You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

"Chineke gbaghara ndị buru akụkọ ụgha maka ọnwụ m"

Ọchịagha chịburu Naịjirịa bụ Ibrahim Babangida egosila ụwa ma akụkọ ọnwụ ya bụ okpotokpo asị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. DSS sepunu aka n'ikpe Sowore - Ọkaiwu Ukwu Naịjirịa

    Ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami agwala ngalaba Directorate of State Services (DSS) ka ha sepu aka n'ikpe Omoyele Sowore.

    Nke a na-abịa dika ọtụtụ mmadu na-agbarụ ihu maka etu DSS siri chọọ ịnwụchị Sowore n'ụlọikpe.

    Gọọmentị Naịjirịa na-beo Sowore ebubo na ọ na-achọ itinye Naịjirịa n'ọgbaghara.

  2. Ụmụnwoke 38 a na-enyocha maka idina nwoke ibe ha ga-ama ikpe ha na 2020

    Ụmụnwoke iri anọ na asaa a na-enyo maka idina nwoke ibe ha pụtara n'ụlọikpe na Legọs ụnyaahụ ịzara ọnụ ha.

    Ọkaikpe yigharịrị ma buga ikpe ha ọnwa Febrụwarị 2020 dịka mgbe a ga-ekpe ikpe n’agbanyeghị na ndị kpụpụrụ ha ụlọikpe enwetebeghi onye akaebe ọbụla.

  3. Boris Johnson emeriela ntuliaka mba Briten

    Dịka ọnụọgụgụ si na ntuliaka e mere na mba Briten na-egosi, pati Conservative bụ pati Johnson, kacha zọta oche.

    Ha ga-enweta oche 364, Labour ga-enweta 203, SNP ga-enweta 48, Lib Dems ga-enweta 12, Plaid Cymru ga-enweta anọ, Greens ga-enweta otu, ebe pati Brexit enwetaghị nke ọbụla.

    Nke a pụtara na ndị Conservative enwetela ihe bụ oche ha kachasị kemgbe Margaret Thatcher meriri n'afọ 1987.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari kelere Boris Johnson na mmeri o meriri na ntuliaka ahụ.

    N'ozi si n'aka onye enyemaka ya bụ Garba Shehu, Onyeisiala Buhari sị na mmeri Johnson dara nnukwu ụda. Na ọ na-atụ anya ezi mmekọrịta ndị Briten na Naịjirịa site n'aka ya.

  4. Tanka bu mmanu ụgbọala adachiela ụzọ na Legọs

    Dịka ụlọ ọrụ na-ahụ maka njme okoroụzọ na Legọs siri dee n'akara Twitter ha Tanka bu mmanụ dachiri ụzo na Legọs.

    Ndị Lastma na-akọwa na ha amalitela ibupu ha bu ụgbọala ugbua.

  5. Pati Conservative na-achịzị ka ha mmeriri nke ukwu na ntuliaka Briten

    Boris Johnson na pati ya bụ conservative pati nọ n'ụzọ ịbụ pati kachasị nwete oche n'ụlọomeiwu na mba Briten ka ọnụọgụgụ ntuliaka e mere ụnyaahụ na-apụta.

    Onyeisi Labour pati bụ Jeremy Corbyn, ekwerela na ha achịtaghị aja na ya bụ ntụliaka, ma kwuo na ya ga-aritu n'ọkwa tupu e mee ntuliaka ọzọ.

  6. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a, Akụkọ niile ga-amasị gị ịkọ taa niile dị ebe a

  7. Onyeisi uweojii Naịjirịa akagbuola ọgbakọ pati APC n'Edo steeti

    Onyeisi ndi uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Abubakar akagbuola ọgbakọ ukwu patị "All Progressives Congress" (APC) chọrọ ime n'Edo steeti n'ụbọchị Fraịde.

    Nke ba-abịa dịka ndị na-akwado onyeisioche patị APC bụ Adams Oshiomhole na ndị nke na-akwado aka na-che Edo steeti bụ Godwin Obaseki bara onwe ha ọgụ ụnyaahụ na Bini bụ isi obodo steeti ahụ.

    A na-eche na ọgbaghara sitere n'okwu dị n'etiti Maazị Oshiomhole na Obaseki.

    Ọgbakọ ahu kwesiri ịbụ ebe Oshiomhole ga-anabata ndi si pati Peoples Democratic Party (PDP) abata APC nke onye zọbụrụ ọkwa gọvanọ n'okpuru patị ahụ bụ Osagie Eze-Iyamu no n'isi ha.

    A na-ahụta Obaseki dịka onye Oshiomhole kpọbatara n'ọchịchị dịka n'usoro Bekee na-akpọ "god fatherism" mana ha abụọ dizi ka ha adịghi esizi otu ụzọ.

    Ndị mmadụ na Bini si na ọgbaghara dara n'etiti ndị na-akwado mmadu abụọ tara ezigbote akpụ ụnyaahụ.

  8. Unu asaala chi?

    Ọ bụ Chiagozie na Chinma nọ n'ụtụtụ a.

    Anyi ga na-ewetere unu ihe niile dị mkpa mere taata ruo elekere atọ nke ehihie bụ oge ndi ọzọ ga-anọchị anya anyị.

    Ngwa, ka buru ha gawa. Nnọ nụ!