Nwuchie ndị niile na-eke ihe onyonyo mwakpo ndị Fulani n'Ebonyi - Umahi

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi enyela iwu ka anwuchie ndị niile na-ekesa ihe onyonyo ọ kpọrọ adigboroja ha sị na-egosi ebe a na-awakpo ndị Fulani.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chiagozie Nwonwu

  1. Ụlọakụ FCMB ga-enyocha ebubo na onyisi ha gara n'ubi onye ọzọ

    N'ozi ya tinyere n'akara Twitter ha, ụlọakụ FCMB ekwuola na ha ma maka ebubo na-efegharị na soshal midia banyere onyeisi ha bụ Adam Nuru.

    Ha si na ha ga-eme nyocha banyere ihe a a sị mere nakwa mata ma o migidere iwu ha.

    Nke a na-abịa dịka ihe karịrị mmadụ puku abụọ binyere aka n'atụmatu e tinyere na ọga change.org na-asi ka achụọ Maazị Nuru n'ọrụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Ndị Omekome egbuola ọtụtụ mmadụ na mba Niger

    Ndị ọrụ gọọmentị na mba Niger sị na ndị ojiegbe gburu ọtụtụ ndi nkiti na mpaghara Tillaberi n'ụbọchị Satọde.

    Otu onye ọrụ gọọmenti na mpaghara ahụ gwara AFP na ọ bụ n'ehihe ka mwakpo ahụ mere mana o kwughi mmadụ ole o metụtara.

    Onye ọzọ si na "ọtụtụ ndị nkiti nwụrụ" na mwakpo a mere n'obodo Tchomo-Bangou di nso n'okeala mba ahụ na mba Mali.

    Otu onye ntaakụkọ redio achọghị ka akpọọ aha ya siri na ndi oji egbe ahụ gbara obodo ahụ okiri kiri ma gbuo mmadụ iri ise. Ọ sị na-akpọrala ndị merụrụ ahụ gawa ụlọ ọgwụ Ouallam.

    Mwakpo a mere dịka akpọrọ mpụtara ntuliaka mba ahụ mere iji họpụta onye ga-abụ onyeisiala ha.

  3. Sowore na ndị otu ya ka nọ n'aka ndị uweojii - Falana

    Femi Falana, bụ ọkaiwu onye zọbụrụ ọhịchị ịbụ onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019 bụ Omoyele Sowere, ekwuola na ndị uweojii mba ahụ ka ji ya kemgbe abalị 31 nke ọnwa Disemba 2020 ha nwụchiri ya na ndị ọzọ.

    Sowore na ndị anwụchiri ya na ha na-eme ngagharịiwe n'Abuja oge ndị uweojii wụchiri nwụrụ ha.

    Ọkaiwu Falana sị na ndị uweojii dowere Sowore na mpaghara nga ebe ndị omekome ajọọ na-anọ

    Ọ gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na ndị uweojii nwụchiri Sowore, "Tiri ya ezigbote ihe nke mere o jiri nwee apa n'ahụ ya niile.

    Tupu a nwụchie ya, Sowore o dere n'akara Twitter ya ka ndị mmadụ pụta bịa soro ya mee ngagharịiwe maka "ajọ ọchịchị".

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ndị uweojii gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na ọ bụ eziokwu na anwụchiri Sowore na mmadụ anọ ọzọ n'elekere iri na otu nke ụtụtụ Jenụwarị 1 2021.

    Ọnụ na-ekwuuru ndị uweojii n'Abuja bụ Mariam Yusuf sị na ọ bụ ama ndị mmadụ gbara ha maka ndị amaghị ndị ha bụ na-agbakọ mere ha jiri ga ebe ahụ.

    Ha sị na ha nwụchiri Sowore na ndị otu ya maka "ịgbakọ na n'ime abalị na-enweghi ikike nke yiri ndị bi na Gudu na Lokogoma n'ọnọdụ egwu'.

  4. Unu asaala chi?

    Anyi amalitela iwetere unu akụkọ pụrụiche si ụwa niile abịa.

