Ụbọchị ncheta Biafra: Ka o si gaa

Ka o si aga n'ihe gbasara ncheta Biafra na Naijiria na ụwa gburugburu taa bụ Mee 30, nke afọ 2019.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chiagozie Nwonwu

  1. #BiafraHeroesDay na-ewu na Twitter

    Na Soshal Midia Twitter, akara #BiafraHeroesDay na-ewu n'usoro agba ọhụrụ na-akpọ "trending".

    Onyeisi otu Ipob tinyere ọnụ na ya bụ atụmatụ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Mana, onwere ndị ya bu atumatu amasịghị, dịka onye a ji akara @generalzango ede na-ebo ebubo maka agha.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  2. 'Na m pụtara abụghị na m anaghị akwanyere Biafra ugwu'

    N'Isi-gate dị n'Umuahia, azụmahịa na-aga sirir were.

    Otu onye gwara BBC okwu achọghị ka akpọ aha ya si na ịpụta ịchọ ihe ọ ga-eri abụghị mkparị Biafra. Onye ọzọ sị na ya anaghi eme ihe ọbụla banyere Biafra, na ọ bụ ihe ezinaụlọ ya ga-eri ka ọ na-achọ.

    Isi-Gate dị n'Ụmụahia
    Nkọwa foto, Isi-Gate dị n'Ụmụahia
    Umuahia
    Nkọwa foto, Umuahia
  3. Etu o si dị n'Orji Junction, Owere

    Onye Ntaakụkọ BBC n'Owere sị na ya ahubeghị mkpatụ atumatu akpọrọ "Sit at home" na Bekee.

    Orji Junction
    Nkọwa foto, Orji "Junction"
    Ọkọrọtọ Biafra
    Nkọwa foto, Ọkọrọtọ Biafra n'Owere
  4. Ọdịghị ka Abakaliki eso eme ndọdụ n'ụlo

    Agbanyeghi na Abakaliki na-eji nwayọ amalite njem ụbọchị, onye ntaakụko BBC sị na onweghị ihe ọbụla na-egosi na ndị mmadụ na-akwado ịnọ n'ụlọ.

    Ka anyị na-ele anyi etu ọ ga-adị.

    Ahịa nkwo Abakaliki
    Nkọwa foto, Ahịa Nkwo Abakaliki na-azụ
    Nkwo Abakaliki
    Nkọwa foto, Nkwo Abakaliki
    Abakaliki
    Nkọwa foto, Ndị na-aga akwụkwọ
    Abakaliki
  5. N'Umuahia, ndị mmadụ na-agara onwe ha ka onweghi ihe na-eme

    Umudike Junction n'Umuahia
    Nkọwa foto, Umudike 'Junction' n'Umuahia
    Umudike Junction
  6. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ewepute ubọchịa dịka oge a ga-eji kwanyere ndị nwụrụ n'agha sotere nhibe Biafra ugwu

    Otu n'ime otu ndị chọrọ ka mba Biafra laghachite bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) n'onwe ha sị na ọ bụ ịnọ n'ụlọ ka mma iji kwanye ugwu a.

    Nke mere ha jiri sị ka ndị mmadu nọdụ n'ụlo taa.

    BBC Igbo na-ele etu ya bụ Ncheta Biafra si aga.

  7. Ọ bụ n'ụbọchị nke iri atọ nke ọnwa Mee ka Emeka Odumegwu Ojukwu kwuru okwu hibere mba akpọrọ Biafra

    Biafra

    Ebe foto si, Getty Images

  8. Unu asaala chị?

    Ka anyị malite igosi etu esi eme emume ncheta Biafra n'ala Igbo