Akụkọ ụwa nke mgbede a n'ime otu nkeji
Ị ma na Nkeji nke BBC Igbo na-ewetara unu akụkọ ụwa na nke nke ya n'ime otu nkeji?
Gee ya ka ị mara ebe 'Super Falcons' Naịjirịa kwụ ugbua.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọchịagha chịburu Naịjirịa bụ Ibrahim Babangida egosila ụwa ma akụkọ ọnwụ ya bụ okpotokpo asị.
Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
Ị ma na Nkeji nke BBC Igbo na-ewetara unu akụkọ ụwa na nke nke ya n'ime otu nkeji?
Gee ya ka ị mara ebe 'Super Falcons' Naịjirịa kwụ ugbua.
Ọchịagha chiburu Naịjirịa bụ Ibrahim Babangida agbaghala akụkọ ụgha na-efegharị maka ọnwụ ya.
Ọ bụ n'ụtụ ụbọchị ụka ka akụkọ na-ewu na ọ nwụọla.
O si n'aka onye mgbasaozi ya bụ Kassim Afegbua kwuo na "Chineke ga-agbaghara ndị niile buru akụkọ ụgha a maka ọnwụ m"
Babangida chịrị Naịjirịa n'oge ndị agha site n'afọ 1985 rue afọ 1993.
Onye ndu otu ndọrọndọrọ ọchịchị otu ‘Labour Party’ na mba UK bụ Jeremy Corby arịọla ndị nkwado ha mgbaghara maka mmeri e meriri ha na ntuliaka e mere abalị atọ gara aga.
Otu Labour party dachara na ya bụ ntuliaka kụọ ukwu n’ala ebe otu ‘conservative’ nwetara mmeri dị ebube.
Ụlọọrụ mbipụta akwụkwọ akụkọ bụ 'Sun Publishing Limited' ekwuola na ọbụghị Orji Uzor Kalu nwe ya bụ ụlọọrụ.
Nke a na-abịa dịka ndị EFCC wuchiri n'isi ụlọọrụ ahụ dị na Legọs n'ụbọchị Satọde iji kaa ya akara na ọbụzị gọọmentị nwe ya.
A na-eche na ọbụ Orji Uzor Kalu nwe ya bụ ụlọọrụ.
Mana n'akwụkwọ ozi ya ụlọọrụ ahụ wepụtara, ha dọrọ ndị EFCC aka na nti ka ha sepu aka enwe n'ofe.
Ndị 'Sun' kwuru na okwu gbasara onye nwe ya bụ ụlọọrụ ka na-aga n'ihu n'ụlọikpe kachasị bụ 'Supreme Court'.
Ha kọwakwara na ya bụ ụlọọrụ bụ ihe bekee kpọrọ 'corporate limited liability company'.
Nke a pụtara na ọbụghị naanị otu onye nwe ya kama ọtụtụ ndị mmadụ a kpọrọ 'shareholders' bụ ndị nwe ya.
Nke a abụghị nke mbụ ụdị ihe a na-eme n'ụlọọrụ 'Sun newspaper'.
O meburu n'ọnwa Julaị 2017 mgbe ndị EFCC gbachikwara ụlọọrụ ahụ.
Ụlọọrụ mgbochi nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) amalitela ịkpọchi ụlọ nakwa ihe ndị ọzọ dị icheiche bụ nke aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu nwe.
Ha kọwara na nke a bụ iji gbochie ndị mmadụ isi azụ owere rekọchaa ihe niile Kalụ nwere.
Cheta na ụlọikpe tụrụ Kalu mkpọrọ afọ iri na abụọ n'izuuka abụọ gara aga.
Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka e rekọọ ihe niile ụlọọrụ SLOK nwere ma nyefee gọọmentị etiti ego ya.
SLOK bụ ụlọọrụ nke Kalu ji aha ya wee zuo ego Abịa Steeti, dịka ụlọikpe si kpebie.
Onyeisiala mba Gana bụ Nana Akuffo-Addo ekwuola hoo haa na sọsọ ndị mba ya bụ Gana nwereike ịzụ ahịa Retail n'ala ha.
O kwuru na otu ndị ahịa na Gana emeghi ihe ọjọọ igbochi ndị mba ọzọ ị zụ ahịa obere na be ha.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ụtụtụ ụbọchị satọde.
"Ọ sọ gị bụrụ onye Chaịna ọ sọ gị bụrụ onye Naịjirịa, ị nweghị ike ịzụ ahịa obere n'ala anyị" ka o kwuru
Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Imo steeti bu Orlando Ikeokwu sị na ọ bụ ha ji onye oti egwu ama ama aha ya bụ Duncan Mighty.
Ọ si na ha nwụchiri nwa amadị a maka nrụrụaka dịka ulọikpe nyere iwu ka ejide ya.
Gụọ ya n'uju
Ọdachị dakwasịri otu nwa agbọghọ na-akwado agbam nkwu ya dika ụkwụ kpọrọ o were daba n’ime olulu mmiri na obodo Danbatta dị na steeti Kano.
Fatima Abubakar dị afọ iri na isii nwụrụ tupu agụpụtanwo ya.
Nna nwa agbọghọ ahụ si na ndị kwadoburu ịbịa agbam nkwụ ya bịaziri akwam ozu.
Nwoke chọbụrụ ịnụ ya n'onwe ya nọ n'akwa.
Ụlọ ọrụ ụgbọelu akpọro Turkish Airlines ekwerela n’iwu gọọmentị Naịjirịa nyere ha site na-ibute ụgbọelu ukwu akpọrọ A330.