    Biko gwa onye ukwu na onye nta na BBC Igbo suru ka emee.

  5. Igbo ndị ọma ka ọ dị nụ

    Echi ka anyị chụọ n'owere nchi.

    I meela n'isonyere anyị taa.

  6. Isreal bụ mba kachasị n'ịgba ọgwụ mgbochi coronavirus n'ụwa

    Ọgwụ mgbochi coronavirus

    Ebe foto si, EPA

    Mba Izrel bụ ndị mbụ kachasị n’ịgba ọgwụ mgbochi coronavirus n’ụwa ugbua dịka ha agbaala mmadụ karịrị otu nde ọgwụ.

    Ha malitere ịgba ụmụafọ ha ọgwụ mgbochi a n’ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Disemba afọ 2020.

    Ndị na-esote Izrel n'azụ bụ mba Bahrain ba mba UK ebe mba Fransị agbaala naanị mmadụ 138 ọgwụ na ngwụcha Disemba.

    Ọ bụ mahadum Oxford na 'educational charity' gbakọtara aka ọnụ n'ịgụkọ ndị a gbarala ọgwụ mgbochi coronavirus n'ụwa.

  7. Ndị ekperima egbuola otu onyeisi okpukpere alakụba na Kaduna Steetị

    Ndị ekperima

    Ebe foto si, AFP

    Ndị ekperima egbuola Sheik Danleeman Isah bụ onyeisi ụlọ alakụba a kpọrọ 'Chief Imam' nke obodo Kawaran Rafi dị n'okpuruọchịchị Igabi nke Kaduna.

    Dịka kọmishọna na-ahụ maka nchekwa na Kaduna bụ Samuel Aruwan si kwuo n'ozi o wepụtara na Satọde, ọ sị na ndị ekperima ahụ wakporo obodo ahụ ma gaa n'ụlọ Chief Imam gbaa ya egbe ma pụọ na-ezughi maọbụ tọọrọ onye ọbụla.

    Ọ sị na ogbugbu onyeisi ekpere nwereike ịbụ maka etu o si akatọ ogbugbu na ntọrị na-emekaarị n'obodo ya.

  8. Mouricio Pochettino abụrụla ọkwọ ụgbọala ndị Paris Saint Germain

    Pochettino

    Ebe foto si, Getty Images

    Mouricio Pochettino bụbu onye nchịkọta Tottenham ewerela ọnọdụ ugbua dịka onye ga na-achịkọta Paris Saint Germain.

    Nwafọ Ajentịna a tinyere aka n’akwụkwọ ịchịkọta PSG site ugbua ruo ngwụcha ọnwa Juun afọ 2022.

    Ọ nọchiri anya Thomas Tuchel bụ onye PSG chụrụ n'ụbịchị iri 29 nke ọnwa Disemba afọ 2020.

    Pochettino gbaara PSG bọọlụ site n'afọ 2001 ruo afọ 2003, anọghị n'ọrụ kamgbe Tottenham chụrụ ya n'ọnwa Nọvemba afọ 2019.

    Ugbua PSG nọ n'ogogo atọ nke Tebụlụ Ligue 1 ebe ha ga-ezute Barcelona n'asọmpi Champions League n'ọnwa Febụwarị na Maachị.

    Ọ ga-amalite ọrụ n'ọzụzụ ndị PSG ga-enwe n'ụbọchị Sọnde.

  9. A ga-egbu otu nwaanyị amara ikpe ọnwụ n'Amerịka n'ọnwa Jenụwarị 2021

    Lisa Montgomery a mara ikpe ọnwụ

    Ebe foto si, Reuters

    Ụlọikpe mkpegharị n'Amerịka akagbuola akwụkwọ a gbara sị ka a ghaara igbu otu nwaanyị a mara ikpe ọnwụ n'Amerịka nke bụ na igbu ya ga-aga n'ihu.

    N'afọ 2004 ka Lisa Montgomery pịgburu nwaanyị dị ime na Missouri tupu ọ bọọ afọ nwaanyị ma tọọrọ nwa dị ya n'ime afọ.

