Mba ndị bụ ọgbọ Naịjirịa
Ị ma na ọ bụghị sọsọ Naịjirịa gbara afọ 59 na 2019?
Lee mba ndị ọzọ bụ ọgbọ Naịjirịa ebe a.
Ndị ọzọ bụ:
- CAR
- Chad
- Benin Republic
- Gabon
- Mali
- Somalia
- Congo
- Cameroon.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị be anyị ndewonu o! Anyị ga-ewetere ụnụ emume niile na-kpọtụ taa maka ịcheta ụbọchị nwereonwe nke Naịjirịa.
Chioma Obianinwa, Jessica Nwankwo, Chris Sanctus Okereke and Ikechukwu Kalu
Ị ma na ọ bụghị sọsọ Naịjirịa gbara afọ 59 na 2019?
Lee mba ndị ọzọ bụ ọgbọ Naịjirịa ebe a.
Ndị ọzọ bụ:
Emume pụrụiche na-akpọtụ n'Okpara Square dị n'Enugwu.
Nchekwa
Onyeisiala Buhari kwuru na ọchịchị ya na-agbasị mbọ ike ihụ na ha gboro nsogwu ndị Niger Delta na-enwe ma hịcha Ogoni bụkwa nosgbu gburugburu ebe ahụ nwerela kamgbe.
Akụ na ụba Naịjịrịa
Buhari kwuru na ọ ga-agba mbọ hụ na akụ na ụba Naịjirịa kwụsie ike ma bụrụ nke onye ọbụla ga-enwe ohere isonye mee ka o wulite nkeọma.
2nd Niger Bridge
"Anyị ga-arụcha akwa mmiri a n'afọ 2022."
Cheta na akwụsịrị ọrụ ebe ahụ nso nso a.
"A bụ m onye Adamawa steeti mana nne na nna m mụrụ m n'Enugwu steeti."
Ezenwaanyị Briten bụ 'Eliza nke abụọ' kwuru na obi bụ ya sọ ọṅụ ikele ndị Naịjịrịa maka ụbọchị taa.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump zitere onyeisiala Muhammadu Buhari ekele ọma maka ncheta ụbọchị nnwereonwe Naịjirịa bụ ụbọchị mbụ ọnwa Ọktoba. N'ozi ya, Trump sị na Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dịnta abụọ na-achụ otu anụ ọhịa n'ụzọ dị iche iche.
Aka chiburu Naịjirịa bụ GoodLuck Jonathan ekwuola ka ụmụ Naịjirịa nwe okwukwe ọhụrụ n'ala ha.
Ebe gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyị arịọla ka ụmụ Naịjịrịa kwụsịeike n’ichụ udo,njikọ na mmekọrịta ụmụnne.
Igbo demenu!
Egbe bere, Ugo bere, onye sị na ibe ya agaghị ebe gịnị ga-eme ya?
Soro nu anyị dịka anyị na-ewetara unu emume niile gbasara ụbọchị mwereonwe n'ọwụwa anyanwụ.