Gọọmentị Naịjirịa sibu na a ga-amachị Turkish Airline ịfebata mba ahụ maka ha ji obele ụgbọelu akpọrọ B737 adịghị abata ndị njem na ibu ha arụ ọrụ.
Otu United Nations akatọọla ogbugbu ndị oyi ndỤ egwu Boko Haram gburu ndị ọrụ enyemaka anọ na steeti Borno.
Onyeisi United Nations na Naịjirịa bụ Edward Kallon sị na obi na-agba ya maka arụ a Boko Haram kpara ma rịọ ka atụghapụ Grace Taku bụ onye ka nọ n’aka ndị omekome a.
Atụọla onye bụbụ onyeisiala Sudan bụ Omar al-Bashir mkpọrọ afọ abụọ ka ikpe mara ya maka ebubo nrụrụaka.
Ikpe a metụtara ego mba ofesi ruru nde dọla iri abụo na ise enwetere na ụlọ Maazị Bashir ka achụturu ya n'ọkwa na mbido afọ a.
Bashir sị na ya bụ ego bu onyinye ndị be eze Saụdị Arebịya nyere ya.
Ndị na-akwado ya nyere nsogbu n'ụlọikpe ka ikpe na-aga n'ihu nke mere e ji chupu ha iro.
Omar al-Bashir nọkwa na nyocha maka nwakatu gọọmentị e mere n'afọ 1989 bụ nke tinyere n'ọkwa onyeisiala.
Ụlọikpe ụwa Bekee kpọrọ "International Criminal Court" na-achọkwa Maazị Bashir ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo arụ metụtara ikike ndị mmadụ na mpaghara Darfur.
Mba Bosnia ekwerela na ọ ga-akpọlata ụmụafọ Naịjirịa abụọ gara asọmpị tennis na mba Croatia ma tọọ n’ọdọ ndị gbara ọsọ ndụ.
Alex Abia na Kenneth Eboh sị na ndi uweojii nwụchiri ha n’obodo Zagreb ma kpọrọ ha n’ike gawa oke ala Bosnia na Croatia dịka eboro ha ebubo na ha batara mba ahụ n’ejighi akwụkwọ.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa nọ mba ofesi bu Abike Dabiri-Erewa sị na Bosnia kwenyere na mmadu abụọ a ga-alọta ma ya bụrụ na ha emeghị ka otu nwata akwụkwọ rịọrọ ka Croatia nabata ọsọ ndụ ya.
Ka a na-ekwu okwu etu esi nye pati Labour nkeBriten mmeri kachasị kemgbe afọ 1935 otu nwafọ Naịjirịa nyere ha ihe ọchị.
Chinyelu Onwurah nwere mmeri iji nọdụ n’oche ya dịka onye na-anọchịte anya mpaghara Newcastle Central n’Ụlọ Omeiwu n’ọkpụrụ pati Labour.
Aka na-achị Edo steeti bụ Godwin Obaseki akagbuola ọgbakọ ndị ndọrọndọrọ ọbụla na steeti ahụ.
Nke a na-abị n'azụ ọgbaghara dara n'etiti ndi na-akwado mpaghara patị APC ya na ndị nke na-akwado mpaghara onyeisioche pati ahu bụ Adam Oshiomhole n'ụbọchị Tọsde n'obodo Bini.
Ọ bụ unu na Chiagozie ka ga-anọ n'ụtụtụ a.
Ka anyi legharịa anya mara nke na-eme n'obodo.
Nnọ nu.
Ụlọọrụ enyemaka a kpọrọ Action Against Hunger etiela ezinaụlọ ndị ọrụ ha ndị Boko Haram gburu aka n'obi.
Ndị Boko Haram kwuru taa bụ Fraide na ha egbuola ndị ọrụ enyemaka 'Action Against Hunger' mmadụ anọ ha nwụchiri kamgbe ọnwa Julai.
Ha kwukwara na otu onye fọrọ n'aka a kpọrọ Grace ga-abụ ohu ha.
Nke a ga-eme ya ndị ọrụ ụlọọrụ a mmadụ ise Boko Haram gburula.
Ha tọrọ otu onye ọrụ Action Against Hunger, ọkwọụgbọala abụọ na ndị ọrụ ahụike nke gọọmenti oge ha na-arụ ọrụ na Borno steeti n'ọnwa Julai.
N'ozi ha wepụtara na Websaiti ha, Action Against Hunger katọrọ agwa ndị Boko Haram kpara ma kpọọ oku ka ha hapụ onye ọrụ ha bụ Grace ha ji.
Ụlọọrụ na-ahụ maka ejealọ nke okporoụzọ sị na ọ bụ mmadụ anọ nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ mere n’etitiụgbọala Peace na nke GUO n’ụzọ awarawa si Benin gawa Ore.
Bisi Kazeem bụ ọnụ na-ekwuru ndị ụlọọrụ a sị na ihe mberede a mere n’ụbọchị Wednezde na ọ bụghịTọzde
Ndị uweojii Abia Steeti agọọla na ọ bụghị onye otu ha gbaburu otu nwaanyị n’Akpụnmiri Ubakala dị n’Ụmụahịa n’ụbọchị Wednezde.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Geoffrey Ogbonna sị na ọ nwụrụ site na mgbọ tụrụ ya dịka ndị uweojii na ndị ohi na-akwarịta mgbọ.
Ọnwụ nwaanyị a wutere ndị ntoroọbịa obodo ahụ nke mere ha jiri mee ngagharịiwe na gburugburu ahụ na-akpọ oku ka ndị uweojii kpọpụta onye gburu ya.