    Ọ bụrụ na a gaa n'ihu gbuo ya, ọ ga-abụ nwaanyị mbụ a mara ikpe ọnwụ ma gbuo ya kamgbe ihe ruru afọ iri asaa gara aga.

    Eyiweburu igbu Montgomery n'ọnwa gara aga mana e mechaghị gbuo ya maka ọkaiwu ya butere coronavirus.

    Mana e yigharịrị ya gaa ụbọchị 12 nke ọnwa Jenuwarị mana ọkaiwu ya sị agaghị emenwu ya ebe ha nwere akwụkwọ a gbara n'ụlọikpe.

    Ụlọikpe kwadoro ihe ọkaiwu ya kwuru ma kwụsị onye dịrektọ ụlọmkpọrọ inye iwu ka e gbuo ya.

    N'ụbọchị Fraịde, otu ndị ọkaikpe kpebiri na direktọ mere ka iwu si kwuo, ma sị ka a gaa n'ihu gbuo ya.

    Ndị ọkaiwu Montgomery sị na ha ga-agba akwụkwọ ga-asị ndị ọkaịkpe lebagharịa anya na mkpebi ha.

    Nwaanyị ikpeazụ gọọmentị Amerịka mara ikpe ọnwụ ma gbuo bụ Bonnie Heady, onye e ji ikuku gaasị gbagbuo na Missouri n'afọ 1953.

  10. Gọọmentị enyela iwu ga-eme ka i weghachite akara ekwentị gị ma ekwentị gị fuo

    Akara ekwentị

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị etiti enyela iwu ọhụrụ ga-eme ka onye ekwentị ya furu efu maọbụ mebiri emebi nweghachite akara ekwentị.

    Onye ahụ nwereike iji akara njirimara ya dịka nwafọ Naịjirịa bụ National Identity Number (NIN) inweghachite akara ekwentị ya.

    Iwu a dịka ndị ụlọọrụ 'National Identity Management Commission (NIMC) na Nigerian Communications Commission (NCC)' si kwuo bụ mbọ gọọmentị na-agba ibelata ahụhụ ndị mmadụ na-ata inweghachite akara ekwentị ha.

    Iwu sị na onye ahụ ga-egosi akara njirimaara ya tupu e nwee ike nyeghachị ya akara ekwentị ya.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka akara njirimaara ga-enyocha akara onye ahụ gosiri iji maara ma ọ bụ nke ya n'ezie.

  11. Anyị asịghị ka akwụọ anyị ụgwọ maka okwu nwa anyị - Nne nwata akwụkwọ Deeper Life

    Deborah Okezie

    Ebe foto si, Deborah Okezie/Facebook

    Deborah Okezie bụ nne nwata akwụkwọ ụlọakwụkwọ ụka Deeper Life dị na Akwa Ibom steeti ekwuola na ọnweghị oge ya jiri si ka enye ya ego maka ikpezi ya na ndị ụka.

    Ọ bu ụlọ ntaakukọ Punch dere na Oriakụ Okezie na-ana ndị Deeper Life otu narị nde Naịra.

    Okezie, na ozi o tinyere n'akara Facebook ya, sị na onweghị oge ya jiri naa onye ọbụla ego.

    Ọ sị: "Ihe m chọrọ bụ ikpe ziri ezi maka ihe nwa m gabigara n'ụlọakwụkwọ ahụ."

    Ọ kpọtakwara nwa ya ka o soro kwuo okwu ma juọ ya ihe mere n'ụlọ akwụkwọ ahụ.

    Ya bụ nwata si na o nwere oge ya nọ izuụka abụọ tupu ọ saa ahụ.

    Ọ sị: "A na m esi isi n'oge ahụ makana ndị no na classi elu ekweghi ka m saa ahụ n'ulọ nsa ahụ ha."

    Oriakụ Okezie sị na ya agbaala mbọ maka okwu nwa ya ma na-asị ka nne na nna ndị ọzọ jiri ihe mere ya mụta ihe na kwuo okwu n'oge o kwesiri.

    Cheta na gọọmentị Akwa Ibom sepụrụ aka n'okwu ahụ ma hanye ya n'aka ndi uweojii.

