Ka mmemme June 12 n'Abuja sị aga

BBC Igbo kwụ chịm na-ewetara unu akụkọ gbasara etu mmemme June 12 n'Abuja sị aga n'Abuja taa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo and Uche Akolisa

  1. Ọkwa Osote Onyeisi Sineti: Atụmvotu ebidola

    Ojeozi ụlọomeiwu na-akpọ aha ndị omeiwu n'otu na otu.

    Onye a kpọtụtara aha ya , ọ pụta tuo vootu nke ya.

    Oge a kpọrọ Omo Agege, ndị na-akwado ya bidoro kụwara ya aka.

    Oge a kpọọ Ekweremmadụ, o nweghị onye kụrụ aka.

    Ovie Omo-Agege

    Ebe foto si, Channels TV

  2. Onye ga-abụ Osote Onyeisi ụlọomeiwu: Ekweremadu ka ọ bụ Omo-Agege?

    A kpọpụtala Ovie Omo-agege maka Osote onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu.

    Ọ nabata ya ma kwe nkwa ịkwado Onyeisi Sineti n'ọrụ ya

    Chukwuka Ọkazi kpọpụatara Ike Ekweremadu dịka Osote onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu.

    Ekweremadu nabatara mkpọpụta ahụ. O kọwapụtara ihe o merela. O metụtara aka ihe mere oge ndị amaghị ndị ha bụ dabatara zuru ọfọ Sineti. Were kwuo na ntulaka a bụ iji kwado maọdụ kwugide mkpamkpa ahụ kpara n'ụlọmeiwu.

    Ekweremmadu na Omo-Agege

    Ebe foto si, Channels TV

  3. Na Akpọtụ Ugbu A, Lawan abụrụla onyeisi ụlọomeiwu ukwu ọhụrụ

    Ahmed Lawan ji vootu 79 merie Ali Ndume nwetere vootu 28 dịka nguko bịara na njedebe.

    Nke a mere na ọ ga-abụ onyeisi ụlọoomeiwu nke iri n'anọ na Naịjirịa.

    Ali Ndume nabatara mmeri ahụ ma gaa kwe Lawan n'aka.

    Ihe nke a pụtara bụ na Gbajabimila nwere ike imeri dịka onyeisi ụlọ nnọchiteanya dịka ọ na-emepu na ntulaiaka gara aka ebe etu ntuliaka Ulọ Nnochiteanya na agbaso ka nke Sineti siri gaa.

    Ahmad Lawan
  4. A gụwala vootu atụtara

    Ụlọomeiwu

    Ebe foto si, Channels TV

    Obi ekutuola ndị mmadụ ala mana ọtụtụ ka chị obi n'aka dịka onye ojeozi Sineti na agụ vootu... Ahed Lawan'... 'Ndume'

    Ihe na-eme na-echetara ndị n'ụlọ ha ekiri ya ka Tom Ikimi sị akpọpụta Ekwueme, Obasanjo, Obasanjo, Ekwueme oge ntuliaka imeụlọ PDP mere n'afọ 1998 n'Jọs.

  5. Aka na-ada!

    Dịka Ahmed Ibrahim Lawan pụtara tụọ vootu nke ya, aka budoro dawa dịka ndị na-akwado ya na-enye ya nkwado.

    Ahmed Lawan

    Ebe foto si, Ahmed Lawan

  6. Ndịnotu na iwulite Naịjirịa ka Lawan mkpa

    Ihe a bụ nchịkọta okwu Ahmad Lawan kwuru n'ime ozi o nyere ndị otu ya mgbe ọ na-azọ ọkwa onyeisi ụlọomeiwu.

    Ahmad Lawan

    Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook/BBC

  7. Okwu Ali Ndume na-ada gbowam n'ụlọomeiwu

    Ihe a bụ nchịkọta okwu Ali Ndume kwuru n'ime ozi o nyere ndị otu ya mgbe ọ na-azọ ọkwa onyeisi ụlọomeiwu.

    Ali Ndume

    Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook/BBC

  8. Ndị ụlọomeiwu ebidola ntuliaka onye ga-abụ onyeisi ha.

    Igbe ntụlịaka

    Ebe foto si, NTA LIVE/Facebook

    Onyeisi ojeozi bụ Mohammed Sani Ataba Omolori, batara n'ụlọomeiwu were gwa ndị sinetọ gbakọrọ na a ga-agbaso usoro ntuliaka mkpụchi bụ Closed Ballot iji họpụta onyeisi ha.

    Ụfọdụ jụrụ ajụ sị n'ụlọikpe nyere mkpebi ka ọ bụrụ ntuliaka ezoghị ezo, ebe ụfọdụ kwuru na enweghị mkpebi ụlọikpe ọbụla n'okwu ahụ.

