A nwuchiela ndị gbara oringo maka ịda iwu coronavirus na Legọs
Ndị uweojii Legọs Steetị anwuchiela mmadụ iri asaa na otu ebe ha na-agba oringi n'ụlọ ọrịngi maka ịda iwu na-achị coronavirus.
Uweojii sị na a nwuchiri ndị a n'ọtụtụ ụlọ oringo dị na Lekki nakwa Surulere nke Legọs ma sị na a ga-akpọpụ ha n'ụlọikpe.
Ọnụ na-ekwuru uweojii na Legọs bụ Olumuyiwa Adejobi gwara BBC na ndị a dara iwu ọgbakọ igwe mmadụ, mmepe ụlọ oringo nakwa iwu onye apụla n'ezi n'ime abalị nke gọọmentị tinyere na steetị ahụ.
Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-agbasi mbọ ike na anwuchi ọtụtụ ndị na-ada iwu na-achị coronavirus.
Nke a na-abịa dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na-arị elu na Naịjirịa ugbua.
N'ụbọchị Mọnde, mmadụ otu puku na narị abụọ na anọ butere coronavirus bụ ọnụọgụgụ kachasị n'otu ụbọchị kamgbe ọrịa a malitere.