  12. Mmadụ 4176 bu covid-19 na Legọs na-anata ọgwụgwọ na be ha

    Ihe ruru mmadụ puku anọ na otu narị na iri asaa na isii bu coronavirus na Legọs steeti nọ be ha anata ọgwụgwọ dịka mkpa mkpa ọrịa ahụ na-abawanye.

    Ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Ọkamụta Akin Abayomi dere nke a n’akara Twitter ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Coronavirus fesara mmadụ 1074 na Naịjirịa n'ụbọchị mbụ nke afọ 2021

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ "Nigeria Centre for Disease Control" (NCDC) ekwuola na ọ bụ mmadụ 1074 ka nnyocha gosiri na ha butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị mbụ nke afọ 2021.

    Ọka bụ Legọs ka bụ isi injin mfesa nje a dịka mmadụ 642 butere ya ọhụrụ na steeti ahụ.

    Kaduna nwere 92m ebe Abuja nwere 78.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Ọgbaa bọọlụ Victor Osimhen nke Napoli ebutela coronavirus

    Victor Osimhen

    Ebe foto si, Victor Osimhen/Twitter

    Ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Victor Osimhen ebutela coronavirus.

    Ọ bụ otu egwuregwu ya bụ Napoli kwuru nke a na Fraịde dika ha mechara Osimhen nnyocha ka o si Naịjirịa lọta.

    Ọ bụ n'ụbọchị Tọzde ka Osimhen lọtara Ịtalị dịka o gakwara emume Ekeresimesi na Naịjirịa.

    Iwu otu egwuregwu ya bụ na onye ọbụla si esi bata ka emeriri nnyocha covid-19. Nnyocha nke Osimhen gosiri na o butere ọrịa coronavirus.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Atọghapụla Bishop Owere ndị ntọrị nwụchiri - Ndị uweojii

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu ekwuola na atọghapụla Bishop Owerri Diaosis bụ Moses Chikwe.

    Maazị Ikeokwu sị na ọ bụ site na mbọ ndị uweojii gbara ka e jiri tọghapụ ụkọchukwu a.

    Ọ sị: "Onweghị ego ọbụla akwụrụ. Onweghikwanu mmerụ ahụ ọbụla o nwere."

    Maazị Ikeokwu ekwughi oge ihe a mere maọbụ usoro e siri ji mee ya.

    Ọ bụ n'ụbọchị 27 nke ọnwa Disemba ka ndị amabeghị ndi ha bụ wakporo ụgbọala ụkọchukwu na ọkwọ ụgbọala ya n'ụzọ si Wold Bank gawa Umuguma n'ime steeti.

    Ọtụtụ ndị ụkọchukwu na Naịjirịa gbarụrụ ihu maka ntọrị ahụ. Ụmụ nwaanyịụka mekwara ngagharị iwe n'Ọwere maka ya.

    Ụlọụka Katọlịk nke Owere dekwere maka ntụghapụ ụkọchukwu a n'akara Facebook ha ma na-asi ya nnọọ.

  16. Unu asaala chi?

    A na m asị unu nnọọ dịka anyị na-amalite njem iwetere unu akụkọ si ụwa niile.

    Ya gaziere onye ọbụla.

  17. Nwunye Gọvanọ Anambara anabatala nwa mbụ a mụrụ n'afọ 2021

    Somma, nwa ọhụrụ mbụ n'Anambara steeti

    Ebe foto si, ABS

    Nkọwa foto, Somma, nwa ọhụrụ mbụ n'Anambara steeti

    Nwunye aka na-achị Anambra steeti bụ Ebele Chukwu Obiano anabatala nwa mbụ a mụrụ n'afọ 2021.

    Ọ bụ Kọmishona steeti ahụ na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na ụmụaka bụ Ndidi Mezue nabatara nwa ọhụrụ ahụ aha ya bụ Somma Obizolu n'aha nwunye gọvanọ.