    N'ikpeazụ, ha mechara họrọ iji usoro ntuliaka mkpuchi.

    Ugbua ha niile na-atụnye onye ha bu n'uche ga-abụ onyeisi ha.

  9. Amalitela nhọpụta onyeisi ụlọomeiwu ugbua, Ahmad Ibrahim Lawan na Ali Ndume bụ ndị akpọpụtara aha ha.

    Ndị abụọ na-azọ ọkwa onyeisi ụlọomeiwu

    Yahaya Abdullahi ahọpụtala Ahmad Ibrahim Lawal dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu

    Solomon Olamilekan kwadoro ya bụ nhọpụta

    Ahmed Lawan n'onwe ya anabatala nhọpụta ahọpụtara ya.

    N'ozi ya Lawan sị ka

    "Mmadụ niile mịba mma ha n'ọbọ ma jịkọọ aka rụọ ọrụ ịwulite ụlọomeiwu nakwa Naịjirịa"

    Ali Ndume anabatala nhọpụta ahọpụtara ya.

  10. Lee aha ndị ọwụwa anyanwụ nọ n'ụlọomeiwu ukwu, Sọsọ Imo steeti nwere otu onye n'ụlomeiwu.

    Ịmeụlọ ụlọomeiwu

    Abia

    Theodore ahamefula

    Orji uzor kalu

    Abaribe Enyinnaya

    __________________________________________________________________

    Anambra

    Ekwunife uche lilian

    Oduah stella

    Ubah Patrick Ifeanyi

    __________________________________________________________________

    Delta

    Omo Agege Ovie

    Nwaoboshi Peter

    __________________________________________________________________

    Ebonyi

    Sam Egwu

    Ogba Joseph Obinna

    Michael Ama Nnachi

    _________________________________________________________________

    Enugu

    Nnnamani Chimaroke

    Ekweremadu Ike

    Chukwuka Godfery Utazi

    ________________________________________________________________

    Imo

    Onyewuchi Francis

    ________________________________________________________________

  11. Na Akpọtụ Ugbu A, Akpọghị aha Rochas n'ụlọomeiwu

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-akọwa na akpọhghị aha Rochas dịka onye ụlọomeiwu Naịjirịa taa.

  12. Ebidola mkpọpụta aha ndị bụ ụlọomeiwu

    A malitela mkpọpụta aha ndị niile nwere ọkwa n'ụlọomeiwu iji chọpụta ezi ọnụọgụgụ ha.

    Onye a kpọrọ aha ya, ọ kwụrụ ọtọ zara aha nna ya. Ndị Sinetọ io7 bụ ndị a kpọọ aha ha nọ ebe ahụ.

  13. Nghọtaghie abanyela n'ụsoro ntuliaka ụlọomeiwu

    Ndị ụlọomeiwu na-enwe nrụrịtaụka gbasara ụsoro a ga-eji họpụta ndị isi ha.

    Ụfọdụ chọrọ ka ọ bụrụ ntụliaka mkpughe bụ 'open ballot' ebe ndị ọzọ chọrọ ntuliaka mkpuchi nke bụ 'Closed ballot' na Bekee

  14. Ndị Sịnetọ awụchiela n'ụlọomeiwu ugbua

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

  15. Lee ndị na-azọsi ọkwa onyeisi ụlọomeiwu ike

    PDP akwụnyerela Ali Ndume ebe APC kwunyere Ahmed Lawan.

    Ahmed Lawan na Ali Ndume
    Onye nwereike ịnọchị ndị isi ụlọmeiwu anya.
  16. Otu PDP akwụnyerela Ali Ndume maka onyeisi ụlọomeiwu

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. Gịnị ga-eme Rochas?

    Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka ga-agwa Rochas ebe ọ kwụ taa.

    Inec kwuru na ha ga-ebu ụzọ lebanye anya na mkpebi niile ụlọikpe nyere gbasara asambodo mmeri Rochas Okorocha tupu ha kwuo ihe ga-eme ya.

    Rochas Okorocha

    Ebe foto si, Rochas Okorocha/Facebook

  18. Ndị nwereike ịpụta dịka ndị isi Ụlọomeiwu

    Taa ka a ga-ama ndị bụ oke mbe n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa taa.

    Ndị na-azo isi oche n'ụlọomeiwu Naịjirịa

    Ebe foto si, Other

  19. Unu abọọla chi?

    Nnọ nụ na ọba ozi anyị.

    BBC Igbo ga-ewetara unu akụkọ niile ka o sị a ga n'idu n'iyi ọrụ ndị ụlọomeiwu Naịjirịa.

    Jisinu ike.