ na-ajụ ma Johnson Suleiman o nwere osisi na-amịrị ya ego.

    Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu:

    Nekka Smith kwuru na ya bụ ihe gbakwara ya gharịị

    Hankvalj jụrụ ajụjụ ma ọ bụkwa otu coronavirus a nke mere ụwa niile ji eti mkpu ka Apostle Suleman na-ekpe ekpere ka ọ ghara ịla?

  11. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi.

    Ya dịkwara onye ukwu na onye nta mma.

  12. Nwaanyị anwụọla ebe ya na di ya na-enwe nghọtahie maka ịgba n'ezi

    Aka ndi uweoji ngalaba steeti Lagos akpara otu nwoke bụ David Idibie maka ikụgbụ nwunye ya bụ Juliana gbara afo iri anọ na abụọ n’Ajah nke steeti Lagos.

    Akụkọ kwuru na mmiri Juru nwa awọ ọnụ mgbe esemokwu tọpụrụ ọgọdọ gbara ọtọ, dika nwanyi gbochiri di ya ịpụ apụ n'ihi na ọnaghị erizi nri o siri.

    Onye nọ mgbe o mere kwuru na Juliana na-ebo di ya ebubo ịgba n'ezi n'ihi na ọ naghi emetu nri ya onu.

    Dika o na-egbochi ya ịpụ, ụkwụ chịpụrụ ya o wee kụọ isi n’ala n'ulo ha di na Joado street, Oke Ira nla nke steeti Legọs, ma nwụọ.

    Onye oti mkpụ ndi uweoji na steeti Legọs, Olumuyiwa Adejobi, kwuru na njinji a jiri n’elekere iri nke abalị Tuzde.

  13. Nkeji coronavirus

  14. Patị nọ n'ọchịchị na Japan ahapụla ụmụnwaanyị ise ka ha bịa gee ntị n'ọgbakọ ha

    N'ofesi, pati nọ na-ọchịchị na mba Japan akpọọla ụmụ nwaanyị ise ndị omeiwu ka ha bịa kirie ka ịhe si aga ma ghara ikwu ihe ọbụla ebe ahụ.

    Nke a na-eme ka achụdara onye nọ n'isi oche egwuregwu Olympic bụ Yoshiro Mori maka okwu ọjọọ ọ kwara ụmụ nwaanyị.

  15. Ndị ntọ ahapụla Eze ndị Uruagu dị na Nnewi, Anambra steeti

    N'otu aka ahụ atọhapụla Igwe ndụ Uruagu dị na Nnewi, Anambra steeti bụ Obi Charles Afamefuna Obi nke ndị ntọ ji kemgbe Fraịde.

    Odeakwụkwọ ya bụ Igwe bụ Prince Nwabụfo Obi gwara BBC nke a n'ekwentị n'ehihie.

    Cheta na-atọọrọ ya bụ Obi Charles Afamefuna ka o si akwamozu nwunye Igwe ndị Ọraifite alọta ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Febuwarị.

    Ha ekwughị ka ọnwere ụgwọ agwụrụ tupu a tọhapụ ya.

  16. Ọkụ na-agba ahịa ọgbọosisi n'Nnewi, Anambra steeti

    Akụkọ ruru anyị ntị n'ehihie a bụ na ahịa ọgbọ osisi dị na Nnewi gbara akụkọ n'ehihie taa bụ Wenezde.

    Anyị nụrụ na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ abịala ebe ahụ dịka ha ka na-ama imi n'ala ịmata ebe mmiri si banye opi ụgbọghọri.

  17. Emeela otu Super Falcons niile nyocha maka ọrịa covid-19 dịka ha na-akwado ịgba asọmpi iko mba Turkey nke na-aga n’ihu ugbua.

    Ndị Super Falcons ga-ezute mba Rọshịa n’ụbọchị Tọzde n’ọgbọ egwuregwu dị n’Antalta n’elekere asatọ nke ụtụtu ụbọchị Tọzde.

  18. N'Anambara ka a kacha bute nje Covid-19 n'ụbọchị Tuzde

    Mmadụ narị atọ na iri anọ na anọ butere nje coronavirus ọhụrụ naanị n’Anambara iji bụrụ steeti a kacha bụte nje ahụ dịka ndị NCDC si gụpụta n’ụbọchị Tuzde.

    Mkpokọta ngụkọ ahụ gosiri na ọ bụ mmadụ otu puku, narị atọ na iri isii na asatọ butere nje covid ịhụrụ na Naịjirịa.

    Lee ka ngụpụta ha si dị:

  19. Ndị ntọ awakpola ụlọakwụkwọ na Naịja steeti tọrọ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi

    Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu buharị bụ Garba Shehu ekwuola na Buhari katọrọ ntọrọ ụmụakwụkwọ n'obodo Kagara dị na Naịjia steeti.

    Garba Shehu kwuru nke a site n'akara Twitter ya n'ụtụtụ Wenezde.

    O kwuru na Buhari nyere iwu ka ndị agha Naịjirịa gaa gbapụta ndị a furu efu.

    Ndị ntọ wakporo ụlọakwụkwọ Government Secondary School ma tọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi n’ụbọchị Tuzde.

    Otu onye ọnụ na-eru n’okwu na gọọmentị Niger Steeti gwara BBC na ya bụ ihe mere n’eziokwu, mana o kwughị ụmụakwụkwọ ole maọbụ ndị nkuzi ole a tọọrọ.

    Akụkọ na-ekwu na ụfọdụ n'ime ndị ahụ a tọọrọ gbapụrụ, ebe otu nwata akwụkwọ nwụrụ anwụ.

    Gọọmentị n’onwe ha ewepụtabeghị okwu ọbụla gbasara nke a.

    Shehu Sani, onye bụbu onye omeiwu na Naịjirịa kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ bụ ebe ya onwe ya gụrụ akwụkwọ.

    Sani gara njem nleta n’ụlọakwụkwọ ahụ ebe ya na onyeisi ha na ndị ọzọ na-arụ ebe ahụ nwere mkparịtaụka.

    Ihe onyonyo juputara na sosha midia ebe ndị ntọ ahụ na-egosi ndị ha tọọrọ, nakwa nnukwu egbe dị icheiche ha bucha.

    N’ọnwa Disemba afọ 2020, ihe karịrị mmadụ narị atọ ka ndị ntọ tọọrọ n’ụlọakwụkwọ dị n’obodo Kankara dị na Katsina steeti.

  20. Ogbunigwe egbuola ụmụaka asaa na Zamfara steeti

    Ogbunigwe egbuola ụmụaka asaa n'obodo Magami nke dị n'okpuru ọchịchị Maradun na Zamfara steeti.

    Kọmishọna okwu nchekwa dị n'aka ya bụ Abubakar Dauran kọwaara ndị ntaakụkọ na ụmụaka ndị ahụ gara ịkpata nkụ n'ime ọhịa wee hụ ihe ahụ ha amaghị na ọ bụ ogbunigwe, ma jiri ya na-egwuri egwu tupu ọ gbaa.

    Mmadụ isii nwụrụ n'otu ntabi anya ebe onye nke asaa nwụrụ n'ụlọọgwụ.

    Ụfọdụ ndị ọzọ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.