    Nne ya bụ Oriakụ Ifeoma Obizolu mụrụ ya n'ụlọọgwu General Hospital, Onitsha ka o jiri nkeji iri na abụọ gafee Elekere iri na abụọ nke ụzọ ụtụtụ ụbọchị mbụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

    Ifeoma Obizolu na nwa ọhụrụ ya

    Ebe foto si, ABS

  18. Obiano agbagharala ndị eze ọdịnala atọ ọ kwusiburu ọrụ

    Willie Obiano

    Ebe foto si, Willie Obiano/Facebook

    Aka na-achị Anambara steeti bụ Willie Obiano agbagharala Eze atọ so na ndị ọ kwụsiburu ọrụ n'afọ 2020.

    Ndị Igwe o metụtara gụnyere; Igwe Kelly N Nkeli nke Igbariam, Igwe Emeka Ilouno nke Ifitedunu, na Igwe Peter A Uyanwa nke Ukwulu.

    N'akwụkwọ ozi nke Kọmịshọna-ahụ maka ihe na-eme n'ime ọbodo bụ greg Obi binyere aka, o kwuru na n'obi na mụọ ịgba afọ ọhụrụ, na "gọvanọ agbagharala ndị eze ọdịnala atọ a kwụsịị ọrụ malie ozigbo ozigbo site n'ikike dị n'iwu Ndị Ezeọdịnala nke Anambra steeti nke emegharịrị n'afọ 2007."

    Cheta na n'afọ 2020, Obianọ kwụsiri Eze 12 ọrụ n'ike maka ịso Arthur Eze gaa abụja ịga hụ onyeisiala Muhammadu Buhari na-anatghị ikike n'aka gọvanọ tupu ha zọpụ ije.

    Akwụkwọ mgbasaozi si n'aka Gọọmentị Anambara steeti

    Ebe foto si, Anambra State Government

  19. Anyị ga-arụ ọdọụgbọelu, amaegwuregwu n'afọ 2021- Umahi

    Dave Umahi

    Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi steeti ekwela ndị steeti ahụ nkwa ịrụchapụ ọdọụgbọelu, amaegwuregwu,nnukwu ọdọahia Bekee kpọrọ 'Shopping Mall', n'afọ 2021.

    N' ozi afọ ọhụrụ ọ ziri na Fraide, Umahi naa-gbaneghị nsogbu coronavirus nakwa ngagharịiwe Endsars, na ọchịchị ya wuru ọtụtụ ihe ndị na-akwalite akụnaụba na steeti ahụ.

  20. Buhari, họgharịa ndị isi ọrụ nchekwa- Archbishop Adewale Martins

    Archbishop Adewale Martins

    Ebe foto si, Catholic Diocese of Lagos

    Nnukwu ụkọchukwu Katọlik na Dayọsis Legọs bụ Archbishop Adewale Martins akpọọla onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka ọ họgharịa ndị isi ọrụ nchekwa.

    N'ozi afọ ọhụrụ o zipụtara ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị,afọ 2021 Martins kwuru na nnu aghaala ofe n'okwu nsogbu nchekwa Naijiria.

    Martins kwuru na ọtụtụ mmadụ akpọọla ya bụ oku ka e jiri ụzọ ọhụrụ soo nsogbu ọnọdụ nchekwa Naijiria, onyeisiala na-ekwukarị na ya na anwa oko ya.

    ""Ọkwu nsogbu nchekwa bụ okwu dị oke mkpa. Anyị na-ele anya na Buhari ga-agbanwe etu o si eso ya bụ ọkwu n'afọ 2021.

    "Ikekwa, ọ bụrụ na ọ gbanwe ndị isi nchekwa, ọ ga-enye aka mee ka ndị mmadụ mata na ọ na-anwa oko ya."

    Martins, metụrụ aka n'okwu Bishop Moses Chikwe nke Dayọsịsi Owere ndị ntọ tọọrọ ma sị na ya bụ ihe bụ 'nsọala".

    Ọ gara n'ihu bekuo onyeisiala na ndị gọvanọ ka ha tinye anya na ọnọdụ akụnaụba, ahụike na agụmakwụkwọ nke o kwuru dakpọọ adakpọ.